Jotam Nọgidere Na-efe Chineke n’Agbanyeghị na Nna Ya Kwụsịrị Ife Chineke
Kụziere Ụmụ Gị Ihe
Jotam Nọgidere Na-efe Chineke n’Agbanyeghị na Nna Ya Kwụsịrị Ife Chineke
Ọ BỤRỤ na nne ma ọ bụ nna akwụsị ife ezi Chineke, bụ́ Jehova, o nwere ike isiri nwa ya ike ịnọgide na-efe Chineke. Ka anyị kwuo ihe gbasara Jotam. Anyị ga-amata nsogbu ndị o nwere n’ụlọ ha n’oge ọ ka na-eto eto.
Ọ bụ papa Jotam bụ eze Juda. Aha ya bụ Ọzaya. Ọ bụ ya na-ekwu ihe a na-eme n’Izrel. Ọzaya bụ ezigbo mmadụ ọtụtụ afọ tupu ya amụọdị Jotam. Ma mgbe Jotam ka dị obere, isi buwere Ọzaya, ya emebie iwu Chineke. Nke a mere ka Chineke mee ka ọ rịawa ọrịa ọjọọ a na-akpọ ekpenta. Ị̀ ma ihe Jotam mere mgbe ahụ?— *
Jotam nọgidere na-efe Jehova. O nwere ike ịbụ na mama ya bụ́ Jerusha nyeere ya aka ime otú ahụ. N’agbanyeghị aka mama ya nyeere ya, ọ ga-abụkwa na o siiri ya ike ịnọgide na-eme ihe dị Jehova mma n’oge a kpọpụsịrị papa ya n’ụlọ Jehova.
Ọ bụrụkwanụ na papa gị ma ọ bụ mama gị akwụsị ife Jehova? Ọ̀ bụ na ọ gaghị eme ka ife Jehova siere gị ike?— Buru n’obi na ọ dịghị njọ ma i chee echiche ihe ị ga-eme ma ụdị ihe ahụ mee. Ihe Devid dere na Baịbụl gosiri na iche ụdị ihe ahụ adịghị njọ.
Papa Devid bụ ezigbo mmadụ. Aha ya bụ Jesi. O fere Jehova. Devid hụkwara papa ya n’anya. Ma Devid bịara hụ Jehova n’anya karịadị
otú ọ hụrụ papa ya Jesi. Olee otú anyị si mata?Biko sapeta Abụ Ọma 27:10 na Baịbụl gị. Devid dere n’ebe ahụ, sị: “Ọ bụrụ na nna m na nne m ahapụ m, Jehova ga-akpọrọ m.” Chebagodịrị ihe a anyị gụrụ echiche: Baịbụl na-ekwu n’ebe a na ọ bụrụgodị na Jesi bụ́ papa Devid ma ọ bụ mama ya akwụsị ife Jehova, Devid ga-anọgide na-efe Jehova.
Gịnwakwanụ? Ọ bụrụgodị na papa gị ma ọ bụ mama gị akwụsị ife Jehova ị̀ ga-anọgide na-efe Jehova?— Ọ dị mkpa ka ị jụọ onwe gị ajụjụ a. Ihe mere ị ga-eji mee otú ahụ bụ n’ihi iwu kacha mkpa e nyere anyị na Baịbụl. Iwu ahụ bụ: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.”
Ihe iwu a pụtara bụ na ị gaghị akwụsị ife Jehova ọ bụrụgodị na o siiri gị ike ịnọgide na-efe ya. Ònye ka i chere chọrọ ka anyị kwụsị ife Jehova?— Ọ bụ onye iro Chineke nke a na-akpọ Setan bụ́ Ekwensu. Jizọs kpọrọ ya “onye na-achị ụwa a.” Baịbụl kpọkwara ya “chi nke usoro ihe a.” Ànyị kwesịrị ịna-atụ Setan egwu?—
Mba, anyị ekwesịghị. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị icheta na Jehova ka Setan ike. Jehova ga-echebe anyị ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị ya obi. Were Baịbụl gị gụọ otú Jehova si chebe Devid ka Golayat, bụ́ dike a na-atụ ụjọ, ghara ime ya ihe ọ bụla. Jehova nwekwara ike ichebe gị ma ọ bụrụ na ị nọgide na-efe ya.
Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị
2 Ihe E Mere 26:16-21; 27:1, 2
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.