Otú M Si Arụsi Ọrụ Ike n’Ọgbakọ Jehova
Otú M Si Arụsi Ọrụ Ike n’Ọgbakọ Jehova
Dị ka Vernon Zubko si kọọ
Ọ BỤ n’ugbo dị nso na Stenen, bụ́ obere obodo dị na Saskachịwan, Kanada, ka m nọ too. Papa m na mama m, bụ́ Fred na Adella, gbasiri mbọ ike na-akụziri mụ na nwanne m nwaanyị nke tọrọ m bụ́ Aurellia, nakwa ụmụnne m ndị nke m tọrọ bụ́ Alvin, Allegra, na Daryl banyere Jehova. Ha na-egbokwara anyị mkpa ndị ọzọ na-akpa anyị. Obi dị anyị ụtọ ruo taa maka otú papa anyị na mama anyị si kụziere anyị eziokwu dị na Baịbụl.
Papa m bụ Onye Kraịst e tere mmanụ, o jikwa obi ike ezi ozi ọma. Ọ bụ nwoke na-agba mbọ iji kpata ihe anyị ga-eri, n’agbanyeghị nke a, ọ na-eme ka onye ọ bụla mara na ya bụ Onyeàmà Jehova. Ọ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma mgbe niile. Agaghị m echefu otú o si anụ ọkụ n’obi na otú o si eji obi ike ezi ozi ọma. Ọ na-agwakarị m, sị, “Na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ Jehova, ị gaghị enwe ọtụtụ nsogbu.”
Anyị na-agbakarị àmà n’okporo ámá ndị dị na Stenen nakwa n’obodo ndị dị ya nso. Nke a anaghị adịchara m mfe. E nwere ụmụaka na-achọ okwu n’obodo nke ọ bụla. Ha na-emekwa anyị bụ́ ụmụaka akaje. Mgbe m dị afọ asatọ, o nwere ụbọchị ụmụaka gbara m gburugburu n’ebe m chị Ụlọ Nche na Teta! guzoro n’akụkụ ụzọ. Ha kpupụrụ m okpu m kpu n’isi kpunye ya n’okporo osisi dị n’akụkụ ebe m guzo. Ihe ọma merenụ bụ na nwanna nwoke m so gaa ozi ọma hụrụ ihe na-aganụ. Ọ bịaruru nso wee jụọ m sị, “Vern, ọ̀ bụ gịnị?” Ụmụaka ahụ gbara ọsọ. N’agbanyeghị na ihe a merenụ adịghị m obi mma, ọ kụziiri m na onye na-agba àmà okporo ámá ekwesịghị iguzo ka ogwe osisi, o kwesịrị ịna-agagharị agagharị. Ọzụzụ ndị a e nyere m mgbe m na-eto eto mekwara ka obi kaa m ịna-ekwusa ozi ọma site n’ụlọ ruo n’ụlọ.
E mere mụ na Alvin baptizim na Mee 1951 mgbe m dị afọ iri na atọ. M ka na-echeta na nwanna Jack Nathan, bụ́ onye kwuru okwu baptizim ahụ, gwara anyị ka a ghara inwe mgbe anyị ga-ekwe ka otu ọnwa gafee anyị aghara ikwusa banyere Jehova. * N’ezinụlọ anyị, anyị weere na ịsụ ụzọ bụ ihe kacha mma mmadụ nwere ike ime ná ndụ. Ọ bụ ya mere na mgbe m pụtara ụlọ akwụkwọ n’afọ 1958, m kwagara Winipeg, Manitoba, ịga sụọ ụzọ. Ọ bụ eziokwu na obi dị papa m ụtọ na m na-enyere ya aka na-akwachasị osisi n’ebe ọ na-arụ ọrụ, ya na mama m gbasiri m ume ike ka m malite ozi oge niile, obi dịkwa ha ụtọ na m kwagara Winipeg.
Ebe Ọhụrụ na Onye Ọhụrụ Mụ na Ya Ga Na-eje Ozi Ọma
N’afọ 1959, alaka ụlọ ọrụ dị na Kanada gwara ndị nwere mmasị ịkwaga Kwebek, bụ́ 1 Kọr. 9:22, 23.
ebe a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma, ka ha kwaga ebe ahụ. M gawara ịsụ ụzọ na Mọntriol. Ebe ahụ dị nnọọ iche n’ebe m si. M gbalịrị ịmụ asụsụ French na omenala ha, bụ́ ihe m na-emetụbeghị. Onye nlekọta sekit anyị gwara m, sị, “Ya enwekwala mgbe ị ga-asị, ‘Otú a ka anyị si eme ya n’ebe m si.’” Ndụmọdụ a o nyere m dị mma.—E nweghị ọsụ ụzọ mụ na ya na-arụkọ ọrụ mgbe m ruru Kwebek. Ma, otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Shirley Turcotte, bụ́ onye mụ na ya matara na Winipeg, ghọrọ onye mụ na ya na-arụkọ mgbe niile mgbe m lụrụ ya na Febụwarị 1961. O sikwa n’ezinụlọ hụrụ Jehova n’anya. N’oge ahụ, amachaghị m na ọ ga-emecha bụrụ ya ka m ga-esi n’aka ya na-enweta ume na agbamume ruo ọtụtụ afọ.
