Gịnị Mere Ịdị Ọcha Ji Dị Mkpa?
Gịnị Mere Ịdị Ọcha Ji Dị Mkpa?
Kemgbe ọtụtụ puku afọ, ọrịa ọjọọ, na ndị nke na-efe efe, arịala ụmụ mmadụ. Ụfọdụ ndị chere na ọ bụ Chineke wetara ọrịa ndị ahụ iji gosi na iwe na-ewe ya na iji taa ndị ajọ omume ahụhụ. Nnyocha na nchọpụta e ji nleru anya na ndidi mee n’ime ọtụtụ narị afọ gosiri na ihe na-akpatakarị ọrịa ndị ahụ bụ ụmụ ahụhụ na ụmụ anụmanụ ndị bi anyị nso.
Nchọpụta ndị dọkịta mere gosiri na òké, ọchịcha, ijiji, na anwụnta nwechara ike ibufe mmadụ ọrịa. Ha chọpụtakwara na ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-ebute ọrịa n’ihi adịghị ọcha. Ịdị ọcha nwere ike ichebe mmadụ ndụ, ebe adịghị ọcha nwere ike ịkpatara mmadụ ọnwụ.
N’ezie, otú ndị mmadụ si adị ọcha na-adaberekarị n’omenala ha na ọnọdụ ha. N’ebe a na-enweghị mmiri pọmpụ ma ọ bụ ụlọ mposi dị mma, ịdị ọcha anaghị adị mfe. Ma, Chineke nyere ụmụ Izrel oge ochie ntụziaka banyere otú ha ga-esi na-adị ọcha n’oge ha nọ n’ala ịkpa. Ọnọdụ ahụ ha nọ bụ ọnọdụ siri ezigbo ike mmadụ idebe onwe ya ọcha.
Gịnị mere ịdị ọcha ji dị Chineke mkpa? Olee ụzọ kwesịrị ekwesị anyị ga-esi na-ele ịdị ọcha anya? Olee ihe dị iche iche dị mfe gị na ezinụlọ gị nwere ike ime iji mee ka ọrịa belata?
ỤLỌ akwụkwọ agbasaala. Otu nwata bi na Cameroon, nke aha ya bụ Max, * si ụlọ akwụkwọ lọta. Agụụ ji ya, akpịrị kpọkwara ya nkụ. Ọ banyere n’ụlọ ha nke na-amaghị oké mma, nkịta ha abịa makwasị ya n’ahụ́, o wee kelee ya. Max tụsara akpa akwụkwọ ya na tebụl ebe ha na-eri ihe, nọdụ ala na-eche ka e butere ya nri.
Mama Max, bụ́ onye nọ n’usekwu, nụrụ mkpọtụ gosiri na Max alọtala, ya ebutere ya efere osikapa na àgwà dị ọkụ o siri. Ma, ihu ọchị o ji na-ebutere ya nri gbanwere mgbe ọ hụrụ na Max tụsara akpa akwụkwọ ya n’elu tebụl ahụ dị ọcha. O lere nwa ya anya wee kpọọ ya òkù, sị, “Maaaax!” Max ghọtara ihe mere o ji kpọọ ya òkù otú ahụ wee bupụ akpa ahụ ozugbo ma gaa kwụọ aka ya ngwa ngwa. Ọ lọghachiri n’egbughị oge ịbịa rie nri ahụ na-agụ ya kemgbe. O kwuru
ná mwute, sị, “Mama, ewela iwe. M chefuru ya echefu.”Nwaanyị hụrụ ndị ezinụlọ ya n’anya na-arụ ọrụ dị ukwuu iji hụ na ahụ́ siri ha ike nakwa na ha dị ọcha. Ma, ọ dị mkpa ka ndị ezinụlọ ya dum nyere ya aka. Dị ka ihe a kọrọ banyere Max gosiri, ike ekwesịghị ịgwụ ndị mụrụ ụmụ n’ịkụziri ụmụ ha ihe ha kwesịrị ime n’ihi na ịdị ọcha chọrọ ime mgbalị n’esepụghị aka, ọ dịkwa mkpa ka a na-echetara ya ụmụaka mgbe niile.
Mama Max ghọtara na e nwere ọtụtụ ụzọ nje nwere ike isi banye ná nri. N’ihi ya, ọ bụghị naanị na ọ na-akwọ aka ya nke ọma tupu ya emetụ ihe oriri aka, kamakwa, ọ na-ekpuchi ihe oriri ekpuchi ka ijiji ghara ibufe ya nje. Òké na ọchịcha anaghị enyekarị ya nsogbu n’ihi na ọ na-echekwa ihe oriri ya nke ọma, na-edebekwa ụlọ ya ọcha.
