Osisi ‘Akwụkwọ Ya Na-adịghị Akpọnwụ Akpọnwụ’
Osisi ‘Akwụkwọ Ya Na-adịghị Akpọnwụ Akpọnwụ’
Ị̀ GATỤLA n’ime obodo hụ ọtụtụ osisi ndị akwụkwọ ha na-ama pokopoko? Ị ga-ekweta na ọ na-ama ezigbo mma. Ọ bụrụ na ị hụ ọtụtụ nnukwu osisi akwụkwọ ha na-ama pokopoko, ị̀ ga-asị na e nwere ụkọ mmiri n’ebe ahụ? Kama ikwu otú ahụ, ị ga-ama na e nwere nnukwu mmiri ji osisi ndị ahụ ndụ, nke na-emekwa ka ha na-ama mma n’anya.
Ka a sịkwa ihe mere Baịbụl ji kwuo na ndị ha na Chineke dị ná mma yiri nnukwu osisi ndị akwụkwọ ha na-ama pokopoko. Dị ka ihe atụ, legodị ọmarịcha ihe a e kwuru n’amaokwu atọ mbụ nke Abụ Ọma, isi nke mbụ:
“Obi ụtọ na-adịrị onye na-adịghị eje ije na ndụmọdụ ndị ajọ omume, onye na-adịghịkwa eso ụzọ ndị mmehie, onye na-adịghịkwa anọ n’etiti ndị na-akwa emo. Kama iwu Jehova na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa iwu ya n’olu dị ala ehihie na abalị. Ọ ga-adịkwa ka osisi a kụrụ n’akụkụ iyi, nke na-amị mkpụrụ ya n’oge ya, akwụkwọ ya adịghịkwa akpọnwụ akpọnwụ, ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”
Jeremaya 17:7, 8 kwukwara ihe yiri ya, sị: “Ngọzi na-adịrị dimkpa nke tụkwasịrị Jehova obi, onye Jehova bụ obi ike ya. Ọ ga-adị ka osisi a kụrụ n’akụkụ mmiri, nke gbanyere mgbọrọgwụ n’akụkụ ọwa mmiri; ọ gaghịkwa ahụ mgbe okpomọkụ bịara, kama akwụkwọ ya ga na-ama pokopoko. Ọ gaghị echegbu onwe ya n’afọ e nwere ụkọ mmiri ozuzo, ọ gaghịkwa akwụsị ịmị mkpụrụ.”
N’ebe abụọ ahụ, e ji osisi maa atụ otú ndụ onye iwu Chineke na-atọ ụtọ na-adị, bụ́ onye tụkwasịrị ya obi ya niile ma na-eme ihe dị mma. Ọ bụ ya mere anyị ga-eji jụọ, sị, Olee otú onye ahụ si dị ka osisi akwụkwọ ya na-ama pokopoko? Ka anyị lebatụkwuo anya n’amaokwu ndị ahụ.
“Osisi A Kụrụ n’Akụkụ Iyi”
E kwuru na a kụrụ osisi ndị ahụ “n’akụkụ iyi” ma ọ bụ “n’akụkụ mmiri.” A mara ụdị atụ ahụ n’Aịzaya 44:3, 4, bụ́ ebe Jehova Chineke kwuru otú ọ ga-esi lekọta ndị Juu chegharịrị echegharị bụ́ ndị si n’ebe a dọọrọ ha n’agha na Babịlọn lọta. Jehova si n’ọnụ Aịzaya onye amụma kwuo, sị: “M ga-enye onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ka ọ ṅụọ, meekwa ka iyi nke na-asọ nwayọọ nwayọọ dịrị n’ebe kpọrọ nkụ. . . . Ha ga-epulite dị ka ahịhịa ndụ, dị ka osisi pọpla ndị dị n’akụkụ ọwa mmiri.” E kwuru n’ebe a na “iyi” na “ọwa mmiri” na-eme ka ndị Chineke gọziri too ka osisi pọpla ndị akwụkwọ ha na-ama pokopoko.
N’ebe ụfọdụ taa, i nwere ike ịhụ mmiri si n’iyi ma ọ bụ n’ọwa mmiri na-asọba n’ubi. Mmiri ndị ahụ na-esi ná nnukwu mmiri ndị ọzọ, dị ka olulu mmiri miri emi, osimiri, ọdọ mmiri, ma ọ bụ mmiri e gbochiri egbochi. Ọtụtụ mgbe, ihe mere e ji enwe ha bụ iji na-agba ubi mmiri. Mgbe ụfọdụ, a na-eme ka
ọwa mmiri gaa n’ubi mkpụrụ osisi. N’ebe ụfọdụ, iyi ndị ahụ na-agba ubi ndị dị ha n’otu akụkụ mmiri, na-agbakwa osisi ndị nwere akwụkwọ ndụ dị n’akụkụ ha nke ọzọ mmiri, ikekwe ghọọrọ ha ókè.Olee otú ahụ́ na-adị osisi ndị a kụrụ n’akụkụ iyi ndị dị otú ahụ? Abụ Ọma 1:3 kwuru banyere osisi “nke na-amị mkpụrụ ya n’oge ya.” N’ala ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, e nwere osisi fig, pọmigranet, na apụl, nweekwa osisi det na osisi oliv. Ọ bụ ezie na osisi fig nwere ike iru mita itoolu n’ogologo ma nwee nnukwu alaka, ihe ka ọtụtụ n’osisi ndị ọzọ na-amị mkpụrụ anaghị adịcha ogologo. N’agbanyeghị ya, ahụ́ nwere ike ịdị ha mma, akwụkwọ ha ana-ama pokopoko, ha ana-amịpụtakwa ọtụtụ mkpụrụ n’oge kwesịrị ekwesị.
