Ì Chetara?
Ì Chetara?
Ì medala obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị ga-azali ajụjụ ndị a:
• Olee ihe atọ nwere ike ime ka anyị ghara ịbụ ndị na-anaghị eme ihe n’eziokwu?
Ha bụ: (1) Na-atụ egwu Chineke. (1 Pita 3:12) (2) Nwee akọnuche e ji Baịbụl zụọ. (3) Gbaa mbọ ka ihe i nwere na-eju gị afọ.—4/15, peeji nke 6-7.
• Olee otú anyị si mara na iji ozi Chineke kpọrọ ihe apụtaghị na anyị ga na-amachi ihu mgbe niile ma ọ bụkwanụ na anyị agaghị na-atụsara ahụ́?
Anyị nwere ike ichebara ihe nlereanya Jizọs echiche. O nwere mgbe ya na ndị ọzọ nọrịrị rie nri. Anyị ma na ọ naghị amachikarị ihu. Ndị ọzọ, ma ụmụaka, na-abịa ya nso, ahụ́ na-erukwa ha ala.—4/15, peeji nke 10.
• Gịnị ka di na nwunye nwere ike ime ma ọ bụrụ na ya adị ha ka kemgbe ha mụrụ ụmụ, ha anaghịzi emekọrịta ihe otú ha na-emebu?
Onye ọ bụla n’ime ha kwesịrị ime ka di ma ọ bụ nwunye ya mara na ya ka hụrụ ya n’anya. Onye bụ́ di ga-agbalịsi ike mee ka ahụ́ na-eru nwunye ya ala. Ha abụọ kwesịkwara ịgbasi mbọ ike na-agwarịta ibe ha otú obi dị ha na ihe na-akpa ha.—5/1, peeji nke 12-13.
• Gịnị ka e ji osisi oliv e kwuru okwu ya ná Ndị Rom isi iri na otu mee ihe atụ ya?
Osisi oliv ahụ gbasara ndị so ná mkpụrụ Ebreham, ya bụ, Izrel nke Chineke. Jehova dị ka mgbọrọgwụ nke osisi oliv ihe atụ a, ebe Jizọs dị ka ogwe ya. Mgbe ọtụtụ ndị Juu jụrụ Jizọs, a nyadoro ndị Jentaịl ghọrọ ndị kwere ekwe n’osisi ahụ. E si otú ahụ mee ka ọnụ ọgụgụ nke ndị ọzọ so ná mkpụrụ Ebreham zuo ezuo.—5/15, peeji nke 22-25.
• Olee ozi ọma anyị kacha kwesị izi ndị ogbenye?
Ozi ọma ahụ bụ na Chineke emeela Jizọs eze. Ọ bụ ya bụ onye ọchịchị ga-emeli ka ndị mmadụ ghara ịna-ada ogbenye. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ga-achị mmadụ niile, ọ dịkwa ike; ọ na-emetere ndị ogbenye ebere; ọ ga-akwụsịlikwa ihe ndị na-eme ka ụmụ mmadụ na-ada ogbenye, ya bụ, ndị mmadụ ịchọ naanị ọdịmma onwe ha, nke bụ́ ihe dị anyị n’ọbara.—6/1, peeji nke 7.
• Gịnị ka ihe Jizọs gwara Keyafas nke bụ́, “ọ bụ gị kwuru ya,” pụtara?—Matt. 26:63, 64.
Ọ ga-abụ na okwu ahụ bụ́ “ọ bụ gị kwuru ya” bụ otú ndị Juu si ekwu na ihe mmadụ kwuru bụ eziokwu. Nnukwu onye nchụàjà bụ́ Keyafas jụrụ Jizọs ma ọ̀ bụ ya bụ Kraịst, bụ́ Ọkpara Chineke. Ihe Jizọs zara ya, nke bụ́: “Ọ bụ gị kwuru ya” gosiri na ihe ahụ Keyafas kwuru bụ eziokwu.—6/1, peeji nke 18.
• Ụmụ Jizọs, bụ́ nwoke zuru okè, gaara amụta hà gaara eso n’ihe mgbapụta ahụ?
Ee e. Ọ bụ eziokwu na Jizọs gaara amụta ọtụtụ ijeri ụmụ zuru okè ma a sị na ọ chọrọ, ụmụ ndị ahụ ọ gaara amụta esoghị n’ihe mgbapụta ahụ. Ọ bụ naanị ndụ Jizọs nke zuru okè kwekọrọ na nke Adam.(1 Tim. 2:6)—6/15, peeji nke 13.
• Olee otú Ndị Kraịst ga-esi egosi na ha na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị ahụ e nyere banyere ndị ozizi ụgha, bụ́ nke e dere n’Ọrụ Ndịozi 20:29, 30?
Ha anaghị anabata ndị ozizi ụgha n’ụlọ ha ma ọ bụ kelee ha ekele. (Rom 16:17; 2 Jọn 9-11) Ndị Kraịst anaghịkwa agụ akwụkwọ ndị si n’ezi ofufe dapụ biri, kirie ihe ha na-eme na tiivi, ma ọ bụkwanụ gaa n’ebe ndị e dere ozizi ha n’Ịntanet.—7/15, peeji nke 15-16.
• Ònye kwesịrị ịkụziri ụmụaka banyere Chineke?
Ma nne ma nna kwesịrị ịna-eme nke a, dị ka e kwuru na Baịbụl. (Ilu 1:8; Efe. 6:4) Nchọpụta e mere gosiri na mgbe nne na nna gbakọrọ aka na-akụziri ụmụaka ihe, ụmụaka na-eme nke ọma.—8/1, peeji nke 6-7.