Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ nke Abụọ: Gịnị Ga-eme M Ma M Nwụọ?

Ajụjụ nke Abụọ: Gịnị Ga-eme M Ma M Nwụọ?

Ajụjụ nke Abụọ: Gịnị Ga-eme M Ma M Nwụọ?

E NWERE otu nwata nwoke aha ya bụ Roman. Mgbe ọ dị obere, ezigbo enyi ya nwụrụ n’ihe mberede ụgbọala. Roman kwuru, sị: “Ọnwụ enyi m ahụ wutere m nke ukwuu. Ọtụtụ afọ ihe ahụ mechara, m ka nọ na-eche ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ.”

Gịnị mere ndị mmadụ ji ajụ ajụjụ a? O nweghị onye ọnwụ na-atọ ụtọ. N’agbanyeghị afọ ole anyị dị, o nweghị onye n’ime anyị chọrọ ịnwụ anwụ. Ọtụtụ ndị na-atụ ụjọ ihe ga-eme ha ma ha nwụọ.

Gịnị ka ụfọdụ ndị na-ekwu? Ọtụtụ ndị na-ekwu na ọ na-abụ mmadụ nwụọ, o nwere ihe dị ya n’ahụ́ na-aga ebe ọzọ dịrị ndụ. Ha kweere na ndị ezi omume na-aga eluigwe ma ha nwụọ, kwerekwa na a ga-ata ndị ajọ omume ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ ruo mgbe ebighị ebi. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ na-abụ mmadụ nwụọ, nke onye ahụ agwụla, a gaghịkwa echeta ya ọzọ.

Gịnị ka ihe ahụ ha na-ekwu pụtara? Ọ bụrụ na ihe mbụ ahụ ha na-ekwu bụ eziokwu, ihe ọ pụtara bụ na onye nwụrụ anwụ anwụchabeghị. Ma, ọ bụrụ na ihe nke abụọ ha na-ekwu bụ eziokwu, ihe ọ pụtara bụ na ndụ anyị dị enweghị isi. Ndị chere na ndụ a anyị dị enweghị isi na-ebi ndụ otú ọ bụla masịrị ha. Mkpa ha bụ “ka anyị rie ma ṅụọ, n’ihi na echi ka anyị ga-anwụ.”—1 Ndị Kọrịnt 15:32.

Gịnị ka Baịbụl na-akụzi? Baịbụl ekwughị na o nwere ihe na-esi mmadụ n’ahụ́ apụ gaa dịrị ndụ n’ebe ọzọ ma mmadụ nwụọ. Chineke si n’ike mmụọ nsọ ya mee ka Eze Sọlọmọn dee, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) Ndị ‘na-amaghị ihe ọ bụla’ enwetụdịghị ihe ha ma, ha amaghịkwa ebe ha nọ. Ihe anaghị emetụ ndị nwụrụ anwụ n’ahụ́, o nweghịkwa ihe ha ga-emeli. N’ihi ya, ndị nwụrụ anwụ enweghị ike inyere anyị aka, ha enweghịkwa ike imerụ anyị ahụ́.

Ọtụtụ ndị chere na Chineke chọrọ ka ụmụ mmadụ na-anwụ anwụ, ma nke ahụ abụghị eziokwu. Mgbe Chineke kere Adam, ọ chọrọ ka ọ dịrị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi. Naanị mgbe Chineke kpọrọ ọnwụ aha bụ mgbe ọ na-agwa Adam ihe ga-eme ya ma o nupụrụ ya isi. Chineke gwara Adam ka ọ ghara iri mkpụrụ nke otu osisi dị n’ogige Iden, gwakwa ya na ọ bụrụ na o rie ya, ọ “ga-anwụrịrị.” (Jenesis 2:17) A sị na Adam na Iv gere Chineke ntị, ha na ụmụ ha niile ndị na-erubere Chineke isi gaara adị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi.

