Nata Mmụọ Chineke, Ọ Bụghị Nke Ụwa
Nata Mmụọ Chineke, Ọ Bụghị Nke Ụwa
“Anyị natara, ọ bụghị mmụọ nke ụwa, kama mmụọ nke si na Chineke, ka anyị wee mara ihe niile Chineke ji obiọma nye anyị.”—1 KỌR. 2:12.
1, 2. (a) Olee otú o si bụrụ na ezigbo Ndị Kraịst na-alụ agha? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-atụle?
EZIGBO Ndị Kraịst na-alụ agha! Onye iro anyị dị ike, dị aghụghọ, ọ bụkwa onye agha obi tara mmiri. Ngwá agha o ji alụ agha dị ike nke mere ka o merie ọtụtụ mmadụ. Ma, nke a ekwesịghị ịkụda anyị mmụọ ma ọ bụkwanụ mee ka anyị na-eche na o nweghị ebe anyị ji azụ aga. (Aịza. 41:10) Anyị nwere ihe ga-eme ka onye ọ bụla ghara imeri anyị.
2 Anyị anaghị alụ agha nkịtị; ọ bụ agha ime mmụọ. Onye iro anyị bụ Setan bụ́ Ekwensu, ngwá agha ọ kacha jiri alụso anyị agha bụ “mmụọ nke ụwa.” (1 Kọr. 2:12) Ihe kacha echebe anyị ka Ekwensu ghara imeri anyị bụ mmụọ nsọ Chineke. Ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri ya anyị na Chineke anọgidekwa na-adị ná mma, anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ ya, otú anyị si ebi ndụ kwesịkwara igosi na anyị nwere mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Gal. 5:22, 23) Gịnịkwanụ bụ mmụọ nke ụwa, oleekwa otú o si malite ịkpa ike otú a? Olee otú anyị nwere ike isi mata ma mmụọ nke ụwa ọ̀ na-akpa ike n’ahụ́ anyị? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs banyere ịnata mmụọ Chineke nakwa ịjụ mmụọ nke ụwa?
Gịnị Mere Mmụọ nke Ụwa Ji Ju Ebe Niile?
3. Gịnị bụ mmụọ nke ụwa?
3 Mmụọ nke ụwa si n’aka Setan, bụ́ “onye na-achị ụwa.” Mmụọ a na-emegidekwa mmụọ nsọ Chineke. (Jọn 12:31; 14:30; 1 Jọn 5:19) Ọ bụ ya na-akpali ndị ụwa ime ihe otú ha si eme. Ọ bụkwa ya na-eme ka ndị mmadụ na-eme ihe megidere nzube Chineke.
4, 5. Olee otú mmụọ nke si n’aka Setan si ju ebe niile?
4 Olee otú mmụọ a nke si n’aka Setan si ju nnọọ ebe niile? Otú o si malite bụ mgbe Setan duhiere Iv n’ogige Iden. O mere ka o kweta na ihe ga-adịrị ya mma ma o nupụrụ Chineke isi. (Jen. 3:13) O si otú a gosi na ya bụ ezigbo onye ụgha. (Jọn 8:44) O sizi n’aka nwaanyị ahụ mee ka Adam nupụrụ Jehova isi. N’ihi ihe a Adam mere, o rere ụmụ mmadụ ka ha bụrụ ndị ohu nke mmehie. Nke a mere ka ụmụ mmadụ na-achọkarị inupụ isi ka Setan.—Gụọ Ndị Efesọs 2:1-3.
5 Setan duhiekwara ọtụtụ ndị mmụọ ozi, bụ́ ndị ghọrọ ndị mmụọ ọjọọ. (Mkpu. 12:3, 4) Nke a mere tupu e nwee Iju Mmiri n’oge Noa nọ ndụ. Ndị mmụọ ozi ndị ahụ kwere na ihe ga-akara ha mma ma ha hapụ ọrụ Chineke nyere ha n’eluigwe ma bịa n’ụwa na-ebi ndụ ihere. (Jud 6) Setan ji ndị mmụọ ọjọọ ndị ahụ, bụ́ ndị na-eyighịzi ahụ́ mmadụ, “na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpu. 12:9) Ọ dị mwute na ọtụtụ mmadụ amaghị na ndị mmụọ ọjọọ ndị a na-eduhie ha.—2 Kọr. 4:4.
Mmụọ nke Ụwa Ọ̀ Na-akpa Ike n’Ahụ́ Gị?
