Otú Ndụ Dị n’Oge Baịbụl—Ego
Otú Ndụ Dị n’Oge Baịbụl—Ego
“O wee nọdụ ala chee igbe a na-atụnye ego ihu wee malite ile otú ìgwè mmadụ ahụ si na-atụnye ego n’igbe ndị ahụ a na-atụnye ego; ọtụtụ ndị bara ọgaranya nọkwa na-atụnye ọtụtụ mkpụrụ ego. Ma otu nwaanyị di ya nwụrụ bụ́ onye dara ogbenye bịara tụnye obere mkpụrụ ego abụọ nke ga-azụtali ihe dị nnọọ nta.”—MAK 12:41, 42.
AKPỌRỌ ego aha n’ọtụtụ ebe na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, n’Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn, Jizọs ji mkpụrụ ego dị iche iche kụziere ndị mmadụ ihe ndị dị mkpa. O ji “obere mkpụrụ ego abụọ” nwaanyị ahụ di ya nwụrụ nyere, bụ́ nke e kwuru okwu ya ná mbido isiokwu a, kụzie ihe. N’oge ọzọ, o ji mkpụrụ ego a na-akpọ dinarịọs mee ka ndị na-eso ụzọ ya ghọta otú ha kwesịrị isi na-ele ndị ọchịchị anya. *—Matiu 22:17-21.
Gịnị mere e ji mepụta ego? Olee otú e si emepụta ya n’oge Baịbụl? Olee ihe ndị e ji ya mee? Oleekwa ihe Baịbụl na-agwa anyị banyere otú anyị kwesịrị isi na-ele ego anya?
E Si n’Iji Ngwá Ahịa Agbanwere Ngwá Ahịa Jiwezie Ọla Azụ Ahịa
Tupu e mepụta ego, otú ndị mmadụ si azụ ahịa bụ iji ngwá ahịa ha agbanwere ngwá ahịa ọzọ. Ha na-eji otu ụdị ngwá ahịa agbanwere ụdị ngwá ahịa ọzọ ya na ya hà. Ọ na-abụkwa otu onye rụọrọ ibe ya ọrụ, onye nke ọzọ arụọkwara ya ọrụ ya na nke ahụ hà. Ma isi otú a azụ ahịa anaghị adị mfe. Tupu ya enwee isi, ngwá ahịa onye nke ọ bụla bu ga-abụrịrị ihe ibe ya chọrọ. Ihe ọzọkwa bụ na ọ na-eme ka ndị ahịa na-ebu nnukwu ibu, dị ka akpa ọka, ma ọ bụ na-akpụgharị ụmụ anụmanụ.
Ndị ahịa mechara chọpụta na ha kwesịrị inwe ihe na-adịghị arọ ha nwere ike iji na-azụ ma ọ bụ na-ere ahịa. Ihe ha meziri bụ iji ọla ndị dị oké ọnụ ahịa, dị ka ọlaedo, ọlaọcha, na ọla nchara, na-azụ ahịa. N’ihe osise dị na peeji a, ị ga-ahụ ebe onye ahịa ji ọla ndị dị oké ọnụ ahịa na ọkpụrụkpụ ígwè na-azụ ihe ma ọ bụ na-akwụ ụgwọ ihe a rụụrụ ya. A na-eji ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ọla ndị ahụ nke ọma tupu e bunye ya ngwá ahịa ọ chọrọ. Dị ka ihe atụ, mgbe Ebreham zụtara ala ebe ọ ga-eli nwunye ya ọ hụrụ Jenesis 23:14-16.
n’anya, bụ́ Sera, o ji ihe e ji atụ̀ ihe tụọ ọlaọcha o ji zụọ ala ahụ.—N’oge Jehova nyere ụmụ Izrel Iwu ya, ndị ji anyaukwu azụ ahịa na-eji ihe ọ̀tụ̀tụ̀ na-adịghị mma ma ọ bụ nke aghụghọ na-aghọgbu ndị ha na-eresị ahịa. Jehova Chineke kpọrọ aghụghọ asị, ọ bụ ya mere o ji gwa ndị ahịa n’Izrel, sị: “Unu ga-enwe ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ziri ezi, ihe ziri ezi e ji atụ̀ ịdị arọ ihe.” (Levitikọs 19:36; Ilu 11:1) Taa, ndị na-azụ ahịa kwesịrị icheta na otú Jehova si ele anyaukwu na aghụghọ anya agbanwebeghị.—Malakaị 3:6; 1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.