Otu ihe mere mama Max ji akpachara anya otú a bụ na ọ chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. O kwuru, sị: “Baịbụl kwuru na ndị na-efe Chineke ga-adị nsọ, n’ihi na Chineke dị nsọ.” (1 Pita 1:16) O kwukwara, sị: “Ịdị nsọ na ịdị ọcha bụ otu. N’ihi ya, m chọrọ ka ụlọ m dị ọcha, chọọkwa ka ndị ezinụlọ m na-adị ọcha. N’ezie, naanị ihe mere nke a ji kwe omume bụ na onye ọ bụla n’ezinụlọ anyị na-enye aka.”
Ọ Dị Mkpa Ka Onye Ọ Bụla Nọ n’Ezinụlọ Nye Aka
Dị ka mama Max kwuru, idebe ezinụlọ ọcha bụ ọrụ onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ga-eso na-arụ. Mgbe mgbe, ezinụlọ ụfọdụ na-anọkọ ọnụ kwuo ihe ndị dị ha mkpa na otú ha ga-esi emezikwu ụlọ ha, ma n’ime ma n’èzí. Nke a na-eme ka ezinụlọ dị n’otu, na-emekwa ka onye ọ bụla cheta ihe o kwesịrị ịna-eme maka ọdịmma mmadụ niile n’ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, nne nwere ike ịgwa ụmụ ya ndị toro eto ihe mere ha ji kwesị ịna-akwọ aka ha mgbe ha gachara mposi na mgbe ha metụrụ ego aka, nakwa tupu ha erie ihe. Ụmụ ya ndị toro eto ga-ahụzi na ndị nke obere na-eme ihe ahụ mama ha kwuru.
E nwere ike ikere mmadụ niile nọ n’ezinụlọ ọrụ ndị dị n’ụlọ. Ezinụlọ nwere ike ikpebi na ha ga na-ehicha ụlọ ha kwa izu nakwa na ha ga na-azacha ma na-ekpocha ụlọ ha dum otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ n’afọ. Olee maka idebe mbara èzí ọcha? Otu ọkà mmụta na-agba mbọ ka a ghara imetọ ụwa, bụ́ Stewart L. Udall, kwuru banyere United States, sị: “Anyị bi ná mba
nke mma ya na-ala ala, mba nke na-ajọwanye njọ, nke mbara èzí ya na-epekwu mpe, nke mmetọ, mkpọtụ, na unyi na-akpa ebe niile aka ọjọọ.”Ì chere na ọ̀ bụ otú ahụ ka gburugburu ebe i bi dị? N’oge ochie nakwa dị ka a ka na-eme n’obodo ụfọdụ dị n’Etiti Africa, ọkụ ékwé na-akụ ékwé iji gwa ndị mmadụ ka ha gee ntị. Ọ na-eji olu dara ụda agwa ụmụ amaala ka ha debe obodo ọcha, kupụsịa mmiri nsị (gwọọ ọwa mmiri), gbutulata osisi, bọọ ahịhịa, ma kpofuo ihe ruru unyi.
Ikpofu unyi bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ, ọ ghọọrọla ọtụtụ ndị ọchịchị nsogbu ha na-agaghị akwụsịli. N’ebe ụfọdụ, ndị ọchịchị anaghị enwe ike ikpofu unyi ndị mmadụ kpopụtara, unyi ndị ahụ adọrọ n’okporo ụzọ. E nwere ike ịgwa ụmụ amaala ka bịa nye aka kpofuo ha. Ebe ọ bụ na Ndị Kraịst bụ ezigbo ụmụ amaala, ha so ná ndị mbụ na-apụta wee rubere iwu Siza isi n’emeghị mkpesa. (Ndị Rom 13:3, 5-7) Ezigbo Ndị Kraịst na-adị njikere ịrụ ụdị ọrụ a ọbụna karịa otú a tụrụ anya n’aka ha. Ọ na-amasị ha ka ebe niile dị ọcha, ọ bụ ya mere ha na-eji ewepụta onwe ha rụọ ọrụ iji debe gburugburu ebe obibi ha ọcha, n’echereghị mgbe niile ka ọkụ ékwé buru ụzọ gwa ha agwa. Ha ghọtara na mmadụ ịdị ọcha na-egosi na a zụrụ ya nke ọma nakwa na o nwere ezigbo àgwà. Ebe onye ọ bụla na-amalite ịdị ọcha bụ n’ime ezinụlọ ya. Naanị idebe gburugburu ebe obibi ọcha ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo ahụ́ ike, meekwa ka ebe o bi dị mma n’anya.
