Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Baịbụl Dị Ndụ Ọbụna n’Asụsụ Nwụrụ Anwụ

Baịbụl Dị Ndụ Ọbụna n’Asụsụ Nwụrụ Anwụ

Baịbụl Dị Ndụ Ọbụna n’Asụsụ Nwụrụ Anwụ

’IME narị afọ ole na ole gara aga, ọ dịkarịa ala, ọkara asụsụ niile a na-asụ n’ụwa ghọrọ asụsụ nwụrụ anwụ. E nwere ike ikwu na asụsụ anwụọla mgbe ọ na-enwekwaghị ndị na-asụ ya dị ka asụsụ ala nna ha. N’ihi ya, a na-asịkarị na Latịn bụ “asụsụ nwụrụ anwụ,” n’agbanyeghị na a ka na-amụ ya n’ọtụtụ ebe, ya abụrụkwa asụsụ obodo Vatican City.

Latịn sokwa n’asụsụ ndị mbụ e ji sụgharịa Baịbụl. È nwere ike ịsị na Baịbụl ndị a sụgharịrị n’asụsụ ahụ nwụrụla anwụ “dị ndụ” taa, ya bụ, hà na-emetụta ndụ ndị na-agụ Baịbụl n’oge a? Akụkọ na-atọ ụtọ banyere otú e si sụgharịa Baịbụl ndị ahụ ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a.

Nsụgharị Latịn Ndị Kacha Ochie

Latịn bụ asụsụ mbụ ndị Rom sụrụ. Ma, mgbe Pọl onyeozi degaara Ndị Kraịst nọ n’obodo ahụ akwụkwọ ozi, o dere ya n’asụsụ Grik. * Nke ahụ abụghị nsogbu ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị bi n’obodo ahụ na-asụ asụsụ abụọ ahụ. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị bi na Rom si ná mpaghara Eshia ebe a na-asụ Grik, e kwuru na obodo ahụ ghọwaziri obodo ndị Grik. Ebe nke ọ bụla n’Alaeze Ukwu Rom nwere asụsụ nke ya, ma ka alaeze ahụ na-eto, ọtụtụ ndị sụwara Latịn. N’ihi ya, e si n’asụsụ Grik sụgharịa Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ Latịn. Ọ ga-abụ na a malitere ịsụgharị ya na narị afọ nke abụọ Oge Anyị n’Ebe Ugwu Africa.

A kpọrọ akwụkwọ Baịbụl dị iche iche a sụgharịrị n’oge ahụ Vetus Latina, nke pụtara nsụgharị Latịn Ochie. O nweghị ihe odide ochie nwere nsụgharị Akwụkwọ Nsọ Latịn zuru ezu ka dị taa. Ihe odide Vetus Latina ndị nke ka dị ugbu a na ndị nke ndị edemede oge ochie dere ihe si na ha na-egosi na ọ bụghị otu akwụkwọ dịkọtara ọnụ. Kama nke ahụ, o yiri ka ọ̀ bụ ndị nsụgharị dị iche iche, ndị na-anọghị n’otu ebe, sụgharịrị ya n’oge dị iche iche. N’ihi ya, kama ịsị na ọ bụ otu akwụkwọ, ọ ka zie ezie ịkpọ ya nsụgharị Grik dị iche iche a chịkọtara ọnụ.

Otú ndị mmadụ si jiri aka ha malite ịsụgharị akwụkwọ dị iche iche dị na Baịbụl n’asụsụ Latịn kpatatụrụ ọgba aghara. N’ọgwụgwụ narị afọ nke anọ Oge Anyị, Augustine kwuru na “onye ọ bụla nwetara ihe odide Grik, nke chekwara na ya matụụrụ asụsụ abụọ ahụ, ọ bụrụgodị na ọ machaghị ha, na-amalite ịsụgharị Akwụkwọ Nsọ” n’asụsụ Latịn. Augustine na ndị ọzọ chere na nsụgharị e nwere n’oge ahụ karịrị akarị, ha ekwetachakwaghị na ha niile ziri ezi.

Nsụgharị Jerome

Otu nwoke nwara ịkwụsị ọgba aghara a bụ Jerome, onye bụtụrụ odeakwụkwọ Damasus, bụ́ bishọp Rom, n’afọ 382 Oge Anyị. Bishọp ahụ gwara Jerome ka o degharịa Oziọma Matiu, Mak, Luk, na Jọn bụ́ ndị dị n’asụsụ Latịn, Jerome degharịchakwara ha n’ime afọ ole na ole. Ọ maliteziri idegharị akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ a sụgharịrị na Latịn.

Jerome si n’ihe odide dị iche iche sụgharịa Baịbụl ya nke e mechara kpọwa Vulgate. Jerome si na Septuagint, bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru a sụgharịrị n’asụsụ Grik na narị afọ nke abụọ Tupu Oge Anyị, sụgharịa Abụ Ọma. O degharịrị Oziọma anọ ahụ, o sikwa na Hibru mbụ sụgharịa ọtụtụ akwụkwọ dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru. Ọ dị ka ọ̀ bụ ndị ọzọ degharịrị akwụkwọ ndị fọziri n’Akwụkwọ Nsọ. E mechakwara gbakwụnyeghachi akwụkwọ ụfọdụ dị na Baịbụl Vetus Latina na Vulgate Jerome.

