Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Ebe ọ bụ na ọkọchị na-adị ogologo n’Izrel, olee ihe ndị biri ebe ahụ n’oge ochie na-eme iji hụ na ha na-enwe mmiri mgbe niile?
▪ N’agbata Ọktoba na Eprel, mmiri na-ezo n’Izrel, mgbe ụfọdụkwa na-asọba na ndagwurugwu. Ma, n’ọkọchị, ihe ka ọtụtụ ná mmiri ndị ahụ na-ata, mmiri nwekwara ike ghara izo ruo ọtụtụ ọnwa. Olee otú ndị dịrị ndụ n’oge Baịbụl si enweta mmiri mgbe niile?
Otú ha si emeri nsogbu mmiri bụ igwu okpo mmiri n’akụkụ ugwu nke idei mmiri na-esi na ha asọba n’olulu mmiri ndị dị n’okpuru ala n’udu mmiri. A na-arụ elu ụlọ otú ga-eme ka mmiri ozuzo na-asọba n’olulu mmiri ndị ahụ. Ọtụtụ ezinụlọ na-enwe olulu mmiri nke ha, bụ́ ebe ha nwere ike isi na-esere mmiri ha na-aṅụ.—2 Ndị Eze 18:31; Jeremaya 6:7.
Ndị Izrel na-esikwa n’iyi enweta mmiri. N’ebe ndị bụ́ ugwu ugwu, mmiri ozuzo na-eji nwayọọ nwayọọ amịba n’ala ruo mgbe ha ruru n’okwute ndị ha na-agaghị agafeli, ha asọrọzie n’elu ha ruo mgbe ha sọpụtara ghọọ iyi. Aha obodo ndị dị ka En-shimesh, En-rogel, na En-gidaị na-egosi na a na-ewukarị obodo n’akụkụ iyi (Hibru, en). (Jọshụa 15:7, 62) Na Jeruselem, a wara okpo mmiri nke si n’oké nkume gafee iji webata mmiri n’obodo.—2 Ndị Eze 20:20.
N’ebe a na-enweghị iyi, a na-egwu olulu mmiri (Hibru, beʼerʹ), dị ka nke dị na Bia-shiba, iji si n’ime ala nweta mmiri. (Jenesis 26:32, 33) Onye edemede bụ́ André Chouraqui kwuru na “ndị mmadụ ka na-aja otú a [ndị Izrel] si enweta mmiri mma, ọbụna n’oge anyị a.”
Olee ụdị ụlọ o nwere ike ịbụ na Ebreham biri?
▪ Ebram na nwunye ya biri n’obodo ndị Kaldia bụ́ Ọọ nke bara ọgaranya. Ma Chineke nyere ha iwu ka ha kwapụ n’obodo ahụ ma malite ibi n’ụlọikwuu. (Jenesis 11:31; 13:12) Ka anyị tụlee ihe ndị o nwere ike ịbụ na ha hapụrụ mgbe ha kwapụrụ n’obodo a.
Leonard Woolley gwupụtara Ọọ, bụ́ nke dị ná mba Ịrak ugbu a, n’agbata afọ 1922 na 1934. E ji brik rụọ iri ụlọ asaa na atọ n’ụlọ ndị ọ hụrụ. Ọtụtụ ọnụ ụlọ ndị ahụ chere ihu n’ime èzí a wụrụ ala ya awụ. Ime èzí ụlọ ndị ahụ kpọdatụrụ akpọda n’ebe etiti ha, bụ́ ebe e nwere ebe mmiri na-adịghị ọcha na-esi asọpụ. N’ụlọ ndị ka buo ibu, ọnụ ụlọ ndị njem nwere ebe mposi nke ha. Ọnụ ụlọ ndị ọzọ dị n’ala nwere usekwu na ebe ndị ohu na-ehi ụra. Ndị nwe ụlọ na-ebi n’ọnụ ụlọ ndị dị n’elu, bụ́ ndị nwere steepụ e si arịgo na ha. A na-esi na steepụ ha abanye na veranda e ji osisi rụọ nke gara ime èzí ahụ gburugburu, bụ́kwa ndị e nwere ike isi na ha banye n’ọnụ ụlọ ndị ahụ dị n’elu.
Woolley dere, sị: “Ụlọ . . . , nke nwere ime èzí e tere ete na ahụ́ ájá e tere nzụ nke ọma, nke nwere ebe mmiri si asọpụ . . . na ọnụ ụlọ iri na abụọ ma ọ bụ karị, na-egosi na ndị bi n’ebe ahụ mepere anya. Ndị nwe ụlọ ndị ahụ bụ . . . ndị na-abachaghị ọgaranya, ndị na-ere ahịa, ndị na-azụ obere ahịa, ndị odeakwụkwọ, na ndị ọzọ.”
[Foto dị na peeji nke 19]
Olulu mmiri, Họvot Mezada, Izrel
[Ebe E Si Nweta Foto]
Masada National Park, Israel Nature and Parks Authority
[Foto dị na peeji nke 19]
Ụlọ e sere ese nke dịrị n’oge Ebreham
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ihe e sere ese: A. S. Whitburn