Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Mmadụ ò nwere ike ịghọta ihe e dere na Baịbụl?
Baịbụl bụ Okwu Chineke. Baịbụl dị ka akwụkwọ ozi nke nna hụrụ nwa ya n’anya detaara nwa ya. (2 Timoti 3:16) Na Baịbụl, Chineke kwuru ihe ndị anyị ga-eme ka obi na-atọ ya ụtọ, kwuokwa ihe mere o ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme n’ụwa, nakwa ihe ọ ga-emere ụmụ mmadụ n’ọdịnihu. Ma ndị isi okpukpe dị iche iche na-asụgharị Baịbụl isi. Nke a emeela ka ọtụtụ ndị chee na mmadụ agaghị enwe ike ịghọta ihe e dere na Baịbụl.—Ọrụ Ndịozi 20:29, 30.
Jehova Chineke chọrọ ka anyị mata onye ọ bụ nke ọma. Ọ bụ ya mere o ji nye anyị Baịbụl nke bụ́ akwụkwọ anyị ga-aghọtali ihe e dere na ya.—Gụọ 1 Timoti 2:3, 4.
Olee otú i nwere ike isi ghọta ihe e dere na Baịbụl?
Ihe Jehova mere abụghị naanị inye anyị Baịbụl, ọ na-enyekwara anyị aka ịghọta ihe e dere na ya. O zitere Jizọs ka ọ kụziere anyị ihe. (Luk 4:16-21) Jizọs nyeere ndị ọ kụziiri ihe aka ka ha ghọta Akwụkwọ Nsọ. Jizọs kọwaara ha amaokwu dị iche iche na Baịbụl.—Gụọ Luk 24:27, 32, 45.
Jizọs malitekwara ọgbakọ Ndị Kraịst. Ihe mere o ji malite ya bụ ka Ndị Kraịst na-arụ ọrụ ahụ ọ malitere. (Matiu 28:19, 20) Taa, ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs na-enyere ndị mmadụ aka ka ha ghọta ihe Baịbụl kwuru banyere Chineke. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọta ihe e dere na Baịbụl, obi ga-atọ Ndịàmà Jehova ụtọ inyere gị aka.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 8:30, 31.