“Unu na Mmadụ Niile Dịrị n’Udo”
“Unu na Mmadụ Niile Dịrị n’Udo”
“Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, unu na mmadụ niile dịrị n’udo.”—ROM 12:18.
1, 2. (a) Olee ịdọ aka ná ntị Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya? (b) Olee ebe anyị nwere ike inweta ndụmọdụ banyere ihe anyị ga-eme ma e megidewe anyị?
JIZỌS gwara ndị na-eso ụzọ ya na ụwa ga-akpagbu ha. Ná mgbede abalị bọtara ụbọchị ọ nwụrụ, ọ gwara ha ihe mere a ga-eji kpagbuo ha. Ọ gwara ndịozi ya, sị: “A sị na unu bụ nke ụwa, ụwa gaara ahụ ihe bụ́ nke ya n’anya. Ma n’ihi na unu abụghị nke ụwa, kama ahọpụtara m unu n’ụwa, ọ bụ ya mere ụwa ji kpọọ unu asị.”—Jọn 15:19.
2 Pọl onyeozi ji ihe mere ya mara na ihe ahụ Jizọs kwuru bụ eziokwu. N’akwụkwọ ozi nke abụọ Pọl degaara nwa okorobịa ya na ya so aga ozi, bụ́ Timoti, o kwuru, sị: “Ị gbasochiwo ozizi m anya, ya na ụzọ ndụ m, nzube m, okwukwe m, ogologo ntachi obi m, ịhụnanya m, ntachi obi m, mkpagbu m, ahụhụ m.” 2 Tim. 3:10-12) N’isi iri na abụọ nke akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Rom, ọ gwara ha ihe ha kwesịrị ime ma e megidewe ha. Ihe ọ gwara ha ga-enyere anyị aka n’oge ọgwụgwụ a.
O kwukwara, sị: “N’eziokwu, a ga-akpagbukwa ndị niile na-achọ ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nsọpụrụ Chineke ná mmekọrịta nke ha na Kraịst Jizọs.” (“Na-emenụ Ihe Dị Mma”
3, 4. Olee otú anyị ga-esi na-eme ihe ahụ a dụrụ anyị ọdụ ná Ndị Rom 12:17 ka anyị mee (a) ma ọ bụrụ na ndị ezinụlọ anyị niile abụghị Ndịàmà? (b) mgbe anyị na-emeso ndị agbata obi anyị ihe?
3 Gụọ Ndị Rom 12:17. Pọl kwuru na anyị ekwesịghị imegwara ndị na-emegide anyị. Anyị kwesịrị ịṅa ntị ná ndụmọdụ a, karịchaa, ma ọ bụrụ na e nwere ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova. Di ma ọ bụ nwunye nke bụ́ Onye Kraịst ekwesịghị ịgwagwara nwunye ya ma ọ bụ di ya okwu ọjọọ ọ gwara ya ma ọ bụkwanụ megwara ya ihe ọjọọ o mere ya. O nweghị ihe ọma na-esi ‘n’iji ihe ọjọọ akwụ ụgwọ ihe ọjọọ’ apụta. Naanị ihe ọ na-eme bụ ime ka ihe ka njọ.