Idebe Onwe Anyị Ọcha Na-ewetara Chineke Onye Anyị Na-efe Nsọpụrụ
Anyị idebe onwe anyị ọcha ma na-adị mma n’anya na-egosi na anyị na-efe Chineke, ọ na-emekarịkwa ka ndị mmadụ mata na anyị dị iche. Ihe dị ka ụmụ okoro na agbọghọ iri na ise banyere n’ebe a na-eri nri mgbe ha si mgbakọ Ndịàmà Jehova nwere na Toulouse, France, na-alọta. Otu di na nwunye merela agadi bụ́ ndị nọ na tebụl dị nke ha nso tụrụ anya na ha ga na-eme mkpọtụ, na-amajakwa ibe ha. Ma, ezi àgwà ha kpara na ezi mkparịta ụka ha nwere na otú ejiji ha si maa mma mere di na nwunye ahụ obi ụtọ. Mgbe ụmụ okoro na agbọghọ ahụ chọrọ ịpụ, di na nwunye ahụ jara ha mma maka omume ọma ha, gwakwa otu n’ime ụmụ okoro ahụ na o siri ike ịhụ ndị na-eto eto na-akpa àgwà otú ahụ n’oge a.
Ọtụtụ mgbe, ndị na-aga ekiri alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova, ebe ha na-ebi akwụkwọ, na ụlọ obibi nke ndị na-arụ ọrụ na ha na-enwe obi ụtọ ịhụ otú ebe ndị ahụ si adị ọcha. A chọrọ ka ndị wepụtara onwe ha ibi n’ebe ndị ahụ ma na-arụ ọrụ na ha na-eyi uwe dị ọcha mgbe niile, na-akwọ aka ma na-asa ahụ́ mgbe niile. Ite ihe n’ahụ́ na ịgba sent agaghị eme ka ha ghara idebe ahụ́ ha ọcha. Mgbe ndị a, bụ́ ndị wepụtara onwe ha iji oge ha niile na-ejere Chineke ozi, na-ekwusara ndị agbata obi ha ozi ọma ná mgbede ma ọ bụ ná ngwụsị izu, otú ha si adị ọcha n’anya na-eme ka ndị mmadụ na-ekwu okwu ọma banyere ozi ọma ha na-ekwusa.
“Ghọọnụ Ndị Na-eṅomi Chineke”
A gbara Ndị Kraịst ume ka ha ‘ghọọ ndị na-eṅomi Chineke.’ (Ndị Efesọs 5:1) Aịzaya onye amụma dere banyere otu ọhụụ ọ hụrụ. N’ọhụụ ahụ, ndị mmụọ ozi kwuru, sị, “Nsọ, nsọ, nsọ” ka Onye okike anyị dị. (Aịzaya 6:3) Ugboro atọ a ha kwuru ya na-egosi na ọ bụ Chineke bụ onye kacha dị nsọ ma dị ọcha. Ọ bụ ya mere Chineke ji chọọ ka ndị ohu ya niile dị nsọ ma dị ọcha. Ọ gwara ha, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.”—1 Pita 1:16.
Baịbụl gbara Ndị Kraịst ume ka ha “na-eji ejiji dị mma.” (1 Timoti 2:9, nsụgharị The New English Bible) O jughị anyị anya na “ákwà linin ọma nke na-enwu gbaa, nke dịkwa ọcha” bụ́ nke e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Mkpughe nọchiri anya ezi omume nke ndị dị nsọ n’anya Chineke. (Mkpughe 19:8) N’aka nke ọzọ, a na-ejikarị ntụpọ ma ọ bụ unyi ama atụ mmehie n’Akwụkwọ Nsọ.—Ilu 15:26; Aịzaya 1:16; Jems 1:27.
Taa, ọtụtụ nde mmadụ bi n’ebe ọ na-esiri ha ike mgbe niile idebe onwe ha na omume ha ọcha nakwa n’ebe ọ na-esiri ha ike mgbe niile ime ka ha na Jehova dịrị ná mma. Naanị mgbe nsogbu a ga-akwụsị bụ mgbe Chineke ‘ga-eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.’ (Mkpughe 21:5) Mgbe Chineke mezuru nkwa a, unyi niile na adịghị ọcha niile ga-apụ n’anya ruo mgbe ebighị ebi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 A gbanwere aha ya.
