Onye Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Nke a Hụrụ n’Ịtali Oge Ochie
Onye Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia Nke a Hụrụ n’Ịtali Oge Ochie
OLEE ihe bugara otu nwoke Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia n’Alaeze Ukwu Rom oge ochie puku afọ abụọ gara aga? Nke ahụ bụ ajụjụ ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie jụrụ mgbe ha chọpụtara otu ihe dị ịtụnanya n’ebe ndịda Ịtali n’afọ 2009.
Ebe ha hụrụ ihe ahụ bụ n’ebe ili ozu ndị Rom oge ochie dị na Vagnari, bụ́ nke dị ihe dị ka iri kilomita isii site n’ebe ọdịda anyanwụ Bari. A hụrụ ọkpụkpụ iri mmadụ asaa na ise. Mgbe e nyochara ọkpụkpụ ndị ahụ, a chọpụtara na a mụrụ ihe ka ọtụtụ n’ime ha n’obodo ndị dị nso n’ebe ahụ. Ma, ọkpụkpụ nke otu nwoke juru ndị ahụ na-eme nnyocha anya. Nnyocha e nyochara mkpụrụ ndụ DNA ya gosiri na nne ya si n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia. * Ọkpụkpụ ya gosiri na ọ nwụrụ na narị afọ nke mbụ ma ọ bụ nke abụọ O.A. (Oge Anyị). Otu akụkọ nke kwuru banyere ihe ahụ a chọpụtara kwuru na “o yiri ka nke a ọ̀ bụ nke mbụ a na-ahụ ọkpụkpụ onye Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia n’Alaeze Ukwu Rom.” Ònyekwanụ ka nwoke a bụ?
Otu akụkọ ahụ kwuru, sị: “Ihe mbụ mmadụ nwere ike iche kpọtara onye nwe ọkpụkpụ ahụ n’ebe ahụ bụ ahịa ákwà silk mba Chaịna na Rom na-azụkọrịta mgbe ahụ.” Ma, e chere na a na-esi n’aka ọtụtụ ndị ahịa nzụgharị azụ ahịa ahụ, nke mere na ọ dịghị otu onye gara njem ahụ dị puku kilomita asatọ naanị ya site na Chaịna ruo Ịtali.
Olee ihe ndị anyị nwere ike ịmata site n’ebe a hụrụ ọkpụkpụ ahụ? N’oge ochie, Vagnari bụ ime obodo nke dị n’aka eze ukwu Rom, bụ́ ebe ndị ọrụ ngo na-agbaze ígwè ma na-arụpụta taịl ndị e ji ụrọ kpụọ. Ọtụtụ n’ime ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ bụ ndị ohu, o nwekwara ike ịbụ na onye a si Eshia bụ otu n’ime ha. N’ezie, e lighị ya ka ọgaranya. Ngwongwo ya e likọtara ya na ya bụ otu ite, e likwara ozu ọzọ n’elu nke ya.
Olee ihe mere anyị ji nwee mmasị na nke ahụ? Ihe kpebiri ebe ozi Ndị Kraịst gbasaruru na narị afọ mbụ O.A. bụ ebe ndị oge ochie meruru njem. Baịbụl kọrọ na mgbe Pentikọst 33 O.A. gasịrị, ndị njem bịara Jeruselem bu ozi ọma gaa ebe ndị dị anya. (Ọrụ 2:1-12, 37-41) Ma ọ́ dịghị nnọọ ihe ọzọ, ọkpụkpụ a a hụrụ na-egosi na n’ihe dị ka n’oge ahụ, ụfọdụ ndị na-esi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia aga n’ógbè Mediterenian. *
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 Mkpụrụ ndụ DNA ya e nyochara egosighị ebe nna ya si.
^ par. 6 E nwekwara ihe ndị na-egosi na ndị si n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa na-aga n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Eshia n’oge ahụ. Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ebe Ndị Kraịst Oge Gboo Kwusaruru Ozi Ọma n’Eshia?” nke dị n’Ụlọ Nche January 1, 2009.
[Map dị na peeji nke 29]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
ROM
Vagnari
Oké Osimiri Mediterenian
EBE ỌWỤWA ANYANWỤ ESHIA
OKÉ OSIMIRI PASIFIK
[Foto dị na peeji nke 29]
Ọkpụkpụ nke otu onye si n’Ebe Ọwụwa anyanwụ Eshia a bọpụtara n’ebe ili ozu ndị Rom oge ochie
[Ebe E Si Nweta Foto]
© Su concessione del Ministero per i Beni e le Attività Culturali - Direzione Regionale per i Beni Culturali e Paesaggistici della Puglia - Soprintendenza per i Beni Archeologici della Puglia