Ilegharị Anya n’Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova
Obi ga-adị anyị ụtọ ma ị gaa legharịa anya n’ụlọ ọrụ anyị dị iche iche nakwa n’ebe ndị anyị na-ebi akwụkwọ. Ebe a ka ị ga-anọ achọpụta ebe ụlọ ọrụ anyị dị na oge ndị ọbịa ji aga elegharị anya ebe ahụ.
Ịmaliteghachi Ilegharị Anya na Betel: N'ọtụtụ mba, a ga-amaliteghachi ịga legharịwa anya na Betel malite na Jun 1, 2023. Iji matakwuo ihe ndị ọzọ banyere ya, biko kpọturu alaka ụlọ ọrụ ị chọrọ ịga legharịa anya na ya. Biko, agakwala ilegharị anya na Betel ma ọ bụrụ na i bu ọrịa koronavaịrọs, nwee azụzụ, oyi ọmụma ma ọ bụ ya abụrụ na gị na onye bu ọrịa koronavaịrọs nọrọ ná nso nso a.
Mozambik
Rua da Micaia No. 160
Bairro Triunfo
Costa do Sol
MAPUTO
MOZAMBIQUE
+258 21-450-500
Oge E Ji Akpọgharị Ndị Ọbịa
Mọnde ruo Fraịdee
8:00 ụtụtụ ruo 11:00 ụtụtụ na 1:00 ehihie ruo 3:30 mgbede
Ọ na-ewe otu awa
Ihe A Na-eme
Ha na-ahazi ọrụ ikwusa ozi ọma Ndịàmà Jehova dị 81,719 na Mozambik na-arụ. Na-asụgharịkwa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl n’ihe dị ka asụsụ iri abụọ. Ha na-ebugara ha ọgbakọ 1,551 dị iche iche dị na Mozambik. Otu n’ime ihe ndị ị ga-ahụ ná nkenke bụ otú Ndịàmà si malite ikwusa ozi ọma na Mozambik.