Lekwasị Anya n’Ihe ahụ A Na-agbata n’Ọsọ
Lekwasị Anya n’Ihe ahụ A Na-agbata n’Ọsọ
“Ana m achụso ihe mgbaru ọsọ ahụ iji nweta ihe a na-agbata n’ọsọ.”—FIL. 3:14.
1. Olee ihe a na-agbata n’ọsọ nke e kwere Pọl onyeozi ná nkwa?
PỌL onyeozi, onye aha ya bụkwa Sọl onye Tasọs, si n’ezinụlọ a na-akwanyere ùgwù. Ọ bụ Gameliel, bụ́ otu onye a ma ama nke na-akụzi Iwu Mozis, kụziiri ya banyere okpukpe ndị nna nna ya. (Ọrụ 22:3) Pọl nwere ọrụ ndị mmadụ weere na ọ bụ ezigbo ọrụ; n’agbanyeghị nke ahụ, ọ hapụrụ okpukpe ya, ma ghọọ Onye Kraịst. O lekwasịziri anya n’ihe a na-agbata n’ọsọ nke e kwere ya ná nkwa, nke bụ́ ndụ ebighị ebi. Ọ ga-eso bụrụ eze na onye nchụàjà na-agaghị anwụ anwụ n’Alaeze Chineke n’eluigwe. Alaeze a ga-achị ụwa mgbe ọ ga-aghọ paradaịs.—Mat. 6:10; Mkpu. 7:4; 20:6.
2, 3. Olee otú inweta ndụ ebighị ebi n’eluigwe dịruru Pọl mkpa?
2 Pọl gosiri na ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ dị ya ezigbo mkpa. Ọ sịrị: “Ihe ndị bụụrụ m uru, m weere ha dị ka ihe na-abaghị uru n’ihi Kraịst. N’ihi nke ahụ, ana m agụ ihe niile n’ezie dị ka ihe na-abaghị uru n’ihi uru na-enweghị atụ nke ihe ọmụma banyere Kraịst Jizọs Onyenwe m bara. N’ihi ya, ekwerewo m ka ihe niile funahụ m, ana m agụkwa ha dị ka nnukwu ihe e kpofuru ekpofu.” (Fil. 3:7, 8) Mgbe Pọl matara ihe Jehova zubeere ụmụ mmadụ, o weere ihe ọtụtụ ndị na-ele anya na ha dị mkpa, ya bụ, ọkwá, ihe onwunwe, ọrụ, na oké aha, dị ka ihe e kpofuru ekpofu.
3 Malite mgbe ahụ gawa, ihe dị Pọl ezigbo mkpa bụ ịmata Jehova na Kraịst, bụ́ ihe Jizọs kwuru banyere ya n’ekpere o kpekuru Chineke, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ihe Pọl kwuru ná Ndị Filipaị 3:14 gosiri na inweta ndụ ebighị ebi gụsiri ya agụụ ike. Ọ sịrị: “Ana m achụso ihe mgbaru ọsọ ahụ iji nweta ihe a na-agbata n’ọsọ, bụ́ òkù a kpọrọ ịga eluigwe, nke Chineke kpọrọ site n’aka Kraịst Jizọs.” N’eziokwu, o lekwasịrị anya ná ndụ ebighị ebi ọ ga-enweta n’eluigwe mgbe ọ ga-eso na-achị n’Alaeze Chineke.
Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’Ụwa
4, 5. Olee ihe a na-agbata n’ọsọ e kwere ọtụtụ nde mmadụ ndị na-eme uche Chineke n’ụwa taa ná nkwa?