Adam egeghị ntị n’ihe Chineke gwara ya, kama o nupụụrụ ya isi. Ihe ahụ o mere bụ mmehie, n’ihi ya, ọ nwụrụ. (Ndị Rom 6:23) O nweghị ihe si Adam n’ahụ́ pụọ gaa dịrị ndụ n’ebe ọzọ mgbe Adam nwụrụ. Kama nke ahụ, mgbe Adam nwụrụ, ọ kwụsịrị ịdị ndụ. Chineke gwara Adam, sị: “Ọsụsọ ga-agba gị n’ihu tupu gị erie ihe oriri ruo mgbe ị laghachiri n’ala, n’ihi na e si na ya wepụta gị. N’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa n’ájá ka ị ga-alaghachi.” (Jenesis 3:19) Ebe ọ bụ na anyị niile bụ ụmụ Adam, anyị si n’aka ya bute mmehie na ọnwụ.—Ndị Rom 5:12.

N’agbanyeghị na Adam nupụụrụ Chineke isi, Chineke ga-emezu ihe ahụ o bu n’obi, nke bụ́ ime ka ụmụ Adam jupụta ụwa. (Jenesis 1:28; Aịzaya 55:11) N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-akpọlite imeriime ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu banyere oge ahụ, ọ sịrị: “A gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.”—Ọrụ Ndịozi 24:15.

Roman, bụ́ onye anyị kwuru okwu ya ná mbido isiokwu a, bịara mụọ Baịbụl ma ghọta ihe Baịbụl kwuru banyere ọnwụ nakwa banyere Jehova Chineke. Ihe ndị ọ mụtara ruru ya n’obi. Gụọ akụkọ ya na peeji nke 11 n’Ụlọ Nche a.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ, gụọ isi nke 6 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? I nwere ike ịdanlodu ya n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.isa4310.com

[Igbe dị na peeji nke 7]

Gịnị Ka Jizọs Kwuru Banyere Ọnwụ?

N’oge Jizọs nọ n’ụwa, e nwere ụfọdụ ndị isi okpukpe ndị kwuru na mbilite n’ọnwụ adịghị. Jizọs ekwetaghị ihe ahụ ha kwuru. (Luk 20:27) O nwekwanụghị mgbe Jizọs kụziri na o nwere ihe na-esi mmadụ n’ahụ́ apụ gaa dịrị ndụ n’ebe ọzọ ma mmadụ nwụọ. Kama nke ahụ, lee ihe Jizọs kụziri.

Jizọs ji ọnwụ tụnyere ụra. Mgbe enyi ya Lazarọs nwụrụ, ọ sịrị: “Enyi anyị Lazarọs na-arahụ ụra, ma m na-eje ebe ahụ ịkpọte ya.” Ndị na-eso ụzọ Jizọs aghọtaghị ihe Jizọs bu n’obi. N’ihi ya, ha gwara Jizọs, sị: “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ na-arahụ ụra, ahụ́ ga-adị ya mma.” Baịbụl kwuziri ihe merenụ. Ọ sịrị: “Otú ọ dị, ọ bụ banyere ọnwụ ya ka Jizọs na-ekwu. Ma ha chere na ọ na-ekwu banyere ụra efu. Ya mere, n’oge ahụ, Jizọs gwara ha hoo haa, sị: ‘Lazarọs anwụwo.’”​—Jọn 11:11-14.

A ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Mgbe Jizọs rutere n’obodo Lazarọs, ọ kasiri Mata nwanne Lazarọs obi ma gwa ya, sị: “Nwanne gị nwoke ga-ebili.” Jizọs kweziri nkwa a magburu onwe ya: “Abụ m mbilite n’ọnwụ na ndụ. Onye nwere okwukwe n’ebe m nọ, ọ bụrụgodị na ọ nwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ.” Nkwa a Jizọs kwere abụghị nkwa elu ọnụ. Ọ bụ ya mere o ji nọrọ n’ihu ìgwè mmadụ kpọlite Lazarọs n’ọnwụ n’agbanyeghị na o meela ụbọchị anọ Lazarọs nwụrụ.—Jọn 11:23, 25, 38-45.

Ná mkpughe Jizọs kpugheere Jọn onyeozi, Jizọs kwekwara nkwa na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. O kwuru na oge ga-abịa mgbe ọnwụ ga-ahapụ ndị niile o ji, ya bụ, mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi n’ọnwụ bilie.—Mkpughe 20:13.