Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
Ihe dị n’akwụkwọ Ezikiel 18:20, bụ́ nke kwuru sị, “nwata agaghị aza ajụjụ ọ bụla maka njehie nna ya,” ọ̀ na-emegide ihe dị n’Ọpụpụ 20:5, bụ́ nke kwuru na Jehova “na-enye ndị bụ́ ụmụ ntaramahụhụ maka njehie nna ha”?
Ọ naghị emegide ya. Otu na-egosi na mmadụ aghaghị ịza ajụjụ maka ihe o mere, ebe nke ọzọ na-egosi na ihe mmadụ mere nwere ike imetụta ụmụ ya.
Ihe Ezikiel isi iri na asatọ na-eme ka ọ pụta ìhè bụ na ihe onye metere ga-adị n’isi ya. Amaokwu nke anọ kwuru, sị: “Mkpụrụ obi ọ bụla nke na-emehie, ọ bụ ya ga-anwụ.” Oleekwanụ maka onye bụ “onye ezi omume, na-emekwa ihe ziri ezi na ezi omume”? “Ọ ga-anọgide na-adị ndụ.” (Ezik. 18:5, 9) Ya mere, mgbe mmadụ toruru ogo mmadụ, a ga-ekpe ya ikpe ‘dị ka ụzọ ya si dị.’—Ezik. 18:30.
Ihe mere otu nwoke nke si n’ebo Livaị aha ya bụ Kora na-egosi na nke a bụ eziokwu. Mgbe ụmụ Izrel nọ n’ala ịkpa, ihe ùgwù ije ozi Jehova nyere ya ejukwaghị ya afọ. Mgbe Kora na ndị òtù ya nọ na-agbalịsi ike ka ọ ghọọ onye nchụàjà, ha nupụụrụ Jehova na Ọnụ Ọgụ. 16:8-11, 31-33) Ma, ụmụ Kora esoghị nna ha nupụrụ Jehova isi. Chineke ekpeghị ha ikpe maka ihe nna ha mere. Jehova akpaghị ha aka n’ihi na ha rubeere ya isi.—Ọnụ Ọgụ. 26:10, 11.
ndị na-anọchite anya ya, bụ́ Mozis na Erọn, isi. Jehova lara Kora na ndị òtù ya ahụ n’iyi n’ihi na ha chọrọ ịghọ ndị nchụàjà, bụ́ ọrụ na-abụghị nke ha. (Oleekwanụ maka ịdọ aka ná ntị ahụ dị n’Ọpụpụ 20:5, bụ́ nke so n’Iwu Iri ahụ? Ná nke a kwa, tụlee ihe Ọpụpụ isi iri abụọ ahụ na-ekwu. Mgbe Jehova nyechara ụmụ Izrel Iwu ahụ, ha ji oké olu kwuo, sị: “Anyị dị njikere ime ihe niile Jehova kwuru.” (Ọpụ. 19:5-8) Nke a mere ka mba ahụ dum bụrụ nke Jehova. Ya mere, ndị bụ́ isi e bu n’obi dee ihe ahụ dị n’Ọpụpụ 20:5 bụ mba ahụ dum.
Mgbe ọ bụla ụmụ Izrel rubeere Jehova isi, ọ na-agọzi ha nke ukwuu. (Lev. 26:3-8) Ma, ha na-anara ntaramahụhụ mgbe ọ bụla ha nupụụrụ ya isi. Mgbe ọ bụla ha gbakụtara Jehova azụ wee malite ife chi dị iche iche, Jehova na-akwụsị ịgọzi ha na ichebe ha; ha na-anọkwa n’ezigbo nsogbu. (Ikpe 2:11-18) Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ụfọdụ n’ime ha guzosiri ike n’ezi ihe wee na-erubere Chineke isi n’agbanyeghị na ibe ha malitere ife arụsị. (1 Eze 19:14, 18) Ọ ga-abụkwa na ha tatụrụ ahụhụ n’ihi mmehie ụmụ Izrel, ma, Jehova gosiri ha obiọma.
Mgbe ụmụ Izrel malitere ime mmehie n’enweghị nchegharị, bụ́ nke mere ka ndị mba ọzọ kọchawa aha Jehova, o kpebiri na ya ga-ata ha ahụhụ site n’ịhapụ ha ka ndị Babịlọn dọrọ ha n’agha laa obodo ha. Nke a pụtara na a tara ndị ya niile ahụhụ, ma ndị ezigbo mmadụ ma ndị ajọ mmadụ. (Jer. 52:3-11, 27) Baịbụl na-egosi na mmehie mba Izrel karịrị nnọọ akarị nke mere ka mmehie ndị nna nna ha mere metụta ọgbọ nke atọ, nke anọ, ma ọ bụ karịa, dị nnọọ ka Ọpụpụ 20:5 kwuru.
Baịbụl na-egosikwa na e nwere ezinụlọ dị iche iche mmehie nne ha ma ọ bụkwanụ nna ha mere metụtara. Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Ilaị mehiere Jehova n’ihi na ọ hapụrụ ụmụ ya ndị “na-abaghị n’ihe,” bụ́ ndị na-eme omume rụrụ arụ, ka ha bụrụ ndị nchụàjà. (1 Sam. 2:12-16, 22-25) Chineke kwuru na ọ dịkwaghị onye si n’ezinụlọ Ilaị ga-abụ nnukwu onye nchụàjà n’ihi na Ilaị sọpụụrụ ụmụ ya karịa Jehova. Nke a malitere imezu mgbe a chụpụrụ nwa nwa nwa ya bụ́ Abayata ka ọ ghara ịbụkwa onye nchụàjà. (1 Sam. 2:29-36; 1 Eze 2:27) Ihe ahụ dị n’Ọpụpụ 20:5 mezukwara n’ahụ́ Gehezaị. Mgbe ọ na-ejere Ịlaịsha ozi, o mere ihe ọ na-ekwesịghị ime wee nara Neaman, bụ́ Ọchịagha ndị Siria, onyinye mgbe a gwọrọ ya ọrịa. Jehova si n’ọnụ Ịlaịsha maa ya ikpe, sị: “Ekpenta Neaman ga-arapara n’ahụ́ gị na ụmụ gị ruo mgbe ebighị ebi.” (2 Eze 5:20-27) Ya mere, ụmụ Gehezaị natara ntaramahụhụ n’ihi mmehie ya.
Ọ bụ n’aka Jehova ka ọ dị inye onye mmehie ntaramahụhụ kwesịịrị ya n’ihi na ọ bụ ya kere anyị, nyekwa anyị ndụ. Ihe atụ ndị a anyị nyere n’isiokwu a na-egosi na mmehie mmadụ mere nwere ike imetụta ụmụ ya ma ọ bụkwanụ ụmụ ụmụ ya. Ma, ‘mkpu ákwá nke onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na-eru Jehova ntị,’ o nwekwara ike imere ndị ji obi ha niile na-erubere ya isi amara, ọ na-anapụtakwa ha ná nsogbu.—Job 34:28.
[Foto dị na peeji nke 29]
Jehova lara Kora na ndị òtù ya n’iyi n’ihi na ha nupụụrụ ya isi