Jiri “Okwu Dị Ụtọ” Mee Ka Udo Dịrị n’Ezinụlọ Gị
Jiri “Okwu Dị Ụtọ” Mee Ka Udo Dịrị n’Ezinụlọ Gị
AHỤ́ nọ na-agbakasị David n’ụgbọala ebe ọ nọ na-eche nwunye ya. Ya nọtụ, ya elee anya n’elekere ọ gba n’aka. Mgbe Diane, bụ́ nwunye ya, mechara pụta n’èzí, David ejidelighị iwe juru ya obi.
Ọ baara ya mba, sị, “Gịnị ka ị nọ na-eme mụ anọrọ ebe a na-eche gị kemgbe? O nweghị mgbe ị na-aga ihe n’oge! Ọ̀ bụ na o nwetụghị mgbe ị ga-ejikere ngwa ngwa?”
Ahụ́ gwụrụ Diane. Ya ebere ákwá gbaghachi n’ụlọ. Ozugbo ahụ, David ghọtara na ya emebiela ihe. Iwe a o were mere ka ihe ka njọ. Oleezi ihe ọ ga-eme ugbu a? Ọ gbanyụrụ ụgbọala ahụ, maa ọsụ ma jiri nwayọọ sochie ya azụ.
Ihe atụ a na-egosi ihe na-eme eme, ọ́ bụghị ya? Ọ̀ dịtụla mgbe i nwere mwute n’ihi ihe i kwuru? Anyị na-ekwukarị ihe anyị na-emecha kwaara ụta ma ọ bụrụ na anyị echeghị echiche kwuo okwu. E nwere ezigbo ihe mere Baịbụl ji sị: “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche iji zaa okwu.”—Ilu 15:28.
Ma, o nwere ike isiri anyị ike iche echiche nke ọma tupu anyị ekwuo okwu, karịchaa, ma ọ bụrụ na iwe na-ewe anyị, ma ọ bụ na ụjọ na-atụ anyị, ma ọ bụkwanụ na e mere anyị ihe na-ewute anyị. Anyị chọzie ikwu otú ọ dị anyị n’obi, ọ gaghị esi ike anyị atawa ndị ọzọ ụta ma ọ bụ katọwa ha, karịchaa ma ha bụrụ ndị ezinụlọ anyị. Nke ahụ nwekwara ike ịkpasu ndị ọzọ iwe ma ọ bụ mee ka anyị na ha rụwa ụka.
Gịnị ka anyị ga-eme ka ihe wee ka mma? Olee otú anyị nwere ike isi na-ejide mmụọ anyị? Anyị nwere ike inweta ndụmọdụ ga-abara anyị uru n’aka onye so dee Baịbụl bụ́ Sọlọmọn.
Chebara Ihe Ị Ga-ekwu na Otú Ị Ga-esi Kwuo Ya Echiche
Mgbe Sọlọmọn, bụ́ onye dere akwụkwọ Baịbụl bụ́ Ekliziastis, na-ede banyere otú ndụ si bụrụ ihe efu, o yiri ka ihe ya onwe ya chere banyere ndụ dị ya oké mkpa. Ọ sịrị, “Akpọkwara m ndụ asị.” O nwere mgbe ọ kpọrọ ya “ihe efu kasị ihe efu niile.” (Ekliziastis 2:17; 12:8) Ma, ihe Sọlọmọn dere n’Ekliziastis egosighị na ike ndụ agwụla ya. O cheghị na o kwesịrị ekwesị ikwu naanị ihe dị njọ banyere ndụ. Mgbe Sọlọmọn na-apịachi akwụkwọ ya, o kwuru na ya “gbara mbọ ịchọta okwu dị ụtọ na ide okwu ziri ezi bụ́ eziokwu.” (Ekliziastis 12:10) Nsụgharị ọzọ sịrị na ọ “gbalịrị ikwu ihe ndị a n’ụzọ kacha mma nakwa n’ụzọ kacha zie ezi.”—Nsụgharị Contemporary English Version.
