Gaa n'Isiokwu

Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova

Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.

Ịmaliteghachi Ilegharị Anya na Betel: N'ọtụtụ mba, a ga-amaliteghachi ịga legharịwa anya na Betel malite na Jun 1, 2023. Iji matakwuo ihe ndị ọzọ banyere ya, biko kpọturu alaka ụlọ ọrụ ị chọrọ ịga legharịa anya na ya. Biko, agakwala ilegharị anya na Betel ma ọ bụrụ na i bu ọrịa koronavaịrọs, nwee azụzụ, oyi ọmụma ma ọ bụ ya abụrụ na gị na onye bu ọrịa koronavaịrọs nọrọ ná nso nso a.

Yukren

Maka Ịgwa Anyị Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya

Mmadụ ò kwesịrị ịgwa anyị mgbe ọ ga-achọ ịbịa legharịa anya? Ee. Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, anyị ga-achọ ka ndị ọ bụla ga-abịa ilegharị anya gwa anyị agwa tupu ha abịa n’agbanyeghị ole ha ga-adị.

Ọ bụrụ na ị gwaghị anyị agwa tupu gị abịa, ị̀ ka nwere ike ịga legharịa anya? O nwere ike anyị agaghị ekwe ka ị gaa legharịa anya. Anyị enweghị ebe ga-aba ọtụtụ mmadụ, n’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka anyị nwere ike ịkpọgharị n’ụbọchị.

Olee oge i kwesịrị irute n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Iji hụ na ndị bịara ilegharị anya n’otu oge akarịghị akarị, biko abịala ihe karịrị nkeji iri na ise tupu oge ị chọrọ iji malite ilegharị anya eruo.

Olee otú ị ga-esi agwa anyị na ị chọrọ ịbịa legharịa anya? Pịa ebe e dere “Kwuo Oge Ị Ga-achọ Ịbịa Legharịa Anya.”

Ì nwere ike ịkagbu oge ị chọrọ ịbịa legharịa anya ma ọ bụ gbanwee ya? Ee. Pịa ebe e dere “Lee Oge I Tinyere ma ọ bụ Gbanwee Ya.”

Ọ bụrụkwanụ na mmadụ ole anyị chọrọ ịkpọgharị n’ụbọchị ị chọrọ ịbịa legharịa anya ezuola? Nọgide na-ele n’adres Ịntanet anyị n’ihi na anyị nwere ike ikwe ka ị bịa legharịa anya n’ụbọchị ahụ ma ọ bụrụ na ndị tinyeburu ụbọchị ahụ akagbuo ma ọ bụ yigharịa ya.

Adres Ya

Lvivska Street 64

Briukhovychi

79491 LVIV

UKRAINE

+38 032-240-9200

Ihe A Na-eme

E nwere ebe a na-egosi otú e si na-ahazi ọrụ ikwusa ozi oma ọgbakọ Ndịàmà Jehova karịrị otu puku na narị ise na-arụ na Yukren, nakwa otú e si na-ahazi ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, na otú e si na-asụgharị akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’asụsụ Romani (Chokeshi, Lovari), n’asụsụ Romani (Yukren), n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Rọshịa, n’asụsụ Rusin (Kapatian), na n’asụsụ Yukrenian. Ịkpọgharị ndị bịara ilegharị anya n’ebe a na-ewe nkeji iri atọ.

Ihe ọzọ bụ na ndị bịara ilegharị anya nwere ike iji aka ha gaa legharịa anya n’ebe a na-egosi otú Ndịàmà Jehova si malite ikwusa ozi ọma na Yukren. Ha nwekwara ike iji aka ha gaa legagharịa anya n’alaka ụlọ ọrụ anyị. Ha nwere ike ịga kporie ndụ n’ebe ndị bịara ilegharị anya na-anọ ekpori ndụ. Ịga legharịa anya n’ebe ndị a na-ewe ihe dị ka awa abụọ na nkeji ise.

Danloduo Akwụkwọ Ga-akọkwuru Gị Ihe Ndị Ọzọ