Ná mmalite, ọtụtụ ndị enweghị mmasị na Baịbụl Jerome. Ọbụna Augustine katọrọ ya. N’agbanyeghị nke ahụ, o ji nwayọọ nwayọọ ghọọ Baịbụl dịkọtara ọnụ nke kacha mma e nwere. Na narị afọ nke asatọ na nke itoolu, ndị ọkà mmụta Baịbụl dị ka Alcuin na Theodulf malitere idegharị ihe ndị e dejọrọ ná nsụgharị Jerome n’ihi ọtụtụ ugboro e depụtaghachirila ya. Ndị ọzọ kewagasịrị Baịbụl ya ahụ ka o nwee isiakwụkwọ dị iche iche, bụ́ nke mere ka ịchọta ihe n’Akwụkwọ Nsọ dịkwuo mfe. Mgbe a malitere ibi akwụkwọ, ọ bụ Baịbụl Jerome bụ Baịbụl mbụ e biri.

Ọ bụ ná Nzukọ Ndị Isi Chọọchị e mere na Trent n’afọ 1546 ka Chọọchị Katọlik nọ malite ịkpọ Baịbụl Jerome Vulgate. Ndị isi ahụ kwuru na ọ bụ Baịbụl ahụ bụ “nke ezigbo ya,” nke mere ka ọ bụrụ ya bụ Baịbụl ndị Katọlik ga na-agụ. Ndị isi chọọchị ahụ kwukwara ka e degharịa ya. E nwere kọmitii pụrụ iche ndị a họpụtara ga-ahụ maka ọrụ ahụ, ma ebe ọ bụ na ọ dị Poopu Sixtus nke Ise ọkụ n’ahụ́ ịhụ na a sụgharịchara ya nakwa ma eleghị anya n’ihi na o chere na ya maara ọrụ nsụgharị karịa otú ọ maara ya, o kpebiri iji aka ya rụọ ọrụ ahụ. A ka malitere ibipụta Baịbụl a e degharịrị edegharị mgbe poopu ahụ nwụrụ n’afọ 1590. Ndị kadinal chọọchị Katọlik jụrụ nsụgharị ahụ ozugbo n’ihi na ha sịrị na e dehiere ọtụtụ ihe na ya, ha nyekwara iwu ka a kwụsị ikesa ya.

E mechara kpọwa nsụgharị Baịbụl ọhụrụ nke Poopu Clement nke Asatọ nyere iwu ka e degharịa n’afọ 1592 nsụgharị Sixtine Clementine. Ọ bụ ya ka Chọọchị Katọlik gụrụ ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụkwa na Vulgate Sixtine Clementine ka ndị Katọlik si sụgharịa Baịbụl ndị ọzọ n’asụsụ dị iche iche, dị ka nke Antonio Martini sụgharịrị n’asụsụ Italian, bụ́ nke ọ sụgharịchara n’afọ 1781.

Baịbụl Latịn E Nwere Ugbu A

Nnyocha e nyochara Vulgate na narị afọ nke iri abụọ mere ka o doo anya na ọ dị mkpa ka e degharịa ya, dị ka e degharịrị nsụgharị ndị ọzọ. N’ihi ya, n’afọ 1965, Chọọchị Kalọlik hiwere Òtù Ọrụ Ga-ahụ Maka Vulgate Ọhụrụ ma nye òtù ahụ ọrụ idegharị Baịbụl Latịn ahụ dabere n’ihe ọhụrụ ndị a mụtarala. Ọ bụ Baịbụl ọhụrụ a ka a ga-eji na-edo mas ndị Katọlik n’asụsụ Latịn.

E bipụtara nkebi mbụ nke nsụgharị ọhụrụ ahụ n’afọ 1969, Poopu John Paul nke Abụọ nabatakwara Nova Vulgata n’afọ 1979. Ná mbipụta mbụ ya, aha Chineke, bụ́ Iahveh, dị n’amaokwu ndị dị ka Ọpụpụ 3:15 na 6:3. Ma, dị ka otu onye so na kọmitii ahụ si kwuo, mbipụta ya nke abụọ e wepụtara n’afọ 1986 “chegharịrị . . . jirighachi Dominus [‘Onyenwe anyị’] dochie Iahveh.”

