Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ

GỊNỊ mere otu nwaanyị a ma ama na-agụ egwú ji kwụsị ịgụ egwú ma ghọọ onye na-ekwusa ozi ọma oge niile? Gịnị nyeere otu omekome aka ịgbanwe ndụ ya ma baara obodo ya uru, n’agbanyeghị na otu ọkàikpe kwuru na o nweghị mmeta? Gụọ akụkọ ndị a ka ị mata azịza ha.

“Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ.”—ANTOLINA ORDEN CASTILLO

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1962

ABỤ M ONYE: SPEN

NDỤ M BIRI: ANA M EME IHE NKIRI, NA-AGỤKWA EGWÚ

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’obodo nta bụ́ Tresjunkọs, nke dị n’ebe a na-akpọ La Mancha. Ndị ezinụlọ anyị bụ ndị ọrụ ugbo. Mama m bụ onye Katọlik, ebe papa m bụ onye Protestant. Papa m mere m ka m jiri Baịbụl kpọrọ ihe; m na-ahụ ka ọ na-agụ ya mgbe niile. Ma mama m zụlitere m ka m bụrụ onye Katọlik, ọ na-akpọkwa m aga mas n’ụbọchị Sọnde ọ bụla.

Mgbe m dị afọ iri na ise, ahapụrụ m obodo anyị gaa biri na Madrid na nke nwanne m nwaanyị tọrọ m. Agụụ ịhụ ndị mụrụ m na-agụ m mgbe niile, ma ibi n’obodo mepere emepe mechara mara m ahụ́. Mgbe m dị afọ iri na asaa, m rụụrụ òtù egwú a na-akpọ zazuela ọrụ ọnwa ole na ole. Òtù egwú a na-agụ egwú ọdịnala ndị Spen ma na-eme ihe nkiri. Ihe ndị ha na-eme na-atọ m nnọọ ụtọ, m wee kpebie ịghọ onye na-eme ihe nkiri. M kwụsịrị ụlọ akwụkwọ na-azụpụta ndị odeakwụkwọ bụ́ nke m na-aga ma malite iso òtù egwú zazuela dị iche iche. N’oge ahụ, mụ na nwanne nwoke otu enyi m nwaanyị malitere ịkpa. Ebe m nwere ezigbo ọrụ, nwee ego, nweekwa onye hụrụ m n’anya, ọ dị m ka ihe niile ò zuuru m.

Mụ na ndị òtù egwú zazuela dị iche iche malitere iso aga ebe dị iche iche na Spen nakwa mba ndị ọzọ, dị ka Kolumbia, Kọsta Rika, Ekwedọọ na Venezuwela. Mụ na òtù egwú dị iche iche, bụ́ ndị na-agụ egwú ọdịnala na-ewu ewu na Madrid, so gụọ egwú. Otu n’ime òtù egwú ndị a, bụ́ nke m na-agụrụ egwú, mere nnọọ nke ọma.

Ọrụ ahụ m na-arụ dị m mma, ma omume rụrụ arụ ya na ya so adịghị m mma. Nsogbu ọzọ bụ na otú m ga-esi na-adị mma n’anya mgbe niile ma ghara ibu ibu bịara na-echu m ụra. Nke a mere ka m buwe ọnụ, bụ́ nke kpataara m ọrịa.

N’agbanyeghị nsogbu ndị a, m ka chọkwara ịghọ onye na-eme ihe nkiri. E mechara were m n’ụlọ akwụkwọ ebe a na-akụzi ime ihe nkiri na Madrid. A kụziiri anyị na onye na-eme ihe nkiri kwesịrị ịghọta otú onye ọ chọrọ ijije si eche echiche, ghọtakwa otú yanwa na-eme ihe nkiri ahụ si eche echiche. Ọ bụ mgbe m mere ihe a a kụziiri anyị ka m chọpụtara na o nweghịzi ihe na-emetụ m n’obi. M na-achọ naanị ọdịmma onwe m, o nweghịkwa ihe m ji kpọrọ ihe.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: M maara na m ga-agbarịrị mbọ ma ọ bụrụ na m chọrọ ịmụta àgwà ọma. Ma, amaghị m ebe m ga-ebido ebido. M kpebiziri ịga otu chọọchị dị na Madrid nke mụ na papa m na mama m gatụrụla otu mgbe. M kpegaara Chineke ekpere, kpọọ ya aha ya bụ́ Jehova.

Obere oge nke a mechara, Ndịàmà Jehova abụọ bịara n’ụlọ m. Mụ na ha kwurịtara ihe dị na Baịbụl, ma m jụkwara ha ọtụtụ ajụjụ banyere ihe ha na-akụzi. Esther, bụ́ Onyeàmà Jehova na-akụziri m Baịbụl, nweere m ezigbo ndidi. Ya na ndị ezinụlọ ya hụrụ m n’anya nke ukwuu, ha jikwa obiọma meso m ihe. M malitere ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ọ dịghịkwa anya, mụ achọpụta na achọtala m eziokwu ahụ m na-achọ.