4 Pọl kwuru ihe ka mma anyị kwesịrị ime. Ọ sịrị: “Na-emenụ ihe dị mma n’anya mmadụ niile.” Ọ bụrụ na nwaanyị ana-akpaso di ya ezigbo àgwà n’ụlọ, n’agbanyeghị na ọ na-ekwu okwu ọjọọ banyere okpukpe ya, o nwere ike ime ka ha abụọ ghara ịna-enwe oké esemokwu. (Ilu 31:12) Carlos, bụ́ onye nọ Betel ugbu a, kwuru otú mama ya si jiri ịkpa ezigbo àgwà na ilekọta ụlọ ha anya nke ọma merie mkpagbu kpụ ọkụ n’ọnụ papa ya kpagburu ya. Ọ sịrị: “Ọ gwara anyị bụ́ ụmụaka ka anyị na-asọpụrụ papa anyị mgbe niile. Ọ na-agwasi m ike ka mụ na ya na-egwu otu egwuregwu na-amasị ya, n’agbanyeghị na egwuregwu ahụ anaghị amasị m. Ma, mụ na ya na-egwu ya iji mee ya obi ụtọ.” Ka oge na-aga, a malitere ịmụrụ ya ihe, e mechaa mee ya baptizim. A bịa n’ime “ihe dị mma n’anya mmadụ niile,” Ndịàmà Jehova emeela ọtụtụ mgbe ka ndị mmadụ gbanwee otú ha si ele ha anya site n’inyere ndị agbata obi ha ọdachi dakwasịrị aka.
Iji “Icheku Ọkụ” Gbazee Mmegide
5, 6. (a) Olee otú anyị si awụkwasị “icheku ọkụ” n’isi ndị iro anyị? (b) Kọọ ihe mere n’ókèala unu nke na-egosi na ime ihe ahụ a dụrụ anyị n’ọdụ ná Ndị Rom 12:20 nwere ike ịrụpụta ihe dị mma.
5 Gụọ Ndị Rom 12:20. O yiri ka Pọl ò bu ihe dị n’Ilu 25:21, 22 n’uche mgbe o dere ihe dị ná Ndị Rom 12:20. Ilu ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye kpọrọ gị asị, nye ya nri ka o rie; ọ bụrụkwa na akpịrị na-akpọ ya nkụ, nye ya mmiri ka ọ ṅụọ. N’ihi na ọ bụ icheku ọkụ ka ị na-awụkwasị n’isi ya, ọ bụkwa Jehova ga-akwụ gị ụgwọ.” Ndụmọdụ ahụ Pọl nyere anyị ná Ndị Rom isi iri na abụọ gosiri na icheku ọkụ ahụ o ji mee ihe atụ apụtaghị na anyị ga-emegwara mmadụ ihe o mere anyị ma ọ bụkwanụ menye ya ihere. Kama nke ahụ, ilu ahụ nakwa ihe ahụ yiri ya nke Pọl degaara Ndị Rom n’akwụkwọ ozi, yiri ka ha na-ekwu banyere otú e si anụcha ọla n’oge ochie. Otu onye Bekee bụ́ ọkà mmụta aha ya bụ Charles Bridges, nke dịrị ndụ n’ihe dị ka otu narị afọ gara aga, kwuru, sị: “A na-etinye ígwè siri oké ike n’ogbu icheku ọkụ, wụkwasịkwa icheku dị ezigbo ọkụ n’elu ya. Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ka obi ha na-agaghị agbanwe ma e jiri ndidi, ntachi obi, na ezigbo ịhụnanya na-eso ha.”
6 Dị ka “icheku ọkụ” na-eme, obiọma anyị gosiri ndị na-emegide anyị nwere ike ime ka obi ha gbanwee, ha ewee kwụsị imegide anyị. Obiọma anyị gosiri ndị mmadụ nwere ike ime ka ha malite ịhụ anyị n’anya ma ọ bụkwanụ mee ka ha malite ige ntị n’ozi ọma anyị na-ezi. Pita onyeozi dere, sị: “Na-emenụ omume dị mma n’etiti ndị mba ọzọ, ka o wee bụrụ na n’ihe ndị ahụ ha na-ekwugide unu, na-asị na unu bụ ndị ajọ omume, ha ga-enye Chineke otuto n’ụbọchị nleta ya n’ihi ọrụ ọma unu nke ha ji anya ha na-ahụ.”—1 Pita 2:12.
