ISIOKWU ỤLỌ NCHE A ỌCHỊCHỊ NRỤRỤ AKA NA-AGAGHỊ ADỊ NA YA
Otú Ndị Ọchịchị Si Arụrụ Aka Na-akpa Ụwa Aka Ọjọọ
E kwuola na a sị na ndị ọchịchị na-arụrụ aka, ihe ọ pụtara bụ na ha na-eji ikike ọhaneze nyere ha na-eme ihe ga-abara naanị ha uru. Ọ dịla anya ndị mmadụ bidoro ịrụrụ aka. Dị ka ihe atụ, otu iwu e dere na Baịbụl ihe karịrị puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga kwuru ka ndị mmadụ ghara iri ngarị n’oge a na-ekpe ikpe. Ihe ọ pụtara bụ na ndị mmadụ arụrụwala aka tupu mgbe ahụ. (Ọpụpụ 23:8) N’eziokwu, nrụrụ aka abụghị naanị iri ngarị. Mgbe ụfọdụ, ndị ọrụ gọọmenti na-ezuru ihe n’ụlọ ọrụ ha, were ihe ụfọdụ ụlọ ọrụ ha ji arụ ọrụ na-egboro onwe ha mkpa ha, na-erite uru ha na-ekwesịghị irite ma ọ bụkwanụ na-ezuru ego. Ha nwekwara ike iji ọkwá e nyere ha na-eme ka ndị enyi ha na ndị ikwu ha nweta ihe ha na-ekwesịghị inweta.
Ọ bụ eziokwu na ndị nọ n’òtù dị iche iche na-arụrụ aka, ma o yiri ka ọ̀ bụ ndị ọrụ gọọmenti kacha arụrụ aka. Akwụkwọ ụlọ ọrụ na-ahụ maka igbochi nrụrụ aka n’ụwa bipụtara n’afọ 2013 kwuru na n’ebe niile n’ụwa, ndị mmadụ chere na ndị kacha arụrụ aka bụ ndị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị uwe ojii, ndị ọrụ gọọmenti, ndị omeiwu, nakwa ndị ọkàiwu na ndị ọkàikpe. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ gosiri otú nrụrụ aka si ju ebe niile.
-
AFRỊKA: N’afọ 2013, a gbara ihe dị ka puku ndị ọrụ gọọmenti iri abụọ na abụọ akwụkwọ na Saụt Afrịka maka ịrụrụ aka.
-
AMERỊKA NA MBA NDỊ GBARA YA GBURUGBURU: N’afọ 2012, a mara mmadụ iri abụọ na ise ikpe na Brazil maka na ha weere ego ọhaneze na-amachi ndị mmadụ akpa ka ha tụnyere ha vootu. Otu n’ime ndị ahụ a mara ikpe bụ onyeisi ndị na-enye onyeisi ala mba ahụ ndụmọdụ, bụrụkwa osote ya.
-
ESHIA: N’obodo Sol, nke dị na Saụt Koria, nnukwu ụlọ ahịa dagburu narị mmadụ ise na abụọ n’afọ 1995. Ndị na-eme nchọpụta chọpụtara na ihe kpatara ụlọ ahụ ji daa bụ na mgbe a na-arụ ya, e nyere ndị na-ahụ maka ụlọ ndị a na-arụ n’obodo ahụ aka azụ, ha ekweta ka ndị rụrụ ya were ihe ndị na-adịghị mma rụọ ya.
-
YUROP: Cecilia Malmström, bụ́ kọmishọna Òtù Jikọtara Mba Ndị Dị na Yurop, sịrị: ‘Otú nrụrụ aka si ju ebe niile ná mba ndị dị na Yurop na-awụ akpata oyi n’ahụ́. Ọ dị ka ndị ọchịchị enweghịzi mmasị ime ka nrụrụ aka kwụsị.’
O yiri ka nrụrụ aka ọ̀ baala ndị ọrụ gọọmenti n’ụmị. Otu ọkachamara n’okwu banyere ịkwụsị nrụrụ aka, bụ́ Susan Rose-Ackerman, dere na ọ bụrụ na nrụrụ aka ndị ọchịchị na-arụrụ ga-akwụsị, “gọọmenti ga-agbanwe ọtụtụ ihe n’otú ha si achị.” Ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ nwere ike iche na nrụrụ aka emekataghị kwụsị, ma Baịbụl mere ka anyị ghọta na ọ ga-akwụsịrịrị n’ihi nnukwu mgbanwe a ga-enwe n’ụwa.