“Ruo Mgbe Ọnwụ Kewara Anyị”
“Ruo Mgbe Ọnwụ Kewara Anyị”
Ì CHETỤLA di na nwunye ole na-eji obi ụtọ ekwughachi okwu a n’ụbọchị agbamakwụkwọ ha, ikekwe, n’echeghị echiche ihe ọ pụtara? Nká, ọrịa, ma ọ bụ ihe mberede nwere ike ịnapụ mmadụ di ya ma ọ bụ nwunye ya ọ hụrụ n’anya n’ike, mee ka owu mawa ya, ya eruwekwa uju.—Ekliziastis 9:11; Ndị Rom 5:12.
Ngụkọ ndị e mere na-egosi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara ụmụ nwaanyị ndị dị iri afọ isii na ise gbagowe enwekwaghị di. N’ezie, ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ ụmụ nwaanyị di ha na-anwụ ji okpukpu atọ karịa nke ndị nwoke nwunye ha na-anwụ, a kpọọla ọnwụ di ma ọ bụ nwunye “nsogbu ndị inyom.” Nke a apụtaghị na ndị nwoke nwunye ha nwụrụ anaghị ata ahụhụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ nde mmadụ ataala nnọọ ahụhụ n’ihi ọnwụ di ha ma ọ bụ nwunye ha. Ị̀ bụ otu n’ime ha?
Ma ị̀ bụ nwoke ma ị̀ bụ nwaanyị, olee ihe i nwere ike ime ma ọ dabara gị? Baịbụl ò nwere ike inyere mmadụ aka mgbe ọ na-eru uju ọnwụ di ya ma ọ bụ nwunye ya? Olee otú ụfọdụ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ na ụmụ nwoke nwunye ha nwụrụ sirila die ya? Ọ bụ ezie na ọ dịghị otu ihe a ga-asị ga-enyeliri onye ọ bụla di ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ aka idi ya, e nwere ụkpụrụ na aro ndị nwere ike inye aka.
Idi Ọnwụ Ahụ
Ọ bụ ezie na ụfọdụ chere na ibe ákwá na-egosi na obi akaghị mmadụ ma ọ bụdị na ọ na-akpatara mmadụ nsogbu, otu ọkachamara n’ihe metụtara akparamàgwà ụmụ mmadụ, bụ́ Ọkà Mmụta Jọịs Brọdas, bụ́kwa onye di ya nwụrụ, kwuru na anya mmiri bụ ihe mbụ na-enyere onye mmadụ nwụnahụrụ aka. N’ezie, ibe ákwá so nnọọ n’iru uju, ọ na-enyekwa aka ebelata obi mgbawa ọnwụ na-akpata. Emela ihere ibe ákwá. E nwere ihe atụ nke onye na-emeghị ihere ibe ákwá na Baịbụl. Ebreham bụ nwoke nwere okwukwe siri ike, a kpọkwara ya enyi Chineke. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbe nwunye Jenesis 23:2.
ya ọ hụrụ n’anya nwụrụ, ọ ‘batara ịkwara Sera ákwá arịrị na ibere ya ákwá.’—Ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe ọjọọ dị n’ịchọ ịnọrọ naanị gị mgbe ụfọdụ, akpala iche. Ilu 18:1 dọrọ aka ná ntị, sị: “Onye na-akpa iche ga-achọ ihe na-agụ naanị onwe ya.” Kama ime otú ahụ, chọọ enyemaka nke ndị ikwu na ibe gị dị ọmịiko. Ihe ga-enyere gị ezigbo aka na nke a bụ ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ ebe ndị ikom tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ nwere ike inyere gị aka ma nye gị ndụmọdụ mgbe ọ dị mkpa.—Aịzaya 32:1, 2.
Ihe nyeerela ụfọdụ ndị aka bụ ịzaghachi akwụkwọ ozi na kaadị ndị mmadụ ji kasie ha obi. I nwere ike iji ohere a dee ezigbo ihe ndị i chetara banyere di gị ma ọ bụ nwunye gị nakwa oge ndị unu ji nọrịa. Ịchịkọta foto, akwụkwọ ozi, na ihe odide ndị ọzọ ọnụ ma na-ekiri ha nwekwara ike inyere gị aka idi ya.