O doro anya na Sọlọmọn ghọtara na ya ekwesịghị ikwucha ihe otú ọ dị ya n’obi. E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, ọ nọ na-ajụ onwe ya, sị: ‘Ihe a m na-achọ ikwu ọ̀ bụ eziokwu, ma ọ bụkwanụ, ò ziri ezi? Ọ bụrụ na m kwuo ya otú a
ọ̀ ga-atọ ndị ọzọ ụtọ, ọ̀ ga-adịkwa ha mma?’ Ịchọ “okwu dị ụtọ” bụ́ eziokwu mere ka ọ ghara ikwucha ihe otú ọ dị ya n’obi.Ọ bụghị naanị na nke a mere ka akwụkwọ ahụ magbuo onwe ya, kamakwa, ọ bụ ebe e si enweta amamihe si n’ike mmụọ nsọ banyere ndụ. (2 Timoti 3:16, 17) Otú ahụ Sọlọmọn si kwuo okwu n’isiokwu ahụ nke siri ike itinye ọnụ, ò nwere ike inyere anyị aka ka anyị na ndị anyị hụrụ n’anya na-ekwurịta okwu nke ọma karị? Tụlee otu ihe atụ.
Mụta Ijide Mmụọ Gị
Dị ka ihe atụ, otu nwatakịrị ji rịpọt kaadị ya si ụlọ akwụkwọ gbarụrụ ihu lọta. Nna ya elee anya na rịpọt kaadị ya hụ na ọ dara otu ihe ọmụmụ. Ozugbo ahụ, nna ya were iwe wee cheta ọtụtụ ugboro nwata ahụ na-emeghị ihe omume e nyere ya ka o mee n’ụlọ. Nna ya achọọ ka ọ sị ya: “Ị dị umengwụ! Ọ bụrụ na i jiri aka a, ị gaghị aba uru!”
Ma tupu nna ahụ ekwuo ihe ahụ na-adịghị mma dị ya n’obi, ọ ga-aka mma ka o buru ụzọ jụọ onwe ya, sị, ‘Ihe a dị m n’obi ọ̀ bụdị eziokwu, ma ọ bụkwanụ, ò ziri ezi?’ Ajụjụ a nwere ike inyere ya aka ichezi echiche echezi ghọta nke bụ́ eziokwu. (Ilu 17:27) Ọ̀ bụ eziokwu na nwata ahụ agaghị aba uru ná ndụ maka na ọ dara otu ihe ọmụmụ? Ọ̀ bụ onye umengwụ n’ezie, ka ihe mere o ji ghara ime ihe omume ahụ e nyere ya ka o mee n’ụlọ ọ̀ bụ maka na o nwere ihe siiri ya ike ịghọta na ya? Baịbụl kwusiri ike ugboro ugboro na ọ dị mkpa ka anyị jiri ezi uche na-eleru ihe anya. (Taịtọs 3:2; Jems 3:17) Otú nne ma ọ bụ nna ga-esi gbaa nwatakịrị ume bụ ikwu “okwu ziri ezi bụ́ eziokwu.”
Chọta Okwu Ziri Ezi
Ozugbo nna ahụ kpebiri ihe ọ ga-ekwu, o nwere ike ịjụ onwe ya, sị, ‘Olee otú m ga-esi kwuo ya ka ọ tọọ nwa m ụtọ, dịkwa ya mma?’ N’ezie, ịchọta okwu ziri ezi adịghị mfe. Ma, ọ dị mkpa ka ndị mụrụ ụmụ cheta na ndị ka na-eto eto na-echekarị na ọ bụrụ na ha anaghị emetacha ihe nke ọma na ha abaghị uru ọ bụla. Otu ebe ha na-anaghị eme nke ọma nwere ike inyewe ha nsogbu nke na ha ga-eche na o nweghị ihe ọ bụla ha dị mma ya. Ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ejideghị onwe ya, o nwere ike ime ka nwa ahụ chewekwuo echiche na-adịghị mma banyere onwe ya. Ndị Kọlọsị 3:21 sịrị: “Unu adịla na-akpasu ụmụ unu iwe, ka ha wee ghara ịda mbà n’obi.”