Ikwusa Ozi Ọma na Gaspi
Afọ abụọ ka anyị gbachara akwụkwọ, a gwara anyị ka anyị gaa rụwa ọrụ ịsụ ụzọ pụrụ iche na Rimoski dị na Kwebek. N’oge opupu ihe ubi nke afọ 1964, alaka ụlọ ọrụ gwara anyị ka anyị gaa kwusaa ozi ọma na Gaspi Peninsụla niile, nke dị n’akụkụ oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ Kanada. A gwara anyị ghaa mkpụrụ nke eziokwu ahụ otú anyị nwere ike. (Ekli. 11:6) Anyị dọnyere ihe karịrị otu puku magazin na ihe fọrọ obere ka o ruo narị akwụkwọ anọ nakwa nri na uwe n’ụgbọala anyị, ma malite ịga ebe anyị ga-ekwusa ozi ọma otu ọnwa. Anyị chọtara ụzọ dị mma anyị ga-esi na-ekwusa ozi ọma n’obodo nta ndị dị na Gaspi. Ụlọ ọrụ redio obodo ahụ gwara ndị obodo ahụ na Ndịàmà Jehova na-abịa, gwakwa ha ka ha ghara ịnara anyị akwụkwọ ọ bụla. Ma, ọtụtụ n’ime ha naara anyị akwụkwọ ndị ahụ n’ihi na ha aghọtaghị ọkwa ahụ a mara na redio, ha chere na a na-akpọsa akwụkwọ anyị.
N’oge ahụ, e nwere ebe ndị a na-ekweghị ka Ndịàmà Jehova na-ekwusa ozi ọma na Kwebek, ndị uwe ojii na-akwụsịkarịkwa anyị n’ụzọ. Nke a mere n’otu obodo, bụ́ ebe ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ n’ụlọ niile ka ndị mmadụ naara anyị akwụkwọ. Otu onye uwe ojii gwara anyị ka anyị soro ya gaa n’ụlọ ọrụ ha. Anyị sooro ya gawa. M mechara chọpụta na ọkàiwu na-anọchite anya obodo ahụ gwara ndị uwe ojii ka ha kwụsị anyị izi ozi ọma. Ebe ọ bụ na onyeisi ndị uwe ojii anọghị ya, egosiri m ọkàiwu ahụ akwụkwọ ozi si alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Toronto nke na-egosi na ndị ọchịchị nyere anyị ikike ikwusa ozi ọma n’ebe ahụ. Mgbe ọ gụchara akwụkwọ ozi ahụ, o kwuru ozugbo, sị: “Ka m gwa unu, achọghị m nsogbu. Ọ bụ ụkọchukwu ebe a sịrị m kwụsị unu ikwusa ozi ọma.” Anyị gara maliteghachi ozi ọma n’ebe ahụ ndị uwe ojii kwụsịrị anyị ka anyị wee gosi ndị ebe ahụ na iwu kwadoro ozi ọma anyị.
Mgbe anyị gara n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii n’ụtụtụ echi ya ịga hụ onyeisi ndị uwe ojii, iwe were ya na a kwụsịrị anyị ikwusa ozi ọma. O ji ezigbo iwe gwa ọkàiwu ahụ okwu na fon. Ọ gwara anyị mee ka ya mara ma ọ bụrụ na e nwee onye nyere anyị nsogbu, na ya ga-eme ihe banyere ya. Ndị ebe ahụ na-anabata anyị ma jiri obiọma na-emeso anyị ihe n’agbanyeghị na anyị bụ ndị ọbịa na-anaghị asụ asụsụ French nke ọma. Ma, anyị nọ na-eche ma hà ga-emecha nata eziokwu. Anyị matara nke a mgbe ọtụtụ afọ gafere, bụ́ mgbe anyị gaghachiri Gaspi gaa wuo Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche. Anyị chọpụtara na ọtụtụ n’ime ndị anyị ziri ozi ọma bụzi ụmụnna anyị. N’eziokwu, ọ bụ Jehova na-eme ka o too.—1 Kọr. 3:6, 7.
