Ihe Bụ́ Eziokwu Banyere Oriri Nso
Ihe Bụ́ Eziokwu Banyere Oriri Nso
ỌTỤTỤ mmadụ n’ụwa dum na-eri ya mgbe mgbe. Ha na-eri ya ọtụtụ ugboro n’afọ, kwa izu, ma ọ bụkwanụ kwa ụbọchị. Ma, a sịrị na ọ bụ nkwenkwe dị omimi. Ọtụtụ n’ime ndị na-eri ya enweghị onye na-ekwu na ya ghọtara ihe ọ bụ. A na-ewere ya na ọ dị nsọ nakwa na ọ bụ ọrụ ebube.
Ọ bụ Oriri Nsọ, nke a na-eri n’ụka Katọlik mgbe ụkọchukwu na-edo Mas, mgbe ọ gọziri achịcha na mmanya ma gwa ndị bịara ụka ka ha bịa nara Kraịst n’Oriri Nsọ. * Poopu Benedict nke Iri na Isii kwuru na oriri a bụụrụ ndị Katọlik “ihe kacha mkpa n’okpukpe anyị.” N’oge na-adịbeghị anya, ndị Katọlik mere ememme “Afọ Oriri Nsọ,” bụ́ otu n’ime ihe ndị ha na-eme iji “mee ka ndị mmadụ jiri oriri nsọ kpọrọ ihe otú ha na-emebu.”
Ọbụna ndị Katọlik okwukwe ha na-esighị ike kwenyesiri ike n’oriri a. Dị ka ihe atụ, n’otu edemede nke gbara na magazin bụ́ Time, otu nwaanyị nke a kọwara na ọ bụ nwa agbọghọ na-eme nke ọma n’ụka Katọlik dere, sị: “N’agbanyeghị nghọtahie ọ bụla anyị na-enwe n’iwu na-achị okpukpe Katọlik, anyị agaghị ahapụ otu ihe a jikọrọ anyị ọnụ n’okpukpe Katọlik, ya bụ: otú anyị si eji obi anyị dum na-eri Oriri Nsọ.”
Ma, gịnị bụ Oriri Nsọ? Ndị na-eso ụzọ Kraịst hà kwesịrị iri ya? Ka anyị buru ụzọ tụlee otú ememme Oriri Nsọ si malite. E mechaa, anyị ga-eleba anya n’ajụjụ ọzọ ka mkpa, ya bụ: Oriri Nsọ ọ̀ bụ ya bụ ihe ahụ Jizọs Kraịst hiwere n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ puku afọ abụọ gara aga?
Oriri Nsọ na Ndị Ụka
O sighị ike ịmata ihe mere e ji ele Oriri Nsọ anya dị ka ọrụ ebube. Oge kacha mkpa n’oriri ahụ bụ mgbe a na-ekpe ekpere Oriri Nsọ. Dị ka akwụkwọ bụ́ Catechism of the Catholic Church si kwuo, n’oge ahụ, “ike nke okwu na ọrụ nke Kraịst, na ike nke Mmụọ Nsọ,” na-eme ka achịcha na mmanya ‘hugharịa’ ghọọ ahụ́ na ọbara Jizọs. Mgbe ụkọchukwu riri achịcha ahụ, ṅụọkwa mmanya ahụ, ọ na-agwa ndị ụka ka ha bịa
nara Oriri Nsọ. Ihe ọ na-emekarị bụ inye ha naanị achịcha.Okpukpe Katọlik na-akụzi na achịcha na mmanya ahụ na-agbanwe ghọọ ahụ́ na ọbara Kraịst, bụ́ nke ha na-akpọ “nhugharị.” Ozizi a ji nwayọọ nwayọọ malite. Ọ bụ na narị afọ asatọ gara aga bụ mgbe mbụ ndị ụka webatara okwu Bekee a sụgharịrị “nhugharị” ma kọwaa ya. N’oge okpukpe Protestant malitere, e bidoro inyo ihe ụfọdụ n’ozizi Oriri Nsọ ndị Katọlik enyo. Luther ekwetaghị na achịcha na mmanya ahụ na-aghọ ahụ́ na ọbara Kraịst, kama, na ahụ́ na ọbara Kraịst na-abata n’achịcha na mmanya ahụ. O nweghị ezigbo ihe dị iche na ha abụọ. Luther kụziri na ahụ́ na ọbara Jizọs dị n’achịcha na mmanya ahụ, kama ịghọ ahụ́ na ọbara Jizọs.
