Kwesịrị Ikwu na Onye Kweere na Chineke Na-aghọ Onwe Ya Aghụghọ?
Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .
Kwesịrị Ikwu na Onye Kweere na Chineke Na-aghọ Onwe Ya Aghụghọ?
▪ Ọ na-abụ ụfọdụ ndị nwee nsogbu, ha anaghị eche echiche ihe ha ga-eme ka nsogbu ahụ kwụsị ma ọ bụkwanụ ihe ha ga-eme ka ha nwee ike idi nsogbu ahụ. Kama nke ahụ, ihe ha na-eme bụ ịgbalị ka ha chefuo nsogbu ahụ mgbe ahụ. Ihe a ha na-eme bụ ịghọ onwe ha aghụghọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-amalite ịṅụ mmanya ka ha chefuo nsogbu ha. Mgbe ha bidoro ịṅụ mmanya, ọ na-adị ha ka nsogbu niile ha nwere ò biela. Ma e mechaa, mmanya ahụ ha na-aṅụ na-eme ka nsogbu ha ka njọ. È kwesịrị ikwu na ọ bụ otu ihe ahụ na-eme ndị kweere na Chineke, ya bụ, na ha na-aghọ onwe ha aghụghọ?
Ụfọdụ ndị na-asị na ndị kweere na Chineke bụ ndị na-amaghị nke a na-akọ. Ha sịrị na ndị ahụ anaghị eche echiche, kama na ọ na-abụ a sị ha na ihe dị iri, ha achịrị wụnye n’akpa. Ihe ha na-ekwu bụ na onye ọ bụla okwukwe ya siri ike na Chineke enweghị ezigbo ihe mere o ji kwere na ya.
N’eziokwu, Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe banyere mmadụ inwe okwukwe na Chineke. Ma ọ dịghị ebe Baịbụl kwuru ka anyị kwere na Chineke mgbe ọ na-enweghị ezigbo ihe mere anyị ga-eji kwere na ya. O nwekwanụghị ebe Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ịna-eche echiche nke ọma. Kama nke ahụ, o kwudịrị na ndị na-ekweta ihe ọ bụla ha nụrụ bụ ndị na-amaghị ihe, bụrụkwa ndị nzuzu. (Ilu 14:15, 18) N’eziokwu, anyị na-egosi na anyị bụ ndị nzuzu ma ọ bụrụ na anyị ekwere ihe anyị nụrụ mgbe anyị na-achọpụtabeghị ma ọ̀ bụ eziokwu. Ime otú ahụ dị ka ebe mmadụ kpuchiri ihe n’anya na-achọ ịgafe okporo ụzọ ọtụtụ ụgbọala na-agbafe maka na onye ọzọ gwara ya ka o mee otú ahụ.
Baịbụl gwara anyị ka anyị kpachara anya ka a ghara ịghọgbu anyị, ọ gwaghị anyị ka anyị kwere ihe ọ bụla a gwara anyị n’ajụghị ase. (Matiu 16:6) Ọ bụrụ na anyị ejiri ikike “iche echiche” Chineke nyere anyị chebara ihe anyị nụrụ echiche tupu anyị ekwere, anyị na-egosi na anyị na-akpachara anya. (Ndị Rom 12:1) Baịbụl na-akụziri anyị ka anyị na-echebara ihe a gwara anyị echiche ma kwere ihe ahụ ma ọ bụrụ na anyị ahụ ihe gosiri na ọ bụ eziokwu. Ka anyị leba anya n’ihe ole na ole Pọl onyeozi kwuru n’akwụkwọ ozi ndị o dere.
Mgbe Pọl degaara ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Rom akwụkwọ ozi, ihe bụ́ mkpa ya abụghị ka ha kwere na Chineke n’ihi na yanwa gwara ha mee otú ahụ. Kama, ọ gwara ha ka ha buru ụzọ chebara ihe ndị gosiri na Chineke dị adị n’eziokwu echiche tupu ha ekwere na ya. O dere, sị: “Àgwà [Chineke] ndị a na-apụghị ịhụ anya ka a na-ahụ nke ọma malite mgbe e kere ụwa gaa n’ihu, n’ihi na a na-aghọta ha site n’ihe ndị e kere eke, ya bụ, ike ebighị ebi ya na ịbụ Chineke ya, nke mere na [ndị na-ekwu na Chineke adịghị] enweghị ihe ngọpụ.” (Ndị Rom 1:20) Pọl kwukwara ihe yiri nke ahụ n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Hibru. O dere, sị: “N’ezie, ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) N’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst bi na Tesalonaịka, ọ gwara ha ka ha ghara ikwere ihe niile ha nụrụ. Ọ chọrọ ka ha ‘na-achọpụta ihe niile.’—1 Ndị Tesalonaịka 5:21.
N’eziokwu, e nwere ike ikwu na onye kweere na Chineke mgbe ọ na-enweghị ezigbo ihe mere o ji kwere na ya na-aghọ onwe ya aghụghọ, onye ahụ na-emekwa onwe ya ihe ọjọọ. Pọl kwuru banyere ụfọdụ ndị sịrị na ha na-efe Chineke n’oge ya, sị: “Ana m agbara ha akaebe na ha na-anụ ọkụ n’obi n’ijere Chineke ozi; ma ọ bụghị dị ka ezi ihe ọmụma si dị.” (Ndị Rom 10:2) N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ihe a Pọl gwara ọgbakọ Ndị Kraịst dị na Rom. Ọ gwara ha, sị: “Gbanweenụ site n’ime ka uche unu dị ọhụrụ, ka unu wee chọpụta n’onwe unu ihe bụ́ uche Chineke, nke ziri ezi na nke dị ya mma, nke zukwara okè.” (Ndị Rom 12:2) Ọ bụrụ na anyị kweere na Chineke n’ihi eziokwu ndị anyị mụtara banyere ya, a gaghị asị na anyị na-aghọ onwe anyị aghụghọ. Kama nke ahụ, okwukwe anyị ga-abụ “ọta ukwu” nke ga-eme ka obi ruo anyị ala, meekwa ka onye ọ bụla ghara ịghọgbu anyị.—Ndị Efesọs 6:16.
[Foto dị na peeji nke 23]
Okwukwe anyị nwere ike ime ka onye ọ bụla ghara ịghọgbu anyị