Isi anaghị akpakọcha onye mmadụ nwụnahụrụ ọhụrụ ọnụ, ọ na-echefukarịkwa onwe ya, ma ịnọgide na-eme ihe ndị ị na-emebu mgbe niile ga-enyere gị aka. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na i nwere oge i ji ehi ụra, eteta, eri nri, ma ọ bụ arụ ọrụ ụfọdụ dị n’ụlọ, gbalịa ịnọgide na-eme ha n’oge ndị ahụ. Tupu oge eruo, mee atụmatụ ihe ndị ị ga-eme ná ngwụcha izu nakwa n’ụbọchị ndị pụrụ iche, dị ka ụbọchị ncheta agbamakwụkwọ unu, bụ́ mgbe ọnwụ ahụ ga-ewutebiga gị ókè. Ọ dị mkpa karịchaa ịnọgide na-eme ihe ndị metụtara ofufe Chineke ị na-emebu.—1 Ndị Kọrịnt 15:58.
Onye obi na-erughị nnọọ ala nwere ike ime mkpebi na-ezighị ezi. Ikekwe, ndị na-ebughị ezi ihe n’obi nwedịrị ike ịchọ iji ohere ahụ ghọgbuo gị. N’ihi ya, zere ime mkpebi ọkụ ọkụ banyere ihe ndị dị ka ire ụlọ gị, itinye nnukwu ego n’azụmahịa, ịkwaga ebe ọzọ, ma ọ bụ ịlụgharị di ma ọ bụ nwunye. Otu ilu onye amamihe kwuru, sị: “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru, ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.” (Ilu 21:5) I kwesịrị ịhapụtụgodị ime ihe ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ otú ahụ ị chọrọ ime ná ndụ gị ruo mgbe isi kpakọkwuru gị ọnụ.
Ịhazi ngwongwo di gị ma ọ bụ nwunye gị nwụrụ anwụ nwere ike isiri gị ezigbo ike, nke ka nke ma ọ bụrụ na unu ebiela ọtụtụ afọ, ma, o so n’iru uju. Iyigharị ya nwere ike ime ka mwute ọ ga-akpatara gị dịtee aka karịa otú o kwesịrị. (Abụ Ọma 6:6) Ọ na-akara ụfọdụ mma ime nke a naanị ha; ndị ọzọ achọpụtala na ezigbo enyi ha bụ́ onye ha ga-enwe ike ịkọrọ ihe ha na-echeta mgbe ha na-arụ ọrụ ahụ iso ha arụ ya na-enye aka. I nwekwara ike ịgwa enyi gị ma ọ bụ onye ikwu gị ka o nyere gị aka ịhụ maka ihe ọ bụla metụtara akwụkwọ, dị ka inweta satifiketi ọnwụ; ịgwa ụlọ ọrụ gọọmenti dị iche iche, ụlọ akụ̀, na ụlọ ọrụ ndị na-enye kaadị ịzụ ihe n’aka; ịgbanwe aha dị n’akwụkwọ ala ma ọ bụ ụlọ; inweta ego a na-akwụ onye mmadụ nwụnahụrụ; na ịkwụ ụgwọ ụlọ ọgwụ.
Cheta na anyị bi n’ụwa rụrụ arụ. Ugbu a ị nọ naanị gị, e nwere nnọọ ike ịnwa gị ọnwụnwa ime omume rụrụ arụ. Okwu ndị a Pọl onyeozi kwuru bara nnọọ uru taa otú ha bara kemgbe: “Ka onye ọ bụla n’ime unu mara otú ọ ga-esi jide arịa nke ya n’ịdị nsọ na nsọpụrụ, ọ bụghị iji anyaukwu na-enwe agụụ mmekọahụ, ụdị nke ahụ mba ndị na-amaghị Chineke na-enwe.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:4, 5) N’ihi ya, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya izere fim, akwụkwọ, na egwú ndị na-ekwu banyere mmekọrịta nwoke na nwaanyị ma ọ bụ mmekọahụ.