Ka oge na-aga, e nwewere ọdịiche n’otú ndị ụka dị iche iche si ghọta Oriri Nsọ, otú ha si eri ya nakwa ugboro ole ha na-eri ya. Otú o sina dị, n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ, oriri a bụụrụ ndị ụka dị iche iche ihe omume dị oké mkpa. Ma, gịnị bụ ihe ahụ Jizọs hiweere ndị na-eso ụzọ ya?
Otú E Si Hiwe “Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị”
Ọ bụ Jizọs hiwere “nri anyasị nke Onyenwe anyị,” ma ọ bụ Ncheta ọnwụ ya. (1 Ndị Kọrịnt 11:20, 24) Ma, ihe ahụ o hiwere ọ̀ bụ ememme dị omimi nke ndị na-eso ụzọ ya ga na-eri ahụ́ ya ma na-aṅụ ọbara ya mgbe ha na-eme ya?
N’oge ahụ, Jizọs ka mechara Ememme Ngabiga ndị Juu ma gwa Judas Iskarịọt ka ọ pụọ, bụ́ onyeozi ya nke ga-arara ya nye. Matiu bụ otu n’ime ndịozi iri na otu nọ ya mgbe ahụ. O dere, sị: “Mgbe ha nọ na-eri ihe, Jizọs weere otu ogbe achịcha. Mgbe ọ gọzichara ya, ọ nyawara ya, nye ya ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘Naranụ, taa. Nke a pụtara ahụ́ m.’ O bukwaara iko. Mgbe o kelesịrị [Grik, eu·kha·ri·ste΄sas] Chineke, o bunyekwara ha ya, sị: ‘Ṅụọnụ, unu niile; n’ihi na nke a pụtara “ọbara m nke ọgbụgba ndụ ahụ,” nke a ga-awụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.’”—Matiu 26:26-28.
Ọ bụ omenala Jizọs na omenala ndị niile bụ́ ndị ohu Chineke ịrịọ Chineke ka ọ gọzie nri ha tupu ha e riwe nri. (Diuterọnọmi 8:10; Matiu 6:11; 14:19; 15:36; Mak 6:41; 8:6; Jọn 6:11, 23; Ọrụ 27:35; Ndị Rom 14:6) Ò nwere ihe mere a ga-eji kwere na mgbe ahụ Jizọs nọ na-ekele Chineke na ọ nọkwa na-arụ ọrụ ebube wee mee ka ndị na-eso ụzọ ya rie ahụ́ ya nkịtị, ṅụọkwa ọbara ya nkịtị?
“Nke A Pụtara” Ka Ọ̀ Bụ “Nke A Bụ”?
N’ezie, ụfọdụ nsụgharị Baịbụl sụgharịrị okwu ahụ Jizọs kwuru otú a: “Naranụ nke a, rienụ ya, nke a bụ ahụ m,” kwuokwa, sị, “Ṅụọnụ nke a unu niile. Nke a bụ ọbara m.” (Matiu 26:26-28, nsụgharị Nhazi Katọlik; leekwa Bible Nsọ nke Union Version) N’eziokwu, okwu Grik bụ́ e·stin΄, nke bụ́ ngwaa Grik e nwere ike ịsụgharị “ga-abụ,” pụtara “bụ.” Ma, otu ngwaa ahụ nwekwara ike ịpụta “pụtara.” Ọ dị mma ịmara na n’ọtụtụ nsụgharị Baịbụl, a sụgharịrị ngwaa a ọtụtụ ugboro “pụtara,” ma ọ bụ “na-anọchi anya.” * Ọ bụ ihe a na-ekwu na-eme ka a mara otú kacha mma a ga-esi sụgharịa ya. Dị ka ihe atụ, n’ọtụtụ nsụgharị Baịbụl, a sụgharịrị e·stin bụ́ nke dị na Matiu 12:7 “pụtara”, amaokwu ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na unu ghọtara ihe nke a pụtara [Grik, e·stin], ihe na-amasị m bụ ebere, ọ bụghị aja, unu akaraghị ama ndị ikpe na-amaghị ikpe.”—nsụgharị Nhazi Katọlik.