N’oge ochie, nnukwu osisi pọpla na-eto n’akụkụ osimiri na iyi ndị dị na Siria na Palestaịn. Baịbụl na-ekwukarị na osisi pọpla dị n’ebe ọwa mmiri ma ọ bụ “ndagwurugwu” dị. (Levitikọs 23:40) Osisi wilo, bụ́ nke na-eyi osisi pọpla, na-etokwa n’ebe e nwere mmiri buru ibu. (Ezikiel 17:5) Nnukwu osisi ndị ahụ akwụkwọ ha na-ama pokopoko dabara nnọọ adaba n’ihe ọbụ abụ ahụ na Jeremaya na-achọ ịkụziri anyị, nke bụ́: Ndị na-agbalị iso iwu Chineke ma tụkwasị ya obi ha dum ga na-eme nke ọma ná mmekọrịta ha na Chineke, ‘ihe niile ha na-eme ga na-agakwa nke ọma.’ Ọ́ bụghị ihe anyị chọrọ, ya bụ, ka ihe gaara anyị nke ọma ná ndụ?
Ime Ka Iwu Jehova Na-atọ Anyị Ụtọ
E nwere ọtụtụ ụzọ ndị mmadụ si achọ ime ka ihe gaara ha nke ọma taa. Ha na-eji oge ha niile achụ ihe ndị nwere ike ime ka ha baa ọgaranya, ghọọkwa ndị a ma ama, ma ọtụtụ mgbe, ihe ndị a anaghị eru ha aka. Ma, olee ihe ga-eme ka ndụ mmadụ ju ya afọ, ya enweekwa obi ụtọ na-adịgide adịgide? Ihe Jizọs kwuru mgbe ọ na-ezi Ozizi Elu Ugwu ya zara ajụjụ ahụ. O kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.” (Matiu 5:3) N’ezie, ihe na-eme ka anyị nwee ezi obi ụtọ abụghị inweju akụ̀, kama, ọ bụ ịmata mkpa ime mmụọ anyị na igbo ya iji mee ka anyị na Chineke dịrị ná mma, anyị adịkwa ka osisi ndị akwụkwọ ha na-ama pokopoko, bụ́ ndị na-amị mkpụrụ n’oge ha. Olee otú anyị ga-esi mee ka anyị na Chineke dịrị nnọọ ná mma?
Ọbụ abụ ahụ kwuru na ọ dị ihe ụfọdụ anyị ga-ebugodị ụzọ jụ. O kwuru na anyị ga-ajụ “ndụmọdụ ndị ajọ omume,” “ụzọ ndị mmehie,” na ‘ịnọ n’etiti ndị na-akwa emo.’ Ọ bụrụ na anyị chọrọ inwe obi ụtọ, anyị kwesịrị izere ndị na-akwa iwu Chineke emo ma na-eleghara ya anya.
Anyị kwesịziri ime ka iwu Jehova na-atọ anyị ụtọ. Ọ bụrụ na ihe na-atọ anyị ụtọ, ọ ga na-agụ anyị agụụ ime ya, ọ́ bụghị ya? N’ihi ya, iwu Chineke ịtọ anyị ụtọ pụtara na anyị ga-eji nnọọ Okwu Chineke kpọrọ ihe, ya ana-agụ anyị agụụ ịmụkwu ya na ịghọtakwu ya.
Ihe ọzọ bụ na ọ dị mkpa ka anyị na-agụ ya “n’olu dị ala ehihie na abalị.” Nke ahụ pụtara ịgụchi Baịbụl anya na ịtụgharị uche n’ihe ndị anyị gụrụ. Anyị kwesịrị iwere Okwu Chineke otú ahụ ọbụ abụ ahụ weere ya, bụ́ onye kwuru, sị: “Lee ka m si hụ iwu gị n’anya! Ọ bụ ihe m na-atụgharị n’uche ogologo ụbọchị dum.”—Abụ Ọma 119:97.
Ee, ọ bụrụ na anyị amata Jehova Chineke nke ọma ma tụkwasị ya obi anyị dum, kwerekwa na ọ ga-emezu nkwa ya niile, anyị na ya ga-adị nnọọ ná mma. Anyị ga-adịzi ka nwoke ahụ nwere obi ụtọ ọbụ abụ ahụ kwuru na “ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”