N’oge ahụ, m ka si nnọọ n’ụlọ akwụkwọ ahụ na-akụzi ime ihe nkiri pụta, ọtụtụ ndị chọkwara ka m bịa rụwara ha ọrụ. M nwetara ọrụ iso mee ihe nkiri a chọrọ ime n’ebe a ma ama a na-eme ihe nkiri na Madrid. Ma, m chọpụtakwara na ọ bụrụ na m chọrọ ime nke ọma n’ime ihe nkiri, m ga-etinyerịrị oge m niile na ya. M kpebiziri ịchọ ọrụ ọzọ ga-enye m ohere ife Chineke. M ghọtara na Jizọs kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị: “Ọ dịghị onye pụrụ ịbụ ohu nke nna ukwu abụọ; n’ihi na, ma ọ́ bụghị na ọ ga-akpọ otu asị ma hụ onye nke ọzọ n’anya, ya abụrụ na ọ ga-arapara n’otu ma leda onye nke ọzọ anya. Unu apụghị ịbụ ndị ohu Chineke na nke Akụnụba.” (Matiu 6:24) Enyi m nwoke ahụ mụ na ya kparala afọ asatọ enweghị mmasị n’ihe ndị m na-amụta na Baịbụl, n’ihi ya, mụ na ya kwụsịrị ịkpa. O nweghị nke dịịrị m mfe n’ime mgbanwe ndị a m mere.

URU NDỊ M RITERELA: Ugbu a, m na-arụzi ọrụ na-anaghị ewecha oge m niile. M na-enyere ndị agadi aka. Ọrụ a na-eme ka m nwee oge buru ibu m ji akụziri ndị na-asụ asụsụ Arabik, bụ́ ndị bi n’ógbè anyị, Baịbụl. Ọ dịrịghị m mfe ịmụta asụsụ ọhụrụ a, ma ọ na-atọ m nnọọ ụtọ izisara ndị a ozi ọma. Ha na-ele ọbịa nke ọma, nweekwa mmasị ịmụ okwu Chineke.

Ndụ m enweela isi ugbu a, ọ dịghịzi ka mgbe ahụ m na-amaghị ebe m kwụ akwụ n’oge ahụ m nọ n’ụlọ akwụkwọ a na-amụ otú e si eme ihe nkiri. Aga m asị na Jehova enyerela m aka ịghọ ezigbo mmadụ na inwekwu obi ụtọ ná ndụ.

“Egosila m na ihe ahụ otu ọkàikpe kwuru abụghị eziokwu.”—PAUL KEVIN RUBERY

A MỤRỤ M N’AFỌ: 1954

ABỤ M ONYE: INGLAND

NDỤ M BIRI: ABỤ M ONYE OMEKOME, ANA M EMEKWA IHE IKE

NDỤ M BIRI NA MBỤ: A mụrụ m n’obodo Dudli, nke dị na West Midlands, bụ́ nnukwu obodo e nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ na ya. Papa m bidoro n’oge m bụ nwata mee ka m nwee mmasị n’ịgụ akwụkwọ. O mekwara ka m nwee mmasị n’ihe ndị e kere eke, n’agbanyeghị na o kweghị na e kere ha eke. Ọ gwara m na Chineke adịghị. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị mụrụ m gwara m ka m na-aga Sọnde skul ndị chọọchị Metọdist na-enwe n’obodo anyị.

Mgbe m dị afọ asatọ, ahụrụ m ka ụfọdụ ụmụ okorobịa bi n’ógbè anyị mụnyere otu ụgbọ mmiri ọkụ. Mgbe ndị uwe ojii bịara, ụjọ ekweghị m kwuo ihe m hụrụ n’ihi na ụmụ okorobịa ahụ kwuru na ha ga-emerụ m ahụ́ ma m kwuo. Ndị uwe ojii kwuziri na ọ bụ m mere ihe ahụ, nke a mekwara ka iwe ju m obi. N’ihi ya, m gara mebisie ihe n’ụfọdụ ụlọ akwụkwọ, ụlọ ụka, na ụlọ ọrụ ndị dị n’obodo anyị. Ihe ndị m mebiri rukwara ọtụtụ puku dọla. Mgbe m na-erule afọ iri, amalitela m ịkụka ụlọ ndị mmadụ na ụlọ ahịa na-ezu ohi. Ọ na-atọ m ụtọ iji ọkụ egwuri egwu, m gbakwara ọtụtụ ihe ndị mmadụ ọkụ. N’ụlọ akwụkwọ anyị, ndị nkụzi anyị kwuru na mụ enweghị mmeta.