Nke kacha mkpa bụ ịghọta na ọ ga-ewe gị oge inwetaghachi onwe gị. Magazin bụ́ USA Today kọrọ na ihe ọmụmụ Ngalaba Na-eme Nnyocha Banyere Mmekọrịta Ndị Mmadụ na Ibe Ha na Ndị Galeshia 5:22, 23) Ka oge na-aga, ụbọchị nke ọ bụla ga-aka ụnyaahụ ya mma, ọ bụ ezie na e nwere ike ị gaghị eche otú ahụ ugbu a.
Mahadum Michigan mere gosiri na ọ ga-ewe onye di ya ma ọ bụ nwunye ya nwuru ọ dịkarịa ala ọnwa iri na asatọ tupu ahụ́ amalite ịgbasi ya ike, uche akpakọwakwa ya ọnụ. Na-ekpegara Chineke ekpere ka o nyere gị aka inwe ntachi obi, bụ́ àgwà mkpụrụ nke mmụọ nsọ ya na-eme nnọọ ka mmadụ nwetakwuo. (Otú Ụfọdụ Sirila Die Ya
Mgbe di Ana, bụ́ onye ya na ya biri n’obi ụtọ ruo iri afọ anọ, nwụrụ na nso nso a, obi gbawara Ana. O kwuru, sị: “Nne m nwụrụ mgbe m dị afọ iri na atọ, e mechaakwa nna m na ụmụnne m ndị nwoke abụọ anwụọ, nwanne m nwaanyị anwụọkwa. Ma, m nwere nnọọ ike ikwu na ọ dịghị onye n’ime ha ọnwụ ya wutere m ka ọnwụ di m. Ọ dị m nnọọ ka è ji ihe kwọbie m abụọ. O kweghị m odidi.” Olee ihe nyeerela ya aka idi ya? “Achịkọtala m ozi ekele na kaadị ndị mmadụ ziteere m bụ́ ndị ha ji kwuo na ha nwere obi ụtọ maka àgwà ọma ndị Daril nwere nakwa na ha hụrụ ya n’anya, ejirikwala m ha mee nnukwu ùkwù akwụkwọ. Nke ọ bụla n’ime ha nwere ihe o kwuru banyere Daril. Eji m n’aka na Jehova na-echetakwa ya nakwa na ọ ga-akpọlite ya n’ọnwụ.”
Esta, bụ́ onye dị afọ iri asatọ na asatọ kwuru ihe nyeerela ya aka, sị: “Kemgbe di m mụ na ya biri afọ iri anọ na isii nwụrụ, nsogbu kacha njọ m nwerela bụ owu ọmụma. Ma, m hụla na ịrụsi ọrụ ike n’ihe metụtara ofufe Chineke enyerela m nnọọ aka. Akwụsịbeghị m ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst, izisara ndị ọzọ ozi Baịbụl nakwa ịgụ ya agụ n’onwe m mgbe niile. Ịghara ịkpa iche enyekwarala m aka. M na-akpakwuru ndị enyi na-ege m ntị. Ọ bụghị mgbe niile ka ha na-enwe okwu nkasi obi ịgwa m, ma, na ha na-ewepụta oge ka mụ na ha nọọ ma na-ege m ntị na-eme m ezigbo obi ụtọ.”
