Nweta Ngọzi Site n’Aka Eze Nke Mmụọ Chineke Na-edu!
Nweta Ngọzi Site n’Aka Eze Nke Mmụọ Chineke Na-edu!
“Mmụọ Jehova ga-adakwasị ya.”—AỊZA. 11:2.
1. Olee ihe ụfọdụ ndị kwuru banyere nsogbu e nwere n’ụwa?
N’AFỌ 2006, Stephen Hawking, bụ́ ọkà mmụta banyere ihe ndị dị na mbara igwe, jụrụ, sị: “N’ụwa a nke ndị ọchịchị na ọhaneze nọ n’ọgba aghara, nakwa nke e mebisirila, olee otú ụmụ mmadụ ga-esi dịruo ndụ otu narị afọ ọzọ?” Otu akụkọ nke gbara n’otu akwụkwọ akụkọ kwuru, sị: “Anyị akwụsịbeghị ịda ogbenye ma ọ bụ mee ka udo dị n’ụwa niile. Kama nke ahụ, o yiri ka ihe anyị merela ọ̀ bụ ime ka e nwekwuo ndị ogbenye na ọgba aghara. Ọ bụghị n’ihi na anyị agbalịbeghị. Anyị anwaleela ihe niile, ma ụdị gọọmenti nke ji aka ya ekpebi otú akụnụba onye ọ bụla ga-aha, ma ụdị gọọmenti nke na-anaghị etinyecha anya n’akụnụba ọhaneze; anyị agbalịala igbochi agha site n’ihiwe Njikọ Mba Niile, gbalịakwa ịkwakọba ngwá agha iji gbochie agha. Anyị alụọla ọtụtụ ‘agha iji kwụsị agha’ n’ihi na anyị chere na anyị ma otú e si akwụsị agha.”
2. N’oge na-adịghị anya, olee otú Jehova ga-esi gosi na ọ bụ ya kwesịrị ịchị ụwa?
2 Ihe a ndị mmadụ kwuru anaghị eju ndị ohu Jehova anya. Baịbụl gwara anyị na e keghị ụmụ mmadụ ka ha na-achị ibe ha. (Jere. 10:23) Ọ bụ naanị Jehova kwesịrị ịchị anyị n’ihi na ọ bụ Ọkaakaa. N’ihi ya, ọ bụ naanị ya kwesịrị ịgwa anyị ihe anyị ga-eme nakwa otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ, olileanya anyị kwesịrị inwe nakwa otú ihe ahụ anyị na-atụ anya ya ga-esi ruo anyị aka. Ihe ọzọ bụ na ọ ga-akwụsị mbọ ụmụ mmadụ na-agba ịchị onwe ha, bụ́ nke na-enweghị isi. Ọ ga-egbukwa ndị niile jụrụ ọchịchị ya. Ọ bụ ọjụjụ ụmụ mmadụ jụrụ ọchịchị ya mere ka ha bụrụ ohu nke mmehie, ezughị okè, na nke “chi nke usoro ihe a,” bụ́ Setan bụ́ Ekwensu.—2 Kọr. 4:4.
3. Olee amụma Aịzaya buru banyere Mesaya?
3 Na Paradaịs a ga-enwe n’ụwa ọhụrụ, Jehova ga-eji Alaeze Mesaya chịa ụmụ mmadụ ọchịchị ọma. (Dan. 7:13, 14) Aịzaya buru amụma banyere Eze ga-achị n’Alaeze ahụ, sị: “Alaka ga-esi n’úkwù osisi Jesi puo; ome nke si na mgbọrọgwụ ya pulite ga-amị mkpụrụ. Mmụọ Jehova ga-adakwasị ya, bụ́ mmụọ amamihe na nke nghọta, mmụọ ndụmọdụ na nke ịdị ike, mmụọ ihe ọmụma na nke egwu Jehova.” (Aịza. 11:1, 2) Olee otú Chineke sirila jiri mmụọ nsọ mee ka Jizọs Kraịst, bụ́ ‘alaka si n’úkwù osisi Jesi puo,’ ruo eruo ịchị ụmụ mmadụ? Olee ihe ọma ọchịchị ya ga-eweta? Oleekwa ihe anyị ga-eme ka anyị wee nweta ihe ọma ndị ahụ?
Ọ Bụ Chineke Mere Ka Jizọs Ruo Eruo Ịchị Ụmụ Mmadụ
4-6. Olee ihe Jizọs ma nke mere ka o ruo eruo ịbụ Eze maara ihe ma nwee obiọma, Nnukwu Onye Nchụàjà, na Onyeikpe?
