Ònye Nwere Ike Ịnapụta Ndị Na-eti Mkpu Enyemaka?
Ònye Nwere Ike Ịnapụta Ndị Na-eti Mkpu Enyemaka?
“Chineke, biko, mee ka eze mara mkpebi ikpe gị . . . N’ihi na ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka.”—ỌMA 72:1, 12.
1. Gịnị ka anyị mụtara n’aka Devid banyere otú Chineke si emere anyị ebere?
IHE ahụ Eze Devid, bụ́ onye chịrị Izrel n’oge ochie, dere n’Abụ Ọma 72:1, 12 na-agba anyị ume. Ọtụtụ afọ tupu ya edee ihe ahụ, ọ kwara ụta maka iko ya na Bat-shiba kwara. Ọ rịọrọ Chineke n’oge ahụ, sị: “Hichapụ mmebi iwu m dị ka ebere gị si dị ukwuu. . . . Mmehie m dịkwa n’ihu m mgbe niile. . . . Lee! Ebu m njehie pụta mgbe a mụpụtara m site n’ihe mgbu, abụ m onye mmehie malite mgbe nne m tụụrụ ime m.” (Ọma 51:1-5) Jehova na-emere anyị ebere n’ihi na ọ ma na anyị ketara mmehie.
2. Olee otú Abụ Ọma nke iri asaa na abụọ si agba anyị ume?
2 Jehova ma ọnọdụ ọjọọ anyị nọ na ya. Ma, dị ka e buru n’amụma, Eze Chineke tere mmanụ “ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka, nakwa onye nọ n’ahụhụ na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere, ọ ga-azọpụtakwa mkpụrụ obi ndị ogbenye.” (Ọma 72:12, 13) Olee otú a ga-esi anapụta ndị mmadụ ná nsogbu ha nọ na ya? Abụ Ọma nke iri asaa na abụọ gwara anyị otú a ga-esi eme nke a. E dere Abụ Ọma a banyere ọchịchị Sọlọmọn nwa Devid, ma, ọ na-egosi otú ọchịchị Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst, ga-esi anapụta ụmụ mmadụ ná nsogbu.
Otú Ọchịchị Kraịst Ga-adị
3. Gịnị ka Sọlọmọn rịọrọ Chineke, gịnịkwa ka Chineke nyere ya?
3 Mgbe Devid, bụ́ onye merela agadi, kwuchara ka e mee Sọlọmọn eze, ọ gwara Sọlọmọn ihe ndị Sọlọmọn mechara mee. (1 Eze 1:32-35; 2:1-3) Jehova mechara gwa Sọlọmọn ná nrọ, sị: “Rịọ ihe m ga-enye gị.” Sọlọmọn wee rịọ naanị otu ihe, sị: “Nye ohu gị obi na-erube isi iji kpee ndị gị ikpe, iji mata ihe dị iche n’ihe ọma na ihe ọjọọ.” Chineke nyere Sọlọmọn ihe ahụ ọ rịọrọ ya, nyekwa ya ihe ndị ọzọ n’ihi na o ji obi umeala rịọ ya.—1 Eze 3:5, 9-13.
4. Olee ihe eze nwaanyị Shiba kwuru banyere ọchịchị Sọlọmọn?
4 Jehova gọziri ọchịchị Sọlọmọn, nke mere ka Izrel nwee udo na ọganihu a na-enwetụbeghị n’ọchịchị ọ bụla n’ụwa. (1 Eze 4:25) Eze nwaanyị Shiba na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi so ná ndị bịara hụ otú ọchịchị Sọlọmọn dị. Ọ gwara Sọlọmọn, sị: “Ihe m nọ n’ala m nụ banyere gị . . . bụ eziokwu . . . A gwarughị m ọkara ya. Amamihe na ịba ụba gị akarịwo ihe a na-anụ.” (1 Eze 10:1, 6, 7) Ma, Jizọs nwere amamihe karịa Sọlọmọn, ọ bụ ya mere o ji kwuo banyere onwe ya, sị: “Lee! e nwere onye ka Sọlọmọn n’ebe a.”—Mat. 12:42.