Ọ bụ nke a mere ọtụtụ ndị ọkà mmụta Baịbụl a na-akwanyere ùgwù ji kweta na okwu ahụ bụ́ “bụ” asụgharịtaghị ihe Jizọs
kwuru n’amaokwu ahụ. Dị ka ihe atụ, Jacques Dupont lebara anya n’omenala a na-eme n’ebe a mụrụ Jizọs wee kwuo na “otú kacha mma” e kwesịrị isi sụgharịa amaokwu ahụ bụ: “Nke a pụtara ahụ́ m” ma ọ bụ, “Nke a na-anọchi anya ahụ́ m.”Ka o sina dị, ọ dịghị mgbe ihe Jizọs kwuru bụ ka ndị na-eso ụzọ ya rie ahụ́ ya, ṅụọkwa ọbara ya nkịtị. N’ihi gịnị? Mgbe Iju Mmiri oge Noa gachara, mgbe Chineke nyere ụmụ mmadụ ikike iri ụmụ anụmanụ, ọ gwara ha ka ha ghara iri ọbara. (Jenesis 9:3, 4) E nyeghachiri iwu a n’Iwu Mozis, bụ́ nke Jizọs rubeere isi nke ọma. (Diuterọnọmi 12:23; 1 Pita 2:22) Ndịozi si n’ike mmụọ nsọ nyeghachi Ndị Kraịst niile iwu ahụ, ya bụ, ka ha ghara iri ọbara. (Ọrụ 15:20, 29) Jizọs ọ̀ ga-ehiwe ihe ga-eme ka ndị na-eso ụzọ ya mebie iwu dị nsọ Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nyere? Mbanụ!
Ya mere, o doro anya na Jizọs ji achịcha na mmanya ahụ mee ihe atụ. Achịcha na-ekoghị eko pụtara, ma ọ bụ nọchiri anya, ahụ́ ya na-enweghị mmehie nke ọ ga-achụ n’àjà. Mmanya ahụ na-acha ọbara ọbara nọchiri anya ọbara ya “nke a ga-awụpụ n’ihi ọtụtụ mmadụ maka mgbaghara mmehie.”—Matiu 26:28.
Ihe Mere E Ji Hiwe Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị
N’oge mbụ e riri Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị, Jizọs ji okwu a mechie ya: “Na-emenụ nke a ka unu wee na-echeta m.” (Luk 22:19) N’ezie, ime ya na-enyere anyị aka icheta Jizọs na ihe ndị dị ebube ọnwụ ya rụrụ. Ọ na-echetara anyị na Jizọs gosiri na ọ bụ Nna ya, bụ́ Jehova, kwesịrị ịchị achị. Ọ na-echetakwara anyị na Jizọs nyere “mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ,” site n’ọnwụ ọ nwụrụ dị ka mmadụ zuru okè nke na-emeghị mmehie. Ihe mgbapụta ahụ na-eme ka onye ọ bụla nke nwere okwukwe n’àjà ọ chụrụ kwụsị ịbụ ohu mmehie, ọ ga-emekwa ka onye ahụ nweta ndụ ebighị ebi.—Matiu 20:28.
Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na Nri Anyasị Onyenwe Anyị abụghị nri gbasara naanị otu onye. Ndị ọ gbasara bụ (1) Jehova bụ́ Chineke, onye mere ndokwa maka ihe mgbapụta, (2) Jizọs Kraịst, “Nwa Atụrụ Chineke,” onye bụ́ ihe mgbapụta ahụ, na (3) ụmụnna ime mmụọ Jizọs. Mgbe ụmụnna ime mmụọ Jizọs riri achịcha ahụ, ṅụọkwa mmanya ahụ, ha na-egosi na ha na Kraịst bụ otu. (Jọn 1:29; 1 Ndị Kọrịnt 10:16, 17) Ha na-egosikwa na ha bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ndị e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ndị so ‘n’ọgbụgba ndụ ọhụrụ.’ Ọ bụ ha na Kraịst ga-abụ ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe.—Luk 22:20; Jọn 14:2, 3; Mkpughe 5:9, 10.