4 Jehova chọrọ ka Eze maara ihe ma nwee obiọma, onye bụkwa Nnukwu Onye Nchụàjà, na Onyeikpe, mee ka ụmụ mmadụ ndị na-erubere ya isi zuo okè. Ọ bụ ya mere Chineke ji họrọ Jizọs Kraịst, bụ́ onye o ji mmụọ nsọ mee ka o ruo eruo ịrụ ọrụ ndị a dị ezigbo mkpa. Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ mere anyị ji
kwuo na Jizọs ga-arụli nnọọ ọrụ ndị a Chineke nyere ya.5 Jizọs ma Chineke nke ọma karịa onye ọ bụla ọzọ. Ọkpara a Chineke mụrụ naanị ya maara Nna ya kemgbe karịa onye ọ bụla ọzọ, ikekwe ọ ma ya kemgbe ọtụtụ ijeri afọ. N’oge ahụ, Jizọs ma ihe niile banyere Jehova, ọ bụ ya mere e ji kpọọ ya “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya.” (Kọl. 1:15) Jizọs kwuru, sị: “Onye hụrụ m ahụwokwa Nna m.”—Jọn 14:9.
6 Ọ bụ Jizọs na-esote Jehova. Ọ ma otú e si kee ihe niile, tinyere ụmụ mmadụ. Ndị Kọlọsi 1:16, 17 kwuru, sị: “E si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile n’eluigwe na n’elu ụwa, ihe ndị a pụrụ ịhụ anya na ihe ndị a na-apụghị ịhụ anya . . . Ọ dịkwa tupu ihe ndị ọzọ niile, e mekwara ka ihe ndị ọzọ niile dịrị site n’aka ya.” Chegodị banyere nke a! Jizọs, bụ́ “onye ọkà ọrụ” Chineke, so kee ihe niile ọzọ e kere eke. N’ihi ya, ọ ma ihe niile banyere eluigwe na ụwa, site n’ụmụ irighiri ihe e kere eke ruo n’ụbụrụ dị egwu nke mmadụ. N’eziokwu, Kraịst bụ amamihe n’onwe ya!—Ilu 8:12, 22, 30, 31.
7, 8. Olee otú mmụọ nsọ Chineke si nyere Jizọs aka mgbe ọ na-eje ozi?
7 Chineke ji mmụọ nsọ ya tee Jizọs mmanụ. Jizọs kwuru, sị: “Mmụọ Jehova dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma, o zitere m ikwusara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụwo ha, na ime ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ, na ịtọhapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha lawa, ikwusa afọ Jehova na-anabata ndị mmadụ.” (Luk 4:18, 19) Mgbe e mere Jizọs baptizim, o yiri ka mmụọ nsọ ò mere ka o cheta ihe ndị ọ mụtara tupu ya abịa n’ụwa, tinyere ọrụ o ji bụrụ Mesaya nke Chineke chọrọ ka ọ rụọ n’ụwa.—Gụọ Aịzaya 42:1; Luk 3:21, 22; Jọn 12:50.
8 Jizọs bụ ma nwoke kacha ukwuu nke dịrịla ndụ n’ụwa ma Onye Ozizi kacha ukwuu n’ihi na e nyere ya mmụọ nsọ, o zukwara okè n’ahụ́ nakwa n’uche. N’eziokwu, “otú o si ezi ihe juru” ndị o ziri ihe anya. (Mat. 7:28) Otu n’ime ihe mere nke a ji dị otú a bụ na Jizọs mere ka a mata ihe kpatara nsogbu ụmụ mmadụ na-enwe, ya bụ, mmehie, ezughị okè, na amaghị Chineke. Jizọs makwa ihe ndị mmadụ bụ n’eziokwu, o mesokwara ha ihe otú gosiri na ọ ma ha nke ọma.—Mat. 9:4; Jọn 1:47.