Otú Sọlọmọn Ka Ukwuu Ga-esi Napụta Ndị Mmadụ ná Nsogbu
5. Gịnị ka Abụ Ọma nke iri asaa na abụọ mere ka anyị mata, gịnịkwa ka anyị na-amụta banyere Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst?
5 Ka anyị tụlee ihe ndị e kwuru n’Abụ Ọma nke iri asaa na abụọ, ma hụ ngọzi ụmụ mmadụ ga-enweta n’ọchịchị Jizọs Kraịst, bụ́ Sọlọmọn Ka Ukwuu. (Gụọ Abụ Ọma 72:1-4.) Abụ Ọma a na-eme ka anyị ghọta otú obi dị Jehova maka “ịchịisi” nke Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst, bụ́ “Onyeisi Udo.” (Aịza. 9:6, 7) Chineke ga-agwa Sọlọmọn ahụ ka ukwuu ka ‘o kpechitere ndị nọ n’ahụhụ ọnụ ha, zọpụtakwa ụmụ onye ogbenye.’ Ọchịchị ya ga-abụ nke udo na nke ezi omume. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o mere ka a mata otú ihe ga-adị n’Ọchịchị Puku Afọ ya.—Mkpu. 20:4.
6. Olee otú Jizọs si mee ka a mata ngọzi ndị a ga-enwe n’Alaeze Chineke?
6 Ka anyị tụlee ụfọdụ ihe Jizọs Kraịst mere, bụ́ ndị na-eme ka anyị mata ihe ọ ga-emere ụmụ mmadụ iji mezuo ihe e kwuru n’Abụ Ọma nke iri asaa na abụọ. E nwere ọtụtụ ihe mere obi ji kwesị ịdị anyị ụtọ na ọ ga-enwe ọmịiko dị ukwuu n’ebe ndị na-ata ahụhụ nọ. (Mat. 9:35, 36; 15:29-31) Dị ka ihe atụ, otu nwoke bụ́ onye ekpenta gakwuuru Jizọs rịọ ya, sị: “Ọ bụrụ nnọọ na ị chọrọ, ị pụrụ ime ka m dị ọcha.” Jizọs wee sị ya: “Achọrọ m. Dị ọcha.” Ekpenta nwoke ahụ lara. (Mak 1:40-42) N’oge ọzọ, Jizọs hụrụ otu nwaanyị di ya nwụrụ nke naanị otu nwa ọ mụrụ nwụrụ. Jizọs ‘nweere ya ọmịiko’ ma gwa nwa ahụ sị, “Bilie!” o wee bilie dị ndụ ọzọ.—Luk 7:11-15.
7, 8. Olee otú dị iche iche Jizọs si gosi na ya nwere ike ịgwọ ọrịa?
7 Jehova nyere Jizọs ike o ji rụọ ọrụ ebube. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ otú o si gwọọ “otu nwaanyị nke na-arịa ọrịa oruru ọbara kemgbe afọ iri na abụọ.” N’agbanyeghị Lev. 15:19, 25) Jizọs matara na ike apụọla ya n’ahụ́ wee jụọ ha onye bitụrụ ya aka. Nwaanyị ahụ “tụrụ ụjọ, marakwa jijiji bịa daa n’ala n’ihu ya wee gwa ya eziokwu niile.” Ebe ọ bụ na Jizọs ghọtara na Jehova agwọọla nwaanyị ahụ, o ji obiọma gwa ya, sị: “Nwa m nwaanyị, okwukwe gị emewo ka ahụ́ dị gị mma. Laa n’udo, gbakee n’ọrịa ọjọọ nke na-arịa gị.”—Mak 5:25-27, 30, 33, 34.
