Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Haziri Ahazi Na-efe Ya?

Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Haziri Ahazi Na-efe Ya?

Mụta Ihe N’okwu Chineke

Gịnị Mere Chineke Ji Nwee Ndị Ọ Haziri Ahazi Na-efe Ya?

N’isiokwu a, a jụrụ ajụjụ ndị o nwere ike ịbụ na ị jụọla. E dekwara ebe ndị i nwere ike ịgụ na Baịbụl gị ka ị hụ azịza ha. Obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ ịkọwara gị azịza ha.

1. Gịnị mere Chineke ji mee ka e nwee mba Izrel?

Chineke mere ka ụmụ Ebreham ghọọ otu mba. O nyere ha iwu ga na-achị ha. Aha ọ kpọrọ mba ahụ bụ Izrel. O nyekwara ha Okwu ya, bụ́ Akwụkwọ Nsọ, ma gwa ha ka ha fewe ya ofufe otú ọ chọrọ. Chineke chọkwara ka ndị ọzọ si n’aka ha mụta Okwu ya ma fewe ya otú ọ chọrọ. (Abụ Ọma 147:19, 20) Iwu ahụ o nyere mba Izrel baara mba niile uru.—Gụọ Jenesis 22:18.

Chineke họọrọ ụmụ Izrel ka ha bụrụ ndị àmà ya. Mgbe ha rubeere iwu Chineke isi, ọ baara ha uru. (Diuterọnọmi 4:6) Ọ bụrụ na anyị agụọ akụkọ ụmụ Izrel, anyị ga-amatakwu ezi Chineke.—Gụọ Aịzaya 43:10, 12.

2. Gịnị mere Chineke ji hazie ezigbo Ndị Kraịst ka ha fewe ya?

Mba Izrel mechara kwụsị ife Jehova otú ọ chọrọ, n’ihi ya, Jehova ji mba ọzọ, nke bụ́ ọgbakọ Ndị Kraịst, dochie ha. (Matiu 21:43; 23:37, 38) Ọ bụ ndị Izrel bụbu ndị àmà Chineke. Ma ugbu a, ọ bụ ezi Ndị Kraịst bụ ndị àmà ya.—Gụọ Ọrụ 15:14, 17.

Jizọs haziri ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-agba àmà banyere Jehova nakwa ka ha mee ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ná mba niile. (Matiu 10:7, 11; 24:14; 28:19, 20) Ọrụ ikwusa ozi ọma a agwụwala. Taa, Jehova emeela ka ọtụtụ nde mmadụ ná mba niile jiri otu obi na-efe ya otú ọ chọrọ. E nwetụbeghị mgbe ọtụtụ ndị ji otu obi na-efe Jehova otú a. (Mkpughe 7:9, 10) Jizọs gwakwara ezigbo Ndị Kraịst ka ha jiri otu obi na-efe Chineke. Nke a ga-eme ka ha na-agbarịta ibe ha ume ma na-enyere ibe ha aka. N’ụwa niile, ọ bụ otu ihe ka ha niile na-amụ n’ụlọ nzukọ ha. Ihe niile ha na-amụ sikwa na Baịbụl.—Gụọ Ndị Hibru 10:24, 25.

3. Olee otú Ndịàmà Jehova e nwere n’oge anyị a si malite?

Ọ bụ n’afọ 1870 ka Ndịàmà Jehova e nwere n’oge anyị a malitere. Otú ha si malite bụ na e nwere mmadụ ole na ole bịakọtara ọnụ ma malite ịmụ Baịbụl. Ka ha na-amụ Baịbụl, ha malitere ịchọpụta eziokwu ndị dị na Baịbụl nke ndị mmadụ leghaara anya kemgbe. Ha maara na Jizọs haziri ọgbakọ Ndị Kraịst ka ha na-ekwusa ozi ọma. N’ihi ya, ha malitere ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile. Ma, ọ bụ n’afọ 1931 ka ha malitere ịza Ndịàmà Jehova.—Gụọ Ọrụ 1:8; 2:1, 4; 5:42.

4. Olee otú e si hazie Ndịàmà Jehova taa?

N’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, ọ bụ ndịozi na ndị okenye nọ na Jeruselem ka e nyere ọrụ ịhazi na ilekọta ọgbakọ Ndị Kraịst n’ebe dị iche iche. Ndị ikom ahụ matara na ọ bụ Jizọs bụ Onyeisi ọgbakọ Ndị Kraịst. (Ọrụ 16:4, 5) Taa, Ndịàmà Jehova makwa na ọ bụ Jizọs bụ Onye Ndú ha. (Matiu 23:9, 10) Ndịàmà Jehova nwekwara ndị ikom na-ahazi ọrụ ha n’ụwa niile. Ndị ikom a ma nke a na-akọ n’Okwu Chineke. Ha na-eji Okwu Chineke agba ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova ume. Ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị ihe karịrị otu narị puku n’ụwa niile. E nwekwara ndị ikom na-elekọta ọgbakọ nke ọ bụla. A na-akpọ ha ndị okenye, ma ọ bụ ndị nlekọta. Ndị ikom a na-elekọta atụrụ Chineke nke ọma n’ihi na ha hụrụ atụrụ Chineke n’anya.—Gụọ 1 Pita 5:2, 3.

A haziri Ndịàmà Jehova ka ha na-ekwusa ozi ọma ma mee ka ndị mmadụ ghọọ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Ha na-asụgharị ma na-ebipụta akwụkwọ dị iche iche e ji amụ Baịbụl n’ihe karịrị narị asụsụ ise. Ha na-ekesara ndị mmadụ akwụkwọ ndị a n’ebe niile. Ha na-eme ihe a niile iji nyere ndị mmadụ aka. Ha na-ekwusakwa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ otú ahụ ndịozi Jizọs mere. (Ọrụ 20:20) Ọ bụrụ na mmadụ achọọ ịmata eziokwu ndị dị na Baịbụl, ha na-akụziri onye ahụ Baịbụl. Ndịàmà Jehova na-enwe obi ụtọ n’ihi na ihe bụ́ mkpa ha bụ ime uche Chineke na inyere ndị ọzọ aka.—Gụọ Abụ Ọma 33:12; Ọrụ 20:35.

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ihe ndị a kọrọ n’isiokwu a, gụọ GỊnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 19 n’akwụkwọ a Ndịàmà Jehova bipụtara.