Ụmụ Mmadụ Enweghachi Olileanya Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa
Ụmụ Mmadụ Enweghachi Olileanya Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa
“Daniel, zochie okwu ndị a . . . ruo n’oge ikpeazụ. Ọtụtụ ndị ga na-awagharị, ezi ihe ọmụma ga-abakwa ụba.”—DAN. 12:4.
1, 2. Olee ajụjụ ndị a ga-atụle n’isiokwu a?
ỌTỤTỤ nde mmadụ taa ghọtara ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. (Mkpu. 7:9, 17) Mgbe Chineke kere mmadụ, o gosiri na ya kere ụmụ mmadụ ka ha dị ndụ ebighị ebi, ọ bụghị ka ha dị ndụ afọ ole na ole wee nwụọ.—Jen. 1:26-28.
2 Ụmụ Izrel nwere olileanya izu okè dị ka Adam zuru tupu ya emee mmehie. Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst kwuru otú Chineke ga-esi mee ka ụmụ mmadụ nwee ike ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs n’ụwa. Ya mere, gịnị mere a ga-eji mee ka ụmụ mmadụ nweghachi olileanya ịdị ndụ ebighị ebi? Olee otú e si kpughee olileanya a ma mee ka ọtụtụ nde mmadụ mara banyere ya?
Olileanya nke A Na-amabughị
3. Gịnị mere ọ naghị eju anyị anya na ọtụtụ ndị amabughị banyere olileanya ụmụ mmadụ nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa?
3 Jizọs buru amụma na ndị amụma ụgha ga na-akụzi ihe ọ na-akụzighị nakwa na a ga-eduhie ọtụtụ ndị. (Mat. 24:11) Pita onyeozi dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị, sị: “A ga-enwekwa ndị ozizi ụgha n’etiti unu.” (2 Pita 2:1) Pọl onyeozi kwuru na a ga-enwe “oge mgbe [ndị mmadụ] na-agaghị anabata ozizi ahụ na-enye ezi ndụ, kama, dị ka ha si chọọ, ha ga-akpọkọtara onwe ha ndị ozizi ka ha wee na-anụ ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị.” (2 Tim. 4:3, 4) Setan na-eduhie ụmụ mmadụ, o mewokwa ka ndị si n’ọgbakọ Ndị Kraịst pụọ mee ka ndị mmadụ ghara ịmata eziokwu nke na-enye obi ụtọ. Eziokwu a bụ banyere ihe bụ́ nzube Chineke maka ụmụ mmadụ nakwa ụwa.—Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 4:3, 4.
4. Olee olileanya ụmụ mmadụ nwere nke ndị ndú okpukpe ụgha na-ekweghị na ya?
4 Akwụkwọ Nsọ kwuru na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị n’eluigwe nke ga-egwepịa ọchịchị ụmụ mmadụ ma mee ka ha ghara ịdịkwa. (Dan. 2:44) Mgbe Kraịst ga-achị ọchịchị otu puku afọ, a ga-atụba Setan n’Abis, kpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, meekwa ka ụmụ mmadụ ndị bi n’ụwa zuo okè. (Mkpu. 20:1-3, 6, 12; 21:1-4) Ma, ndị ndú okpukpe nke Krisendọm na-akụzi ihe dị iche. Dị ka ihe atụ, Origen, onye Alegzandria, bụ́ Nna Chọọchị na narị afọ nke atọ, katọrọ ndị kweere na Ọchịchị Puku Afọ ahụ ga-eweta ọtụtụ ngọzi n’ụwa. Akwụkwọ nkà ihe ọmụma ndị Katọlik kwuru na ọkà mmụta okpukpe ndị Katọlik, bụ́ Augustine nke Hippo (onye a mụrụ n’afọ 354, ya anwụọ n’afọ 430 O.A.), “kweere na a gaghị enwe ọchịchị otu puku afọ ọ bụla.” *
5, 6. Gịnị mere Origen na Augustine ekweghị na a ga-enwe ọchịchị puku afọ?