9. Olee otú ichebara ihe Jizọs mere mgbe ọ bịara n’ụwa echiche ga-esi mee ka obi sie gị ike na Jizọs ruru eru ịbụ Eze?
9 Jizọs bụ mmadụ mgbe ọ bịara n’ụwa. Ihe ndị Jizọs gabigara mgbe ọ bịara n’ụwa na ihe ndị ọ hụrụ n’ebe ụmụ mmadụ na-ezughị okè nọ nyere aka nke ukwuu mee ka o ruo eruo ịbụ Eze. Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ dị mkpa ka [Jizọs] dị ka ‘ụmụnna’ ya n’ụzọ niile, ka o wee ghọọ nnukwu onye nchụàjà na-eme ebere, nke kwesịrị ntụkwasị obi n’ijere Chineke ozi, ka o wee chụọ àjà ime udo maka mmehie nke ndị mmadụ. N’ihi na ebe ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-ele ya ule, o nwere ike ịgbatara ndị a na-ele ule ọsọ enyemaka.” (Hib. 2:17, 18) Jizọs nwere ike imere ndị a na-ele ule ebere n’ihi na ‘e lere ya ule.’ Jizọs gosiri na ya nwere ọmịiko mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa. Ndị ọrịa, ndị nwere nkwarụ, ndị a na-emegbu emegbu, na ụmụ ntakịrị, na-agakwuru ya n’atụghị ụjọ. (Mak 5:22-24, 38-42; 10:14-16) Ndị dị nwayọọ n’obi na ndị ọ na-agụ agụụ ịma banyere Chineke gakwukwara ya. Ma, ndị mpako, na ndị na-enweghị “ịhụnanya Chineke” jụrụ ya, kpọọ ya asị, kpagbuokwa ya.—Jọn 5:40-42; 11:47-53.
10. Olee ụzọ kachanụ Jizọs si gosi na ya hụrụ anyị n’anya?
10 Jizọs nwụrụ n’ihi anyị. Ma eleghị anya, ihe kacha gosi na Jizọs ruru eru ịbụ Eze anyị bụ na ọ nwụrụ n’ihi anyị. (Gụọ Abụ Ọma 40:6-10.) Jizọs kwuru, sị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) N’eziokwu, Jizọs emeghị ka ndị ọchịchị bụ́ ụmụ mmadụ na-ezughị okè, ndị na-eji ihe ha na-enweta n’aka ndị ha na-achị ebi ndụ okomoko. Ọ nwụrụ n’ihi ụmụ mmadụ.—Mat. 20:28.
E Nyere Ya Ike Ime Ka Àjà Mgbapụta ahụ Baara Anyị Uru
11. Olee ihe mere obi ji sie anyị nnọọ ike na Jizọs bụ Onye Mgbapụta anyị?
11 Ọ dị nnọọ mma na ọ bụ Jizọs bụ onye bụ́ isi ga-eme ka àjà mgbapụta ahụ e ji ya chụọ baara anyị uru n’ihi na ọ bụ Nnukwu Onye Nchụàjà! N’eziokwu, mgbe Jizọs na-eje ozi n’ụwa, o mere ka anyị ghọtatụ ihe yanwa bụ́ Onye Mgbapụta anyị ga-emere anyị n’Ọchịchị Puku Afọ ya, ma ọ bụrụ na anyị anọgide na-efe Jehova. Ọ gwọrọ ndị ọrịa na ndị nwere nkwarụ, kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, nye ìgwè mmadụ nri, meekwa ka ebili mmiri dajụọ. (Mat. 8:26; 14:14-21; Luk 7:14, 15) Ihe ọzọ bụ na ihe mere o ji mee ihe ndị a abụghị ka o gosi ndị mmadụ na ya nwere ikike, kama, ọ bụ ka o gosi na ya nwere ọmịiko na ịhụnanya. Ọ gwara otu onye ekpenta rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ gwọọ ya, sị: “Achọrọ m.” (Mak 1:40, 41) N’Ọchịchị Otu Puku Afọ Jizọs, ọ bụ mmadụ niile nọ n’ụwa ka ọ ga-egosi ụdị ọmịiko ahụ o gosiri onye ekpenta ahụ.
12. Olee otú ihe e kwuru n’Aịzaya 11:9 ga-esi emezu?
12 Kraịst na ndị ya na ha ga-achị ga-anọgide na-akụziri ndị mmadụ banyere Chineke, bụ́ ọrụ ọ malitere kemgbe ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga. Nke a ga-emezu ihe e kwuru n’Aịzaya 11:9, bụ́ nke sịrị: “Ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa dị ka mmiri si kpuchie oké osimiri.” A ga-akụzikwara ụmụ mmadụ otú ha ga-esi na-elekọta ụwa na ọtụtụ ihe ndị e kere eke dị n’ime ya, bụ́ ihe a gwara Adam ka ọ na-eme tupu ya enupụ isi. Ná ngwụcha nke otu puku afọ ahụ, a ga-emezu ihe Chineke zubere ná mmalite, bụ́ nke e kwuru na Jenesis 1:28, ụmụ mmadụ ga-eritekwa uru zuru ezu n’àjà mgbapụta ahụ.