4 Ihe ọtụtụ n’ime ndị na-eme uche Chineke kwesịrị ịrụsi ọrụ ike ka ha nweta bụ ndụ ebighị ebi n’ụwa nke Chineke ga-eme ka ọ dị ọhụrụ. (Ọma 37:11, 29) Jizọs mesiri anyị obi ike na anyị ga-enweta ihe a anyị na-atụ anya ya. Ọ sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị dị nwayọọ n’obi, n’ihi na ha ga-eketa ụwa.” (Mat. 5:5) Dị ka Abụ Ọma 2:8 gosiri, Jizọs bụ onye bụ́ isi e nyere ụwa anyị a ka ọ bụrụ ihe nketa ya. Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-anọkwa n’eluigwe na-achị. (Dan. 7:13, 14, 22, 27) Ndị yiri atụrụ, bụ́ ndị ga-ebi n’ụwa, “ga-eketa” ụwa mgbe Alaeze ahụ ‘a kwadebeere ha malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa’ ga na-achị. (Mat. 25:34, 46) Obi siri anyị ike na nke a ga-emezurịrị n’ihi na Chineke, bụ́ onye kwere nkwa a, ‘apụghị ịgha ụgha.’ (Taị. 1:2) Anyị kwesịrị inwe ụdị obi ike ahụ Jọshụa nwere na Chineke ga-eme ihe o kwere ná nkwa. Jọshụa gwara ụmụ Izrel, sị: “Ọ dịghị otu ihe n’ime ihe ọma niile Jehova bụ́ Chineke unu gwara unu nke na-emezughị. Ha niile emezuworo unu. Ọ dịghị otu ihe n’ime ha nke na-emezughị.”—Jọsh. 23:14.
5 Nsogbu ndị e nwere ugbu a agaghị adị n’ụwa ọhụrụ Chineke. Ihe ga-adị nnọọ iche: agha, mpụ, ịda ogbenye, ikpe na-ezighị ezi, ọrịa, na ọnwụ agaghị adị na ya. N’oge ahụ, ndị mmadụ ga-enwe ahụ́ ike zuru okè, birikwa n’ụwa e mere ka ọ ghọọ paradaịs. Anyị agaghị echetali otú ndụ ga-atọru ụtọ mgbe ahụ. N’oge ahụ, obi ga na-atọ ndị mmadụ ụtọ kwa ụbọchị. Nke a bụ ihe magburu onwe ya a na-agbata n’ọsọ!
6, 7. (a) Olee ihe Jizọs mere iji gosi ihe ndị anyị ga-atụ anya ha n’ụwa ọhụrụ Chineke? (b) Olee otú a ga-esi mee ka ndị nwụrụ anwụ malite ịdị ndụ ọzọ?
6 Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, mmụọ nsọ Chineke nyere ya ike ịrụ ọrụ ebube iji gosi ihe ndị dị ebube ga-eme n’ụwa dum n’ụwa ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, Jizọs gwara otu nwoke ahụ́ ya kpọnwụrụ akpọnwụ kemgbe afọ iri atọ na asatọ ka ọ gawa ije. Baịbụl kwuru na nwoke ahụ malitere ịga ije. (Gụọ Jọn 5:5-9.) N’ụbọchị ọzọ, Jizọs hụrụ “otu nwoke kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya,” wee gwọọ ya. Ka e mechara, ndị mmadụ jụrụ nwoke ahụ kpuburu ìsì ajụjụ banyere Onye gwọrọ ya, o wee, sị: “Malite n’oge ochie, a nụtụbeghị na mmadụ meghere anya onye kpuru ìsì malite mgbe a mụrụ ya. Ọ bụrụ na nwoke a esighị n’ebe Chineke nọ bịa, ọ pụghị ime ihe ọ bụla ma ọlị.” (Jọn 9:1, 6, 7, 32, 33) Ihe mere Jizọs ji nwee ike ime ihe a niile bụ n’ihi na Chineke nyere ya ike. Ebe ọ bụla Jizọs gara, ọ gwọrọ “ndị nwere mkpa ọgwụgwọ.”—Luk 9:11.
7 Ọ bụghị naanị na Jizọs gwọrọ ndị ahụ́ na-adịghị, meekwa ka ndị ngwọrọ jewe ije, ọ kpọlitekwara ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwata nwaanyị dị afọ iri na abụọ nwụrụ, ndị mụrụ ya ruru uju nke ukwuu. Ma, Jizọs sịrị: “Nwata nwaanyị, ana m asị gị, Bilie!” Ya ebilie n’eziokwu! Chegodị echiche otú obi dị ndị mụrụ ya na ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ. (Gụọ Mak 5:38-42.) N’ụwa ọhụrụ Chineke, a ga-enwe “oké obi ụtọ” mgbe a ga-akpọlite ọtụtụ ijeri mmadụ n’ọnwụ, n’ihi na “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ 24:15; Jọn 5:28, 29) Ha ga-amalite ịdị ndụ ọzọ, nweekwa olileanya ịdị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.
8, 9. (a) N’oge Ọchịchị Otu Puku Afọ Kraịst, gịnị ga-eme mmehie anyị ketara n’aka Adam? (b) Olee ihe a ga-eji maka ya kpee ndị e si n’ọnwụ kpọlite ikpe?
