Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Mgbidi ahụ Pọl onyeozi kwuru okwu ya ná Ndị Efesọs 2:11-15, nke kewara ndị Juu na ndị Jentaịl, ọ̀ bụ mgbidi nkịtị?
Mgbe Pọl onyeozi na-edegara ndị Efesọs akwụkwọ ozi, o kwuru ọdịiche dị n’etiti ụmụ Izrel na “ndị mba ọzọ.” Ọ sịrị na e nwere “mgbidi” dị n’etiti ha nke ‘kewara’ ha. (Ndị Efesọs 2:11-15) Ihe Pọl na-ekwu okwu ya bụ “Iwu ahụ” e nyere site n’aka Mozis. Ma, ọ ga-abụ na “mgbidi” ahụ o kwuru okwu ya chetaara ndị gụrụ akwụkwọ ozi ahụ banyere otu mgbidi nke dịrị adị n’ezie.
N’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, ụlọ nsọ Jehova dị na Jeruselem nwere ọtụtụ ogige ndị mmadụ niile na-anaghị abanye. Onye ọ bụla nwere ike ịbanye n’Ogige Ndị Jentaịl, ma, ọ bụ naanị ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu nwere ike ịbanye n’ogige ndị dị n’ụlọ nsọ ahụ. Soreg, bụ́ mgbidi e ji nkume a chọrọ mma rụọ, nke dị ihe dị ka otu mita na ọkara n’ịdị elu, kebiri ebe mmadụ niile nwere ike ịbanye na ebe mmadụ niile na-anaghị abanye. Dị ka onye Juu bụ́ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Flavius Josephus, onye dịrị ndụ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, si kwuo, e dere ihe n’asụsụ Grik na Latịn ná mgbidi ahụ iji dọọ ndị Jentaịl aka ná ntị ka ha ghara ịgafe mgbidi ahụ wee banye n’ebe ahụ dị nsọ.
A hụrụ otu ebe e ji asụsụ Grik dee ihe ahụ ná mgbidi. Ọ na-agụ, sị: “Ka onye ala ọzọ ghara ịgafe mgbidi a nke e ji rụbichie ebe nsọ. A ga-egbu onye ọ bụla e jidere gafere ya.”
O doro anya na Pọl ji Soreg dochie anya ọgbụgba ndụ Iwu Mozis, bụ́ nke kewara ndị Juu na ndị Jentaịl kemgbe. Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ kagburu ọgbụgba ndụ Iwu ahụ, wee si otú a “bibie mgbidi dị n’etiti.”
Olee ihe mere e ji ekwukarị ebo iri na abụọ nke Izrel ebe ha dị ebo iri na atọ?
Ebo dị iche iche nke Izrel, ma ọ bụ ezinụlọ Izrel, sitere n’ụmụ ndị ikom Jekọb, bụ́ onye a gbanwere aha ya ka ọ zawa Izrel. Nna ochie a mụrụ ndị ikom iri na abụọ. Ha bụ Ruben, Simiọn, Livaị, Juda, Dan, Naftalaị, Gad, Asha, Ịsaka, Zebulọn, Josef, na Benjamin. (Jenesis 29:32–30:24; 35:16-18) A gụrụ ebo iri na otu aha mmadụ iri na otu n’ime ha, ma o nweghị ebo a gụrụ aha Josef. Kama nke ahụ, a gụrụ ebo abụọ aha ụmụ ya, bụ́ Ifrem na Manase, ndị bụ́ ndị isi nke ebo ndị a gụrụ aha ha. Ya mere, ebo dị iche iche nke Izrel dị iri na atọ. Gịnịzi mere Baịbụl ji ekwukarị ebo iri na abụọ?
N’etiti ụmụ Izrel, a họọrọ ndị ikom ebo Livaị ka ha na-eje ozi n’ụlọikwuu Jehova, ha mesịkwara na-eje ozi n’ụlọ nsọ ya. N’ihi ya, ha anaghị eso eje agha. Jehova gwara Mozis, sị: “Ọ bụ naanị ebo Livaị ka ị na-agaghị edeba aha ha n’akwụkwọ, agụnyekwala ọnụ ọgụgụ ha n’ọnụ ọgụgụ ụmụ Izrel. Gị onwe gị, họpụta ndị Livaị ka ha na-elekọta ụlọikwuu Ihe Àmà na arịa ya niile na ihe niile metụtara ya.”—Ọnụ Ọgụgụ 1:49, 50.
E kenyeghịkwa ndị Livaị ala n’Ala Nkwa ahụ. Kama nke ahụ, e kenyere ha obodo iri anọ na asatọ ndị dị n’ebe dị iche iche n’ala Izrel.—Ọnụ Ọgụgụ 18:20-24; Jọshụa 21:41.
N’ihi ihe abụọ a e kwuru, a naghị edekarị ebo Livaị mgbe a na-ede ebo ndị nke ọzọ. Ọ bụ ya mere e ji ekwukarị ebo iri na abụọ nke Izrel.—Ọnụ Ọgụgụ 1:1-15.
[Ebe E Si Nweta Foto dị na peeji nke 21]
Ebe A Na-edebe Ihe Mgbe Ochie n’Istanbul