“Unu na Mmadụ Niile Dịrị n’Udo”
7. Olee ihe bụ udo ahụ Kraịst hapụụrụ ndị na-eso ụzọ ya, oleekwa ihe ọ ga-enyere anyị aka ime?
7 Gụọ Ndị Rom 12:18. Ná mgbede ikpeazụ Jizọs na ndịozi ya nọrọ tupu ya anwụọ, ọ gwara ha, sị: “M na-ahapụrụ unu udo, m na-enye unu udo m.” (Jọn 14:27) Udo ahụ Kraịst hapụụrụ ndị na-eso ụzọ ya bụ obi ụtọ ha na-enwe ma ha cheta na Jehova Chineke na Ọkpara ya hụrụ ha n’anya. Obi ụtọ a anyị na-enwe kwesịrị ime ka anyị na ndị ọzọ dịrị n’udo. Ezigbo Ndị Kraịst hụrụ udo n’anya, na-emekwa udo.—Mat. 5:9.
8. Olee otú anyị nwere ike isi bụrụ ndị na-eme udo, ma n’ezinụlọ ma n’ọgbakọ?
8 Otu n’ime ụzọ e si eme udo n’ezinụlọ bụ ikpezi esemokwu ngwa ngwa, kama ịhapụ ka ihe na-aka njọ. (Ilu 15:18; Efe. 4:26) Anyị kwesịkwara ịna-ekpezi esemokwu ngwa ngwa n’ọgbakọ. Pita onyeozi kwuru na onye na-achụso udo kwesịrị igbochi ire ya ka ọ ghara ịna-ekwu ihe ọjọọ. (1 Pita 3:10, 11) Mgbe Jems nyechara ndụmọdụ banyere otú anyị kwesịrị isi na-ekwu okwu, gwakwa anyị na anyị kwesịrị izere ekworo na esemokwu, o dekwara, sị: “Amamihe nke si n’elu bu ụzọ dị ọcha, na-emekwa udo, nwee ezi uche, dị njikere irube isi, jupụta n’ebere na ezi mkpụrụ, ọ dịghị akpa ókè n’ihi ile mmadụ anya n’ihu, ọ dịghị ihu abụọ. A na-aghakwa mkpụrụ nke ezi omume n’ebe udo dị maka ndị na-eme udo.”—Jems 3:17, 18.
9. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi mgbe anyị na-achọ ka anyị na “mmadụ niile dịrị n’udo”?
9 Ihe Pọl kwuru ná Ndị Rom 12:18 na-egosi na ọ bụghị naanị n’ezinụlọ nakwa n’ọgbakọ ka anyị kwesịrị ịna-eme udo. O kwuru na anyị na ‘mmadụ niile kwesịrị ịdị n’udo.’ “Mmadụ niile” gụnyere ndị agbata obi anyị, ndị ọrụ ibe anyị, ụmụ akwụkwọ ibe anyị, nakwa ndị anyị na-ahụ n’ozi ọma. Ma, Pọl onyeozi bu ụzọ kwuo n’amaokwu ahụ, sị: “Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka.” Nke a pụtara na anyị kwesịrị ime ike anyị niile ka anyị na ‘mmadụ niile wee dị n’udo,’ ma, anyị ekwesịghị ịnọ ebe anyị na-achọ ka anyị na mmadụ niile dịrị n’udo anyị emebie iwu Chineke.
Jehova Nwe Ịbọ Ọbọ
10, 11. Olee otú anyị si ‘enye ọnụma ohere,’ oleekwa ihe anyị ji kwesị ime nke a?