E Nyere Ya Ike Ikpe Ikpe
13. Olee otú Jizọs si gosi na ya hụrụ ezi omume n’anya?
13 Ọ bụ Kraịst bụ “Onye ahụ Chineke kpebiri na ọ ga-abụ onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.” (Ọrụ 10:42) N’ihi ya, obi siri anyị nnọọ ike na Jizọs na-ekpe ikpe ziri ezi, nakwa na ọ na-eke ezi omume na ikwesị ntụkwasị obi n’úkwù dị ka ájị̀! (Aịza. 11:5) Ọ kpọrọ anyaukwu, ihu abụọ na ihe ọjọọ ndị ọzọ asị. Ọ bakwaara ndị ahụhụ ndị ọzọ na-ata na-anaghị emetụ n’obi mba. (Mat. 23:1-8, 25-28; Mak 3:5) Ihe ọzọ bụ na Jizọs gosiri na otú mmadụ dị n’elu ahụ́ anaghị emegharị ya anya, “n’ihi na ya onwe ya maara ihe dị n’ime mmadụ.”—Jọn 2:25.
14. Olee otú Jizọs si egosi taa na ya hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya, oleekwa ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?
14 Jizọs na-egosi na ya ka hụrụ ezi omume na ikpe ziri ezi n’anya site n’ilekọta ọrụ ikwusa ozi ọma na nke ịkụzi ihe na-enweghị atụ a na-arụ n’ụwa. E nweghị mmadụ, ọchịchị mmadụ, ma ọ bụ mmụọ ọjọọ ga-emeli ka a kwụsị ịrụ ọrụ a ruo otú Chineke chọrọ. N’ihi ya, obi kwesịrị isi anyị ike na a lụchaa agha Amagedọn, Chineke ga na-ekpe ikpe ziri ezi. (Gụọ Aịzaya 11:4; Matiu 16:27.) Jụọ onwe gị, sị: ‘Mgbe m na-ezi ozi ọma, m̀ na-emeso ndị mmadụ ihe otú Jizọs si mesoo ndị mmadụ ihe? M̀ na-eme ike m niile n’ozi Jehova, a sịgodị na ọrịa ma ọ bụ ihe ndị ọzọ anaghị ekwecha m gachie ozi ọma anya?’
15. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’uche nke ga-enyere anyị aka iji ike anyị niile na-ejere Chineke ozi?
15 Chineke ga-enyere anyị aka ka anyị jiri mkpụrụ obi anyị dum na-ejere ya ozi ma ọ bụrụ na anyị eburu n’uche na ọ bụ ya nwe ọrụ ikwusa ozi ọma. Ọ bụ ya nyere iwu ka e kwusaa ozi ọma; o si n’aka Ọkpara ya na-eduzi ya; o jikwa mmụọ nsọ na-enye ndị na-arụ ya ike. Ì ji ihe ùgwù i nwere, bụ́ gị na Chineke na Ọkpara ya mmụọ nsọ na-edu ịrụkọ ọrụ, kpọrọ ihe? Ọ bụ naanị Jehova ga-emeli ka ihe karịrị nde mmadụ asaa, bụ́ ndị a na-ele ọtụtụ n’ime ha anya ka ndị “na-agụghị oké akwụkwọ na ndị nkịtị,” na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze na narị ala abụọ na iri atọ na isii.—Ọrụ 4:13.
Nweta Ngọzi Site n’Aka Kraịst!
16. Gịnị ka Jenesis 22:18 kwuru banyere ngọzi Chineke?
16 Jehova gwara Ebreham sị: “Ọ bụkwa site ná mkpụrụ gị ka mba niile nke ụwa ga-agọzi onwe ha n’ihi na i gewo ntị n’olu m.” (Jen. 22:18) Nke a na-egosi na ndị niile na-anaghị eji ozi ha na-ejere Chineke na Ọkpara ya egwu egwu kwesịrị inwe obi ike na Mkpụrụ ahụ bụ́ Mesaya ga-agọzi ha. Taa, ha na-echeta ngọzi ndị ahụ ka ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi.
17, 18. Olee nkwa Jehova kwere nke dị na Diuterọnọmi 28:2, oleekwa ihe anyị kwesịrị ime ka Jehova wee gọzie anyị?