6. Olee naanị ihe nwere ike ime ka mmụọ nke ụwa kpawa ike n’ahụ́ anyị?
6 Ọtụtụ ndị amaghị na Setan na-eduhie ndị mmadụ, ma, ezigbo Ndị Kraịst ma otú o si eme nke a. (2 Kọr. 2:11) Nke bụ́ eziokwu bụ na mmụọ nke ụwa enweghị ike ịkpa ike n’ahụ́ anyị ọ gwụla ma anyị kwere ka o mee otú ahụ. Ka anyị tụlee ajụjụ anọ ga-enyere anyị aka ịmata ma ọ̀ bụ mmụọ Chineke na-edu anyị ka ọ bụkwanụ mmụọ nke ụwa.
7. Olee otu n’ime ihe ndị Setan ji agba mbọ ikewapụ anyị n’ebe Jehova nọ?
7 Olee ụdị mmadụ ihe ndị m ji atụrụ ndụ na-egosi na m bụ? (Gụọ Jems 3:14-18.) Setan na-agbasi mbọ ike ime ka anyị na Chineke ghara ịdị ná mma site n’ime ka anyị malite ịhụ ime ihe ike n’anya. Ekwensu ma na Jehova kpọrọ onye ọ bụla hụrụ ime ihe ike n’anya asị. (Ọma 11:5) N’ihi ya, Setan na-eji akwụkwọ, fim, egwú, na egwuregwu kọmputa eme ka agụụ ime ihe ọjọọ na-agụ anụ ahụ́ anyị. Ụfọdụ n’ime ihe ndị a na-eme ka ndị ji ha atụrụ ndụ na-eme omume rụrụ arụ na ihe ike. Setan achọghị ịma ma ànyị hụrụ ihe ziri ezi n’anya ma ọ bụrụhaala na o nwere ka anyị si hụ ihe na-adịghị mma ọ na-akwado n’anya.—Ọma 97:10.
8, 9. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị banyere ntụrụndụ?
8 Ma, mmụọ Chineke na-eme ka omume ndị natara ya na-adị ọcha ma na-eme udo. Ha na-ejupụtakwa n’ebere. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Otú m si atụrụ ndụ ọ̀ na-eme ka m na-akpa àgwà ndị dị mma?’ Amamihe nke si n’elu ‘adịghị ihu abụọ.’ Ndị mmụọ Chineke na-achị anaghị abụ ha gwa ndị agbata obi ha ka ha na-eme omume dị ọcha ma na-eme udo, hanwa anọrọ n’ụlọ ha na-ekiri ndị obi tara mmiri na-eme ihe ike nakwa ndị na-eme omume rụrụ arụ.
9 Jehova chọrọ ka anyị na-efe ya ofufe a na-ekewaghị ekewa. Ma, Setan chọrọ ka anyị fee ya ofufe, ya bụrụgodị otu ugboro, otú ahụ ọ chọrọ ka Jizọs mee. (Luk 4:7, 8) Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike ịjụ onwe ya, sị: ‘Ihe ndị m ji atụrụ ndụ hà na-eme ka m na-efe Chineke ofufe a na-ekewaghị ekewa? Hà na-eme ka ọ na-esikwuru m ike ịjụ mmụọ nke ụwa ka hà na-eme ka ọ na-adịkwuru m mfe? M̀ kwesịrị ime mgbanwe ọ bụla ma m chọọ otú m ga-esi atụrụ ndụ n’ọdịnihu?’
10, 11. (a) Olee ihe mmụọ nke ụwa na-eme ka ndị mmadụ na-eme banyere ihe onwunwe? (b) Olee ihe Okwu Chineke nke e ji mmụọ nsọ dee na-agwa ndị mmadụ ka ha na-eme?
10 Olee otú m si ele ihe onwunwe anya? (Gụọ Luk 18:24-30.) Mmụọ nke ụwa na-eme ka ndị mmadụ na-enwe “ọchịchọ nke anya” nke na-eme ka ha nwee anyaukwu ma na-achụ ihe onwunwe ka a na-anwụ anwụ. (1 Jọn 2:16) O meela ka ọtụtụ ndị kpebisie ike na ha ga-abarịrị ọgaranya. (1 Tim. 6:9, 10) Mmụọ a ga-eme ka anyị na-eche na o nweghị ihe ga-eme anyị n’ihi na anyị nwere nnukwu ihe onwunwe. (Ilu 18:11) Setan enwetala anyị ma ọ bụrụ na anyị hụrụ ego n’anya kama ịhụ Chineke n’anya. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ihe bụ mkpa m ọ̀ bụ inwe nnukwu ihe onwunwe nakwa ikpori ndụ?’