10 Gụọ Ndị Rom 12:19. Ma n’ihu “ndị isi ike,” ya bụ, ndị na-anaghị achọ iji ntị anụ ozi ọma anyị, ma n’ihu ndị na-akpagbu anyị, anyị kwesịrị ‘ijide onwe anyị mgbe ọnọdụ dị njọ’ ma “jiri nwayọọ” na-emeso ha ihe. (2 Tim. 2:23-25) Pọl dụrụ Ndị Kraịst ọdụ ka ha ghara ịbọrọ onwe ha ọbọ, kama, ka ha ‘nye ọnụma ohere.’ Ọnụma ònye ka Pọl na-ekwu okwu ya? O nweghị ihe ga-eme ka ọ bụrụ ọnụma anyị ka Pọl kwuru ka anyị nye ohere. O doro anya na ọ bụ ọnụma Chineke ka anyị na-enye ohere. Anyị bụ́ Ndị Kraịst ma na ọ bụghị anyị nwe ịbọ ọbọ. Ọbụ abụ bụ́ Devid, dere, sị: “Hapụ iwe, hapụkwa ọnụma; ewela iwe naanị iji mee ihe ọjọọ.” (Ọma 37:8) Sọlọmọn dụrụ anyị ọdụ, sị: “Asịla: ‘M ga-emegwara ihe ọjọọ e mere m!’ Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, ọ ga-azọpụtakwa gị.”—Ilu 20:22.
11 Ọ bụrụ na ndị mmegide emee anyị ihe ọjọọ, anyị kwesịrị ịhapụrụ ya Jehova ka ọ bọọ ọbọ n’ahụ́ ha ma ọ chọọ, ka o meekwa otú ahụ mgbe ọ chọrọ. Pọl gosiri na ihe ya kwuru okwu ya bụ ọnụma Chineke, nke mere ka o deekwa, sị: “E dere, sị: ‘Ọ bụ m nwe ịbọ ọbọ; m ga-akwụ ụgwọ, ka Jehova kwuru.’” (Tụlee Diuterọnọmi 32:35.) Ọ bụrụ na anyị anwaa anwa bọọrọ onwe anyị ọbọ, anyị na-egosi na anyị dị mpako, ya bụ, na anyị na-eweghara ọrụ dịịrị naanị Jehova. Ọ pụtakwara na anyị enweghị okwukwe na Jehova ga-emezu ihe o kwere ná nkwa mgbe ọ sịrị: “M ga-akwụ ụgwọ.”
12. Olee mgbe Jehova ga-awụkwasị ndị mmehie ọnụma ya, oleekwa otú ọ ga-esi wụkwasị ha ya?
12 N’isi mbụ nke akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Rom, o kwuru, sị, “E si n’eluigwe na-ekpughe ọnụma Chineke megide asọpụrụghị Chineke na ajọ omume niile nke ndị na-ekpuchi eziokwu ahụ n’ụzọ na-ezighị ezi.” (Rom 1:18) Jehova ga-anọ n’eluigwe site n’aka Ọkpara ya wụkwasị ndị mmehie ọnụma “n’oké mkpagbu ahụ.” (Mkpu. 7:14) Ọ ga-abụ “ihe àmà nke ikpe ezi omume Chineke,” dị ka Pọl kwuru n’akwụkwọ ozi ọzọ o ji ike mmụọ nsọ dee. Ọ sịrị: “Nke a na-egosi na ọ bụ ezi omume n’ebe Chineke nọ iji mkpagbu kwụọ ndị na-akpagbu unu ụgwọ. Ma ọ ga-eme ka unu onwe unu bụ́ ndị a na-akpagbu nwere onwe unu, tinyere anyị onwe anyị, mgbe a ga-ekpughe Onyenwe anyị Jizọs site n’eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi ya dị ike, n’ọkụ na-enwu enwu, mgbe ọ na-abọ ọbọ n’ahụ́ ndị na-amaghị Chineke, na ndị na-adịghị erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.”—2 Tesa. 1:5-8.
Iji Ihe Ọma Na-emeri Ihe Ọjọọ
13, 14. (a) Olee ihe mere na mkpagbu ndị iro na-akpagbu anyị anaghị atụ anyị n’anya? (b) Olee otú anyị nwere ike isi na-agọzi ndị na-akpagbu anyị?