na ‘ọ tawo ahụhụ nke ukwu n’aka ọtụtụ ndị ọgwọ ọrịa, mefuokwa ihe niile o nwere,’ ọrịa ya kara njọ. Nwaanyị ahụ banyere n’etiti ìgwè mmadụ ma metụ Jizọs aka, nke bụ́ ihe e kwuru n’Iwu Mozis na onye ‘ọbara na-agbapụta n’ahụ́’ ekwesịghị ime. (8 Jizọs ji ike Chineke nyere ya gwọọ ndị ọrịa, ọ ga-abụkwa na nke a ruru ndị hụrụ ihe merenụ n’ahụ́. Dị ka ihe atụ, o doro anya na obi dị ọtụtụ ndị ụtọ mgbe ha hụrụ ka Jizọs gwọrọ ndị ọrịa tupu ya ezie Ozizi Elu Ugwu ahụ a ma ama. (Luk 6:17-19) Mgbe Jọn Onye Na-eme Baptizim zigara ndị ozi ya abụọ ka ha gaa mara ma Jizọs ọ̀ bụ Mesaya ahụ, ha hụrụ ya ka ọ na-agwọ ‘ọtụtụ ndị nwere ọrịa na ajọ ọrịa dị iche iche na mmụọ ọjọọ, na-emekwara ọtụtụ ndị ìsì amara ka ha hụwa ụzọ.’ Jizọs gwara ha abụọ, sị: “Gaanụ kọọrọ Jọn ihe unu hụrụ na ihe unu nụrụ: ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwọrọ na-eje ije, a na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe, a na-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ, a na-ezikwa ndị ogbenye ozi ọma.” (Luk 7:19-22) Ihe ahụ Jizọs gwara Jọn gbara ya nnọọ ume.
9. Olee ihe ọrụ ebube dị iche iche Jizọs rụrụ na-egosi?
9 Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe ndị Jizọs meere ndị mmadụ mgbe ọ nọ n’ụwa iji napụta ha n’ahụhụ ha na-ata adịteghị aka. Ndị ọ gwọrọ ọrịa ma ọ bụ kpọlite n’ọnwụ mechara nwụọ. N’agbanyeghị nke a, ọrụ ebube ndị ahụ Jizọs rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa na-egosi otú ọ ga-esi jiri ọchịchị ya napụta ndị mmadụ kpamkpam ná nsogbu ha.
Ụwa Niile Ga-aghọ Paradaịs!
10, 11. (a) Ngọzi ndị a ga-enweta n’Alaeze ahụ ọ̀ ga-adịru mgbe ole, oleekwa otú ọchịchị Jizọs ga-adị? (b) Olee onye ya na Kraịst ga-anọ na Paradaịs, oleekwa ihe ga-eme ka ọ dịrị ndụ ebighị ebi?
10 Chegodị otú ụwa ga-adị mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs. (Gụọ Abụ Ọma 72:5-9.) N’oge ahụ, ndị na-efe ezi Chineke ga-ebi na Paradaịs ruo mgbe ọnwa na-agakwaghị adị, ya bụ, ruo mgbe ebighị ebi. Eze bụ́ Jizọs Kraịst ga-eme ka ahụ́ ruo ha ala, ‘dị ka mmiri ozuzo si ezokwasị ahịhịa a sụrụ asụ, dịkwa ka oké mmiri ozuzo nke na-ede ala.’
11 Ka i ji anya nke uche na-ahụ ka ihe ndị ahụ e kwuru n’Abụ Ọma nke iri asaa na abụọ na-emezu, obi ọ́ dịghị gị ụtọ na ị ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi mgbe ọ ga-aghọ paradaịs? N’eziokwu, obi tọrọ onye omekome ahụ a kpọgidere n’osisi ịta ahụhụ ụtọ mgbe Jizọs gwara ya, sị: “Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.” (Luk 23:43) N’Ọchịchị Puku Afọ Jizọs, a ga-akpọlite nwoke ahụ n’ọnwụ. Ọ bụrụ na o rubere ọchịchị Kraịst isi, ọ ga-adị ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, bụ́ ebe ọ ga-enwe obi ụtọ, ọ gaghịkwa arịa ọrịa.
