Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Olee ihe Pọl onyeozi bu n’obi mgbe o kwuru banyere “ngagharị mmeri”?
▪ Pọl dere, sị: “Chineke . . . na-edu anyị . . . ná ngagharị mmeri ná mmekọrịta anyị na Kraịst ma na-eme ka e nwee ike ịnụ ísìsì ihe ọmụma banyere ya n’ebe niile site n’aka anyị! N’ihi na n’ebe Chineke nọ, anyị bụ ísìsì ụtọ nke Kraịst n’etiti ndị a na-azọpụta nakwa n’etiti ndị na-ala n’iyi; n’ebe ndị na-ala n’iyi nọ, ọ bụ ísìsì ọnwụ nke na-eduga n’ọnwụ, n’ebe ndị a na-azọpụta nọ, ọ bụ ísìsì ndụ nke na-eduga ná ndụ.”—2 Ndị Kọrịnt 2:14-16.
Onyeozi ahụ na-ekwu banyere ihe ndị Rom na-eme nke bụ́ ime ngagharị mmeri iji kwanyere ọchịagha meriri ndị iro nke obodo ya n’agha ùgwù. Ná ngagharị ndị dị otú ahụ, a na-egosi ma ihe ndị a kwatara n’agha ma ndị a dọtara n’agha, a na-akpụkwa oké ehi aga ebe a ga-eji ha chụọ àjà ka ìgwè mmadụ na-eto ọchịagha ahụ na ndị agha ya. Mgbe njem ngagharị ahụ kwụsịrị, a na-achụ oké ehi ndị ahụ n’àjà, o yikwara ka à na-egbu ọtụtụ n’ime ndị ahụ a dọtara n’agha.
Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru na “ọ ga-abụ n’ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ a na-esure ka ndị mmadụ kwụ n’ahịrị na-aga ka e si nweta” okwu bụ́ “ísìsì ụtọ nke Kraịst” nke pụtaara ụfọdụ ndụ, pụtara ndị ọzọ ọnwụ. “Ísìsì ụtọ ahụ nke na-egosi mmeri ndị meriri n’agha meriri na-echetara ndị a dọọrọ n’agha na e nwere ike igbu ha.” *
Olee ihe bụ́ “ebe ndị dị elu” ahụ e kwuru banyere ha ọtụtụ ugboro n’Akwụkwọ Nsọ Hibru?
▪ Mgbe ndị Izrel na-achọ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ, Jehova gwara ha ka ha wepụ ebe niile ndị Kenan bi ebe ahụ na-anọ efe ofufe. Chineke nyere ha iwu, sị: “Bibie ihe oyiyi niile ha ji nkume mee, bibiekwanụ ihe oyiyi niile ha ji ígwè wụọ, laakwanụ ebe nsọ ha niile dị elu n’iyi.” (Ọnụ Ọgụgụ 33:52) O nwere ike ịbụ na ebe ndị ahụ a na-anọ efe ofufe ụgha bụ mbara ala dị n’elu ugwu ma ọ bụ ebe e wuliri elu n’ebe ndị ọzọ, dị ka n’okpuru osisi ma ọ bụ n’ime obodo. (1 Ndị Eze 14:23; 2 Ndị Eze 17:29; Ezikiel 6:3) Ebe ndị ahụ nwere ike inwe ebe ịchụàjà, ogidi nsọ ma ọ bụ ogwe osisi dị nsọ, ihe oyiyi, ihe ndị e ji adọba ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ, na arịa ndị ọzọ e ji efe ofufe.
Tupu e wuo ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, ndị Izrel fere Jehova n’ebe ndị ọ nabatara bụ́ ndị Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ebe ndị dị elu. Onye amụma Chineke bụ́ Samuel chụrụ àjà “n’ebe dị elu” dị n’obodo a na-akpọghị aha dị n’ala Zọf. (1 Samuel 9:11-14) Ma, ozugbo e wuchara ụlọ nsọ ahụ, ọtụtụ ndị eze kwesịrị ntụkwasị obi nye Jehova gbara mbọ iwepụsị “ebe ndị dị elu” n’ala ahụ.—2 Ndị Eze 21:3; 23:5-8, 15-20; 2 Ihe E Mere 17:1, 6.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịhụ ebe a kọwara ihe ihe atụ a Pọl mere pụtara n’ụzọ ime mmụọ, gụọ Ụlọ Nche, November 15, 1990, peeji nke 27.
[Foto dị na peeji nke 23]
Otu akụkụ nke ihe a tụrụ atụ na-egosi ngagharị mmeri nke ndị Rom, narị afọ nke abụọ oge anyị
[Ebe E Si Nweta Foto]
A natara Ebe Ndebe Ihe Ochie Briten ikike see foto a
[Foto dị na peeji nke 23]
Ogidi nsọ dakasịrị adakasị, na Giza