11 Ma, Okwu Chineke nke e ji mmụọ nsọ dee anaghị agwa anyị ka anyị na-eme ihe ndị a, kama, ọ na-akụziri anyị na anyị ekwesịghị ịna-achụ ego ọnwụ ọnwụ, na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi na-arụsi ọrụ ike iji gboo mkpa anyị na nke ezinụlọ anyị. (1 Tim. 5:8) Mmụọ Chineke na-enyere ndị natara ya aka ka ha na-emesapụ aka ka Jehova. Onye ọ bụla ma na ndị dị otú a bụ ndị na-enye enye, ha abụghị ndị weta ka e rie. Ha ma na mmadụ ibe ha karịrị ihe onwunwe, obi na-adịkwa ha ụtọ inyetụ ndị ọzọ ihe aka hanwa ruru. (Ilu 3:27, 28) Ha anaghịkwa ekwe ka ịchụ ego gbochie ha ife Chineke.
12, 13. Olee otú mmụọ Chineke, bụ́ nke dị iche na nke ụwa, ga-esi nyere anyị aka ịkpa ezigbo àgwà?
Ndị Kọlọsi 3:8-10, 13.) Mmụọ nke ụwa na-eme ka ndị mmadụ na-arụ ọrụ nke anụ ahụ́. (Gal. 5:19-21) Ihe ga-eme nnọọ ka a mara mmụọ nke na-edu anyị abụghị mgbe ihe niile dị mma, kama, ọ bụ mgbe ihe na-anaghị agazicha otú o kwesịrị, dị ka mgbe nwanna anyị leghaara anyị anya ma ọ bụ chọọ anyị okwu, ma ọ bụkwanụ mee anyị ihe ọjọọ. Mgbe ọzọ e ji ama mmụọ nke na-edu anyị bụ mgbe anyị nọ naanị anyị n’ụlọ anyị. Anyị kwesịrị inyocha onwe anyị nke ọma. Jụọ onwe gị, sị: ‘Kemgbe ọnwa isii, otú m si akpa àgwà ọ̀ na-egosi nnọọ na m na-eme ka Kraịst, ka m̀ na-ekwuzi okwu otú m si ekwu tupu mụ aghọọ Onye Kraịst, ma ọ bụ na-akpa àgwà ọjọọ m na-akpabu?’
12 Olee mmụọ nke omume m na-egosi na m nwere? (Gụọ13 Mmụọ Chineke ga-enyere anyị aka ‘iyipụ mmadụ ochie ahụ na omume ya’ ma yiri “mmadụ ọhụrụ ahụ.” Nke a ga-enyere anyị aka ịhụkwu ndị ọzọ n’anya ma jiri obiọma na-emeso ha ihe. Ọ ga-eme ka anyị na-agbaghara ibe anyị kpamkpam ọ bụrụgodị na o yie ka ànyị nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji mee mkpesa. Nke a ga-eme ka anyị ghara iji ‘obi ilu na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị’ na-agwa ndị ọ dị anyị ka hà mejọrọ anyị okwu. Kama nke ahụ, anyị ga-agba mbọ ‘na-enwe obi ọmịiko.’—Efe. 4:31, 32.
14. Olee otú ọtụtụ ndị nọ n’ụwa si ele Okwu Chineke anya?
14 M̀ na-erube isi n’iwu dị na Baịbụl ma na-enwe mmasị idebe ha? (Gụọ Ilu 3:5, 6.) Ndị mmụọ nke ụwa na-edu anaghị erube isi n’ihe dị n’Okwu Chineke. Ha na-eleghara ihe ọ bụla dị na Baịbụl anya, bụ́ nke ha chere na ọ na-enye ha nsogbu. Kama irube isi n’ihe dị n’Okwu Chineke, ha na-ahọrọ irube isi n’ọdịnala mmadụ ma na-anabata echiche ndị ọkachamara. (2 Tim. 4:3, 4) Ụfọdụ na-eleghara Okwu Chineke anya kpamkpam. Ha na-ekwu na Baịbụl abaghị uru nakwa na ọ naghị ekwu eziokwu. Ha si otú a bụrụ ndị ma ihe n’anya onwe ha. Ha na-elelị ihe Baịbụl kwuru banyere ịkwa iko, nwoke idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị idina nwaanyị ma ọ bụkwanụ ịgba alụkwaghịm. Ha na-ekwu na “ihe ọma bụ ihe ọjọọ, na ihe ọjọọ bụ ihe ọma.” (Aịza. 5:20) Ànyị na-eme ka ha? Mgbe nsogbu bịaara anyị, ànyị na-atụkwasị obi n’amamihe anyị ma ọ bụkwanụ n’amamihe mmadụ ọzọ? Ka ànyị na-agba mbọ irube isi na ndụmọdụ Baịbụl?