5 Gịnị mere Origen na Augustine ekweghị na a ga-enwe ọchịchị puku afọ? Origen bụ nwa akwụkwọ Clement nke Alegzandria, bụ́ onye si n’ozizi ndị Grik mụta na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Ọkà mmụta okpukpe bụ́ Werner Jaeger kwuru na Origen “kụziiri Ndị Kraịst ihe
ọ mụtara n’aka Plato banyere mkpụrụ obi.” Kama ịkụzi na a ga-enwe ngọzi n’ụwa mgbe Ọchịchị Otu Puku Afọ malitere, Origen kwuru na a ga-enweta ngọzi ahụ n’eluigwe.6 Tupu Augustine aghọọ onye chọọchị mgbe ọ dị afọ iri atọ na atọ, o kweere n’ozizi nke Plotinus kụziri na narị afọ nke atọ, bụ́ ozizi yiri nke Plato. Mgbe Augustine ghọrọ onye chọọchị, ọ malitere ịkụzi ozizi Plotinus. Otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma kwuru na “ọ bụ Augustine gwakọtara ozizi Plato na ihe a kụziri n’Agba Ọhụrụ.” Akwụkwọ nkà ihe ọmụma ndị Katọlik kwuru na Augustine sịrị na Ọchịchị Puku Afọ e kwuru okwu ya ná Mkpughe isi iri abụọ bụ ihe atụ. Akwụkwọ ahụ kwukwara, sị: “Ndị nkà mmụta okpukpe ndị dịrị ndụ mgbe Augustine nwụrụ . . . kweere ihe a Augustine kụziri, nke a mere ka a ghara inwe ọtụtụ ndị kwere n’ọchịchị puku afọ n’oge ndị gara aga.”
7. Olee nkwenkwe ụgha nke merela ka ọtụtụ ndị ghara ikwe na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa, oleekwa otú o sirila mee nke a?
7 Otu ihe nke ọtụtụ ndị kweere na Babịlọn oge ochie, bụ́ nke mechara gbasaruo ụwa dum, mere ka ọtụtụ ndị ghara ikwe na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ihe ahụ ha kweere bụ na mmadụ nwere mkpụrụ obi ma ọ bụ mmụọ nke na-anaghị anwụ anwụ, bụ́ nke dị n’ime mmadụ. Mgbe ndị Krisendọm kweere nke a, ndị nkà mmụta okpukpe malitere ịkọwahie amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị kwuru banyere olileanya ịga eluigwe. Ha kụziri na amaokwu ndị a na-ekwu na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe. Ihe ahụ ha na-akụzi pụtara na ụwa bụ ahịa, ya bụ na ụwa bụ ebe mmadụ na-ebi ruo mgbe a ga-achọpụta ma ò ruru eru ibi n’eluigwe. Otu ihe a mekwara ka ndị Juu oge ochie kwụsị inwe olileanya na mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ka ndị Juu ji nwayọọ nwayọọ na-ekwere n’ozizi ndị Grik, nke bụ́ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, ha kwụsịrị inwe olileanya na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Nke a dị nnọọ iche n’ihe Baịbụl kwuru banyere mmadụ. Mmadụ bụ anụ ahụ́ nkịtị, ọ bụghị mmụọ. Jehova gwara nwoke mbụ, sị: “Ájá ka ị bụ.” (Jen. 3:19) E kere mmadụ ka o biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị n’eluigwe.—Gụọ Abụ Ọma 104:5; 115:16.
Ìhè Amalite Inwu n’Ọchịchịrị
8. Olee ihe ụfọdụ ndị ọkà mmụta dịrị ndụ malite n’afọ 1600 gawa kwuru banyere olileanya ụmụ mmadụ nwere?
8 N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst ekweghị na ụmụ mmadụ ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa, Setan enwebeghị ike ime ka eziokwu ghara ịpụta ìhè. Ka oge na-aga, ụfọdụ ndị ji ezi obi na-amụ Baịbụl malitere ịchọpụta eziokwu dị na ya mgbe ha ghọtatụrụ otú Chineke ga-esi mee ka ụmụ mmadụ zughachi okè. (Ọma 97:11; Mat. 7:13, 14; 13:37-39) Site n’afọ 1600 gawa, a malitere ịsụgharị Baịbụl na ibipụta ya, nke a mekwara ka o ruo ọtụtụ ndị aka. N’afọ 1651, otu ọkà mmụta dere na ebe ọ bụ Adam mere ka ụmụ mmadụ “ghara ibi na Paradaịs, meekwa ka ha kwụsị ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa,” otú ahụkwa ka Kraịst ga-esi mee ka “mmadụ niile biri n’Ụwa; ma ọ́ bụghị ya, e kwesịghị iji Kraịst tụnyere Adam.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:21, 22.) Otu onye Bekee a ma ama nke na-ede uri aha ya bụ John Milton (onye a mụrụ n’afọ 1608, ya anwụọ n’afọ 1674), dere uri ọ kpọrọ Paradise Lost (Paradaịs A Tụfuru), mechaakwa dee nke na-eso ya, nke ọ kpọrọ Paradise Regained (Paradaịs E Nwetaghachiri). N’uri ahụ Milton dere, o kwuru okwu banyere ụgwọ ọrụ a ga-akwụ ndị na-erubere Chineke isi, nke bụ́ na ha ga-ebi na Paradaịs ga-adị n’ụwa. N’agbanyeghị na Milton ji oge dị ukwuu ná ndụ ya mụọ Baịbụl, o kwetara na a gaghị aghọtacha ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ ruo oge ọnụnọ Kraịst.
