Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ì KWESỊRỊ ỊNA-EKPE EKPERE?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ekpe Ekpere?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Ekpe Ekpere?

Ị̀ na-ekpe ekpere mgbe niile? Ọtụtụ ndị na-ekpe ekpere. Ụfọdụ ndị na-ekweghị na Chineke na-ekpekwa ekpere. Gịnị mere ndị mmadụ ji ekpe ekpere? Ajụjụ a jụrụ ndị mmadụ na Frans gosiri na e kee ndị bi na Frans ụzọ abụọ, otu ụzọ n’ime ha na-ekpe ekpere mgbe ụfọdụ “ka obi ruo ha ala.” Ihe mere ha ji ekpe ekpere abụghị ka ha fee Chineke ma ọ bụ ka ha nye ya otuto. Otú ahụ ka ọ dịkwa ọtụtụ ndị bi na Yurop. Naanị ihe bụ́ mkpa ha bụ ka ekpere “mee ka ahụ́ dajụọ ha.” Ụfọdụ ndị na-ekpe ekpere naanị ma ha nwee nsogbu n’agbanyeghị na ha kweere na Chineke. Ha na-achọkwa ka Chineke zaa ha ekpere ngwa ngwa.—Aịzaya 26:16.

Gịnwa kwanụ? Ihe mere i ji ekpe ekpere ọ̀ bụ naanị na ekpere na-eme ka uche kpakọọ gị ọnụ ka i nwee ike ikpebi ihe ị ga-eme? Ọ bụrụ na i kweere na Chineke, ì chere na e nwere uru ekpere na-abara gị? Ka ọ̀ dị gị ka Chineke anaghị aza gị ekpere? Baịbụl ga-enyere gị aka ka ị mata na ekpere adịghị ka ọgwụ mmadụ na-aṅụ sọọsọ mgbe ahụ́ nyewere ya nsogbu, kama na ekpere bụ ihe dị mkpa na-eme ka mmadụ na Chineke dịrị ná mma.