Mgbe m dị afọ iri na abụọ, ahụrụ m otu akwụkwọ nke na-akọ banyere ime mgbaasị. Esi m n’ihe m gụtara na ya rụọ bọọdụ m ga-eji na-agba afa. Ebe ọ bụ na ndị mụrụ m ekweghị na Chineke, ha chere na o nweghị ihe mgbaasị ahụ m na-eme ga-eme m nakwa na ọ ga-eme ka m wepụ uche m n’ime ihe ọjọọ. Ma tupu mụ agụchaa akwụkwọ, e kpeela m ikpe ọtụtụ ugboro n’ụlọikpe a na-ekpe ndị na-eto eto ikpe. Abanyere m n’òtù na-eme ihe ike a na-akpọ isi agbọ ncha. Ana m eji ágụbá na agbụ ígwè aga ebe ọ bụla m na-aga. Achọtara m ọrụ, ma a napụrụ m ọrụ ahụ mgbe m gara mkpọrọ obere oge. Mgbe m si n’ụlọ mkpọrọ pụta, ebidokwara m imebisị ihe ndị mmadụ. E jidekwara m ọzọ ma tụọ m mkpọrọ afọ abụọ. Ọ bụ n’oge a ka ọkàikpe kwuru na mụ enweghị mmeta nakwa na m bụụrụ ndị obodo m nnukwu nsogbu.

Mgbe m si n’ụlọ mkpọrọ pụta, mụ na enyi m nwaanyị aha ya bụ Anita kpawakwara. Anyị lụziri, ezughịkwa m ohi ma ọ bụ kpata nsogbu ruo oge ụfọdụ. Ma, mgbe afọ ole na ole gafere, ebidokwara m kpawa arụ. Amaliltere m ịkụka ụlọ ahịa ndị mmadụ na izu ego ndị ha debere n’ebe ha na-edebe ego. Ebidoro m ịṅụ ọgwụ ike, ịṅụ oké mmanya, na ibu égbè. E jidekwara m ọzọ ma tụọ m mkpọrọ.

Ụdị ndụ m na-ebi mere ka nwunye m na-echegbu onwe ya. Mgbe ọ gara ụlọ ọgwụ, dọkịta nyere ya ọgwụ ga-eme ka ọ kwụsịlata iche oké echiche ma gwa ya na ihe o kwesịrị ime bụ ịgba m alụkwaghịm. Ma obi dị m ụtọ na o meghị ihe ahụ dọkịta ahụ gwara ya.

OTÚ BAỊBỤL SI GBANWEE NDỤ M: N’oge anyị lụrụ ọhụrụ, nwunye m na ndị Ndịàmà Jehova mụtụrụ Baịbụl. Mgbe m nọzi n’ụlọ mkpọrọ, nke mechara bụrụ nke ikpeazụ m, Ndịàmà Jehova ziri ya ozi ọma ọzọ. Ọ dabara na ọ bụkwa n’ụbọchị ahụ ha ziri ya ozi ọma ka m kpegaara Chineke ekpere, sị, “Ọ bụrụ na ị dị adị n’eziokwu, gosi m na ị dị.”

Mgbe ọnwa ole na ole gafere, apụtara m n’ụlọ mkpọrọ ma gakwuru ụkọchukwu otu chọọchị dị n’ógbè anyị wee gwa ya ka ọ kụziwere mụ na nwunye m Baịbụl. Ọ sịrị na naanị ihe ya ga-akụziri anyị bụ otu ekpere na ihe ndị chọọchị ha kweere.

N’ikpeazụ, amalitere m ịgụ Baịbụl. O juru m anya mgbe m mụtara na Baịbụl na ime mgbaasị adịghị mma. (Diuterọnọmi 18:10-12) Emechara m hụ otu Ụlọ Nche Ndịàmà Jehova nyere nwunye m n’ụbọchị ahụ m rịọrọ Chineke n’ekpere ka o nyere m aka. Ihe m gụtara na ya mere ka m gwa Ndịàmà Jehova ka ha bịa kụziwere anyị Baịbụl.

Obi adịghị ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi anyị, mma na anyị na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl, ọ dịghịkwa ndị mụ na ha na-akpabu arụ. Ụfọdụ sịrị na ha na-emebi m isi. N’eziokwu, ọ dị mkpa ka a sachapụ m ihe ọjọọ niile juru m isi. Enwere m ọtụtụ àgwà ọjọọ nke na akọnuche m anaghịzi apịa m ụtarị. E wezụgakwa ihe ọjọọ ndị ọzọ m na-eme, ana m aṅụru sịga iri isii n’ụbọchị. Ndịàmà Jehova ndị nyeere anyị aka ịmụta Baịbụl na ndị nke nọ n’ọgbakọ anyị na-aga nweere anyị ezigbo ndidi, gosikwa anyị obiọma. N’ikpeazụ, akwụsịrị m àgwà ọjọọ ndị ahụ m na-akpa.—2 Ndị Kọrịnt 7:1.

URU NDỊ M RITERELA: O ruola afọ iri atọ na ise mụ na Anita lụrụ. Otu n’ime ụmụ anyị na ụmụ ụmụ anyị abụọ sokwa anyị na-ejere Jehova ozi. N’ime afọ ndị na-adịbeghị anya, mụ na nwunye m na-eji nnọọ oge buru ibu akụziri ndị ọzọ Baịbụl.

Ijere Jehova Chineke ozi emeela ka ndụ anyị nwee isi ma baa uru. N’afọ 1970, otu ọkàikpe kwuru na mụ enweghị mmeta. Ma Chineke na ndụmọdụ m nwetara na Baịbụl enyerela m aka igosi na ihe ahụ ọkàikpe ahụ kwuru abụghị eziokwu.