9, 10. (a) Gịnị ka Isaac Newton dere banyere olileanya ụmụ mmadụ nwere? (b) Olee ihe mere Newton ji chee na ọnụnọ Kraịst ka dị anya?
9 Onye ọkà a ma ama ná mgbakọ na mwepụ bụ́ Sir Isaac Newton, (onye a mụrụ n’afọ 1642, ya anwụọ n’afọ 1727), nwekwara mmasị dị ukwuu na Baịbụl. Ọ ghọtara na ndị nsọ ga-aga eluigwe, ha na Kraịst anọrọ ebe ahụ na-achị. (Mkpu. 5:9, 10) O dekwara banyere ndị Alaeze ahụ ga-achị, sị: “Ụmụ mmadụ ga-anọgide na-ebi n’ụwa ma ụbọchị ikpe gasịa, ọ bụghịkwa naanị otu puku afọ, kama ọbụna ruo mgbe ebighị ebi.”
10 Newton kwuru na ọ fọrọ ọtụtụ narị afọ ka oge ọnụnọ Kraịst malite. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Stephen Snobelen kwuru, sị: “Otu ihe mere Newton ji kwuo ihe banyere Alaeze Chineke ọtụtụ narị afọ gara aga bụ n’ihi na obi adịghị ya mma maka ozizi Atọ n’Ime Otu ndị si n’ezi ofufe dapụ n’oge ya na-akụzi.” A ka kpuchiri ozi ọma ihe n’oge ahụ. Newton ahụghịkwa okpukpe ọ bụla sị na ha bụ Ndị Kraịst ndị ga-ekwusali ozi ọma ahụ. O dere, sị: “A gaghị aghọta amụma ndị Daniel na Jọn buru [e dere nke Jọn ná Mkpughe] ruo n’oge ikpeazụ.” Newton kwukwara, sị: “Daniel sịrị, ‘Mgbe ahụ, ọtụtụ ndị ga na-awagharị, ihe ọmụma ga-abakwa ụba.’ N’ihi na a ga-ekwusa Ozi Ọma n’ụwa niile tupu oké mkpagbu abịa, ụwa ewee gwụ. Ndị ahụ ji igu nkwụ n’aka ha, bụ́ ndị si n’oké mkpagbu ahụ pụta, agaghị abụ ndị a na-enweghị ike ịgụta ọnụ, ndị si na mba niile, ọ gwụla ma è bu ụzọ kwusaa Ozi Ọma tupu oké mkpagbu ahụ abịa.”—Dan. 12:4; Mat. 24:14; Mkpu. 7:9, 10.
11. Gịnị mere ọtụtụ ndị nọ ndụ n’oge Milton na Newton amaghị banyere olileanya ụmụ mmadụ nwere?
11 N’oge Milton na Newton dị ndụ, onye ọ bụla nke kwuru ihe megidere ihe chọọchị na-akụzi na-etinye ndụ ya n’ihe ize ndụ. N’ihi ya, ọ bụ mgbe ha nwụrụ ka e bipụtara ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ ha mụtara na Baịbụl. Mgbanwe ahụ ndị Protestant mere na narị afọ nke iri na isii agbanweghị ihe ahụ a na-akụzi, nke bụ́ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, ọtụtụ chọọchị ndị Protestant ndị a ma ama nọgidekwara na-akụzi ihe Augustine kụziri, ya bụ na Ọchịchị Puku Afọ ahụ agaala, na ọ gaghị abịa n’ọdịnihu. Ihe ọmụma ọ̀ baala ụba n’oge ikpeazụ a?
