Nwoke nke Gbanwere Ụwa
Nwoke nke Gbanwere Ụwa
Ọtụtụ ijeri mmadụ ebiela ndụ n’ụwa a ma nwụọ. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha emeghị ihe ọ bụla a ga-eji na-echeta ha. Ma, ole na ole n’ime ha mere ihe metụtara ndụ ndị mmadụ—ikekwe, ihe na-emetụta ndụ gị kwa ụbọchị.
KA E were ya na i biliri n’ụtụtụ, na-akwadebe ije ọrụ. Gị agbanye ọkụ ka ị na-ejikere. Gị ewere akwụkwọ ma ọ bụ magazin ị ga-agụ n’ime bọs. Gị echeta ọgwụ dọkịta deere gị ka ị na-aṅụ maka ọrịa gị. Ihe a ka bụ ụtụtụ, ma i ritela uru n’ihe mmadụ ole na ole a ma ama mepụtara.
Maịkel Faradee Ọ bụ onye Ingland a a mụrụ n’afọ 1791, bụ́ ọkà n’ihe ọmụmụ fiziks, mepụtara ígwè ndị na-enye ọkụ eletrik. Ihe ndị o mepụtara so mee ka ndị mmadụ na-enwetakwu ọkụ eletrik.
Saị Lun E kwuru na ọ bụ Saị Lun, bụ́ onye rụrụ ọrụ n’obí eze ndị Chaịna, chepụtara otú e si emepụta akwụkwọ n’ihe dị ka afọ 105 O.A. (Oge Anyị), bụ́ nke mere ka e mepụtawa akwụkwọ n’ebe o buru ibu.
Yohanis Gutinbag N’ihe dị ka afọ 1450, onye Jamanị a mepụtara ígwè obibi akwụkwọ mbụ a na-edogharị mkpụrụ akwụkwọ ya edogharị. Ígwè obibi akwụkwọ ahụ mere ka ibi akwụkwọ dị ọnụ ala, bụ́ nke mere ka e bipụtawa ọtụtụ akwụkwọ n’isiokwu dị iche iche.
Alegzanda Flemịn N’afọ 1928, onye Skọtland a na-eme nnyocha mepụtara ọgwụ nje a na-akpọ penisilin. A na-ejizi ọgwụ nje a na ndị ọzọ agwọ ọrịa n’ebe niile.
O doro anya na ihe mmadụ ole na ole chọpụtara ma ọ bụ mepụta abaarala ọtụtụ ijeri mmadụ uru ma ọ bụ mee ka ahụ́ gbasikwuo ha ike.
Ma, e nwere otu nwoke mere ihe karịrị ihe ha niile mere. Ihe e ji mara ya abụghị ihe ọ chọpụtara na nkà mmụta sayensị ma ọ bụ ọgwụ o mepụtara. Kama nke ahụ, nwoke a nke si n’ezinụlọ dara ogbenye, bụ́ onye nwụrụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga, kwusara ozi a ka na-ekwusa taa—ozi na-akpa ike nke na-enye olileanya ma na-akasi obi. Ọ bụrụ na a tụlee otú ozi ya sirila metụta ndụ ndị mmadụ gburugburu ụwa, ọtụtụ ndị ga-ekweta na nwoke a gbanwere ụwa n’ezie.
Nwoke ahụ bụ Jizọs Kraịst. Olee ozi o kwusara? Oleekwa otú ozi ahụ nwere ike isi metụta ndụ gị?