Okwu ndị dị ka “mgbe niile” na “ọ dịghị mgbe” anaghị akọkarị otú ihe dị, ha na-akọkarịkwa ihe karịa otú ọ dị. Mgbe nne ma ọ bụ nna sịrị, “Ọ dịghị mgbe ị ga-aba uru ná ndụ,” nwa ahụ ọ̀ ka ga na-ele onwe ya anya ọma? Ọ bụrụ na a na-agwa nwata ụdị okwu nkatọ ahụ mgbe niile, o nwere ike iche na ya agaghị aba uru ná ndụ. Ma, ọ bụghị naanị na ụdị okwu ahụ na-akụda obi, ọ bụkwa ụgha.
Ọ na-akacha mma ịhụta ihe dị mma n’ihe ọ bụla mmadụ mere. Nna ahụ anyị ji mee ihe atụ nwere ike ịsị: “Nwa m, ahụrụ m na ihe ọmụmụ ahụ ị dara na-ewute gị. Ama m na ị na-agụsi akwụkwọ ike. Ka anyị kwuo maka ihe ọmụmụ ahụ ị dara wee mara ihe anyị ga-eme ka ị ghara ịda ya ọzọ.” Iji mata ụzọ kacha mma ọ ga-esi nyere nwa ya aka, nna ahụ nwere ike ịjụ nwa ahụ ajụjụ ụfọdụ iji chọpụta ihe bụ́ nsogbu ya.
Ibu ụzọ chee echiche ma jiri obiọma gwa mmadụ okwu otú a ga-aka aba uru karịa iji iwe. Baịbụl na-emesi anyị obi ike, sị: “Okwu ọma bụ ụgbụgbọ mmanụ aṅụ, ọ na-atọ mkpụrụ obi ụtọ, bụrụkwa ihe na-agwọ ọkpụkpụ.” (Ilu 16:24) Ma ụmụaka ma ndị niile ọzọ nọ n’ezinụlọ na-eme nke ọma ma ọ bụrụ na udo na ịhụnanya dị.
‘Ihe Jupụtara Mmadụ n’Obi’
Chee echiche banyere nwoke ahụ a kọrọ akụkọ ya ná mmalite isiokwu a. Ọ́ gaghị aka mma ma à sị na o ji nwayọọ chọta “okwu dị ụtọ” bụ́ eziokwu kama iji iwe gwa nwunye ya ihe dị ya n’obi? Nwoke ọ bụla nwunye ya mere otú ahụ kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ọ bụrụgodị na o kwesịrị ka nwunye m tinyekwuo mgbalị na-emecha ihe ọ na-eme n’oge, ọ̀ bụ eziokwu na o nweghị mgbe ọ na-aga ihe n’oge? Ọ̀ bụ mgbe ahụ ka ọ kacha mma ikwulite ya? Ịkatọ ya n’iwe ọ̀ ga-eme ka ọ na-emecha ihe n’oge?’ Ibu ụzọ jụọ Ilu 29:11.
onwe anyị ụdị ajụjụ ndị a nwere ike inyere anyị aka ka anyị ghara ịma ụma na-emejọ ndị anyị hụrụ n’anya.—Gịnị ka anyị ga-eme ma ọ bụrụ na anyị na-esekarị okwu ma anyị kparịtawa ụka n’ezinụlọ anyị? Ma eleghị anya, ọ ga-adị mkpa ka anyị leruo anya ala chọpụta ihe mere anyị na-eji ekwu ụdị okwu anyị na-ekwu. Ihe anyị na-ekwu karịchaa mgbe obi na-adịchaghị anyị mma ma ọ bụ mgbe ihe na-esiri anyị ike, nwere ike igosi ihe dị anyị n’obi. Jizọs sịrị: “Ọ bụ ihe jupụtara mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Matiu 12:34) E kwuo ya n’ụzọ ọzọ, okwu anyị na-egosikarị ihe dị anyị n’obi, ọchịchọ anyị, na àgwà anyị.