“Ezi Ihe Ọmụma Ga-abakwa Ụba”
12. Olee mgbe ezi ihe ọmụma ga-aba ụba?
12 Daniel buru amụma ezigbo ihe ga-eme “n’oge ikpeazụ.” (Gụọ Daniel 12:3, 4, 9, 10.) Jizọs kwuru, sị: “N’oge ahụ, ndị ezi omume ga-enwu gbaa dị ka anyanwụ.” (Mat. 13:43) Olee otú ezi ihe ọmụma sirila baa ụba n’oge ikpeazụ a? Tụlee ihe ndị mere ọtụtụ afọ tupu afọ 1914, bụ́ mgbe oge ikpeazụ malitere.
13. Gịnị ka Charles Taze Russell dere mgbe o nyochara ihe banyere otú a ga-esi mee ka ụmụ mmadụ zughachi okè?
13 Malite n’afọ 1860 gawa, e nwere ọtụtụ ndị ji ezi obi na-achọ ịghọta “ụkpụrụ nke okwu na-enye ezi ndụ.” (2 Tim. 1:13) Otu onye n’ime ha bụ Charles Taze Russell. N’afọ 1870, ya na ụfọdụ ndị na-achọ ịmụta eziokwu hiwere otu ìgwè nke ndị na-amụ Baịbụl. N’afọ 1872, ha tụlere ihe banyere otú a ga-esi mee ka ụmụ mmadụ zughachi okè. Russell mechara dee, sị: “Tupu mgbe ahụ, anyị aghọtachaghị na e nwere nnukwu ihe dị iche n’ihe bụ́ ụgwọ ọrụ nke chọọchị ahụ a na-anwa ọnwụnwa ugbu a na ihe bụ́ ụgwọ ọrụ nke ụmụ mmadụ ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’ụwa.” Ihe a ga-eji kwụọ ndị nke ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’ụwa ụgwọ bụ “ime ka ha zughachi okè dị ka nna ha mbụ bụ́ Adam zuru mgbe ọ nọ n’Iden.” Russell kwuru na ndị ọzọ nyeere ya aka ịmara ihe dị na Baịbụl. Olee ndị ka ha bụ?
14. (a) Olee otú Henry Dunn si ghọta Ọrụ 3:21? (b) Ole ndị ka Dunn kwuru na ha ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa?
Ọrụ 3:21) Dunn ma na nke a gụnyere ime ka ụmụ mmadụ zughachi okè n’ụwa n’oge Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst. Dunn tụlekwara ajụjụ ọtụtụ ndị na-amaghị azịza ya. Ajụjụ ahụ bụ, Olee ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa? O kwuru na a ga-akpọlite ọtụtụ nde mmadụ n’ọnwụ, kụziere ha eziokwu, ha enweekwa ohere igosi ma hà nwere okwukwe na Kraịst ma ọ bụ na ha enweghị.
14 Henry Dunn bụ otu n’ime ha. O dere banyere “oge a ga-eme ka ihe niile dị otú ha dị na mbụ, bụ́ nke Chineke kwuru banyere ya site n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ nke oge gboo.” (15. Gịnị ka George Storrs ghọtara banyere mbilite n’ọnwụ?
15 N’afọ 1870, George Storrs kwetakwara na a ga-akpọlite ndị ajọ omume n’ọnwụ, ha ga-enwekwa ohere ịdị ndụ ebighị ebi. O sikwa n’Akwụkwọ Nsọ ghọta na onye a kpọlitere n’ọnwụ nke na-anaghị eme ezi omume mgbe a kpọlitere ya “ga-anwụ, ọ bụrụgodị na ‘onye mmehie ahụ agbaala otu narị afọ.’” (Aịza. 65:20) Storrs biri na Brooklyn, New York, ọ na-edekwa magazin a na-akpọ Bible Examiner (Akwụkwọ Na-enyocha Baịbụl).
16. Olee ihe Ndị Mmụta Baịbụl ji dị iche na Krisendọm?
16 Ihe Russell gụtara na Baịbụl mere ka ọ ghọta na oge eruola ka e kwusaa ozi ọma n’ụwa niile. N’ihi ya, n’afọ 1879, ọ malitere ibipụta Zion’s Watch Tower and Herald of Christ’s Presence, bụ́ nke bụzi Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova. Ná mbụ, ọ bụ mmadụ ole na ole ghọtara olileanya ụmụ mmadụ nwere, ma ka oge na-aga, ìgwè Ndị Mmụta Baịbụl nọ n’ọtụtụ mba malitere inweta Ụlọ Nche ma na-amụ ya. Nkwere Ndị Mmụta Baịbụl kweere na ọ bụ mmadụ ole na ole ga-aga eluigwe, nakwa na ọtụtụ nde mmadụ ga-ebi n’ụwa, mere ka ha dị iche n’ọtụtụ okpukpe Krisendọm.