15. Kama ịdabere n’amamihe anyị nwere, gịnị ka anyị kwesịrị ime?
15 Mmụọ Chineke na-eme ka anyị na-erube isi n’ihe Baịbụl kwuru. Dị ka otu ọbụ abụ mere, anyị na-ele okwu Chineke anya ka oriọna nke na-enye ụkwụ anyị ìhè nakwa ìhè na-enwu n’okporo ụzọ anyị. (Ọma 119:105) Kama ịdabere n’amamihe anyị nwere, obi kwesịrị isi anyị ike na Okwu Chineke ga-enyere anyị aka ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ọ bụghị naanị na anyị kwesịrị ịna-erube isi n’iwu dị na Baịbụl, anyị kwesịkwara ịhụ iwu Chineke n’anya.—Ọma 119:97.
Ṅomie Jizọs
16. Gịnị ka inwe “uche nke Kraịst” pụtara?
16 Anyị ga-enwerịrị “uche nke Kraịst” tupu anyị anata mmụọ Chineke. (1 Kọr. 2:16) Inwe “ụdị echiche ahụ Kraịst Jizọs nwere” pụtara na anyị kwesịrị ịma otú o si chee echiche na otú o si mee ihe mgbe ọ bịara n’ụwa ma ṅomie ya. (Rom 15:5; 1 Pita 2:21) Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ụzọ anyị nwere ike isi mee nke a.
17, 18. (a) Gịnị ka anyị mụtara n’aka Jizọs banyere ekpere? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị ‘ịna-arịọ’ Jehova arịrịọ?
17 Na-ekpe ekpere ka Chineke nye gị mmụọ ya. Tupu e jide Jizọs kpee ya ikpe, o kpekuru Chineke ekpere ka o mee ka mmụọ ya nyere ya aka. (Luk 22:40, 41) Anyịnwa kwesịkwara ịrịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. Jehova na-eji obiọma enye ndị niile rịọrọ ya mmụọ ya mmụọ ya ma ha jiri okwukwe rịọ ya. (Luk 11:13) Jizọs sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ, a ga-emeghere unu. N’ihi na onye ọ bụla nke na-arịọ na-arịọta, onye ọ bụla nke na-achọkwa na-achọta, onye ọ bụla nke na-akụkwa ka a ga-emeghere.”—Mat. 7:7, 8.
18 Mgbe ọ bụla ị chọrọ ka Jehova nye gị mmụọ ya ma ọ bụkwanụ chọọ ka Jehova nyere gị aka, ekwela ka ike ịrịọ ya mmụọ ya gwụ gị. Anyị kwesịrị ịna-ekpe ekpere ugboro ugboro, na-ekpetekwa ya aka. Mgbe ụfọdụ, tupu Jehova azaa ekpere, ọ na-agba nkịtị ka ndị kpekuru ya ekpere gosi na ihe ha na-arịọ ya dị ha mkpa nakwa na ha nwere okwukwe na ọ ga-aza ekpere ha. *
19. Olee ihe Jizọs mere mgbe niile, gịnịkwa mere anyị ji kwesị iṅomi ya?
19 Rubere Jehova isi n’ihe niile. Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, o mere ihe dị Nna ya mma mgbe niile. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, o nwere otu oge ihe Jizọs nwere mmasị ime dị iche n’ihe Nna ya chọrọ ka o mee. Ma, o ji obi ike gwa Nna ya, sị: “Ka uche gị mee, ọ bụghị nke m.” (Luk 22:42) Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-erubere Chineke isi mgbe ọ na-adịrịghị m mfe ime otú ahụ?’ Anyị kwesịrị irubere Chineke isi ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịdị ndụ. Anyị kwesịrị irubere ya isi n’ihe niile n’ihi na ọ bụ Onye kere anyị, Onye nyere anyị ndụ, na Onye ji anyị ndụ. (Ọma 95:6, 7) O nweghị ihe anyị ga-eji dochie irubere ya isi. Anyị enweghị ike inweta ihu ọma Chineke ma ọ bụrụ na anyị anaghị erubere ya isi.