Otú E Si Mepụta Mkpụrụ Ego Mbụ
Ebe e mepụtara mkpụrụ ego mbụ bụ n’obodo Lidia (bụ́ ebe a na-akpọ Tọki ugbu a) n’ihe dị ka afọ 700 Tupu Oge Anyị. N’oge na-adịghị anya nke a mechara, ndị na-eji ígwè akpụ ihe ná mba dị iche iche malitere ịkpụpụta mkpụrụ ego n’ebe o buru ibu, ndị bi n’ala niile a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl malitekwara iji ha azụ ahịa.
Olee otú e si kpụọ mkpụrụ ego ndị ahụ? Onye na-akpụ ego na-esi n’ọkụ ewepụta ígwè ọ gbazere agbaze (1) ma wụba ya n’oghere dị iche iche, bụ́ ndị ga-eme ka ha dị mbadamba ma dị okirikiri (2). Ọ na-ewerezi ha otu otu tinye n’agbata ígwè abụọ bụ́ ndị nwere ihe osise ma ọ bụ akara (3). Ihe ọ na-emezi bụ ịkụ ya hama bụ́ nke ga-eme ka ihe osise ma ọ bụ akara ahụ bie n’ego ahụ ọ na-akpụ (4). Otú e si eme nke a ọkụ ọkụ na-emekarị ka ihe osise ma ọ bụ akara ahụ ghara ibi n’etiti mkpụrụ ego ụfọdụ. Ndị ọrụ na-ahọ ha ahọ ma tụọ ha n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ iji hụ na ha hà nhata, ha na-akpụchakwa ndị karịrị ibe ha ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa (5).
Ndị Na-agbanwe Ego, Ndị Ọnaụtụ, na Ndị Na-echekwa Ego
Na narị afọ nke mbụ Oge Anyị, e ji mkpụrụ ego si mba dị iche iche zụọ ahịa n’Izrel. Dị ka ihe atụ, ndị na-esi ná mba ndị ọzọ abịa n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem na-eji mkpụrụ ego mba ha abịa. Ma, ọ bụghị ụdị mkpụrụ ego ọ bụla ka ndị na-elekọta ụlọ nsọ ahụ na-ekwe anara maka ụtụ isi ụlọ nsọ. Ndị na-agbanwe ego na-anọ n’ụlọ nsọ ahụ agbanwere ndị mmadụ ego, ego ha na-anakwa ha iji gbanweere ha ego ha ji bịa na-ebukwa oké ibu. Jizọs katọrọ ndị anyaukwu ahụ. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na ha na-eme ka ụlọ Jehova bụrụ “ụlọ ahịa” na “ọgba nke ndị na-apụnara mmadụ ihe.”—Jọn 2:13-16; Matiu 21:12, 13.
Matiu 22:17) E nwekwara ụtụ ụzọ na ụtụ a na-atụ maka ibubata na ibupụ ngwá ahịa n’obodo, nakwa ụtụ ndị ọzọ. Ndị na-anatara ndị ọchịchị ụtụ dị iche iche n’Izrel anaghị akwụwa aka ọtọ, ndị mmadụ anaghịkwa ele ha anya ọma. (Mak 2:16) Ndị ọnaụtụ na-ana ndị mmadụ ego karịrị ihe a gwara ha nata ma fọnye nke fọdụrụ n’akpa ha. Ma, ụfọdụ ndị ọnaụtụ, dị ka Zakịọs, gere ntị n’ihe Jizọs kwuru ma kwụsị ịghọ aghụghọ. (Luk 19:1-10) Taakwa, onye ọ bụla nke chọrọ iso ụzọ Kraịst ga-akwụwarịrị aka ya ọtọ n’ihe niile, ma n’ahịa ya.—Ndị Hibru 13:18.