8 A ga-enye ndị e si n’ọnwụ kpọlite ohere ịdị ndụ ebighị ebi. A gaghị ama ha ikpe maka mmehie ha mere tupu ha anwụọ. (Rom 6:7) N’Oge Ọchịchị Otu Puku Afọ Kraịst, mgbe ndị mmadụ ga-erite uru zuru ezu n’àjà mgbapụta Jizọs chụrụ, ndị na-erubere Alaeze ya isi ga-eji nwayọọ nwayọọ zuo okè, wee ghọọ ndị mmehie Adam na-agaghịzi akpatara nsogbu. (Rom 8:21) Jehova “ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.” (Aịza. 25:8) Baịbụl kwukwara na ‘a ga-emeghe akwụkwọ mpịakọta dị iche iche,’ nke na-egosi na a ga-akụziri ndị dị ndụ mgbe ahụ ihe ọhụrụ. (Mkpu. 20:12) Ka a na-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, “ọ bụ ezi omume ka ndị bi n’elu ala ga-amụta.”—Aịza. 26:9.
9 A gaghị ekpe ndị e si n’ọnwụ kpọlite ikpe n’ihi mmehie ha ketara n’aka Adam, kama, a ga-ekpe ha ikpe n’ihi ihe ha onwe ha họọrọ ime. Mkpughe 20:12 sịrị: “E kpekwara ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, dị ka omume ha si dị,” ya bụ, ihe ha mere malite n’oge a kpọlitere ha n’ọnwụ gawa. Nke a na-egosi nnọọ na Jehova na-ekpe ikpe ziri ezi, na-eme ebere, hụkwa anyị n’anya. Ihe ọzọ bụ na ndị e si n’ọnwụ kpọlite ‘agaghị echeta’ ihe ọjọọ ndị mere ha n’oge ha dịrị ndụ n’ụwa ochie a, ‘ha agaghị abatakwa ha n’obi.’ (Aịza. 65:17) Ebe ọ bụ na e nwere ihe ọhụrụ a ga-akụziri ha, nweekwa ihe ndị dị mma a ga-eji na-atụ ndụ mmanụ, ihe ọjọọ ndị mere ha n’oge mbụ ha dịrị ndụ agaghịzi na-enye ha nsogbu. Ha ga-echefu ihe ndị mere ha n’oge gara aga. (Mkpu. 21:4) Oké ìgwè mmadụ ahụ, bụ́ ndị Amagedọn na-akpaghị aka, ga-echefukwa nsogbu ndị ha nwere n’oge gara aga.—Mkpu. 7:9, 10, 14.
10. (a) Olee otú ndụ ga-adị n’ụwa ọhụrụ Chineke? (b) Gịnị ka ị ga-eme ka i wee lekwasị anyị n’ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ?
10 N’ụwa ọhụrụ Chineke, ndị mmadụ ga-adị ndụ n’arịaghị ọrịa, ha agaghịkwa anwụ anwụ. “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’” (Aịza. 33:24) Ka oge na-aga, ndị bi n’ụwa ọhụrụ ga-eteta kwa ụtụtụ wee nwee ahụ́ ike zuru okè ma na-atụ anya na echi ga-amagbu onwe ya. Ha ga na-atụ anya ịrụ ọrụ ga-enye ha obi ụtọ, tụọkwa anya na ha na ndị ha hụrụ n’anya ga na-akpakọrịta. Ndụ dị otú a bụ n’ezie ihe magburu onwe ya a na-agbata n’ọsọ! Sapeta Baịbụl gị gụọ amụma ndị dị n’Aịzaya 33:24 na 35:5-7. Were ya na amụma ndị a na-emezu n’ahụ́ gị. Nke a ga-eme ka i lekwasị anya n’ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ.
