Ọ̀ Na-ewute Chineke na M Na-aṅụ Sịga?
Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ, Sị . . .
Ọ̀ Na-ewute Chineke na M Na-aṅụ Sịga?
▪ Onye hụrụ Chineke n’anya nwere ike ịjụ ajụjụ a ebe ọ bụ na o nweghị ebe Baịbụl kwuru ka anyị ghara ịṅụ sịga ma ọ bụ ka anyị ghara ịkpọ ụtaba. Ma nke a ọ̀ pụtara na ọ ga-esiri anyị ike ịmata ma Chineke ọ̀ chọrọ ka anyị na-aṅụ sịga ma ọ bụ ka anyị ghara ịṅụ ya? Mbanụ.
Baịbụl kwuru na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) E nwere ọtụtụ ihe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ ndị mere ka anyị ghọta na Chineke chọrọ ka anyị na-eleta onwe anyị anya ka ahụ́ nwee ike ịna-adị anyị mma. Ka anyị burugodị ụzọ leba anya n’ihe ndị na-eme nchọnchọ chọpụtara banyere nsogbu ịṅụ sịga na-akpatara ndị mmadụ. E mechazie, anyị elebakwa anya n’otú ihe Baịbụl kwuru si gbasa ihe ndị ahụ a chọpụtara.
Sịga na-akpatara ndị na-aṅụ ya ọrịa, o sokwa n’ihe ndị kacha eme ka ndị mmadụ na-anwụchu ọnwụ. N’ime mmadụ ise ọ bụla na-anwụ n’Amerịka, ọ bụ sịga na-egbu otu onye. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ịṅụ Ọgwụ Ọjọọ n’Amerịka kwuru na ndị sịga na-egbu kwa afọ karịrị ndị niile “mmanya, ọgwụ ọjọọ, ihe mberede ụgbọala, na ọrịa o biri n’ájá ọcha na-egbu, nakwa ndị na-egbu onwe ha na ndị ndị ọzọ na-egbu.”
Ndị na-aṅụ sịga na-akpatara ndị ọzọ ọrịa. Ọ bụrụ na mmadụ ekuru anwụrụ ọkụ sịga, ọ ga-akpatara ya nsogbu n’ahụ́, n’agbanyeghị otú anwụrụ ọkụ ò kuuru hà. Ndị na-anaghị aṅụ sịga, bụ́ ndị na-ekuru anwụrụ ọkụ sịga, nwere ike ịrịa ọrịa kansa nke akpa ume na ọrịa obi bụ́ nke ha na-agaraghị arịa ma a sị na ha anaghị ekuru anwụrụ ọkụ sịga. N’afọ ole na ole na-adịchabeghị anya, ndị dọkịta chọpụtara ụzọ ọzọ sịga ndị mmadụ na-aṅụ si akpatara ndị ọzọ nsogbu. Ha kwuru na e nwere ihe ụfọdụ e ji mee sịga bụ́ ndị na-abanye n’ákwá, na kapet, nakwa n’ebe ndị ọzọ ma dịrị n’ebe ndị ahụ ruo ogologo oge. Ihe ndị ahụ na-emebi ihe n’ahụ́ mmadụ, karịchaa n’ahụ́ ụmụaka. N’ihi ya, ha nwere ike ịkpatara ụmụaka ọrịa ma ọ bụ mee ka ụbụrụ ha ghara ịna-aghọ nkọ.
Sịga na-eri mmadụ ahụ́. Ọ na-atụrụ onye na-aṅụ ya ụka maka na ọ na-esiri mmadụ ike ịkwụsị ya. Ndị na-eme nchọnchọ kwuru na e nwere ihe a na-akpọ nikotin nke na-adị na sịga. Ha kwuru na ọ bụ ya na-eme ka o siere mmadụ ike ịkwụsị ịṅụ sịga, kwuokwa na nikotin so n’ihe ndị kacha eme ka ihe rie mmadụ ahụ́.
Olee otú ihe Baịbụl kwuru si gbasa ihe ndị a a chọpụtara? Ka anyị hụ otú o si gbasa ha.
Chineke chọrọ ka anyị jiri ndụ kpọrọ ihe. N’iwu Chineke nyere mba Izrel, o kwuru na onye ọ bụla chọrọ ife ya kwesịrị iji ndụ kpọrọ ihe. (Diuterọnọmi 5:17) A gwara ha ka ha rụnye ihe nrụbichi, ma ọ bụ obere mgbidi, gburugburu elu ụlọ ha. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na elu ụlọ ha na-adị larịị, ndị mmadụ na-ebikwa na ha. Mgbidi ahụ na-eme ka mmadụ ghara isi n’elu daa merụọ ahụ́ ma ọ bụkwanụ nwụọ. (Diuterọnọmi 22:8) A gwakwara ụmụ Izrel ka ha hụ na anụmanụ ha emerụghị mmadụ ahụ́. (Ọpụpụ 21:28, 29) N’ihi ya, onye na-aṅụ sịga na-eleghara ihe mere e ji nye iwu ndị ahụ anya n’ihi na ọ na-egosi na o nweghị ihe o ji ndụ kpọrọ. Onye ahụ ma ụma na-akpatara onwe ya ọrịa. Ọ na-akpatakwara ndị nọ ya nso ọrịa.
Chineke chọrọ ka anyị hụ ya na ndị agbata obi anyị n’anya. Jizọs Kraịst kwuru na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị irube isi n’iwu abụọ kachanụ, nke bụ́ iji obi ha dum, mkpụrụ obi ha dum, uche ha dum, na ike ha dum hụ Chineke n’anya na ịhụ ndị agbata obi ha n’anya dị ka onwe ha. (Mak 12:28-31) Ebe ọ bụ na ndụ bụ onyinye Chineke nyere ụmụ mmadụ, onye na-aṅụ sịga na-egosi na ya ejighị onyinye ahụ kpọrọ ihe nakwa na ya ahụghị Chineke n’anya. (Ọrụ 17:26-28) Sịga ahụ ọ na-aṅụ nwere ike ịkpatara ndị ọzọ oké nsogbu, n’ihi ya, ọ na-egosi na ọ hụghị ndị agbata obi ya n’anya.
Chineke chọrọ ka anyị ghara ime ihe ọ bụla ga-emerụ anyị. Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha sachapụ onwe ha “mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) O doro anya na ịṅụ sịga na-emerụ mmadụ. Ma, ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ịkwụsị ịṅụ sịga, Chineke ga-enyere onye ahụ aka ịkwụsị ya n’agbanyeghị na ịkwụsị ya nwere ike isitụrụ ya ike.