BỊARUO CHINEKE NSO
Jehova “Adịghị Ele Mmadụ Anya n’Ihu”
Ò nwetụla mgbe a na-enyeghị gị ihe ruuru gị ma ọ bụ ghara imere gị ihe e kwesịrị imere gị ma ọ bụkwanụ kparịa gị n’ihi otú akpụkpọ ahụ́ gị na-acha, obodo i si, ma ọ bụkwanụ n’ihi na ị bụghị onye a ma ama? Ọ bụrụ na e metụla gị ụdị ihe a, buru n’obi na ọ bụghị naanị gị ka e metụrụla ya. Ma, e nwere otu ihe ga-eme gị obi ụtọ. Ị̀ ma ihe ọ bụ? Ọ bụ na ịkpa ókè a juru ebe niile n’ụwa adịghị n’eluigwe. Pita onyeozi kwuru hoo haa, sị: “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.”—Gụọ Ọrụ Ndịozi 10:34, 35.
Ebe Pita nọ kwuo ihe a bụ ebe mmadụ na-agaghị atụ anya na ọ ga-anọ kwuo ya, ya bụ, n’ụlọ onye Jentaịl bụ́ Kọnịliọs. Pita bụ onye Juu. Ọ dịrị ndụ n’oge ndị Juu weere ndị Jentaịl ka ndị na-adịghị ọcha na ndị ha na ha na-ekwesịghị imekọ ihe ọ bụla. Gịnị meziri Pita ji gaa n’ụlọ Kọnịliọs? Ọ bụ Jehova Chineke gwara ya gaa ebe ahụ. E nwere otu ọhụụ Chineke mere ka Pita hụ. Chineke gwara ya n’ọhụụ ahụ, sị: “Kwụsị ịkpọ ihe Chineke mere ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.” Pita amadịghị na otu ụbọchị tupu ya ahụ ọhụụ ahụ, na mmụọ ozi agwala Kọnịliọs n’ọhụụ ka o dunye ndị ozi ka ha gaa kpọọ ya. (Ọrụ Ndịozi 10:1-15) Mgbe Pita ghọtara na ọ bụ uche Jehova ka ọ gaa n’ụlọ Kọnịliọs, ọ gara gwa Kọnịliọs na ndị ezinụlọ ya Okwu Chineke.
Pita kwuru, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.” (Ọrụ Ndịozi 10:34) Otú e si dee okwu Grik a sụgharịrị ‘ile mmadụ anya n’ihu’ bụ “ile ihu.” Otu ọkà mmụta kwuru banyere okwu Grik ahụ, sị: “A na-eji ya akọwa mgbe ọkàikpe lere mmadụ anya n’ihu kpelaara onye ahụ ikpe ma ọ bụkwanụ ma onye ahụ ikpe, kama ilekwasị anya n’ihe ndị merenụ kpee ikpe ahụ.” O nweghị agbụrụ ma ọ bụ mba Chineke hụrụ n’anya karịa ibe ya, ọ naghịkwa ahụ ndị nwere ego n’anya karịa ndị ogbenye.
Kama nke ahụ, ihe Jehova na-ahụ bụ ihe dị anyị n’obi. (1 Samuel 16:7; Ilu 21:2) Ihe ọzọ Pita kwuru bụ: “Ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ Ndịozi 10:35) Onye na-atụ egwu Chineke na-akwanyere Chineke ùgwù ma tụkwasị ya obi. Onye ahụ anaghịkwa eme ihe ga-ewute Chineke. Ime ezi omume pụtara mmadụ isi n’ala ala obi ya na-eme ihe dị mma n’anya Chineke. Ọ bụrụ na mmadụ ji obi ya niile na-eme ihe ziri ezi n’ihi na onye ahụ achọghị ime ihe ga-ewute Jehova, Jehova ga-ahụ onye ahụ n’anya.—Diuterọnọmi 10:12, 13.
Ọ bụrụ na Jehova esi n’eluigwe lee anya n’ụwa, ihe ọ na-ahụ bụ na anyị niile bụ otu ndị, ọ bụghị ndị si n’agbụrụ dị iche iche
Ọ bụrụ na o nweela mgbe e megburu gị ma ọ bụ kpọọ gị asị, biko, ka ihe Pita kwuru banyere Chineke kasie gị obi. Jehova si ná mba dị iche iche na-adọta ndị mmadụ ka ha bịa fee ya. (Jọn 6:44; Ọrụ Ndịozi 17:26, 27) Ọ na-anụ ekpere nke ndị niile na-efe ya na-ekpegara ya n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ mba ha si, ma hà nwere ego ma ọ bụ na ha enweghị. (1 Ndị Eze 8:41-43) Mara na ọ bụrụ na Jehova esi n’eluigwe lee anya n’ụwa, ihe ọ na-ahụ bụ na anyị niile bụ otu ndị, ọ bụghị ndị si n’agbụrụ dị iche iche. Ọ̀ bụ na ị gaghị achọ ịmatakwu banyere Chineke a nke na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu?
Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na baịbụl n’ọnwa Jun