Olee mgbe e kwesịrị icheta Ọnwụ Jizọs? Anyị ga-enweta azịza ya ma ọ bụrụ na anyị echeta na Jizọs họọrọ otu ụbọchị, ya bụ, ụbọchị Ememme Ngabiga, wee hiwe Ncheta Ọnwụ ya n’ụbọchị ahụ. Kemgbe ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ ise tupu oge ahụ, ndị Chineke nọ na-eme ememme ahụ kwa afọ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan, iji na-echeta nzọpụta pụrụ iche Jehova zọpụtara ha. O doro anya na ihe Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-echeta n’otu ụbọchị ahụ bụ nzọpụta ka nke ahụ, bụ́ nke Chineke ga-azọpụta ụmụ mmadụ site n’ọnwụ Kraịst. Ya mere, ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs na-ezukọta maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị kwa afọ, n’ụbọchị manyere n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan na kalenda ndị Hibru.
Hà na-eme ya naanị iji gbasoo omenala? N’eziokwu, nke ahụ bụ ihe mere iri Oriri Nsọ ji amasị ọtụtụ ndị. Onye dere edemede ahụ e kwuru okwu ya ná mbụ nke gbara na magazin bụ́ Time kwuru, sị: “O nwere ihe na-atọgbu onwe ya n’iso na-eme ememme malitere n’oge ochie nke ọtụtụ ndị na-eme.” Onye ahụ dere ihe a chọrọ ka a na-edo Mas oriri nsọ n’asụsụ Latin, dị ka ọtụtụ ndị Katọlik chọrọ. N’ihi gịnị? O dere, sị: “Achọrọ m ka m na-anụ ukwe Mas n’asụsụ m na-anaghị aghọta, n’ihi na ọtụtụ mgbe ihe m na-anụ a na-ekwu n’asụsụ Bekee anaghị adị m mma.”
Ọ na-atọ Ndịàmà Jehova na ọtụtụ nde ndị nwere mmasị n’okpukpe ha ụtọ inwe nzukọ maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị n’asụsụ ha, n’agbanyeghị ebe ha bi. Ọ na-amasị ha ịghọtakwu ihe ọnwụ Kraịst pụtara na uru ọ bara. E kwesịrị ka a na-echebara eziokwu ndị a echiche, na-ekwukwa banyere ha mgbe ọ bụla n’ime afọ. Ndịàmà chọpụtara na Ncheta Ọnwụ Jizọs bụ ụzọ kacha mma isi na-echeta ịhụnanya dị ukwuu nke Jehova bụ́ Chineke na nke Ọkpara ya, bụ́ Jizọs Kraịst. Ọ na-enyere ha aka ‘ikwusa ọnwụ Onyenwe anyị, ruo mgbe ọ ga-abịarute.’—1 Ndị Kọrịnt 11:26.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
^ par. 3 A na-akpọkwa oriri a Oriri Onyenwe Anyị, ịnyawa achịcha, Àjà Nsọ, na Mas Dị Nsọ. Ọ bụ okwu Grik bụ́ eu·kha·ri·sti΄a, nke pụtara obi ekele, ekele, ma ọ bụ inye ekele, ka e si nweta okwu a sụgharịrị “Oriri Nsọ.”
^ par. 15 Dị ka ihe atụ, gụọ Matiu 27:46 na Luk 8:11 ná nsụgharị Nhazi Katọlik ka ị hụ otú e si sụgharịa ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 27]
Gịnị bụ ihe ahụ Jizọs hiweere ndị na-eso ụzọ ya?
[Foto dị na peeji nke 28]
Jizọs hiwere Ncheta ọnwụ ya
[Foto dị na peeji nke 29]
Mgbe a na-echeta Ọnwụ Jizọs Kraịst