ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Septemba 2014
Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Ọktoba 27 ruo na Nọvemba 30, 2014.
Ị̀ ‘Na-agbalị Ka I Ruo Eruo’?
Olee otú i kwesịrị isi mee ya?
Obi Ò Siri Gị Ike na Ị Chọtala Eziokwu? N’ihi Gịnị?
Isiokwu a ga-ekwu ihe ụfọdụ mere ọtụtụ ndị ji kweta na Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu nakwa ihe mere obi ji sie Ndịàmà Jehova ike na ha achọtala eziokwu.
Jiri Obi Gị Niile Na-ejere Chineke Ozi n’Agbanyeghị “Ọtụtụ Mkpagbu”
Nsogbu na-abịara onye ọ bụla bi n’ụwa Setan. Olee ụfọdụ ụzọ Setan si alụso anyị ọgụ? Olee otú anyị ga-esi jikere ejikere?
Ndị Nne na Nna, Na-azụnụ Ụmụ Unu
Baịbụl gwara ndị nne na nna ka ha na-azụ ụmụ ha “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Ndị Efesọs 6:4) Isiokwu a kwuru ihe atọ ha ga-eme ka ha nwee ike ịna-azụ ụmụ ha ma nyere ha aka ịhụ Jehova n’anya.
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ihe Baịbụl kwuru n’Abụ Ọma 37:25 na Matiu 6:33 ọ̀ pụtara na Jehova agaghị ekwe ka nri kọọ Onye Kraịst?
A Ga-eme Ka Ọnwụ, Bụ́ Onye Iro Ikpeazụ, Ghara Ịdị Irè
Ọnwụ na ihe niile na-akpata ya emeela ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. Gịnị mere anyị ji anwụ? Olee otú a ga-esi ‘mee ka ọnwụ ghara ịdị irè’? (1 Ndị Kọrịnt 15:26) Mata otú azịza ajụjụ ndị a si egosi amamihe Jehova, ikpe ziri ezi ya, na ịhụnanya ya.
Na-echeta Ndị Nọ n’Ozi Oge Niile
Ọtụtụ ndị ohu Jehova na-agbasi mbọ ike n’ozi oge niile. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị na-echeta ọrụ ha ji ‘ikwesị ntụkwasị obi na ịhụnanya na-arụ’?