Otú anyị si ele ndụ anya ọ̀ na-egosi na obi siri anyị ike nakwa na anyị nwere olileanya ná ndụ? Ọ bụrụ otú ahụ, otú anyị si ekwu okwu na ihe anyị na-ekwu ga na-egosi nke ahụ. Ànyị na-achọkarị ka okwu bie n’ọnụ anyị, ma ọ bụ na-egosi na anyị enweghị nchekwube ná ndụ ma ọ bụ na-akatọ ndị ọzọ? Ọ bụrụ otú ahụ, ihe anyị na-ekwu ma ọ bụ otú anyị si ekwu ya nwere ike ịkụda ndị ọzọ obi. E nwere ike anyị amaghị na ihe dị anyị n’obi ma ọ bụ ihe anyị na-ekwu adịghị mma. Anyị nwedịrị ike iche na otú anyị si ele ihe anya ziri ezi. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya ka anyị ghara ịghọgbu onwe anyị.—Ilu 14:12.
Ọ bụ ihe magburu onwe ya na anyị nwere Okwu Chineke. Baịbụl ga-enyere anyị aka inyocha ihe ndị dị anyị n’obi, nyekwara anyị aka ịmata ndị ziri ezi n’ime ha nakwa ndị anyị ga-ewepụ n’obi anyị. (Hibru 4:12; Jems 1:25) N’agbanyeghị ụdị àgwà anyị bu pụta ụwa ma ọ bụ otú e si zụlite anyị, anyị niile nwere ike ịgbanwe otú anyị si eche echiche nakwa otú anyị si eme ihe ma ọ bụrụ n’ezie na anyị chọrọ.—Ndị Efesọs 4:23, 24.
E wezụga ịgụ Baịbụl, ọ dị ihe ọzọ anyị nwere ike ime iji ghọta otú anyị si agwa ndị ọzọ okwu. Jụọ ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, jụọ di gị ma ọ bụ nwunye gị ma ọ bụ nwa gị ka ọ gwa gị ihe bụ́ eziokwu banyere otú i si agwa ndị ọzọ okwu. Jụọ enyi gị tozuru okè bụ́ onye maara gị nke ọma. Ịdị umeala n’obi ga-enyere gị aka ịnabata ihe ha ga-agwa gị nakwa ime mgbanwe ndị dị mkpa.
Chee Echiche Tupu Gị Ekwuo Okwu!
Mee elu mee ala, ọ bụrụ n’ezie na anyị achọghị ịgwa ndị ọzọ okwu ga-ewute ha, anyị aghaghị ime ihe Ilu 16:23 kwuru. Ọ sịrị: “Ndị nwere ọgụgụ isi [ya bụ, ndị maara ihe] na-eche echiche tupu ha ekwuo okwu; ihe ha na-ekwu na-erukwa n’obi karị.” (Nsụgharị Today’s English Version) Ọ bụghị mgbe niile ka ọ na-adịrị anyị mfe ijide mmụọ anyị. N’agbanyeghị nke ahụ, ọ bụrụ na anyị agbalịa ịghọta ndị ọzọ kama ibo ha ebubo ma ọ bụ iweda ha ala, ịchọta okwu ziri ezi anyị ga-eji kọwaa ihe anyị bu n’obi ga-adịkwuru anyị mfe.
O doro anya na ọ dịghị onye n’ime anyị zuru okè. (Jems 3:2) Mgbe ụfọdụ anyị niile na-ekwu okwu n’echeghị echiche. (Ilu 12:18) Ma, Okwu Chineke ga-enyere anyị aka ịmụta iche echiche tupu anyị ekwuo okwu, nyekwara anyị aka ibute ihe dị ndị ọzọ mma nakwa ọdịmma ha ụzọ. (Ndị Filipaị 2:4) Ka anyị kpebisie ike ịchọta “okwu dị ụtọ” bụ́ eziokwu, karịchaa mgbe anyị na-agwa ndị ezinụlọ anyị okwu. Ọ bụrụ na anyị mee nke a, okwu anyị agaghị na-ewute ndị ọzọ ma ọ bụ na-eweda ha ala, kama nke ahụ, ọ ga na-eme ka obi dị ndị anyị hụrụ n’anya ụtọ, na-ewulikwa ha elu.—Ndị Rom 14:19.
[Foto dị na peeji nke 12]
Olee otú i nwere ike isi zere ikwu ihe ị ga-emecha kwaara ụta?