Ndị bi n’Izrel na-atụkwara ndị ọchịchị ụtụ dị iche iche. Otu n’ime ha bụ “ụtụ isi” ndị iro Jizọs jụrụ ya ajụjụ maka ya. (Ndị ọzọ ọrụ ha metụtara ego bụ ndị na-echekwa ego. E wezụga ịgbanwere ndị mmadụ ego si mba ọzọ, ha na-echekwara ha ego, na-ebinye ha ego, ma na-akwụ ndị nyere ha ego ka ha jidere ha ọmụrụ nwa. Jizọs kwuru banyere ndị ahụ na-echekwa ego n’ihe atụ o mere banyere ndị ohu e nyere ego n’otu n’otu ka ha jiri zụọ ahịa.—Matiu 25:26, 27.
Otú E Kwesịrị Isi Lee Ego Anya
N’ọtụtụ mba taa, ndị mmadụ na-arụ ọrụ iji nweta ego ha ga-eji zụọ ihe ha chọrọ. Ihe Eze Sọlọmọn si n’ike mmụọ nsọ Chineke dee ọtụtụ narị afọ gara aga ka bụ eziokwu. Ihe o dere bụ: “Ego bụ ihe nchebe.” Ma, Sọlọmọn kwukwara na amamihe ka ego mma n’ihi na ọ “na-echebe ndị nwe ya ndụ.” (Ekliziastis 7:12) Amamihe a dị na Baịbụl.
Jizọs nyeere ndị na-eso ụzọ ya aka ịghọta otú ha kwesịrị isi na-ele ego anya mgbe ọ sịrị: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) Dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs nke narị afọ mbụ mere, anyị ga-egosi na anyị maara ihe ma ọ bụrụ na anyị na-akwụwa aka ọtọ mgbe anyị na-eme ihe ego ma ghara imefusị ego ma ọ bụ hụ ya n’anya.—1 Timoti 6:9, 10.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Gụọ igbe dị na peeji nke 26 nke isiokwu ya bụ, “Mkpụrụ Ego Ndị E Nwere n’Oge Ochie.”
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 26]
Mkpụrụ Ego Ndị E Nwere n’Oge Ochie
● Leptọn bụ mkpụrụ ego e ji ọla kọpa kpụọ nke so ná mkpụrụ ego ndị kacha obere e nwere n’Izrel na narị afọ mbụ. A na-akwụ onye ọrụ e goro ego mkpụrụ ego leptọn abụọ ma ọ rụọ ọrụ naanị nkeji iri na ise. O nwere ike ịbụ mkpụrụ ego leptọn abụọ ka nwaanyị ahụ di ya nwụrụ tụnyere n’igbe a na-atụnye ego n’ụlọ nsọ.—Mak 12:42.
● Drakma bụ mkpụrụ ego ndị Grik, nke e ji ọlaọcha kpụọ. Ọ na-afọ obere ka o wee onye ọrụ e goro ego otu ụbọchị iji rụta otu drakma. (Luk 15:8, 9) Mkpụrụ ego drakma abụọ bụ ụtụ isi nwoke ọ bụla bụ́ onye Juu na-atụ kwa afọ maka ụlọ nsọ.—Matiu 17:24.
● Dinarịọs bụ mkpụrụ ego ndị Rom e ji ọlaọcha kpụọ, nke e sere Siza na ya. N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị na ọ bụ ya bụ mkpụrụ ego e ji atụ “ụtụ ahịa” a na-ana ụmụ nwoke ndị Juu torola eto n’oge ndị Rom na-achị ha. (Ndị Rom 13:7) Onye goro mmadụ ọrụ ga-akwụ onye o goro ọrụ otu dinarịọs maka ịrụrụ ya ọrụ awa iri na abụọ n’ụbọchị.—Matiu 20:2-14.
● N’oge Jizọs nọ n’ụwa, a na-eji mkpụrụ ego shekel e ji naanị ọlaọcha kpụọ azụ ahịa n’Izrel na n’obodo ndị gbara ya gburugburu. A na-akpụ ego a n’obodo Taya. O nwere ike ịbụ shekel a a na-akpụ na Taya ka ndị isi nchụàjà ji kwụọ Judas Iskarịọt “mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ” maka ịrara Jizọs nye n’aka ha.—Matiu 26:14-16.
Otú a e sere mkpụrụ ego ndị a bụ otú ha hà