Gaa n'Isiokwu

Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ewere Ịgba Alụkwaghịm?

Olee Otú Ndịàmà Jehova Si Ewere Ịgba Alụkwaghịm?

 Anyị ji ihe Baịbụl kwuru gbasara alụmdi na nwunye na ịgba alụkwaghịm kpọrọ ihe. Mgbe Chineke malitere alụmdi na nwunye, ọ chọrọ ka a ghara inwe mgbe di na nwunye ga-ahapụ ibe ha. Naanị ihe Baịbụl kwuru nwere ike ime ka mmadụ gbaa alụkwaghịm bụ ma di ya ma ọ bụ nwunye ya kwaa iko.—Matiu 19:5, 6, 9.

Ndịàmà Jehova, hà na-enyere ndị alụmdi na nwunye ha chọrọ itisa aka?

 Ee, n’ọtụtụ ụzọ:

Ndị okenye ọgbakọ, hà ga-akwado Onyeàmà Jehova chọrọ ịgba alụkwaghịm?

 Mba. Ọ bụrụ na ndị okenye chọrọ inyere ndị nwere nsogbu na alụmdi na nwunye ha aka, ọ bụghị ndị okenye ga-ekpebiri ha ihe ha ga-eme. (Ndị Galeshia 6:5) Mana, ọ bụrụ na mmadụ ekpebie ịgba alụkwaghịm nke Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị, ọ gaghịzi enwe ihe ùgwù ọ bụla n’ọgbakọ. N’ihi ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru, onye ahụ agaghị aga lụọ onye ọzọ.—1 Timoti 3:1, 5, 12.

Olee otú Ndịàmà Jehova si ewere nkewa?

 Baịbụl kwuru na di na nwunye ekwesịghị ịhapụ ibe ha ma ọ bụrụgodị na ihe agaghị otú ha tụrụ anya ya. (1 Ndị Kọrịnt 7:10-16) Ọ bụrụ na di na nwunye ana-ekpekọ ekpere ọnụ, na-eme ihe ndị Baịbụl kwuru ma hụ ibe ha n’anya, ọ ga-adịrị ha mfe idozi nsogbu ọ bụla ha nwere.—1 Ndị Kọrịnt 13:4-8; Ndị Galeshia 5:22.

 Mana, ụfọdụ Ndị Kraịst ekpebiela ịhapụ dị ma ọ bụ nwunye ha n’ihi ihe ndị a:

  •   Di kpachaara anya jụ ilekọta ezinụlọ ya.—1 Timoti 5:8.

  •   Di ma ọ bụ nwunye na-akụ ibe ya isi aba okpu.—Abụ Ọma 11:5.

  •   Ekweghị di ma ọ bụ nwunye fee Chineke. Dị ka ihe atụ, di ma ọ bụ nwunye nwere ike chọọ ịmanye di ya ma ọ bụ nwunye ya bụ Onyeàmà Jehova ka o nupụrụ Chineke isi. Onyeàmà ahụ a na-amanye imebi Iwu Chineke nwere ike kpebie na nkewa bụ naanị ihe ọ ga-eme ka o nwee ike “irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.”—Ọrụ Ndịozi 5:29.