13 Gụọ Ndị Rom 12:14, 21. Ebe ọ bụ na obi siri anyị nnọọ ike na Jehova ga-emezu ihe niile bụ́ nzube ya, anyị kwesịrị ịna-arụsi ọrụ o nyere anyị ike, ya bụ, izisa ozi ọma “alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mat. 24:14) Anyị ma na ọrụ a anyị na-arụ ga-akpasu ndị iro anyị iwe, n’ihi na Jizọs dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Mba niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Mat. 24:9) Ya mere, ọ naghị atụ anyị n’anya na a na-akpagbu anyị, anyị anaghịkwanụ ada mba n’ihi ya. Pita onyeozi dere, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, ka ọkụ nke na-ere n’etiti unu, nke na-ere ịbụrụ unu ọnwụnwa, ghara iju unu anya, dị ka à ga-asị na ọ bụ ihe a na-ahụtụbeghị na-adakwasị unu. Kama nke ahụ, na-aṅụrịnụ ọṅụ, ebe unu bụ ndị na-eketa òkè n’ahụhụ nke Kraịst.”—1 Pita 4:12, 13.
14 Kama iweso ndị na-akpagbu anyị iwe, anyị kwesịrị ịna-ezi ha ozi ọma, n’ihi na o nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime ha amaghị ihe ha na-eme. (2 Kọr. 4:4) Anyị ga-agbalịsi ike na-eme ihe Pọl dụrụ anyị ọdụ ka anyị na-eme. Ọ sịrị: “Na-agọzinụ ndị na-akpagbu unu; na-agọzinụ ndị mmadụ, unu abụkwala ha ọnụ.” (Rom 12:14) Otu n’ime ụzọ anyị si agọzi ndị na-akpagbu anyị bụ ikpe ekpere maka ha. Mgbe Jizọs na-ezi Ozizi Elu Ugwu, ọ sịrị: “Na-emerenụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma, na-agọzinụ ndị na-abụ unu ọnụ, na-ekpenụ ekpere maka ndị na-akparị unu.” (Luk 6:27, 28) Pọl onyeozi ji onwe ya mara na onye na-akpagbu Ndị Kraịst nwere ike mechaa ghọọ ezigbo onye na-eso ụzọ Kraịst nakwa onye ji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Jehova ozi. (Gal. 1:13-16, 23) N’akwụkwọ ozi ọzọ Pọl dere, ọ sịrị: “Mgbe a na-ekwujọ anyị, anyị na-agọzi agọzi; mgbe a na-akpagbu anyị, anyị na-atachi obi; mgbe a na-ekwutọ anyị, anyị na-arịọsi arịrịọ ike.”—1 Kọr. 4:12, 13.
15. Olee ụzọ kacha mma anyị ga-esi jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ?
15 Ya mere, ezigbo Onye Kraịst kwesịrị ịna-eme ihe amaokwu ikpeazụ dị ná Ndị Rom isi iri na abụọ kwuru. Ọ sịrị: “Ekwela ka ihe ọjọọ merie gị, kama jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ.” Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu kpatara ihe ọjọọ niile. (Jọn 8:44; 1 Jọn 5:19) N’ọhụụ e mere ka Jọn hụ, Jizọs kwuru na ụmụnna ya e tere mmanụ ‘meriri Setan n’ihi ọbara Nwa Atụrụ ahụ, na n’ihi okwu ha gbara àmà ya.’ (Mkp. 12:11) Nke a na-egosi na ụzọ kacha mma anyị ga-esi merie Setan na ihe ọjọọ niile ọ na-akpatara anyị n’ụwa a bụ ime ihe ọma site n’ikwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke.
Ịṅụrị Ọṅụ n’Olileanya
16, 17. Olee ihe anyị mụtara ná Ndị Rom isi iri na abụọ banyere (a) otú anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ? (b) otú anyị kwesịrị isi na-eme ihe n’ọgbakọ? (ch) otú anyị kwesịrị isi na-emeso ndị na-emegide anyị?