12. N’Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst, olee ihe a ga-enye ndị mmehie a kpọlitere n’ọnwụ ohere ime?
12 N’ọchịchị Jizọs Kraịst, bụ́ Sọlọmọn Ka Ukwuu, “onye ezi omume ga na-ama pokopoko,” ya bụ, ihe ga na-agaziri ya. (Ọma 72:7) Kraịst ga-ahụ ndị mmadụ n’anya nke ukwuu, lekọtakwa ha, dị ka o mere mgbe ọ bịara n’ụwa. N’ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere anyị ná nkwa, “ndị ezi omume” a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-enwe ohere ime uche Jehova wee dị ndụ. (Ọrụ 24:15) Ma, a gaghị ekwe ka ndị na-emeghị uche Chineke nọgide na-adị ndụ ka ha ghara imeghasị udo na ahụ́ iru ala a ga-enwe n’ụwa ọhụrụ.
13. Olee ebe Alaeze ahụ ga-achịru, gịnị mere na e nweghị ihe ga-akwụsị udo ọ ga-eweta?
13 Akwụkwọ Nsọ gosiri na ọchịchị Sọlọmọn Ka Ukwuu ga-ezu ụwa niile ọnụ. Ọ sịrị: “Ọ ga-enwe ndị ọ na-achị malite n’oké osimiri Ọma 72:8, 9) N’eziokwu, Jizọs Kraịst ga-achị ụwa niile. (Zek. 9:9, 10) Ndị ọchịchị ya na ngọzi ndị ọ ga-eweta dị mma ga-eji obi ha niile ‘kpọọ isiala’ n’ihu ya. Ma, e nwere ike ikwu na a ga-ebibi ndị mmehie na-ekweghị echegharị mgbe ha gbara “otu narị afọ.” (Aịza. 65:20) Ha ‘ga-aracha ájá.’
ruo n’oké osimiri, malitekwa n’Osimiri Yufretis ruo na nsọtụ ụwa. Ndị bi n’ebe mmiri na-adịghị ga-akpọ isiala n’ihu ya, ndị iro ya ga-arachakwa ájá.” (Jizọs Na-emere Anyị Ebere
14, 15. Olee otú anyị si mara na Jizọs ma ụmụ mmadụ nke ọma nakwa na “ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka”?
14 Ụmụ mmadụ, bụ́ ndị mmehie nọ n’ọnọdụ ọjọọ, chọsiri enyemaka ike. Ma, anyị nwere olileanya. (Gụọ Abụ Ọma 72:12-14.) Jizọs, bụ́ Sọlọmọn Ka Ukwuu, na-emere anyị ebere n’ihi na ọ ma na anyị ezughị okè. Ihe ọzọ bụ na Jizọs tara ahụhụ maka ezi omume, Chineke hapụkwara ya ka o jiri aka ya die ọnwụnwa ndị bịaara ya. E nwedịrị mgbe obi na-erughị Jizọs ala nke mere ka ‘ọsụsọ ya dị ka ọbara nke na-atapụsị n’ala’! (Luk 22:44) N’oge ọzọ, mgbe a kpọgidere Jizọs n’osisi ịta ahụhụ, o tiri mkpu, sị: “Chineke m, Chineke m, gịnị mere i ji hapụ m?” (Mat. 27:45, 46) N’agbanyeghị ahụhụ niile Jizọs tara nakwa mbọ niile Setan gbara ka ọ kwụsị irubere Jehova isi, ọ nọgidere na-erubere Jehova Chineke isi.
