“Oge A Kara Aka” Dị Nso
“Oge A Kara Aka” Dị Nso
Dị Ka onye amụma bụ́ Habakọk, ọ gụsiri ndị na-eso ụzọ Jizọs agụụ ike ịhụ ka ahụhụ kwụsịrị. Ebe ha mụtarala ihe Alaeze Chineke ga-eme iji dozie ihe n’ụwa, ha jụrụ Jizọs, sị: “Olee mgbe ihe ndị a ga-eme, gịnị ga-abụkwa ihe ịrịba ama nke ọnụnọ gị [n’ike Alaeze] na nke ọgwụgwụ usoro ihe a?” (Matiu 24:3) Jizọs zara ha na ọ bụ naanị Jehova Chineke maara kpọmkwem mgbe Alaeze ahụ ga-amalite ịchị ụwa niile. (Matiu 24:36; Mak 13:32) Ma, Jizọs na ndị ọzọ buru amụma banyere ihe ụfọdụ ga-emenụ, bụ́ ndị ga-egosi na oge ahụ adịla nso.—Lee igbe dị n’aka nri.
Ị́ gaghị ekweta na ihe ndị a na-eme ebe niile taa? Jizọs bukwara amụma na a ga-arụ ọrụ izi ihe n’ụwa niile. O kwuru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”—Matiu 24:14.
Nke ahụ bụ kpọmkwem ihe na-eme taa. Ndịàmà Jehova na-arụ ọrụ ahụ. N’ihe dị ka narị ala abụọ na iri atọ na isii, ihe karịrị nde Ndịàmà asaa na-agwa ndị mmadụ ihe Alaeze ahụ ga-eme, ha na-enyekwara ha aka irubere iwu ezi omume Chineke isi, bụ́ onye ọ bụ uche ya ịkwụsị ahụhụ na ihe mgbu. Nọgide na-amụ banyere Alaeze Chineke, ị ga-enwekwa olileanya ibi n’ụwa nke ahụhụ na-agaghị adị na ya—ruo mgbe ebighị ebi.
[Igbe dị na peeji nke 8]
Amaokwu Ndị Na-ekwu Banyere Ụbọchị Ikpeazụ
• Ụdị agha a na-enwetụbeghị mbụ
• Oké ala ọma jijiji
• Ụkọ nri
• Ọrịa na-efe efe
• Ịba ụba nke mmebi iwu
• Ịhụnanya ịjụ oyi
• Ibibi ụwa
• Ịhụ ego n’anya gabiga ókè
• Inupụrụ nne na nna isi
• Ịhụ onwe onye n’anya gabiga ókè
• Enweghị obi mmadụ
• Ndị mmadụ achọghị inwe nkwekọrịta ọ bụla
• Ndị mmadụ enweghị njide onwe onye
• Ọtụtụ ndị ahụghị ezi ihe n’anya
• Ịhụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya
• Inwe ọtụtụ Ndị Kraịst ihu abụọ
• Inwe ọtụtụ ndị amụma ụgha
• Mkpagbu nke ezi Ndị Kraịst
• Ndị mmadụ aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị sitere na Baịbụl
[Foto dị na peeji nke 8]
N’ụwa niile, Ndịàmà Jehova na-akụziri ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke