Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

Olee otú e si enweta ihe e ji esiji “eri na-acha uhie uhie” bụ́ nke e kwuru okwu ya ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ Ọpụpụ?

Baịbụl kwuru na ihe ndị e ji kwee ákwà e ji kpuchie ụlọikwuu ebe ụmụ Izrel oge ochie na-anọ achụrụ Chineke àjà bụ “eri na-acha anụnụ anụnụ na ajị anụ e sijiri odo odo na eri na-acha uhie uhie na ezigbo eri linin a kpara akpa.” (Ọpụpụ 26:1; 38:18) Ọ bụkwa “eri na-acha uhie uhie” ka e ji kwee “uwe nsọ” nke ndị nchụàjà.—Ọpụpụ 28:1-6.

E nwere ihe na-acha uhie uhie, ma ọ bụ ọbara ọbara, e ji esiji ákwà. Ọ bụ ihe a ka e ji esiji eri ahụ ka ọ chawa uhie uhie. A na-esi n’otu ahụhụ nke na-adị n’osisi ook enweta ihe ahụ na-acha uhie uhie e ji esiji ákwà. Ahụhụ a anaghị enwe nku, ebe a na-ahụkarịkwa ya bụ n’Izrel na ná mba ndị gbara ya gburugburu. Ọ bụ n’àkwá dị n’afọ ahụhụ ahụ n’oge ọ dị ime ka ihe ahụ na-acha uhie uhie na-adị. Mgbe ahụhụ ahụ dị ime, ọ na-eyi obere ikpuru ngwọ, ọ na-ataparakwa n’akwụkwọ nakwa n’ọnụ ọnụ osisi ook. A na-atụtụ ya, surie ya, ya agbapụta ihe ahụ na-acha uhie uhie. Ihe ahụ na-acha uhie uhie na mmiri na-agwakọta nke ọma, ọ bụkwa nke a mere o ji adị mma iji ya esiji ákwà. N’ihe onye Rom, bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme, nke aha ya bụ Pliny nke Okenye, dere, o kwutere okwu ihe ahụ na-acha uhie uhie, kwuokwa na e ji ya kpọrọ ihe n’oge ya.

Mmadụ ole n’ime ndị so dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst nọ ya na Pentikọst nke afọ 33 Oge Anyị?

Ọ dị ka ọ̀ bụ mmadụ isii n’ime mmadụ asatọ ndị so dee Akwụkwọ Nsọ Grik nọ ya n’ụbọchị ahụ.

Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwuru na Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Unu esila na Jeruselem pụọ, kama cherenụ ihe Nna m kwere ná nkwa.” (Ọrụ 1:4) Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kwukwara na Matiu, Jọn, na Pita, bụ́ ndị mechara soro dee Baịbụl, mere ihe ahụ Jizọs kwuru ma soro ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs ‘zukọọ n’otu ebe.’ Ụmụnne Jizọs abụọ, bụ́ ndị nne ji ya na ha, sokwa zukọọ n’ebe ahụ. (Ọrụ 1:12-14; 2:1-4) Ha bụ Jems na Jud (onye a na-akpọkwa Judas). Ọ bụ ha mechara dee akwụkwọ Baịbụl abụọ bụ́ Jems na Jud.—Matiu 13:55; Jems 1:1; Jud 1.

Mgbe Mak na-ede Oziọma ya, o kwuru na e nwere otu nwa okorobịa nke gbara ọsọ n’abalị ụbọchị e jidere Jizọs. O yiri ka ọ̀ bụ onwe ya ka ọ na-ekwu, ebe ọ bụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị ọzọ ahapụlarị Jizọs gbaa ọsọ. (Mak 14:50-52) N’ihi ya, ọ ga-abụ na Mak so ná ndị mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ Jizọs, o nwekwara ike ịbụ na o so ha zukọọ n’ụbọchị Pentikọst ahụ.

Ndị ọzọ fọrọnụ n’ime mmadụ asatọ ahụ so dee Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst bụ Pọl na Luk. Pọl aghọbeghị onye na-eso ụzọ Kraịst na Pentikọst nke afọ 33 Oge Anyị. (Ndị Galeshia 1:17, 18) Ọ dịkwa ka Luk esoghị ha zukọọ n’ụbọchị ahụ, ebe ọ bụ na o kwughị na ya so ná “ndị ji anya ha hụ” otú Jizọs si jee ozi ya n’ụwa.—Luk 1:1-3.

[Foto dị na peeji nke 22]

Ahụhụ e si na ya enweta ihe ahụ e ji esiji ákwà

[Ebe E Si Nweta Foto]

Courtesy of SDC Colour Experience (www.sdc.org.uk)

[Foto dị na peeji nke 22]

Mgbe Pita na-agwa ndị mmadụ okwu na pentikọst nke afọ 33 oge anyị