15 Obi kwesịrị isi anyị ike na Jizọs na-ahụ ahụhụ anyị na-ata, nakwa na “ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka, nakwa onye nọ n’ahụhụ na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka.” Ebe ọ bụ na Jizọs nwere ụdị ịhụnanya Nna ya nwere, ọ ‘ga-ege ndị ogbenye ntị,’ ‘gwọọ ndị e tiwara obi, kechiekwa ọnyá na-egbu ha mgbu.’ (Ọma 69:33; 147:3) Jizọs ‘ga-emere anyị ebere n’adịghị ike anyị,’ n’ihi na ‘a nwalere ya n’ụzọ niile dị ka anyị onwe anyị.’ (Hib. 4:15) Obi dị anyị ụtọ ịmara na Eze bụ́ Jizọs Kraịst na-achị ugbu a n’eluigwe nakwa na ọ na-agụsi ya agụụ ike ịkwụsị ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata!
16. Gịnị mere Sọlọmọn ji nwee ike ịmata nsogbu ndị ọ na-achị nwere?
16 Sọlọmọn ‘meere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ebere’ n’ihi na ọ ma ihe, ghọtakwa ọnọdụ ndị ọ na-achị. E wezụga nke a, o nwere ọtụtụ nsogbu na ihe isi ike ná ndụ ya. Nwanne Sọlọmọn bụ́ Amnọn dinara nwanne ya nwaanyị bụ́ Tema, nwanne ya nke ọzọ bụ́ Absalọm gburu Amnọn n’ihi nke a. (2 Sam. 13:1, 14, 28, 29) O nwedịrị mgbe Absalọm chụpụrụ Devid n’ocheeze ya. Ma, ọ nọteghị aka n’ocheeze ahụ, Joab mechakwara gbuo Absalọm. (2 Sam. 15:10, 14; 18:9, 14) Ka oge na-aga, nwanne Sọlọmọn bụ́ Adọnaịja chọrọ ịnaghara Sọlọmọn ọchịchị. A si na ọ naghaara ya, ọ gaara egbu Sọlọmọn. (1 Eze 1:5) Ihe Sọlọmọn kpere n’ekpere mgbe ọ na-arara ụlọ nsọ ahụ ọ rụrụ nye Jehova gosiri na ọ ma ụdị ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. O kpere ekpere banyere ndị ọ na-achị, sị: “Onye ọ bụla n’ime ha maara ihe na-egbu ya mgbu na ihe na-afụ ya ụfụ; . . . gị onwe gị [Jehova] . . . gbagharakwa wee kwụọ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ụzọ ya niile si dị.”—2 Ihe 6:29, 30.
17, 18. Olee ihe mgbu ụfọdụ ndị ohu Chineke na-edi, oleekwa ihe ndị nyeerela ha aka idi ya?
17 Ihe ndị anyị mere n’oge gara aga nwere ike ịbụ ya kpatara ‘ihe na-egbu anyị mgbu.’ * bụ́ otu Onyeàmà gaferela afọ iri atọ, dere, sị: “M kwesịrị ịna-enwe obi ụtọ, ma, ọ na-abụ m cheta ihe ndị m mere n’oge gara aga, ihere onwe m ana-eme m. M na-enwe mwute dị ukwuu, ákwá ana-agụkwa m dị ka a ga-asị na ihe ndị a mere ụnyaahụ. M cheta ha, ọ na-adị m ka o nweghị ihe m dị mma ya, obi m na-amakwa m ikpe.”
Meri,18 Ọ na-adị ọtụtụ ndị ohu Chineke otú a ọ dị nwanna nwaanyị a, ma, gịnị nwere ike inyere ha aka ịtachi obi? Meri kwukwara, sị: “Ezigbo ndị enyi m na ụmụnna na-eme ka m na-enwe obi ụtọ. M na-agbalị ime ka obi m dịrị n’ihe ndị Jehova kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu, obi sikwara m ike na mkpu m na-eti maka enyemaka ga-aghọ mkpu ọṅụ.” (Ọma 126:5) Anyị kwesịrị inwe obi ike na Ọkpara Chineke, bụ́ Onye Ọchịchị ọ họpụtara, ga-enyere anyị aka. E buru amụma banyere ya, sị: “Ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere, ọ ga-azọpụtakwa mkpụrụ obi ndị ogbenye. Ọ ga-anapụta mkpụrụ obi ha ná mmegbu nakwa n’ihe ike, ọbara ha ga-adịkwa oké ọnụ ahịa n’anya ya.” (Ọma 72:13, 14) Nke a na-akasi anyị nnọọ obi.
