Ndị Ezi Omume Ga-eto Chineke Ruo Mgbe Ebighị Ebi
Ndị Ezi Omume Ga-eto Chineke Ruo Mgbe Ebighị Ebi
“A ga na-echeta onye ezi omume . . . Ezi omume ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—ỌMA 112:6, 9.
1. (a) Olee ihe ọma na-echere ndị Chineke gụrụ ná ndị ezi omume? (b) Olee ajụjụ nke a na-eme ka a jụọ?
IHE ndị magburu onwe ha na-echere ndị Chineke gụrụ ná ndị ezi omume. Ruo mgbe ebighị ebi, obi ga-adị ha ụtọ ịnọgide na-amụta banyere àgwà ndị magburu onwe ha Jehova nwere. Ha ga-eji ọṅụ na-eto Chineke ka ha na-amụtakwa banyere ihe ndị o kere. Ihe ga-eme ka ihe ọma ndị ga-adị n’ọdịnihu rute mmadụ aka bụ “ezi omume,” bụ́ ihe Abụ Ọma nke 112 kwusiri okwu ya ike. Ma, olee otú Jehova Chineke, bụ́ onye ezi omume na onye dị nsọ, ga-esi gụọ ụmụ mmadụ na-eme mmehie ná ndị ezi omume? N’agbanyeghị otú anyị si na-agbalị ime ihe ziri ezi, anyị na-eme mmehie, mgbe ụfọdụkwa, anyị na-eme ndị nke dị oké njọ.—Rom 3:23; Jems 3:2.
2. Olee ọrụ ebube abụọ Jehova rụrụ iji gosi na ya hụrụ ụmụ mmadụ n’anya?
2 Iji gosi na Jehova hụrụ ụmụ mmadụ na-eme mmehie n’anya, o mere ihe ga-eme ka ha nwee ike ịbụ ndị ezi omume. Olee otú o si mee ya? Nke mbụ, site n’iji ọrụ ebube bufee ndụ nke Ọkpara ọ hụrụ n’anya n’akpa nwa nke nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, ka e wee mụọ ya dị ka mmadụ zuru okè. (Luk 1:30-35) Ma, mgbe ndị iro Jizọs gburu ya, Jehova rụrụ ọrụ ebube ọzọ pụrụ iche. Chineke kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ya aghọọ mmụọ dị ebube.—1 Pita 3:18.
3. Gịnị mere o ji masị Chineke iji ịdị ndụ n’eluigwe kwụọ Ọkpara ya ụgwọ?
Hib. 7:15-17, 28) Ihe mere o ji masị Jehova ime nke a bụ n’ihi na Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi mgbe e lere ya ule ndị tara akpụ. Jizọs si otú a nye Nna ya ihe kacha mma ọ ga-eji gosi na Setan ghara ụgha mgbe ọ sịrị na ụmụ mmadụ na-efe Chineke n’ihi ihe ha na-erite n’aka Chineke, ọ bụghị n’ihi na ha ji obi ha dum hụ ya n’anya.—Ilu 27:11.
3 Jehova ji ihe Jizọs na-enweghị tupu ya abịa n’ụwa kwụọ ya ụgwọ, ya bụ, ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe. (4. (a) Olee ihe Jizọs meere anyị mgbe ọ laghachiri n’eluigwe, oleekwa ihe Jehova mere? (b) Olee otú obi dị gị n’ihi ihe Jehova na Jizọs meere gị?
4 Jizọs nwere ihe ndị ọzọ o mere n’eluigwe. O ji uru “ọbara nke ya” ‘pụta n’ihu Chineke maka anyị.’ Nna anyị nke eluigwe hụrụ anyị n’anya ji obiọma nabata àjà dị oké ọnụ ahịa Jizọs chụrụ, ka ọ bụrụ “àjà ime udo maka mmehie anyị.” N’ihi ya, anyị ga-eji ‘akọ na uche a sachapụrụ asachapụ,’ na-ejere “Chineke ahụ dị ndụ ozi dị nsọ.” Nke a mere anyị ga-eji kwere ime ihe ahụ e kwuru ná mmalite Abụ Ọma nke 112, ya bụ: “Toonụ Jaa!”—Hib. 9:12-14, 24; 1 Jọn 2:2.