Dị nnọọ ka a katọrọ Vulgate ọtụtụ narị afọ gara aga, ndị mmadụ, ọbụna ndị ọkà mmụta Baịbụl bụ́ ndị Katọlik, katọrọ Nova Vulgata. Ọ bụ ezie na mgbe a malitere ịsụgharị ya e kwuru na ọ ga-ejikọta okpukpe niile sịrị na ha bụ Ndị Kraịst, ọtụtụ ndị chere na ọ gaghị ekwe okpukpe ndị ọzọ kwuo echiche ha, nke ka nke, ebe ọ bụ na e bu n’obi na a ga-esi na ya na-asụgharị Akwụkwọ Nsọ n’asụsụ ndị a na-asụ ugbu a. Na Germany, Baịbụl Nova Vulgata seere ndị Protestant na ndị Katọlik okwu mgbe ha na-achọ idegharị Baịbụl ga-adị ma ndị Protestant ma ndị Katọlik mma. Ndị Protestant boro ndị Katọlik ebubo na ha na-achọ ka a sụgharịa Baịbụl ọhụrụ ahụ ka ọ dị ka Nova Vulgata.

Ọ bụ ezie na a naghịzi asụkarị Latịn, e nweela ụzọ dị iche iche Baịbụl Latịn si metụta ndụ ọtụtụ ndị na-agụ Baịbụl. Ọ bụ ya mere okpukpe ụfọdụ ji akpọ okwu ụfọdụ ihe ha na-akpọ ya n’ọtụtụ asụsụ. Ma, n’agbanyeghị n’asụsụ a sụgharịrị Okwu Chineke, ọ ka na-akpa ike, na-agbanwe ndụ ọtụtụ nde mmadụ, bụ́ ndị ji nrubeisi na-agba mbọ ime ihe ndị magburu onwe ha ọ na-akụzi.—Ndị Hibru 4:12.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịghọtakwu ihe mere e ji dee Akwụkwọ Nsọ Ndị Kraịst n’asụsụ Grik, gụọ isiokwu bụ́ “Ị̀ Maara?” nke dị na peeji nke 13.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo nke dị na peeji nke 23]

Poopu John Paul nke Abụọ nabatara Nova Vulgata. Aha Chineke, bụ́ Iahveh, dị ná nsụgharị mbụ ya

[Igbe dị na peeji nke 21]

NSỤGHARỊ GBANWERE OKWU DỊ ICHE ICHE

Baịbụl Vetus Latina, nke e si n’asụsụ Grik sụgharịa, nwere ọtụtụ okwu ndị gbanwere otú ndị mmadụ si ele ihe anya. Otu n’ime ha bụ otú e si sụgharịa okwu Grik bụ́ di·a·theʹke, “ọgbụgba ndụ,” ka ọ bụrụ “agba.” (2 Ndị Kọrịnt 3:14) N’ihi otú a e si sụgharị okwu a, ọtụtụ ndị ka na-akpọ Akwụkwọ Nsọ Hibru Agba Ochie ma na-akpọ Akwụkwọ Nsọ Grik Agba Ọhụrụ.

[Igbe dị na peeji nke 23]

IWU NA-ESE OKWU

Na 2001, mgbe Òtù Vatican Na-ahụ Maka Okpukpere Chi na Sakrament rụchara ọrụ afọ anọ, ha bipụtara akwụkwọ ntụziaka bụ́ Liturgiam authenticam (Iwu Ziri Ezi Na-achị Okpukpere Chi). Ọtụtụ ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Katọlik akatọọla ya nke ukwuu.

Akwụkwọ ntụziaka a kwuru na ebe ọ bụ na Nova Vulgata bụ nsụgharị ndị chọọchị ahụ na-agụ, e kwesịrị isi na ya na-asụgharị Baịbụl ndị ọzọ, ọ bụrụgodị na ọ gbanwere ihe ihe odide ochie kwuru. Ọ bụ naanị Baịbụl e si otú ahụ sụgharịa ka ndị isi chọọchị Katọlik ga-anabata. Iwu ahụ kwuru na mgbe ndị Katọlik na-asụgharị Baịbụl n’asụsụ ọ bụla, e kwesịrị iji okwu pụtara Dominus, ma ọ bụ “Onyenwe anyị,” dochie anya “aha Chineke pụrụ ime ihe niile nke bụ́ mkpụrụ okwu Hibru anọ a na-akpọ tetragramatọn (YHWH),” dị nnọọ ka e mere ná nsụgharị nke abụọ nke Nova Vulgata, n’agbanyeghị na nsụgharị nke mbụ ya kpọrọ ya “Iahveh.” *

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

^ par. 29 Gụọ isiokwu bụ́ “Vatican Chọrọ Ime Ka A Kwụsị Ịkpọ Aha Chineke,” nke dị na peeji nke 30.

[Foto dị na peeji nke 22]

Baịbụl Latịn nke Alcuin sụgharịrị, afọ 800 oge anyị

[Ebe E Si Nweta Foto]

E si na Paléographìe latine, nke F. Steffens (www.archivi.beniculturali.it) nweta ya

[Foto ndị dị na peeji nke 22]

Vulgate Sixtine-Clementine, afọ 1592

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ọpụpụ 3:15, Nova Vulgata, afọ 1979

[Ebe E Si Nweta Foto]

© 2008 Libreria Editrice Vaticana