Anyị Nwetara Ihe Nketa
Anyị mụrụ nwa anyị nwaanyị bụ́ Lisa n’afọ 1970. Ihe nketa a Jehova nyere anyị mere ka anyị nwekwuo obi ụtọ. Nwunye m na Lisa so m wuo ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze. Mgbe Lisa gachara akwụkwọ, ọ gwara anyị, sị: “Ebe ọ bụ m mere unu ji kwụsịtụ ozi oge niile, m ga-akwụ ụgwọ ya site n’ịghọ ọsụ ụzọ oge niile.” Lisa ka na-asụ ụzọ kemgbe ihe karịrị iri afọ abụọ, ma, ugbu a, ọ bụ ya na di ya bụ́
Sylvain na-asụ ụzọ. Ha abụọ esorola wuo ụlọ ndị e ji eje ozi Jehova n’ọtụtụ mba. Anyị kpebiri na anyị agaghị etinye aka n’ihe ndị nwere ike ịna-eri oge anyị ka anyị wee nwee ike ịna-eje ozi Jehova. M ka na-echeta ihe ahụ Lisa kwuru mgbe ọ malitere ịsụ ụzọ. N’eziokwu, Lisa mere ka m banyeghachi n’ozi oge niile n’afọ 2001, m ka bụkwa ọsụ ụzọ kemgbe ahụ. Ọrụ ịsụ ụzọ na-eme ka m tụkwasị Jehova obi n’ihe niile m na-eme. O mekwaala ka m ghara itinye aka n’ọtụtụ ihe ndị nwere ike iri oge m, nke mere ka m na-enwe obi ụtọ.Ndị Na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze Kwesịrị Iji Obi Ha Dum na Ịhụnanya Na-arụ Ọrụ
Jehova akụzierela m na ya ga-agọzi anyị ma ọ bụrụ na anyị ewepụta onwe anyị na-arụ ọrụ ọ bụla o nyere anyị. Iso na Kọmitii Na-ahụ Maka Iwu Ihe Owuwu n’Ógbè na iso ụmụnna m na-ewu ụlọ ndị e ji ejere Jehova ozi na Kwebek niile, nakwa n’ebe ndị ọzọ, bụ ihe ùgwù dị ukwuu.
N’agbanyeghị na ụfọdụ n’ime ndị a wepụtara onwe ha iwu ụlọ abụghị ndị ọkà okwu, ha na-arụ ọrụ ha nke ọma mgbe ha na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụmụnna ndị a na-eji obi ha dum arụ ọrụ, aka ọrụ ha na-apụtakwa ìhè. Nke a na-eme ka e nwee ụlọ ndị mara mma a na-anọ efe Jehova.
E nweela ndị jụrụ m, sị, “Olee àgwà ndị kacha mkpa onye na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze kwesịrị inwe?” Achọpụtala m na mmadụ kwesịrị ibu ụzọ hụ Jehova na Ọkpara ya nakwa ụmụnna niile n’anya. (1 Kọr. 16:14) Nke abụọ bụ na onye ahụ kwesịrị iji obi ya dum na-arụ ọrụ. Ọ bụrụ na ihe agaa otú anyị na-atụghị anya ya, bụ́ ihe nwekwaranụ ike ime, onye ji obi ya dum na-arụ ọrụ Jehova ga-anọgide na-erubere ọgbakọ Jehova isi. Nke a ga-eme ka o wepụta onwe ya ịrụ ọrụ ndị ọzọ a ga-arụ n’ọdịnihu.
M Na-ekele Jehova
Ọ bụ eziokwu na papa m nwụrụ n’afọ 1985, m ka na-echeta ndụmọdụ ahụ o nyere m ka m na-arụsi ọrụ ike n’ọgbakọ Jehova. Dị ka ndị ọzọ maliterela ọrụ ha n’eluigwe, o doro anya na ọ nọ ebe ahụ na-arụsi ọrụ ike. (Mkpu. 14:13) Mama m dị iri afọ itoolu na asaa ugbu a. N’agbanyeghị na ọrịa strok anaghịzi ekwe ya kwuo okwu nke ọma, ọ ka ma ihe dị na Baịbụl. Ọ na-ede ihe dị na Baịbụl n’akwụkwọ ozi ọ na-edetara anyị iji gbaa anyị ume ka anyị nọgidesie ike n’ozi Jehova. Obi dị anyị bụ́ ụmụ ha ụtọ nke ukwuu na nne na nna anyị hụrụ anyị n’anya.
M na-ekele Jehova maka na o nyere m nwaanyị hụrụ m n’anya bụ́ Shirley. Ọ naghị echefu ndụmọdụ mama ya nyere ya. Ọ gwara ya, sị: “Vern ga na-arụ ọtụtụ ọrụ n’ọgbakọ Jehova, ọ bụghị naanị gị ga-enwe ya.” Mgbe anyị ghọrọ di na nwunye afọ iri anọ na itoolu gara aga, anyị kpebiri na anyị ga-abụ di na nwunye ruo agadi, na anyị ga-anọgide na-efe Jehova. Ọ bụrụkwa na anyị agafee n’ụwa ọhụrụ, anyị ga-aghọ okorobịa na agbọghọbịa, nọgidekwa na-efekọ Jehova ọnụ ruo mgbe ebighị ebi. N’eziokwu, anyị enweela ‘ọtụtụ ihe anyị rụrụ n’ọrụ Onyenwe anyị.’ (1 Kọr. 15:58) Jehova na-elekọtakwa anyị dị ka o kwere ná nkwa, nke mere na o nweghị ezi ihe ọ bụla kọrọ anyị.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 6 Ị chọọ ịgụ akụkọ ndụ Jack Halliday Nathan, gaa n’Ụlọ Nche nke Septemba 1, 1990, peeji nke 10-14.
[Foto dị na peeji nke 31]
“Anyị kpebiri na anyị agaghị etinye aka n’ihe ndị nwere ike ịna-eri oge anyị ka anyị wee nwee ike ịna-eje ozi Jehova”