17 E nwere mgbe Chineke gwara ụmụ Ebreham, ya bụ, mba Izrel sị: “Ngọzi a niile [e kwuru n’ọgbụgba ndụ Iwu] ga-abịakwara gị ma chụkwute gị, n’ihi na ị na-ege ntị n’olu Jehova bụ́ Chineke gị.” (Diut. 28:2) E nwere ike ịgwa ndị na-efe Chineke taa otu ihe ahụ. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka Jehova gọzie gị, “na-ege ntị” n’olu ya. I mee otú a, ngọzi ya ‘ga-abịara gị ma chụkwute gị.’ Ma, gịnị ka ‘ige ntị’ pụtara?
18 Ọ pụtara ịmụsi Okwu Chineke na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl ike. (Mat. 24:45) Ọ pụtakwara ime ihe Chineke na Ọkpara ya kwuru. Jizọs sịrị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ga-aba n’alaeze eluigwe, kama ọ bụ onye na-eme uche Nna m nke nọ n’eluigwe ga-aba na ya.” (Mat. 7:21) Ige Chineke ntị pụtakwara mmadụ iji obi ya niile na-akwado ndokwa Jehova mere n’ọgbakọ, na-edo onwe ya n’okpuru ndị okenye, ndị bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ.”—Efe. 4:8.
19. Olee ihe anyị ga-eme ka Chineke wee gọzie anyị?
19 Ndị so bụrụ “onyinye n’ụdị mmadụ” bụ ndị so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ ndị na-anọchite anya ọgbakọ Ndị Kraịst niile. (Ọrụ 15:2, 6) N’eziokwu, ihe bụ́ isi ga-ekpebi otú a ga-esi kpee anyị ikpe n’oge oké mkpagbu ahụ na-abịanụ bụ otú anyị si akpaso ụmụnna ime mmụọ Kraịst àgwà. (Mat. 25:34-40) N’ihi ya, otu n’ime ihe ndị anyị ga na-eme ka Chineke wee gọzie anyị bụ ịkwado ndị a Chineke tere mmanụ.
20. (a) Olee ọrụ dị mkpa e nyere ndị bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ”? (b) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị anaghị eleda ụmụnna ndị a bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” anya?
20 Ndị ọzọ so bụrụ “onyinye n’ụdị mmadụ” bụ ndị nọ na Kọmitii Alaka, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, na ndị okenye ọgbakọ. Ọ bụ mmụọ nsọ họpụtara ha niile. (Ọrụ 20:28) Ọrụ dị mkpa e nyere ụmụnna ndị a bụ ka ha na-ewuli ndị Chineke elu “ruo mgbe anyị niile ga-adị n’otu n’okwukwe nakwa n’ezi ihe ọmụma banyere Ọkpara Chineke, ruo mgbe anyị ghọrọ dimkpa, ruo mgbe anyị toruru otú Kraịst toruru.” (Efe. 4:13) N’eziokwu, ha ezughị okè, otú ahụ anyị niile na-ezughị okè. Ma, anyị ga-agọzi onwe anyị ma anyị kwe ka ha jiri ịhụnanya na-edu anyị, nakwa ma ọ bụrụ na anyị na-erubere ha isi.—Hib. 13:7, 17.
21. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-erubere Ọkpara Chineke isi ugbu a?
21 Kraịst ga-ebibi ụwa ọjọọ Setan n’oge na-adịghị anya. Mgbe nke ahụ mere, ọ bụ Jizọs ga-ekpebi ma ànyị ga-adị ndụ ma ànyị ga-anwụ, n’ihi na Chineke enyela ya ike ka o duga “oké ìgwè mmadụ” ahụ e buru n’amụma “n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.” (Mkpu. 7:9, 16, 17) N’ihi ya, ka anyị gbaa mbọ ugbu a jiri obi anyị niile na-edo onwe anyị n’okpuru Eze nke mmụọ Jehova na-edu ma gosi na obi dị anyị ụtọ n’ọrụ ọ na-arụ.
Gịnị Ka Ị Mụtara . . .
• na Mak 1:40, 41?
• na Jenesis 22:18?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 17]
Jizọs gosiri na ya nwere ọmịiko mgbe ọ kpọlitere ada Jeirọs n’ọnwụ
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Jizọs Kraịst na-elekọta ọrụ ikwusa ozi ọma na-enweghị atụ a na-arụ n’ụwa niile