Ndị Na-elekwasịghị Anya n’Ihe ahụ A Na-agbata n’Ọsọ
11. Kwuo otú Sọlọmọn si malite ọchịchị ya n’ụzọ dị mma.
11 Ọ bụrụ na anyị amata banyere ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ, anyị kwesịrị ịrụsi ọrụ ike ka anyị wee lekwasị anya na ya n’ihi na ma anyị amaghị ihe anyị mere, anyị nwere ike ileghara ya anya. Dị ka ihe atụ, mgbe Sọlọmọn ghọrọ eze Izrel oge ochie, o ji obi umeala rịọ Chineke n’ekpere ka o nye ya amamihe na nghọta ka o wee nwee ike ikpe ndị Chineke ikpe n’ụzọ ziri ezi. (Gụọ 1 Ndị Eze 3:6-12.) N’ihi ya, Baịbụl sịrị, “Chineke wee na-enye Sọlọmọn amamihe na nghọta n’ebe ọ dị ukwuu.” N’ezie, ‘amamihe Sọlọmọn dị ukwuu karịa amamihe ndị Ọwụwa Anyanwụ niile, karịakwa amamihe niile nke Ijipt.’—1 Eze 4:29-32.
12. Olee ndụmọdụ Jehova nyere ndị ga-aghọ eze n’Izrel?
12 Ma, tupu Sọlọmọn aghọọ eze, Jehova dọrọ aka ná ntị na onye ọ bụla ghọrọ eze ‘agaghị eme ka ịnyịnya ya dị ọtụtụ,’ nakwa na ‘ọ gaghị alụ ọtụtụ ndị inyom, ka obi ya wee ghara ịpụ n’ebe Chineke nọ.’ (Diut. 17:14-17) Ọ bụrụ na eze emee ka ịnyịnya ya dị ọtụtụ, ọ na-egosi na o kweere na ọ bụghị Jehova, bụ́ Onye Nchebe anyị, na-echebe Izrel kama ọ bụ ndị agha ya. Ịlụ ọtụtụ ndị inyom adịghị mma n’ihi na ụfọdụ n’ime ha nwere ike isi na mba ndị gbara ha gburugburu, bụ́ ndị na-ekpere arụsị. Ndị inyom ahụ nwekwara ike ime ka eze kwụsị ife Jehova.
13. Olee otú Sọlọmọn si leghara ihe e nyere ya anya?
13 Sọlọmọn egeghị ntị na ndụmọdụ ndị ahụ. Kama, o mere ihe Jehova kwuru na ndị eze Izrel ekwesịghị ime. O nwere ọtụtụ puku ịnyịnya na ndị na-agba ha. (1 Eze 4:26) O nwekwara narị nwunye asaa na narị ndị iko atọ, ọtụtụ n’ime ha sikwa mba ndị na-ekpere arụsị, bụ́ ndị dị mba Izrel nso. Ha ‘mere ka obi ya chigharịa soro chi ọzọ dị iche iche; obi ya dum adịghịkwa n’ebe Jehova nọ.’ Sọlọmọn fere chi ụgha nke mba dị iche iche na-ekpere arụsị na-efe, bụ́ ndị ndị inyom ọ lụtara na mba ndị ahụ mere ka o fewe. N’ihi ya, Jehova kwuru na ya ‘aghaghị ịdọkapụ alaeze’ ahụ n’aka Sọlọmọn.—1 Eze 11:1-6, 11.
14. Gịnị ka nnupụisi Sọlọmọn na mba Izrel nupụụrụ Chineke kpatara?
14 Sọlọmọn elekwasịghịzi anya n’ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa o nwere, nke bụ́ ịnọchite anya ezi Chineke. O mikpuru onwe ya n’ikpere arụsị. Ka oge na-aga, Izrel dum dapụrụ n’ezi ofufe, nke mere ka e bibie ha n’afọ 607 T.O.A. N’agbanyeghị na ndị Juu mechara maliteghachi ife Chineke, ka ọtụtụ narị afọ gachara, otú ha si akpa àgwà mere ka Jizọs kwuo, sị: “A ga-anapụ unu alaeze Chineke, werekwa ya nye mba nke na-amị mkpụrụ ya.” Nke a mezuru. Jizọs sịrị: “Lee! A hapụworo unu ụlọ unu.” (Mat. 21:43; 23:37, 38) Mba Izrel enwekwaghị nnukwu ihe ùgwù ha nweburu, ya bụ, ịnọchite anya ezi Chineke, n’ihi na ha ekwesịghị ntụkwasị obi. N’afọ 70 O.A., ndị agha Rom bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ ya, ọtụtụ ndị Juu ndị ọzọ fọdụrụ ndụ ghọrọ ndị ohu.
