Olee Ebe Anyị Si Bịa?
Olee Ebe Anyị Si Bịa?
GỊNỊ MERE AZỊZA YA JI DỊ ANYỊ MKPA? A na-akụziri ọtụtụ ndị na ihe ndị dị ndụ n’ụwa malitere ịdị ndụ n’onwe ha. A na-agwa ha na ọtụtụ ihe na-anaghị emekarị mere na mberede, ihe dị iche iche wee gbanwegide ruo mgbe ha ghọrọ ụmụ mmadụ ndị nwere uche, ọgụgụ isi, na ọchịchọ ịmata ihe ndị dị omimi ná ndụ ha.
Ma, chebara nke a echiche: Ọ bụrụ n’ezie na anyị pụtara n’onwe anyị, ya abụrụkwa na e nweghị Onye Okike, ihe ọ pụtara bụ na ụmụ mmadụ enweghị nne na nna, nakwa na ụmụ mmadụ enweghị onye ka ha mara ihe bụ́ onye ha ga na-agakwuru, ọ dịghị onye ga-enyere anyị aka gboo mkpa anyị. Ihe ọ pụtakwara bụ na anyị ga na-adabere n’amamihe ụmụ mmadụ iji zere ọdachi n’ụwa a, iji zere esemokwu a na-enwe na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na iji dozie nsogbu ndị anyị na-enwe n’otu n’otu.
Ọ bụrụ na echiche a bụ eziokwu, obi ọ̀ ga-eru gị ala? Ọ bụrụ na ọ gaghị eme ka obi ruo gị ala, chebara ihe Baịbụl kwuru echiche. Ọ bụghị naanị na ọ ka ụtọ, kamakwa, o ziri ezi.
Ihe Baịbụl Kwuru
Baịbụl na-akụziri anyị na ọ bụ Chineke kere ụmụ mmadụ. Anyị apụtaghị n’onwe anyị, n’enweghị onye nwere uche nke hụrụ anyị n’anya kere anyị. Kama nke ahụ, ọ bụ Nna nwere amamihe nke hụrụ anyị n’anya kere anyị. Lee okwu ndị a doro anya e dere na Baịbụl.
Jenesis 1:27. “Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya; nwoke na nwaanyị ka o kere ha.”
Abụ Ọma 139:14. “M ga-eto gị n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube. Ọrụ gị dị ebube, dị ka mkpụrụ obi m maara nke ọma.”
Matiu 19:4-6. “Ọ̀ bụ na unu agụghị na onye kere ha site ná mmalite mere ha nwoke na nwaanyị wee sị, ‘N’ihi ya, nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’? Nke mere na ha abụkwaghị anụ ahụ́ abụọ, kama ha bụ otu. Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.”
Ọrụ 17:24, 25. “Chineke nke kere ụwa na ihe niile dị n’ime ya, ebe ọ bụ Onyenwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebi n’ụlọ nsọ ndị e ji aka wuo, aka ụmụ mmadụ adịghịkwa ejere ya ozi dị ka à ga-asị na o nwere ihe na-akpa ya, n’ihi na ya onwe ya na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile.”
Mkpughe 4:11. “I kwesịrị ekwesị, Jehova, bụ́ Chineke anyị, ịnata otuto na nsọpụrụ na ike, n’ihi na ọ bụ gị kere ihe niile, ọ bụkwa n’ihi uche gị ka ha ji dịrị, ọ bụkwa ya mere e ji kee ha.”
Otú Ihe Baịbụl Zara Si Eme Ka Obi Ruo Anyị Ala
Ọ bụrụ na anyị amata na ‘ezinụlọ ọ bụla n’ụwa sitere n’ebe Chineke nọ nweta aha ya,’ otú anyị si ele ndị ọzọ anya ga-agbanwe. (Ndị Efesọs 3:15) Ịmata nke a ga-agbanwekwa otú anyị si ele onwe anyị na nsogbu ndị anyị na-enwe anya. Lekwa ebe ndị ọ ga-agbanwe echiche anyị.
Mgbe anyị chọrọ ime mkpebi ndị siri ike, anyị agaghị echegbuwe onwe anyị gabiga ókè n’ihi echiche dị iche iche ndị mmadụ nwere. Kama nke ahụ, anyị ga-eji obi ike dabere na ndụmọdụ Baịbụl. N’ihi gịnị? N’ihi na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume, ka onye nke Chineke wee ruo eru n’ụzọ zuru ezu, bụrụ onye a kwadebere n’ụzọ zuru ezu ịrụ ezi ọrụ niile.”—2 Timoti 3:16, 17.
N’eziokwu, itinye ndụmọdụ Baịbụl n’ọrụ ná ndụ anyị chọrọ mgbalị na njide onwe onye. Mgbe ụfọdụ, Baịbụl nwere ike inye anyị ndụmọdụ ka anyị mee ihe anyị na-achọchaghị ime. (Jenesis 8:21) Ma, ọ bụrụ na anyị kwetara na ọ bụ Nna anyị bi n’eluigwe nke hụrụ anyị n’anya kere anyị, anyị kwesịrị nnọọ ikweta na ọ ma ihe kacha mma anyị kwesịrị ime. (Aịzaya 55:9) Ọ bụ ya mere Okwu ya ji gwa anyị, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.” (Ilu 3:5, 6) Ọ bụrụ na anyị anabata ndụmọdụ ahụ, ọtụtụ nchegbu anyị na-enwe ma nsogbu bịara anyị na nke anyị na-enwe mgbe anyị chọrọ ime mkpebi ga-akwụsị.
Mgbe ndị ọzọ kpọrọ anyị asị n’enweghị ihe anyị mere ha, anyị agaghị echegbuwe onwe anyị na o nweghị uru anyị bara, na-eche na anyị abachaghị uru otú ndị agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ndị obodo ọzọ bara. Kama nke ahụ, obi ga-esi anyị ike na anyị bara uru. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Nna anyị, bụ́ Jehova Chineke, “adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.”—Ọrụ 10:34, 35.
Ịmara nke a ga-eme ka anyị ghara ikwe ka ịkpọ asị mebie otú anyị si ele ndị ọzọ anya. Anyị ga-aghọta na ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji chee na anyị ka ndị agbụrụ ọzọ mma, ebe ọ bụ na Chineke sitere “n’otu mmadụ mee mba ọ bụla nke ụmụ mmadụ, ka ha biri n’elu ala dum.”—Ọrụ 17:26.
N’eziokwu, ihe ga-eme ka obi ruo anyị nnọọ ala bụ ịmata na e kere anyị eke nakwa na Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya. Ma, a ka nwere ihe ọzọ dị anyị mkpa nke ga-eme ka obi na-eru anyị ala.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
Ụmụ mmadụ hà si n’anụmanụ pụta?
[Foto dị na peeji nke 5]
Ịmata na Onye kere anyị hụrụ anyị n’anya ga-eme ka obi ruo anyị ala