Ị̀ Maara?
Ị̀ Maara?
Mkpụrụ ego abụọ nwaanyị ahụ di ya nwụrụ tụnyere n’igbe ọ̀ bụ ego ole?
N’oge ochie, ndị Juu na-akwụ “mkpụrụ ego drakma abụọ,” bụ́ ụtụ isi a na-atụ maka ụlọ nsọ. Ọ bụ ego e nwere ike ịrụta n’ọrụ abalị abụọ. (Matiu 17:24) Ma, Jizọs sịrị na a na-ere nza abụọ “otu mkpụrụ ego nke ga-azụtali naanị ihe dị nta,” bụ́ ego e nwere ike ịrụta n’ọrụ were nkeji iri anọ na ise. N’ezie, e nwere ike iji mkpụrụ ego abụọ, ma ọ bụ ego a rụtara n’ọrụ were ihe dị ka nkeji iri itoolu, zụta nza ise.—Matiu 10:29; Luk 12:6.
Onyinye nwaanyị ahụ dara ogbenye nyere, bụ́ onye Jizọs hụrụ, erutụdịghị ego ole ga-azụtali nza ise. Mkpụrụ ego abụọ a, ma ọ bụ lepton abụọ, bụ mkpụrụ ego kọpa kacha ntakịrị e ji azụ ihe n’Izrel n’oge ahụ. Ọ bụ otu ụzọ n’ụzọ iri isii na anọ nke ego a na-arụta n’ọrụ otu ụbọchị ma ọ bụ ego a na-arụta n’ọrụ na-erughị nkeji iri na abụọ, ma e jiri awa iri na abụọ a na-arụ ọrụ n’ụbọchị gụkọọ ya.
Jizọs Kraịst sịrị na onyinye nwaanyị ahụ karịrị nke ndị niile nyere onyinye “site n’ọtụtụ ihe ha nwere.” N’ihi gịnị? Akụkọ ahụ sịrị na o nwere “obere mkpụrụ ego abụọ,” ya mere, à sị na ọ chọrọ, ọ gaara enye otu, hapụrụ onwe ya otu. Ma, o nyere “ihe niile o nwere, ihe dum o ji biri.”—Mak 12:41-44; Luk 21:2-4.
Olee mgbe Sọl malitere ịza Pọl?
Pọl onyeozi bụ onye Hibru, ma a mụrụ ya, ya abụrụ nwa amaala Rom. (Ọrụ 22:27, 28; Ndị Filipaị 3:5) Ya mere, ọ ga-abụ na ọ malitere ịza aha Hibru ya bụ́ Sọl na aha Rom ya bụ́ Pọl mgbe ọ bụ nwata. Ụfọdụ ndị ikwu Pọl nwekwara aha Rom na aha Grik. (Ndị Rom 16:7, 21) Ndị Juu oge ahụ, karịchaa, ndị nke na-ebighị n’Izrel, na-azakarị aha abụọ.—Ọrụ 12:12; 13:1.
Malite mgbe onyeozi a ghọrọ Onye Kraịst ruo ihe karịrị afọ iri, ọtụtụ ndị ji aha Hibru ya bụ́ Sọl mara ya. (Ọrụ 13:1, 2) Ma, ọ ga-abụ na ọ họọrọ ịza aha Rom ya bụ́ Pọl mgbe ọ gara njem ozi ala ọzọ nke mbụ ya, n’ihe dị ka n’agbata afọ 47 O.A. na 48 O.A. E nyere ya ọrụ ikwusara ndị na-abụghị ndị Juu ozi ọma, ma eleghị anya, o chere na ha ga-aka anabata aha Rom ya. (Ọrụ 9:15; 13:9; Ndị Galeshia 2:7, 8) Ọ ga-abụkwa na ọ họọrọ ịza Pọl maka na otú ndị Grik si akpọ aha Hibru ya bụ́ Sọl yiri otu okwu Grik nke na-adịghị mma ọnụnụ. N’agbanyeghị ihe ọ bụla mere o ji họrọ ịza Pọl, o gosiri na ya dị njikere ‘ịghọ ihe niile n’ebe ụdị mmadụ niile nọ, ka o wee si n’ụzọ ọ bụla zọpụta ụfọdụ ndị.’—1 Ndị Kọrịnt 9:22.
[Foto dị na peeji nke 12]
Otú lepton hà