5. (a) Olee ihe anyị ga-eme ka Chineke wee gụọ anyị ná ndị ezi omume? (b) Olee otú e si dee Abụ Ọma nke 111 na Abụ Ọma nke 112?
5 Ka Chineke wee gụọ anyị ná ndị ezi omume, anyị aghaghị inwe okwukwe n’ọbara Jizọs wụsịrị. Anyị ekwesịghị ikwe ka ụbọchị ọ bụla gaa n’ekeleghị Jehova n’ihi otú o si hụ anyị n’anya nke ukwuu. (Jọn 3:16) Anyị kwesịrị ịnọgide na-amụ Okwu Chineke ma na-eme ike anyị niile iji bie ndụ kwekọrọ n’ihe anyị na-amụta. E nwere ndụmọdụ dị iche iche dị mma n’Abụ Ọma nke 112, bụ́ ndị ga-abara ndị chọrọ ịnọgide na-enwe akọnuche dị ọcha n’ihu Chineke uru. Ihe dị n’Abụ Ọma nke 112 kwekọrọ n’ihe dị n’Abụ Ọma nke 111. Abụ Ọma abụọ a jicha okwu bụ́ “Toonụ Jaa!” ma ọ bụ “Haleluja!” malite, ahịrị iri abụọ na abụọ esochizie. Ahịrị nke ọ bụla nwere mkpụrụ akwụkwọ Hibru e dere n’elu ya. *
Ihe Na-eme Ka E Nwee Obi Ụtọ
6. Olee otú e si gọzie “onye” na-atụ egwu Chineke, bụ́ onye e kwuru okwu ya n’Abụ Ọma nke 112?
6 “Obi ụtọ na-adịrị onye na-atụ egwu Jehova, bụ́ onye ihe o nyere n’iwu na-atọ ụtọ nke ukwuu. Ụmụ ya ga-aghọ ndị ukwu n’ụwa. A ga-agọzikwa ọgbọ nke ndị ziri ezi.” (Ọma 112:1, 2) Cheta na ọbụ abụ a bu ụzọ kwuo “onye,” mechaakwa kwuo “ndị ziri ezi” ná ngwụcha amaokwu nke abụọ. Nke a pụtara na Abụ Ọma nke 112 na-ekwu banyere otu ìgwè nke ọtụtụ ndị mejupụtara. Iji gosi na nke a bụ eziokwu, Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ kwughachi ihe ahụ dị n’Abụ Ọma 112:9, wee gosi otú o si gbasa Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 9:8, 9.) Abụ ọma a kọwara nnọọ otú ndị na-eso ụzọ Kraịst nọ n’ụwa taa ga-esi na-enwe obi ụtọ.
7. Olee ihe mere ndị ohu Chineke kwesịrị iji na-atụ egwu ka ha ghara imehie ya, oleekwa ihe i kwesịrị ime banyere iwu dị iche iche Chineke nyere?
7 Dị ka Abụ Ọma 112:1 kwuru, ezigbo Ndị Kraịst a na-enwe obi ụtọ dị ukwuu ka ha na-eje ije ‘n’egwu Jehova.’ Egwu ha na-atụ ka ha ghara imehie Jehova na-eme ka ha jụ mmụọ nke ụwa Setan. Ịmụ Okwu Chineke na idebe iwu ya “na-atọ [ha] ụtọ nke ukwuu.” Ikwusa ozi ọma Alaeze ya n’ụwa dum so n’iwu ahụ. Ha na-agbalị ime ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ma na-adọ ndị na-emebi iwu aka ná ntị banyere ụbọchị Chineke ga-eme ihe o kpere n’ikpe.—Ezik. 3:17, 18; Mat. 28:19, 20.