17. Olee otú ezi ihe ọmụma si baa ụba?
17 ‘Oge ikpeazụ’ ahụ e buru n’amụma malitere n’afọ 1914. Ihe omụma banyere olileanya ụmụ mmadụ nwere ọ̀ bara ụba n’oge ahụ? (Dan. 12:4) Ka ọ na-eru n’afọ 1913, e bipụtala ozi ọma Russell na-ezi ndị mmadụ n’akwụkwọ akụkọ dị puku abụọ, nde mmadụ iri na ise na-agụkwa ha. Ka ọ na-eru ná ngwụcha afọ 1914, ihe karịrị nde mmadụ itoolu n’ọtụtụ ebe n’ụwa eleela ihe nkiri bụ́ “Photo-Drama of Creation,” bụ́ ihe nkiri nke kọwara Ọchịchị Puku Afọ Kraịst. N’ụwa niile, malite n’afọ 1918 ruo n’afọ 1925, ndị Jehova kwuru okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “Ọtụtụ Nde Ndị Dị Ndụ Ugbu A Agaghị Anwụ Anwụ” n’asụsụ iri atọ. Okwu a kọwara olileanya ndị mmadụ nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ka ọ na-eru n’afọ 1934, Ndịàmà Jehova ghọtara na e kwesịrị ime ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa baptizim. Nghọta ha ghọtara olileanya e nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mere ka ha jirikwuo ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. Taa, ọtụtụ nde mmadụ na-ekele Jehova maka ime ka ha nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa.
“Nnwere Onwe Dị Ebube” nke A Ga-enwe n’Ọdịnihu!
18, 19. Olee ụdị ndụ e buru n’amụma n’Aịzaya 65:21-25?
18 Aịzaya onye amụma ji ike mmụọ nsọ dee otú ndụ ga-adịrị ndị Chineke n’ụwa ọhụrụ. (Gụọ Aịzaya 65:21-25.) Ikekwe ụfọdụ n’ime osisi ndị dị ndụ mgbe Aịzaya dere ihe a n’ihe dị ka puku afọ abụọ na narị afọ asaa gara aga ka dị ndụ ruo ugbu a. Olee otú obi ga-adị gị ịdị ogologo ndụ n’arịaghị ọrịa ọ bụla?
19 Anyị ga-enwe nnọọ ohere iwu ụlọ, ịkụ ihe ọkụkụ, na ịmụta ihe n’ihi na ndụ agaghịzi adị mkpụmkpụ otú ọ dị ugbu a. Cheedị ụdị ndị enyi ị ga-enwe mgbe ahụ. Gị na ha ga-abụ enyi ruo mgbe ebighị ebi. Nke a bụ ụdị “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke” ga-enwe n’ụwa mgbe ahụ.—Rom 8:21.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 4 Augustine kwuru na Ọchịchị Puku Afọ nke Alaeze Chineke abụghị ihe ka ga-amalite n’ọdịnihu kama na ọ malitere mgbe chọọchị ha bidoro.
Ì Nwere Ike Ịkọwa?
• Olee otú e si mee ka ụmụ mmadụ ghara ịma olileanya ha nwere ịdị ndụ n’ụwa?
• Olee ihe ụfọdụ ndị na-agụ Baịbụl ghọtara malite n’afọ 1600 gawa n’ihu?
• Olee otú olileanya nke ụmụ mmadụ nwere si dokwuo anya ka afọ 1914 na-eru nso?
• Olee otú ihe ọmụma banyere olileanya ibi n’ụwa sirila baa ụba?
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Foto ndị dị na peeji nke 13]
Onye na-ede uri bụ́ John Milton (n’aka ekpe) na onye ọkà mgbakọ na mwepụ bụ́ Isaac Newton (n’aka nri) ma banyere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Ihe Ndị Mmụta Baịbụl n’oge mbụ gụtara n’Akwụkwọ Nsọ mere ka ha ghọta na oge eruola ka e mee ka ụwa niile mara ihe bụ́ olileanya nke ụmụ mmadụ