[Igbe dị na peeji nke 10]
Chineke Chọrọ Ka Anyị Na-adị Ọcha
Mgbe ụmụ Izrel nọ n’ala ịkpa, a gwara ha ka ha lezie anya iji hụ na ha na-eli nsị ha nyụrụ, lie ya nke ọma. (Diuterọnọmi 23:12-14) N’ezie, nke a adịghị mfe ebe ọ bụ na ha dị ọtụtụ. Ma, o doro anya na o mere ka ha ghara ibute ọrịa dị iche iche, dị ka ịba ahụ́ ọkụ na ọgbụgbọ na ọnyụnyụ.
A gwara ha ka ha sachaa ma ọ bụ bibie ihe ọ bụla ihe nwụrụ anwụ metụrụ ahụ́. N’agbanyeghị na ọ ga-abụ na ụmụ Izrel aghọtaghị ihe mere e ji nye ha iwu a, idebe ya mere ka ha ghara ibute ọrịa.—Levitikọs 11:32-38.
A gwara ndị nchụàjà ka ha na-asa aka ha na ụkwụ ha tupu ha amalite ịrụ ọrụ ha na-arụ n’ụlọikwuu. Ọ bụ iwu ha na-aghaghị idebe, n’agbanyeghị na ọ dịghị mfe ịgbaju efere ọla kọpa dị n’ebe ahụ mmiri ha ga-eji na-asa aka na ụkwụ ha.—Ọpụpụ 30:17-21.
[Igbe dị na peeji nke 11]
Ihe Otu Dọkịta Kwuru
Mmiri dị anyị mkpa ná ndụ. Ma, mmiri na-adịghị mma nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa na ọnwụ. Dọkịta J. Mbangue Lobe, bụ́ onyeisi nke ngalaba ụlọ ọgwụ e nwere n’ọdụ ụgbọ mmiri dị na Douala, Cameroon, tụrụ aro ụfọdụ dị mma n’ajụjụ ọnụ a gbara ya.
Ọ sịrị: “Sie mmiri gị n’ọkụ ma ọ bụrụ na o doghị gị anya na ọ dị ọcha.” Ma, ọ dọrọ aka ná ntị, sị: “Itinye ọgwụ ma ọ bụ kemikal ná mmiri adịghị njọ, ma, o nwere ike imerụ mmadụ ahụ́ ma ọ bụrụ na a kpachapụghịrị ya anya. Tupu gị erie ihe oriri mgbe ọ bụla, were ncha na mmiri kwọọ aka gị, meekwa otú a mgbe ị gachara mposi. Ncha adịghị oké ọnụ, ya mere, ọbụna ndị ogbenye ga-azụtali ya. Na-asụ ákwà gị kwa mgbe kwa mgbe. Jiri mmiri ọkụ mgbe ị na-asụ ya ma ọ bụrụ na i nwere ọrịa akpụkpọ ahụ́.”
Dọkịta ahụ kwukwara, sị: “Onye ọ bụla n’ezinụlọ kwesịrị ịhụ na ime ụlọ ha na mbara èzí ha dị ọcha. Ọtụtụ mgbe a na-eleghara ụlọ mposi anya, ya aghọọ ụlọ ọchịcha na ụlọ ijiji.” O nyekwara ndụmọdụ ọzọ dị mkpa banyere ụmụaka, sị: “Kpachara anya mgbe ị na-asa ahụ́ n’iyi ndị dị n’obodo unu. Ọtụtụ nje a na-anaghị ahụ anya ndị dị ize ndụ dị n’ime ha. Na-asa ahụ́ kwa abalị tupu gị alaba ụra, na-asakwa ezé gị nke ọma n’abalị, kpuchiekwa onwe gị ákwà e ji egbochi anwụnta.” Isi ihe ndụmọdụ a na-eme ka anyị mara bụ na anyị kwesịrị iche echiche mara ihe anyị kwesịrị ime, mee ya, ma zere nsogbu.
[Foto dị na peeji nke 10]
Ịsụ ákwà gị ga-enyere gị aka izere ibute ọrịa akpụkpọ ahụ́ na ọrịa ndị ọzọ
[Foto dị na peeji nke 10]
Ndị Kraịst na-ewepụta onwe ha rụọ ọrụ iji debe gburugburu ebe obibi ha ọcha
[Foto dị na peeji nke 10]
Nwaanyị hụrụ ezinụlọ ya n’anya na-arụ ọrụ dị ukwuu iji hụ na ndị ezinụlọ ya dị ọcha