A Ga-enwe Ụwa Ọhụrụ nke Ihe Ga-ejupụta
19, 20. (a) Dị ka Abụ Ọma nke iri asaa na abụọ kwuru, olee nsogbu Alaeze Chineke ga-akwụsị? (b) Olee onye bụ́ isi e kwesịrị ito maka ọchịchị Kraịst, oleekwa otú obi dị gị n’ihi ihe ndị ọ ga-emere ụmụ mmadụ?
19 Chegodị ọzọ otú ihe ga-adịrị ndị ezi omume n’ụwa ọhụrụ Chineke mgbe Sọlọmọn Ka Ukwuu ga na-achị ha. E kwere anyị nkwa, sị: “Ọka ga-ejupụta n’elu ụwa; ọ ga-ejubiga ókè n’elu ugwu dị iche iche.” (Ọma 72:16) Ebe ọ bụ na ọka nkịtị anaghị amịkarị n’elu ugwu, amaokwu a na-eme ka anyị mara otú ala ga-esi na-eme nri. Ihe a kụrụ n’ala “ga na-eme nke ọma dị ka osisi ndị dị na Lebanọn,” bụ́ ebe na-eme nri n’oge Sọlọmọn na-achị. Chegodị nke a! Ụkọ nri agakwaghị adị, e nweghị onye na-agaghị na-eri nri na-edozi ahụ́, ma ọ bụkwanụ onye na-enweghị ihe oriri! N’oge ahụ, mmadụ niile ga na-eri “oké oriri nke ihe mara abụba.”—Aịza. 25:6-8; 35:1, 2.
20 Ònye ka e kwesịrị ito maka ngọzi ndị a niile? Onye bụ́ isi e kwesịrị ito bụ Eze Mgbe Ebighị Ebi, bụ́ Eze Eluigwe na Ụwa, ya bụ, Jehova Chineke. N’eziokwu, anyị niile ga-eso jiri ọṅụ bụọ ngwụcha ọmarịcha abụ a na-agba ume: “Ka aha ya [ya bụ, aha Eze bụ́ Jizọs Kraịst] dịruo mgbe ebighị ebi; ka aha ya dị ukwuu ruo ogologo oge niile anyanwụ dị, ka ha site n’aka ya gọzie onwe ha; ka mba niile kpọọ ya onye obi ụtọ. Ka Jehova Chineke, bụ́ Chineke Izrel, bụrụ onye a gọziri agọzi, onye naanị ya na-arụ ọrụ dị ebube. Ka aha ya nke dị ebube bụrụkwa ihe a gọziri agọzi ruo mgbe ebighị ebi, ka ebube ya jupụtakwa ụwa dum. Amen na Amen.”—Ọma 72:17-19.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 17 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.
Gịnị Ka Ị Ga-aza?
• Gịnị ka Abụ Ọma nke iri asaa na abụọ buru amụma na ọ ga-eme n’ọdịnihu?
• Ònye bụ Sọlọmọn Ka Ukwuu, ebeekwa ka ọchịchị ya ga-eru?
• Gịnị kacha masị gị n’ime ngọzi niile e buru amụma ha n’Abụ Ọma nke iri asaa na abụọ?
[Ajụjụ nke paragraf ndị a na-amụ amụ]
[Foto dị na peeji nke 29]
Gịnị ka ọganihu ahụ Izrel nwere mgbe Sọlọmọn na-achị na-egosi?
[Foto dị na peeji nke 32]
Ihe ọ bụla anyị mere iji nweta ndụ na Paradaịs mgbe Sọlọmọn Ka Ukwuu ga na-achị efughị ọhịa