Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Ònye bụ Ahazuirọs bụ́ eze ndị Peshia ahụ e kwuru okwu ya na Baịbụl n’akwụkwọ Esta?
▪ Na Baịbụl, akwụkwọ Esta kwuru na Ahazuirọs họọrọ Esta, bụ́ nwa agbọghọ onye Juu, ka ọ bụrụ nwunye ya. Akwụkwọ ahụ kwukwara na Esta mechara zọpụta ndị Juu ibe ya mgbe a chọrọ igbukpọ ha. O nwere mgbe ndị ọkà mmụta na-enweghị otu olu banyere onye nke bụ́ Ahazuirọs n’ime ndị eze chịrị mba Peshia. Ma, o yiri ka ihe ndị Peshia dere na nkume, nke e dere n’asụsụ atọ, ò meela ka a mata na Ahazuirọs bụ Xerxes nke Mbụ, bụ́ nwa Darayọs Onye Ukwu (onye a na-akpọkwa Darayọs Hystaspis). E soro otú ndị Peshia si dee aha Xerxes degharịa ya n’asụsụ Hibru, ọ ga-afọ nnọọ obere ka ya na nke ahụ e dere n’asụsụ Hibru n’akwụkwọ Esta bụrụ otu.
Ihe niile e dere n’akwụkwọ Esta banyere Ahazuirọs gosiri na ọ bụ ya bụ Xerxes nke Mbụ. Ahazuirọs, bụ́ eze Peshia, si n’isi obodo ya bụ́ Susa (ma ọ bụ Shushan), nke dị n’Ilam, na-achị Midia. Ọchịchị ya sikwa n’India ruo ná mba ndị Oké Osimiri Mediterenian gbara gburugburu. (Esta 1:2, 3; 8:9; 10:1) Otu ọkà mmụta aha ya bụ Lewis Bayles Paton kwuru, sị: “Ọ gwụla Xerxes bụ eze Peshia chịrị ebe ndị ahụ. Ihe ndị a kọrọ n’Akwụkwọ Esta banyere Ahazuirọs dabakwara n’ihe Herodotus na ndị Grik ndị ọzọ, bụ́ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme, kọrọ banyere Xerxes.”
Olee ihe gosiri na a kpụrụ brik n’Ijipt n’oge ochie?
▪ Akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ọpụpụ kwuru na ndị Ijipt manyere ndị Hibru, bụ́ ndị ohu ha, ka ha na-akpụrụ ha brik. Ha gwara ndị Hibru ahụ brik ole ha ga-eji ụrọ na ahịhịa ọka na-akpụta n’ụbọchị ọ bụla.—Ọpụpụ 1:14; 5:10-14.
N’oge Baịbụl, ịkpụ brik ma gbaa ya n’anwụ bụ otu n’ime ọrụ ndị dị mkpa a na-arụ n’akụkụ Osimiri Naịl. Ihe ụfọdụ e ji brik ndị ahụ rụọ n’Ijipt n’oge Baịbụl ka dịkwa ya taa. E gosiri otú e si akpụ brik ndị ahụ n’otu ihe e sere n’ahụ́ ájá ili otu nwoke aha ya bụ Rekhmire. Ili ahụ dị n’obodo Tibs, n’Ijipt. E sere ihe ahụ n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ ise gara aga, nke fọrọ obere ka ọ bụrụ n’oge ihe ndị a kọrọ n’akwụkwọ Ọpụpụ mere.
Akwụkwọ bụ́ International Standard Bible Encyclopedia kọwara ihe ahụ e sere n’ahụ́ ájá. O kwuru, sị: “A na-ekute mmiri n’olulu mmiri; jiri ọ́gụ̀ gwakọta mmiri ahụ na ụrọ, buruzie ụrọ ahụ gawa n’ebe dị mma a ga-anọ jiri ya kpụọ brik. A na-ekunye ụrọ ahụ n’ihe e ji osisi rụọ nke yiri ihe e ji akpụ blọk ma sụọ ya asụọ. A na-ewepụzi ihe ahụ e ji osisi rụọ ma hapụ brik ahụ a kpụrụ ka anwụ kpọọ ya. A na-akpụ brik ndị ahụ n’ahịrị n’ahịrị, ọ na-abụkwa ha kpọọ, e dokọta ha otú ahụ e si edokọta blọk ma hapụ ha ruo mgbe a ga-eji ha rụọ ụlọ. A ka na-esi otú a akpụ brik n’Ijipt, Izrel, Ịrak, Tọki, nakwa ná mba ndị ọzọ.”
Ihe e dere n’akwụkwọ dị iche iche e ji ahịhịa papaịrọs mee kwuru na ndị ohu na-eji ụrọ na ahịhịa ọka akpụ brik nakwa na o nwere brik ole a na-agwa ha ka ha kpụọ n’ụbọchị. E dere akwụkwọ ndị ahụ n’ihe dị ka puku afọ atọ na narị afọ atọ gara aga.
[Foto dị na peeji nke 22]
Nkume ebe a tụrụ Xerxes (onye nke guzo ọtọ) na Darayọs onye ukwu (onye nke nọ ọdụ)
[Ebe E Si Nweta Foto]
Werner Forman/Art Resource, NY
[Foto dị na peeji nke 22]
Ihe e sere n’ahụ́ ájá ili Rekhmire
[Ebe E Si Nweta Foto]
Erich Lessing/Art Resource, NY