8. (a) Olee otú e sirila kwụọ ndị wepụtara onwe ha ime uche Chineke n’oge a ụgwọ maka na ha na-anụ ọkụ n’obi? (b) Olee ngọzi ndị nwere olileanya ibi n’ụwa ga-enweta n’ọdịnihu?
8 Ndị ohu Chineke nọ n’ụwa taa eruola ihe dị ka nde mmadụ asaa n’ihi na ha na-ekwusa ozi ọma e nyere ha iwu ka ha na-ekwusa. Ò nwere onye ga-asị na ndị Chineke aghọbeghị “ndị ukwu n’ụwa”? (Jọn 10:16; Mkpu. 7:9, 14) “A ga-agọzikwa” ha mgbe Chineke ga-emezu nzube ya. Mgbe ‘oké mkpagbu ahụ’ ga-abịa, a ga-echebe ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ọ bụ ha ga-ebi ‘n’ụwa ọhụrụ’ ahụ, bụ́ ebe ‘ezi omume ga-ebi.’ Ka oge na-aga, ‘a ga-agọzikwu’ ndị Amagedọn na-egbughị. Ha ga na-anabata ọtụtụ nde mmadụ a ga-akpọlite n’ọnwụ. Ihe ga-adị ezigbo mma n’ọdịnihu! N’ikpeazụ, ndị iwu Chineke “na-atọ ụtọ nke ukwuu” ga-ezu okè ma nweta “nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”—2 Pita 3:13; Rom 8:21.
Jiri Akụnụba Gị Na-eme Ihe Kwesịrị Ekwesị
9, 10. Olee ihe ezigbo Ndị Kraịst jirila akụ̀ ime mmụọ ha mee, oleekwa otú ezi omume ha ga-esi dịruo mgbe ebighị ebi?
9 “Ihe ndị dị oké ọnụ ahịa nakwa akụnụba dị n’ụlọ ya; ezi omume ya na-adịrukwa mgbe ebighị ebi. O nwuworo ndị ziri ezi dị ka ìhè n’ime ọchịchịrị. Ọ na-eme amara, na-emekwa ebere, bụrụkwa onye ezi omume.” (Ọma 112:3, 4) N’oge ochie, e nwere ụfọdụ ndị ohu Chineke bara ọgaranya. Ma, ndị na-eme ihe Chineke na-achọ bụ ọgaranya n’ezie, a sịgodị na ha enweghị akụnụba. Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike ịbụ ndị wedara onwe ha ala n’ihu Chineke bụ ndị ogbenye, bụrụkwa ndị a na-eleda anya, dị ka ọ dị n’oge Jizọs nọ n’ụwa. (Luk 4:18; 7:22; Jọn 7:49) Ma mmadụ ò nwere ihe onwunwe ma ọ̀ bụ na o nweghị, onye ahụ nwere ike ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.—Mat. 6:20; 1 Tim. 6:18, 19; gụọ Jems 2:5.
10 Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha, bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ, anaghị ejichi akụ̀ ime mmụọ ha. Kama, ha ‘na-enwuru ndị ziri ezi dị ka ìhè’ n’ime ụwa Setan nke gbara ọchịchịrị. Otú ha si eme nke a bụ site n’ime ka ndị ọzọ nweta amamihe dị oké mkpa, mụtakwa banyere Chineke. Ndị mmegide agbalịala ka ha kwụsị ọrụ nkwusa Alaeze, ma ha akụọla afọ n’ala. Kama nke ahụ, ihe a na-arụpụta n’ọrụ ezi omume a ‘na-adịru mgbe ebighị ebi.’ Ọ bụrụ na ndị ohu Chineke anọgide na-eme ezi omume n’agbanyeghị ọnwụnwa ndị na-abịara ha, obi ga-esi ha ike na ha ‘ga-adịru mgbe ebighị ebi.’