15. Kwuo ndị leghaara ihe dị ezigbo mkpa anya.
15 Judas Iskarịọt bụ otu n’ime ndịozi iri na abụọ Jizọs. Judas nụrụ ozizi magburu onwe ya Jizọs ziri, hụkwa ọrụ ebube dị iche iche mmụọ nsọ Chineke mere ka ọ rụọ. Ma, Judas echebeghị obi ya. Ọ bụ ya na-eji igbe Jizọs na ndịozi ya iri na abụọ na-etinye ego. Ma, “ọ bụ onye ohi, . . . ọ na-ewerekwa ego e tinyere na ya.” (Jọn 12:6) O nwere anyaukwu gabiga ókè nke na ọ gakwuuru ndị isi nchụàjà, bụ́ ndị ihu abụọ, ha na ya wee kwekọrịta na ọ ga-arara Jizọs nye ha ma ha nye ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ. (Mat. 26:14-16) Onye ọzọ na-elekwasịghị anya n’ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ bụ Dimas, onye ya na Pọl onyeozi na-esobu aga ozi. Dimas echebeghị obi ya. Pọl sịrị: “Dimas agbahapụwo m n’ihi na ọ hụrụ usoro ihe dị ugbu a n’anya.”—2 Tim. 4:10; gụọ Ilu 4:23.
Ihe Onye Ọ Bụla n’Ime Anyị Ga-amụta
16, 17. (a) Olee otú ike onye na-emegide anyị hà? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka idi ihe ọ bụla Setan ga-ewetara anyị?
16 Ndị ohu Chineke niile kwesịrị ichebara ihe atụ ndị dị na Baịbụl echiche, n’ihi na a gwara anyị, sị: “Ihe ndị a nọ na-adakwasị ha 1 Kọr. 10:11) Anyị bi ugbu a n’oge ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a.—2 Tim. 3:1, 13.
dị ka ihe atụ, e dekwara ha ede ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka ná ntị, anyị ndị ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị a bịakwasịworo.” (17 Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ “chi nke usoro ihe a,” ma na ya “nwere oge dị mkpirikpi.” (2 Kọr. 4:4; Mkpu. 12:12) Ọ ga-eme ihe ọ bụla o nwere ike ime iji hụ na Ndị Kraịst nupụụrụ Chineke isi. Ọ bụ Setan na-achị ụwa a, ihe ụwa ji agbasa akụkọ dịkwa ya n’aka. Ma, ndị Jehova nwere ihe ka ya ike, ya bụ, “ike karịrị ike nkịtị.” (2 Kọr. 4:7) Obi siri anyị ike na ike a nke si n’aka Chineke ga-enyere anyị aka idi nsogbu ọ bụla Setan ga-ewetara anyị. Ọ bụ ya mere e ji gbaa anyị ume ka anyị na-ekpe ekpere mgbe niile. Anyị nwekwara obi ike na Jehova ‘ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ’ ihe ha na-arịọ ya.—Luk 11:13.
18. Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele ụwa a anya?
18 Ọmụma anyị ma na a ga-ebibi ụwa Setan n’oge na-adịghị anya nakwa na a gaghị ebibi ezigbo Ndị Kraịst na-eme ka okwukwe anyị sie ike. “Ụwa na-agabiga, ọchịchọ ya na-agabigakwa, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Jọn 2:17) N’ihi ya, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya ohu Chineke ọ bụla iche na o nwere ihe dị n’usoro ihe a nke nwere ike ịbara ya uru kara ya na Jehova ịdị ná mma. Ụwa a Setan na-achị na-agabiga agabiga. Ma, Jehova enyela anyị ọgbakọ Ndị Kraịst, bụ́ nke na-echebe ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi. Ka ha na-aga ka ha banye n’ụwa ọhụrụ, ha ga-enwe obi ike ná nkwa a: “A ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ọ bụ ndị nwere olileanya n’ebe Jehova nọ ga-enweta ụwa.” (Ọma 37:9) Ya mere, lekwasị anya n’ihe a magburu onwe ya a na-agbata n’ọsọ!
Ì Chetara?
• Olee otú Pọl si lee ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ e kwere ya ná nkwa anya?
• Olee ihe a ga-eji maka ya kpee ndị ga-ebi n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi ikpe?
• Gịnị bụ ihe amamihe dị na ya nke i kwesịrị ime ugbu a?
[Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Ihe]
[Foto dị na peeji nke 12, 13]
Ị̀ na-ewere na i nwetala ihe ahụ a na-agbata n’ọsọ mgbe ị gụrụ amaokwu Baịbụl nke na-ekwu banyere ya?