Ihe Na-ewute Anyị Na-emetụ Ya n’Obi
Bịaruo Chineke Nso
Ihe Na-ewute Anyị Na-emetụ Ya n’Obi
“ỌMỊIKO bụ mwute mmadụ na-enwe n’ihi ihe mere onye ọzọ.” Ọ bụ otú a ka otu Onyeàmà Jehova nke na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ si kọwaa àgwà a magburu onwe ya. Jehova bụ́ Chineke bụ onye kacha enwe ọmịiko. Ahụhụ ndị mmadụ na-ata na-emetụ ya n’ahụ́. Olee otú anyị ga-esi mara na nke ahụ bụ eziokwu? Okwu ndị Jizọs kwuru na ihe ndị o mere mgbe ọ nọ n’ụwa gosiri ụdị ọmịiko Jehova nwere. (Jọn 5:19) Dị ka ihe atụ, tụlee ihe e dere na Jọn 11:33-35.
Mgbe enyi Jizọs bụ́ Lazarọs nwụchuru ọnwụ, Jizọs gara n’obodo Lazarọs. O doro anya na obi gbawara ụmụnne Lazarọs bụ́ Meri na Mata. Jizọs hụrụ ezinụlọ a n’anya nke ukwuu. (Jọn 11:5) Olee ihe ọ ga-eme? Baịbụl sịrị: “Mgbe Jizọs hụrụ [Meri] ka ọ na-akwa ákwá nakwa ka ndị Juu so ya bịa na-akwa ákwá, ọ sụrụ ude n’ime mmụọ ya, o nyekwara ya nsogbu; o wee sị: ‘Olee ebe unu liri ya?’ Ha sịrị ya: ‘Onyenwe anyị, bịa lee ya.’ Anya mmiri gbara Jizọs.” (Jọn 11:33-35) Gịnị mere Jizọs ji bee ákwá? N’ezie, enyi ya ọ hụrụ n’anya anwụọla. Ma, Jizọs ga-akpọlite ya n’ọnwụ n’oge na-adịghị anya. (Jọn 11:41-44) Ò nwere ihe ọzọ metụrụ Jizọs n’obi?
Leba amaokwu ndị ahụ anya ọzọ. Ị ga-ahụ na mgbe Jizọs hụrụ Meri na ndị ọzọ so ya ka ha na-akwa ákwá, “ọ sụrụ ude,” “o nyekwara ya nsogbu.” Okwu Grik e si na ya sụgharịa okwu ndị a na-egosi ihe imetụ mmadụ n’obi nke ukwuu. * Ihe Jizọs hụrụ metụrụ ya n’ahụ́ nke ukwuu. Anya mmiri ahụ gbara ya gosiri na nke a bụ eziokwu. O doro anya na ihe wutere ndị ọzọ wutere Jizọs. Ọ̀ dịtụla mgbe ị malitere ịkwa ákwá maka na onye ị hụrụ n’anya na-akwa ákwá?—Ndị Rom 12:15.
Ọmịiko Jizọs na-eme ka anyị ghọta àgwà na ụzọ Nna ya bụ́ Jehova. Cheta na Jizọs kpara àgwà dị ka Nna ya n’ụzọ zuru okè nke na ọ sịrị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.” (Jọn 14:9) N’ihi ya, mgbe anyị gụrụ na “anya mmiri gbara Jizọs,” anyị ga-enwe obi ike na ihe na-ewute ndị ohu Jehova na-emetụ Jehova n’obi. N’ezie, ndị ọzọ so dee Baịbụl gosiri na nke a bụ eziokwu. (Aịzaya 63:9; Zekaraya 2:8) Jehova bụ Chineke nke ọmịiko ya na-enweghị atụ.
Ndị mmadụ na-enwe mmasị n’onye nwere ọmịiko. Mgbe obi dara anyị mbà, ọ na-amasị anyị ịgakwuru onye nwere ike ịghọta ọnọdụ anyị ma gosi anyị ọmịiko. O kwesịrị ịmasị anyị ọbụna karị ịgakwuru Jehova, bụ́ Chineke ọmịiko, onye ihe na-ewute anyị na-emetụ n’obi, onye na-aghọtakwa ihe mere anya mmiri ji agba anyị!—Abụ Ọma 56:8.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Okwu Grik a sụgharịrị “anya mmiri gbara Jizọs” na-apụtakarị “ịkwa ákwá n’akwapụtaghị ya akwapụta,” ebe okwu Grik e ji kọwaa ákwá Meri na ndị ọzọ kwara nwere ike ịpụta “iti mkpu ákwá, ịkwasi ákwá ike.”