11, 12. Olee ihe ụfọdụ ndị Chineke na-eji ihe ndị ha nwere eme?
11 Ndị Chineke, ya bụ, ma òtù ohu ahụ e tere mmanụ ma “oké ìgwè mmadụ” ahụ, na-eji ihe onwunwe ha enyere ndị ọzọ aka. Abụ Ọma 112:9 kwuru, sị: “O kesawo ihe n’ụba; o nyewo ndị ogbenye ihe.” Taa, ezigbo Ndị Kraịst na-eji ihe onwunwe ha enyere ụmụnna ha na ndị agbata obi ha nọ ná mkpa aka. N’oge e nwere ọdachi, ha na-esikwa n’ihe onwunwe ha enye ihe a ga-eji nyere ndị ọdachi ahụ metụtara aka. Dị ka Jizọs kwuru, nke a na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ.—Gụọ Ọrụ 20:35; 2 Ndị Kọrịnt 9:7.
12 E wezụga ihe ndị a e kwuru n’elu, a na-emefu ego iji bipụta Ụlọ Nche a n’otu narị asụsụ na iri asaa na abụọ, ọtụtụ n’ime ndị na-asụ asụsụ ndị a dara ogbenye. A na-ebipụtakwa Ụlọ Nche a n’asụsụ ndị ogbi nakwa ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì.
Ọ Na-eme Amara, Na-ekpekwa Ikpe Ziri Ezi
13. Olee ndị setịpụụrụ anyị ezigbo ihe nlereanya n’ime amara, oleekwa otú anyị ga-esi ṅomie ihe nlereanya ha?
13 “Onye na-eme amara, nke na-agbazinyekwa mmadụ ihe, bụ ezigbo mmadụ.” (Ọma 112:5) O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ụfọdụ ndị na-enyere ndị ọzọ aka abụchaghị ndị na-eme amara. Ụfọdụ na-enye ihe iji gosi na ha ka ndị ha nyere ihe, ebe ndị ọzọ anaghị eji obi ha enye ihe. Ọ naghị eme obi ụtọ ma mmadụ nye gị ihe iji gosi na ya ka gị, ma ọ bụkwanụ nye gị ya ka i wee kwụsị inye ya nsogbu. Ma, ọ bụrụ na onye na-eme amara emeere gị ihe, ị ga-enwe obi ụtọ. Jehova bụ onye kacha eme amara na onye kacha eji obi ụtọ enye ihe. (1 Tim. 1:11; Jems 1:5, 17) Jizọs Kraịst mekwaara ndị mmadụ amara dị ka Nna ya si eme. (Mak 1:40-42) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke gụọ anyị ná ndị ezi omume, anyị ga-eji obi ụtọ na-enye ihe ma na-emere ndị ọzọ amara, karịchaa mgbe anyị na-enyere ndị ọzọ aka ka ha mata Jehova.
14. Olee ụzọ ụfọdụ anyị ga-esi ‘jiri ikpe ziri ezi na-eme ihe ndị anyị na-eme’?
14 “Ọ na-eji ikpe ziri ezi eme ihe ndị ọ na-eme.” (Ọma 112:5) Dị ka e buru n’amụma, onye ahụ na-elekọta ụlọ, onye kwesịrị ntụkwasị obi, na-elekọta ihe Nna ya Ukwu nwere, bụ́ nke kwekọrọ n’ikpe ziri ezi Jehova. (Gụọ Luk 12:42-44.) A na-ahụ nke a ná nduzi sitere n’Akwụkwọ Nsọ a na-enye ndị okenye, bụ́ ndị na-ekpe ikpe mgbe ụfọdụ n’ọgbakọ ma e nwee ndị mere mmehie dị oké njọ. Ntụziaka sitere na Baịbụl, bụ́ nke òtù ohu ahụ na-enye banyere otú e kwesịrị isi na-eme ihe n’ọgbakọ, n’ebe obibi ndị ozi ala ọzọ, nakwa na Betel, na-egosi na ohu a na-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ bụghị naanị ndị okenye ka a chọrọ ka ha na-ekpe ikpe ziri ezi, a chọkwara ka Ndị Kraịst ndị ọzọ na-emeso ụmụnna ha, ndị na-abụghị Ndị Kraịst, nakwa ndị ha na ha na-emekọ ihe ego ihe n’ụzọ ziri ezi.—Gụọ Maịka 6:8, 11.