16 Ntụle anyị tụlere na nkenke isi iri na abụọ nke akwụkwọ ozi Pọl degaara Ndị Kraịst nọ na Rom emeela ka anyị cheta ọtụtụ ihe. Anyị mụtara na anyị, bụ́ ndị raara onwe ha nye Jehova, kwesịrị ịdị njikere ịchụ ihe ụfọdụ n’àjà. Mmụọ Chineke mere ka anyị jiri obi anyị dum chụọ ihe ndị a n’àjà n’ihi na ikike anyị ji eche echiche emeela ka anyị mara na ịchụ ya bụ uche Chineke. Mmụọ Chineke emeela ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eji onyinye ndị o nyere anyị na-ejere ya ozi. Anyị ji obi umeala na-ejere Jehova ozi ma na-eme ike anyị niile iji hụ na anyị na ụmụnna anyị dị n’otu. Anyị na-ele ọbịa, ihe banyere ndị ọzọ na-emetụkwa anyị n’obi.
17 Ndị Rom isi iri na abụọ nyekwara anyị ezigbo ndụmọdụ banyere ihe anyị kwesịrị ime ma ndị iro kpagbuwe anyị. Anyị ekwesịghị imegwara ha ihe ọ bụla ha mere anyị. Anyị kwesịrị ịna-egosi ndị na-akpagbu anyị obiọma. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị na mmadụ niile dịrị n’udo ma ọ bụrụhaala na ime nke a agaghị eme ka anyị mebie iwu dị na Baịbụl. Anyị kwesịrị ime nke a n’ezinụlọ anyị, n’ọgbakọ anyị, n’ebe ndị agbata obi anyị nọ, n’ebe anyị na-arụ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ anyị, nakwa mgbe anyị nọ n’ozi ọma. Ọ bụrụgodị na ndị iro na-akpagbu anyị, ka anyị mee ike anyị niile wee jiri ihe ọma na-emeri ihe ọjọọ ma cheta na ọ bụ Jehova nwe ịbọ ọbọ.
18. Olee ndụmọdụ atọ e nyere anyị ná Ndị Rom isi iri na abụọ amaokwu iri na abụọ?
18 Gụọ Ndị Rom 12:12. E wezụga ndụmọdụ a niile bara uru Pọl nyere anyị, e nwere ụzọ ihe atọ ọzọ ọ gbara anyị ume ka anyị na-eme. Ebe ọ bụ na anyị enweghị ike ime ihe ndị a niile ma ọ bụrụ na Chineke enyereghị anyị aka, Pọl onyeozi dụrụ anyị ọdụ ka anyị ‘nọgidesie ike n’ekpere.’ Nke a ga-enyere anyị aka ime ihe ọzọ ọ gwara anyị ka anyị mee. Ọ sịrị: “Na-atachinụ obi n’ime mkpagbu.” N’ikpeazụ, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe Jehova kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu ma ‘na-aṅụrị ọṅụ n’olileanya’ ndụ ebighị ebi, ma ọ̀ bụ nke ịga eluigwe ma ọ̀ bụ nke ibi n’ụwa.
Ntụleghachi
• Olee ihe anyị kwesịrị ime ma ndị iro kpagbuwe anyị?
• Olee ebe ndị anyị kwesịrị ịgbalị ka anyị bụrụ ndị na-eme udo, oleekwa otú anyị ga-esi na-eme udo?
• Gịnị mere anyị ekwesịghị ịchọ ịbọrọ onwe anyị ọbọ?
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Foto dị na peeji nke 8]
Ọ bụrụ na anyị na-enyere ndị agbata obi anyị aka, ha nwere ike ịgbanwe otú ha si ele anyị anya
[Foto dị na peeji nke 9]
Ị̀ na-agba mbọ ka ị bụrụ onye na-eme udo n’ọgbakọ?