Rọbọt, bụ́ onye kansa gburu nwunye ya mgbe ha lụchara afọ iri anọ na asatọ, kwuru, sị: “Ọ na-esi
nnọọ ike mmadụ idi ọnwụ di ya ma ọ bụ nwunye ya bụ́ onye ya na ya nwere ike ikwurịta okwu, ime mkpebi, ime njem, na ịkọrịta ihe ndị mere n’ụbọchị. Ọ dịrịghị m mfe, ma ekpebisiri m ike idi ya na ịghara ịda mbà. Ịrụsi ọrụ ike na itinye uche n’ihe enyerela m aka. Ikpe ekpere akasiekwala m nnọọ obi.”Mmadụ Ibi Ezigbo Ndụ Mgbe Di Ma Ọ Bụ Nwunye Ya Nwụchara
Ọ bụ ezie na ọnwụ nke di ma ọ bụ nwunye mmadụ bụ́ onye ọ hụrụ n’anya so n’ihe ndị kacha agbawa obi na-eme mmadụ, ọ bụghị ebe ahụ ka ụwa onye ahụ gwụrụ. Ọ bụrụ na i si n’ụzọ ọzọ lee ya anya, i nwere ike ịhụ na ọ na-enye gị ohere ime ihe ndị ị na-anabụghị enwecha ohere ime, dị ka igwu egwuregwu ụfọdụ ma ọ bụ ime njem. Ime ihe ndị a nwere ike ime ka owu kwụsị ịma gị. O nwere ike inye ụfọdụ ndị ohere ijechikwu ozi ọma anya. Isi otú a enyere ndị ọzọ aka ga-emerịrị mmadụ obi ụtọ ma nye ya ọṅụ, n’ihi na Jizọs kwuru, sị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
Echela na ị gaghị enwe obi ụtọ ọzọ. Obi sie gị ike na Jehova Chineke ga-elekọta gị ma ọ bụrụ na i kpegara ya ekpere. Ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru, sị: ‘Jehova na-enyere nwaanyị di ya nwụrụ aka.’ (Abụ Ọma 146:9) Ọ na-eme anyị obi ụtọ ịhụ na ọ bụghị naanị na Baịbụl kpọrọ Jehova “Nna nke obi ebere na Chineke nke nkasi obi niile” kama na o kwukwara banyere Jehova, sị: “Ị na-asaghe aka gị, were ihe na-agụ ihe ọ bụla dị ndụ nyejuo ya afọ.” (2 Ndị Kọrịnt 1:3; Abụ Ọma 145:16) N’ezie, Chineke anyị hụrụ anyị n’anya, bụ́ Jehova, nwere ike, nwee mmasị, dịrịkwa njikere ịgbatara ndị na-achọsi ya ike ọsọ enyemaka. Ka obi dị gị otú ahụ ọ dị ndị Izrel oge ochie, bụ́ ndị bụrụ abụ, sị: “M ga-eleli anya lee ugwu dị iche iche. Olee ebe enyemaka m ga-esi bịa? Enyemaka m ga-esi n’aka Jehova bịa, bụ́ Onye kere eluigwe na ụwa.”—Abụ Ọma 121:1, 2.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 19]
Di ma ọ bụ nwunye nke ọtụtụ nde mmadụ anwụọla, kpatakwara ha oké mwute na owu ọmụma. Ì so na ha?
[Igbe dị na peeji nke 21]
Olee Maka Ịlụgharị Di Ma Ọ Bụ Nwunye?
Baịbụl gosiri na ọnwụ na-atọsa alụmdi na nwunye, nke bụ́ na onye di ya ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ nweere onwe ya ịlụ onye ọzọ. (1 Ndị Kọrịnt 7:39) Ma, ọ bụ onye ahụ ka ọ dịịrị ikpebi ihe ọ ga-eme. Ma, ọ dị mkpa ka ụmụaka mara mkpebi nne ma ọ bụ nna ha mere ma kwado ya ma o kwe omume. (Ndị Filipaị 2:4) Dị ka ihe atụ, ná mmalite, Andres akwadotụghị nna ya ịlụ nwaanyị ọzọ. Ọ hụrụ nnọọ nne ya n’anya nke na o chere na ọ dịghị onye kwesịrị iweghara ọnọdụ ya. O kwuru, sị: “Ma n’oge na-adịghị anya, m ghọtara na ọ bụ ezigbo mkpebi ka nna m mere. Ịlụ nwaanyị mere ka obi malite ịtọ ya ụtọ ọzọ. Ọ malitere ime ihe ndị ọ na-emebeghị kemgbe, dị ka ime njem. Obi dịkwa m nnọọ ụtọ na nwunye ọhụrụ ya na-elekọta ya nke ọma, na-emekwa ya obi ụtọ.”
[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]
Iji ọrụ n’aka na ikpegara Chineke ekpere ka o nyere gị aka idi ya ga-enyere gị aka inwetaghachi onwe gị