Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Anyị Mụtara Banyere Ebere Chineke

Ihe Anyị Mụtara Banyere Ebere Chineke

Maka Ndị Na-eto Eto

Ihe Anyị Mụtara Banyere Ebere Chineke

JONA—AKỤKỤ NKE 2

Otú ị ga-esi mee ya: Nọrọ n’ebe ụzụ na-adịghị mee ihe omume a. Mgbe ị na-agụ amaokwu ndị a, were ya na ị nọ mgbe ihe ahụ ị na-agụ mere. Jiri uche gị kirie ebe ọ na-eme. Nụrụ ihe ndị nọ n’ebe ahụ na-ekwu. Gbalịa ka ị ghọta otú obi dị ndị ị na-agụ akụkọ ha. Ka ihe ị na-agụ yie gị ka ọ̀ na-eme eme ugbu a.

1 CHEBARA OTÚ IHE A SI MEE ECHICHE.—GỤỌ JONA 3:1–4:11.

Olee otú i chere obi dị Jona mgbe ọ banyere n’obodo Ninive?

․․․․․

Olee otú i chere olu Jona dara mgbe ọ na-akpọsa ikpe ọmụma Jehova?

․․․․․

Olee ihe ga na-agbakasị Jona ahụ́ ka ọ nọ ọdụ ná mpụga obodo ahụ? (Gụọ Jona 4:5-8.)

․․․․․

2 LEBAKWUO YA ANYA.

Olee ihe o nwere ike ịbụ ya mere Jona ji chọọ ka Jehova bibie Ninive otú ahụ o buru n’amụma?

․․․․․

Jiri akwụkwọ ndị e ji eme nnyocha i nwere chọpụta (1) otú osisi ogiri ụgba na-adị na ihe ndị e ji mara ya, na (2) ihe ákwà iru uju ahụ eze Ninive yi na ọdụ ọ nọdụrụ ná ntụ pụtara.

․․․․․

N’agbanyeghị na Jona achọbughị ịga buo amụma na Ninive, olee ihe mere e nwere ike iji kpọọ ya onye amụma kwesịrị ntụkwasị obi ma nwee obi ike? (Matiu 21:28-31.)

․․․․․

3 MEE IHE Ị MỤTARA. DEE IHE Ị MỤTARA BANYERE  . . .

Otú ụmụ mmadụ nwere ike isi hapụ omume ọjọọ ha.

․․․․․

Ebere Jehova.

․․․․․

Mkpa ọ dị anyị ime ebere.

․․․․․

4 OLEE IHE KACHA BAARA GỊ URU N’AKỤKỌ A? Ọ̀ BỤ MAKA GỊNỊ?

․․․․․

Ọ bụrụ na ị chọrọ imekwu nnyocha, gụọ Ụlọ Nche, April 1, 2009, peeji nke 14-18.

I NWERE IKE ỊMỤTAKWU BANYERE BAỊBỤL, NA www.watchtower.org NA www.isa4310.com