20. Olee ihe bụ mkpa Jizọs mgbe ọ bịara n’ụwa, oleekwa otú anyị nwere ike isi ṅomie ya?
20 Mara Baịbụl nke ọma. Mgbe Jizọs na-aza Setan okwu mgbe ọ na-anwa ya ọnwụnwa, o kwuru ọtụtụ ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ. (Luk 4:1-13) Jizọs ji Okwu Chineke gwa ndị ozi ọma ọ na-ezi na-adịghị mma okwu. (Mat. 15:3-6) Ihe bụ mkpa Jizọs bụ ịmara iwu Chineke na imezu ya. (Mat. 5:17) Anyịnwa kwesịkwara ịna-amụ Okwu Chineke, bụ́ ihe ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. (Fil. 4:8, 9) O nwere ike ịna-esiri ụfọdụ n’ime anyị ike iwepụta oge ha ga-eji na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye ma ọ bụkwanụ ọmụmụ ihe ezinụlọ. Kama ichewe mgbe oge ga-adapụta, anyị nwere ike isi n’ihe ndị ọzọ anyị na-eme wepụta oge anyị ga-eji na-amụ ihe.—Efe. 5:15-17.
21. Olee ndokwa e merela nke ga-enyere anyị aka ịghọtakwu Okwu Chineke, nyekwara anyị aka ime ya eme?
21 “Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” enyerela anyị aka hazie oge anyị ga-eji na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye na nke Mat. 24:45) Ị̀ na-akwado ndokwa a wee na-enwe ọmụmụ ihe onwe onye ma ọ bụ nke ezinụlọ kwa izu? Iji nwee uche Kraịst, mgbe ị na-enwe ọmụmụ ihe a, ì nwere ike ịmụ banyere ihe dị iche iche Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, ị mụchaa otu ị mụwa ọzọ? I nwere ike iji Watch Tower Publications Index chọta ihe ndị ga-enyere gị aka ịghọta ihe dị gị mkpa. Dị ka ihe atụ, malite n’afọ 2008 ruo n’afọ 2010, isiokwu bụ́ “Ihe Anyị Mụtara n’Aka Jizọs” pụtara ugboro iri na abụọ n’Ụlọ Nche nke ọhaneze. I nwere ike iji ihe na-agba n’isiokwu a malite ịmụ ihe. Malite n’afọ 2006, Teta! buru isiokwu bụ́ “Olee Ihe Ị Ga-aza?” Ihe mere e ji jụọ ajụjụ ndị dị n’isiokwu a bụ ka ha nyere gị aka ịmatakwu ọtụtụ ihe n’Okwu Chineke. Ọ̀ bụ na ọ gaghị adị mma ma ihe na-adị n’isiokwu a soro n’ihe unu ga na-atụle site n’oge ruo n’oge n’Ofufe Ezinụlọ unu na-enwe?
ezinụlọ site n’ime ndokwa ka anyị na-enwe Ofufe Ezinụlọ n’otu mgbede kwa izu. (Anyị Ga-emerili Ụwa
22, 23. Gịnị ka anyị ga-emerịrị iji merie ụwa?
22 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka mmụọ Chineke na-edu anyị, anyị ga-ajụrịrị mmụọ nke ụwa. Ịjụ mmụọ nke ụwa adịghị mfe. O nwere ike ịbụ ọgụ na mgba. (Jud 3) Ma, anyị nwere ike imeri! Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “N’ụwa, unu na-enwe mkpagbu, ma nweenụ obi ike! Emeriwo m ụwa.”—Jọn 16:33.
23 Anyịnwa ga-emerikwa ụwa ma ọ bụrụ na anyị ajụ mmụọ ya ma mee ike anyị niile iji nata mmụọ Chineke. N’eziokwu, “ọ bụrụ na Chineke nọnyeere anyị, ònye ga-emegide anyị?” (Rom 8:31) Ọ bụrụ na anyị anata mmụọ Chineke ma na-erubere ya isi site n’ime ihe dị na Baịbụl, anyị ga-enwe afọ ojuju, obi ga-eru anyị ala, anyị ga-enwekwa obi ụtọ, obi esiekwa anyị ike na anyị ga-abanye n’ụwa ọhụrụ a ga-enwe n’oge na-adịghị anya.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 18 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu banyere ekpere, gụọ peeji nke 170-173 n’akwụkwọ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Ì Chetara?
• Gịnị mere mmụọ nke ụwa ji ju ebe niile?
• Olee ajụjụ anọ anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
• Olee ihe atọ anyị mụtara n’aka Jizọs banyere ịnata mmụọ Chineke?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 8]
Olee otú ndị mmụọ ozi ụfọdụ si ghọọ ndị mmụọ ọjọọ?
[Foto dị na peeji nke 10]
Setan na-eji mmụọ nke ụwa eduhie ndị mmadụ, ma, anyị nwere ike inwere onwe anyị