Ngọzi Ndị Ezi Omume Ga-enweta
15, 16. (a) Olee otú akụkọ ọjọọ ndị a na-anụ n’ụwa si emetụta ndị ezi omume? (b) Olee ihe ndị ohu Chineke kpebisiri ike na ha ga na-eme?
15 “Ọ dịghị mgbe a ga-eme ka ọ maa jijiji. A ga na-echeta onye ezi omume ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gaghị atụ akụkọ ọjọọ egwu. Obi ya kwụ chịm, Ọma 112:6-8) Anyị na-anụ akụkọ ọjọọ ugbu a karịa ka anyị na-anụ ha na mbụ. Anyị na-anụ akụkọ banyere agha, iyi egwu, ọrịa dị iche iche pụtara ọhụrụ na ndị nke lara ala, bụ́ ndị na-abịaghachi, mpụ, ịda ogbenye, na mmetọ a na-emetọ ikuku na mmiri. Nsogbu ndị a na-emetụtakwa ndị Chineke gụrụ ná ndị ezi omume, ma ha anaghị eme ka ha daa mba n’okwukwe. Kama nke ahụ, obi ha “kwụ chịm,” ọ naghịkwa “ama jijiji” n’ihi na obi siri ha ike na ihe ga-aka mma n’ọdịnihu maka na ụwa ọhụrụ Chineke dị nso, bụ́ nke ezi omume ga-ebi n’ime ya. Mgbe ọ bụla ọdachi dakwasịrị ha, ha na-enwe ike idi ya n’ihi na obi siri ha ike na Jehova ga-enyere ha aka. Ọ dịghị mgbe ọ ga-ahapụ ndị ya na-eme ezi omume ka ha “maa jijiji,” ọ na-enyere ha aka, na-enyekwa ha ume ha ga-eji die nsogbu ha.—Fil. 4:13.
daberekwa na Jehova. Obi ya adịghị ama jijiji; ọ gaghị atụ egwu, ruo mgbe ọ ga na-ele ndị iro ya anya, na-achị ha ọchị.” (16 Ndị Chineke, bụ́ ndị ezi omume, na-edi asị ndị mmegide kpọrọ ha nakwa ụgha ha na-aghagide ha n’ebe niile. Nke a emebeghị ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma, ọ gaghịkwa eme ka ha kwụsị. Kama nke ahụ, ndị ohu Chineke kwụ chịm, ha anaghị ama jijiji n’ọrụ Jehova nyere ha, ya bụ, ọrụ ikwusa ozi ọma Alaeze na ime ka ndị nabatara ozi ha ghọọ ndị na-ezo ụzọ Jizọs. O doro anya na mmegide a na-emegide ndị ezi omume ga-aka njọ ka ọgwụgwụ na-erukwu nso. Asị a kpọrọ ndị ezi omume ga-akakwu njọ nke na Setan bụ́ Ekwensu, onye bụ́ Gọg nke Megọg, ga-ebuso ndị Chineke agha n’ụwa dum. N’ikpeazụ, anyị ga ‘na-ele ndị iro anyị anya’ mgbe a ga-emeri ha kpamkpam. Ọ ga-amagbu onwe ya ịhụ mgbe a ga-edo aha Jehova nsọ kpamkpam!—Ezik. 38:18, 22, 23.
‘E Mere Ka Ọ Dị Elu ma Nwee Nsọpụrụ’
17. Olee otú a ga-esi mee ka onye na-eme ezi omume “dị elu ma nwee nsọpụrụ”?
17 Obi ga-adị anyị nnọọ ụtọ mgbe anyị ga na-efekọ Jehova ọnụ, bụ́ mgbe Ekwensu na ụwa ya na-agaghị na-emegide anyị. Ọ bụ ndị niile Chineke gụrụ ná ndị ezi omume ga-eji obi ụtọ na-eto Jehova ruo mgbe ebighị ebi. A gaghị emenye ha ihere, a gaghịkwa emeri ha, n’ihi na Jehova ekwela nkwa na ya ga-eme ka “mpi” nke ndị ya, bụ́ ndị na-eme ezi omume, “dị elu ma nwee nsọpụrụ.” (Ọma 112:9) Onye Jehova gụrụ n’onye ezi omume ga-emeri mgbe a ga-ebibi ndị niile na-emegide ọbụbụeze Jehova.
18. Olee otú a ga-esi mezuo okwu e ji mechie Abụ Ọma nke 112?
18 “Onye ajọ omume ga-ahụ ya wee iwe. Ọ ga-ata ikikere ezé wee pụọ n’anya. Ihe na-agụ ndị ajọ omume ga-ala n’iyi.” (Ọma 112:10) N’oge na-adịghị anya, ndị niile nọgidere na-emegide ndị Chineke ‘ga-apụ n’anya,’ ha na anyaụfụ ha na ịkpọasị ha. Ọchịchọ ha na-achọ ka ọrụ ikwusa ozi ọma anyị kwụsị ga-eso ha laa n’iyi n’oge “oké mkpagbu” nke na-abịa.—Mat. 24:21.
19. Gịnị ka obi siri anyị ike na ọ ga-eme?
19 Ị̀ ga-eso ná ndị ga-adị ndụ mgbe a ga-enwe nnukwu mmeri ahụ? Ka ị̀ ga-eso ná “ndị ezi omume,” bụ́ ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ma ọ bụrụ na ị nwụọ n’ihi ọrịa ma ọ bụ nká tupu e bibie ụwa Setan a? (Ọrụ 24:15) Azịza ya ga-abụ ee ma ọ bụrụ na i nwere okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs ma na-eṅomi Jehova, dị ka ndị “onye” ahụ na-eme ezi omume, bụ́ onye a kọwara n’Abụ Ọma nke 112, na-anọchi anya ha. (Gụọ Ndị Efesọs 5:1, 2.) Jehova “ga-echeta” ndị dị otú ahụ, ọ gaghị echefu ọrụ ezi omume ha. Jehova ga-echeta ha ma hụ ha n’anya ruo mgbe ebighị ebi.—Ọma 112:3, 6, 9.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
^ par. 5 Otú e si dee abụ ọma abụọ a na ihe ndị e dere na ha na-egosi na ha kwekọrọ. “Onye” ahụ nke na-atụ egwu Chineke toro àgwà Chineke n’Abụ Ọma nke 111, tookwa ya n’Abụ Ọma nke 112. Ihe e dere n’Abụ Ọma 111:3, 4 na Abụ Ọma 112:3, 4 na-egosi na nke a bụ eziokwu.
Ajụjụ Ndị Anyị Ga-echebara Echiche
• Olee ụfọdụ ihe mere anyị ga-eji tie “Haleluja”?
• Olee ihe mere n’oge a nke mere ka ezigbo Ndị Kraịst na-enwe obi ụtọ dị ukwuu?
• Olee ụdị inye ihe nke na-amasị Jehova?
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Foto dị na peeji nke 25]
Ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke nọgide na-agụ anyị ná ndị ezi omume, anyị aghaghị inwe okwukwe n’ọbara Jizọs wụsịrị
[Foto ndị dị na peeji nke 26]
A na-eji onyinye afọ ofufo ndị a na-enye enyere ndị ọdachi dakwasịrị aka, jirikwa ha na-ekesa akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl