Echefukwala Jehova
Echefukwala Jehova
ỤMỤ Izrel chọrọ ịgafe osimiri Jọdan. Ụfọdụ n’ime ha emetụla ihe yiri ya, ma e nwere ọtụtụ n’ime ha nke a ga-abụ nke mbụ na nke ikpeazụ ha ga-eji ụkwụ agafe osimiri, mmiri aghara imetụ ha. Jehova mere ka Osimiri Jọdan kewaa abụọ. Ọtụtụ nde ụmụ Izrel kwụụrụ n’ogologo ahịrị si n’ala akọrọ na-agafe iji banye n’Ala Nkwa ahụ. Dị ka ndị nna nna ha mere mgbe ha gafere Oké Osimiri Uhie afọ iri anọ tupu oge a ha gafere Osimiri Jọdan, ọtụtụ ndị gafere Osimiri Jọdan ugbu a ga na-ekwu n’obi ha, sị, ‘Agaghị m echefu ihe a Jehova mere.’—Jọsh. 3:13-17.
Ma, Jehova maara na ụfọdụ ụmụ Izrel ‘ga-echefu ọrụ ya ngwa ngwa.’ (Ọma 106:13) N’ihi ya, ọ gwara onye ndú ụmụ Izrel, bụ́ Jọshụa, ka o buru nkume iri na abụọ n’ala osimiri ahụ ma busa ha n’ebe mbụ ha ga-ama ụlọikwuu. Jọshụa gwara ụmụ Izrel, sị: “Nkume ndị a ga-abụkwara ụmụ Izrel ihe ncheta.” (Jọsh. 4:1-8) Nkume ndị ahụ ga-echetara ụmụ Izrel ọrụ ndị dị ike Jehova rụrụ, chetakwara ha ihe mere ha ga-eji jiri ikwesị ntụkwasị obi na-efe ya.
Akụkọ ahụ ọ̀ baara ndị Chineke uru taa? Ee. Anyịnwa ekwesịghịkwa ichefu Jehova; anyị ga-anọgidekwa na-eji ikwesị ntụkwasị obi na-efe ya ofufe. Ihe ndị ọzọ a gwara ụmụ Izrel iji dọọ ha aka ná ntị gbasakwara ndị ohu Jehova taa. Mozis kwuru, sị: “Lezie anya ka ị ghara ichefu Jehova bụ́ Chineke gị, i wee ghara idebe ihe o nyere n’iwu na mkpebi ikpe ya na ụkpụrụ ya.” (Diut. 8:11) Ihe a e kwuru ebe a gosiri na mmadụ ichefu Jehova nwere ike ime ka o nupụrụ ya isi. Nke a nwekwara ike ime n’oge anyị a. Mgbe Pọl onyeozi na-edegara Ndị Kraịst akwụkwọ, ọ dọrọ ha aka ná ntị ka ha ghara ịdaba “n’ụdị nnupụisi ahụ” ụmụ Izrel dabara n’ala ịkpa.—Hib. 4:8-11.
Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ mere ná mba Izrel, bụ́ ndị gosiri na anyị ekwesịghị ichefu Chineke. Akụkọ banyere ndị Izrel abụọ kwesịrị ntụkwasị obi ga-emekwa ka anyị jiri ntachi obi na obi ekele na-efe Jehova.
Ihe Ndị Mere Anyị Ga-eji Na-echeta Jehova
Jehova echefughị ụmụ Izrel n’ime afọ niile ahụ ha nọ n’Ijipt. O ‘chetara ọgbụgba ndụ ya na Ebreham, Aịzik na Jekọb’ gbara. (Ọpụ. 2:23, 24) Ihe o mere n’oge ahụ iji mee ka ha ghara ịbụkwa ohu bụ ihe a na-agaghị echefu echefu.
Jehova tiri Ijipt ihe otiti itoolu. Ndị dibịa anwansi Fero akwụsịlighị ihe otiti ndị ahụ. Ma, Fero egeghị Jehova ntị, ọ hapụghịkwa ụmụ Izrel ka ha laa. (Ọpụ. 7:14–10:29) Ma, ihe otiti nke iri manyere eze ahụ dị mpako ime ihe Chineke kwuru. (Ọpụ. 11:1-10; 12:12) Mozis duuru mba Izrel na ndị ọzọ na-abụghị ndị Izrel, si n’Ijipt pụọ. Ha niile dị ihe dị ka nde mmadụ atọ. (Ọpụ. 12:37, 38) Ha agatebeghị aka mgbe Fero gbanwere obi ya wee chọọ ka ha lọghachi. Ọ gwara ndị agha ya na-agba ụgbọ ịnyịnya na ndị nke na-agba ịnyịnya nkịtị, bụ́ ndị agha kacha ike e nwere n’oge ahụ, ka ha gaa kpọghachi ndị ahụ na-agbaburu ya ohu. Jehova agwalarị Mozis ka o duru ụmụ Izrel gawa n’ebe a na-akpọ Paịhahaịrọt, nke dị n’agbata Oké Osimiri Uhie na ọtụtụ ugwu. Ha yiri ndị tọrọ atọ n’ebe ahụ.—Ọpụ. 14:1-9.
Fero chere na ụmụ Izrel atọla ebe ahụ, cheekwa na ndị agha ya ga-ejide ha ozugbo. Ma Jehova mere ka ndị Ijipt ghara ijide ụmụ Izrel site n’itinye ogidi ígwé ojii na ogidi ọkụ n’etiti ha na ụmụ Izrel. Chineke wee mee ka Oké Osimiri Uhie ahụ kewaa abụọ. Mmiri ahụ akwụrụ ka mgbidi n’akụkụ abụọ, ogo ya dịkwa ihe dị ka mita iri na ise. Ụmụ Izrel malitere ịgafe n’ala akọrọ. N’oge na-adịghị anya, ndị Ijipt rutere Ọpụ. 13:21; 14:10-22.
n’ụsọ oké osimiri ahụ, hụ ndị Izrel ka ha na-agafe oké osimiri ahụ.—Eze ma ihe gaara akwụsị ịchụ ụmụ Izrel, ma Fero siri ọnwụ. Ebe obi ya gwara ya na ya ga-ejideli ha, ọ gwara ndị agha ya na-agba ụgbọ ịnyịnya na ndị nke na-agba ịnyịnya nkịtị ka ha chụrụ ụmụ Izrel banye n’ala oké osimiri ahụ. Ha gbaara na-aga n’eleghị anya n’azụ. Ma tupu ha erute ebe ndị Izrel nọ, egwú dagharịrị. Ụgbọ ịnyịnya ha kwụsịrị ịga ihu n’ihi na Jehova hịọpụchara ụkwụ ha.—Ọpụ. 14:23-25; 15:9.
Ka ndị Ijipt na ụgbọ ha mebiri emebi nọ na-alụ, ndị Izrel gafechara. Mozis ewee setịa aka n’elu Oké Osimiri Uhie. Mgbe o mere nke a, Jehova mere ka mmiri ahụ, bụ́ nke kwụ ka mgbidi, zeda. Mmiri ahụ nke malitere sọsiwe ike riri Fero na ndị agha ya. Ọ dịghị onye n’ime ha pụtaranụ. Ụmụ Izrel enwerela onwe ha.—Ọpụ. 14:26-28; Ọma 136:13-15.
Ruo ọtụtụ afọ, akụkọ banyere ihe a merenụ mere ka ụjọ jide mba ndị nọ gburugburu ebe ahụ. (Ọpụ. 15:14-16) Mgbe afọ iri anọ gachara, Rehab onye Jeriko gwara ụmụ nwoke abụọ bụ́ ndị Izrel, sị: “Ụjọ unu ejidela anyị, . . . n’ihi na anyị anụwo otú Jehova si mee ka mmiri Oké Osimiri Uhie takọọ n’ihu unu mgbe unu si n’Ijipt pụta.” (Jọsh. 2:9, 10) Ọbụna mba dị iche iche na-ekpere arụsị echefughị otú Jehova si napụta ndị ya. N’ezie, e nwere ọtụtụ ihe ọzọ mere mba Izrel ga-eji na-echeta Jehova.
‘Ichebe Ha Dị Ka Nwa Anya Ya’
Mgbe ụmụ Izrel gafechara Oké Osimiri Uhie ahụ, ha banyere n’Ọzara Saịnaị, nke bụ́ “nnukwu ala ịkpa nke dị egwu.” Ìgwè mmadụ ahụ enweghị nri ha ga-eri ka ha ji ụkwụ na-agagharị ‘n’ala ahụ kpọrọ nkụ nke mmiri na-adịghị,’ ma, Jehova nyere ha ihe na-akpa ha. Mozis chetara ihe merenụ. Ọ sịrị: “[Jehova] wee chọta [mba Izrel] n’ala ịkpa, n’ọzara nke tọgbọ nkịtị, nke anụmanụ na-agbọ ụja na ya. Ọ malitere ịgba ya gburugburu, iji lekọta ya, iji chebe ya dị ka nwa anya ya.” (Diut. 8:15; 32:10) Olee otú Chineke si lekọta ha?
Jehova nyere ha ‘ihe oriri nke si n’eluigwe.’ Ọpụ. 16:4, 14, 15, 35) Jehova mekwara ka mmiri si ‘n’oké nkume siri ike gbapụta.’ N’afọ iri anọ ahụ niile ha gagharịrị n’ala ịkpa, Chineke mere ka uwe ha ghara ịka nká, ụkwụ ha azaghịkwa aza. (Diut. 8:4) Gịnị ka Jehova chọrọ ka ha mee iji gosi na obi dị ha mma n’ihe o meere ha? Mozis gwara mba Izrel, sị: “Naanị lezie anya, cheekwa mkpụrụ obi gị nche nke ọma, ka i wee ghara ichefu ihe ndị anya gị hụworo, ka ha gharakwa ịpụ n’obi gị n’ụbọchị niile nke ndụ gị.” (Diut. 4:9) Ọ bụrụ na ụmụ Izrel echeta otú Jehova si zọpụta ha, nweekwa ekele n’ihi ya, ha ga-anọgide na-efe ya ma na-agbalịsi ike ime ihe o nyere n’iwu. Gịnị ka ndị Izrel kwesịrị ime?
Ha kpọrọ ihe oriri ahụ mana, bụ́ nke Jehova rụrụ ọrụ ebube o wee daa “n’ala ịkpa ahụ.” (Onye Chefuru Ihe E Meere Ya Agaghị Ekele Onye Meere Ya Ihe
Mozis kwuru, sị: “I wee chefuo Oké Nkume nke mụrụ gị, i wee malite iwepụ Chineke n’echiche.” (Diut. 32:18) N’oge na-adịghị anya, mba ahụ chefuru ihe Jehova mere n’Oké Osimiri Uhie, chefuo ihe ndị o nyere ha n’ala ịkpa, bụ́ ndị mere ka ha dị ndụ, chefuokwa ihe ọma ndị ọzọ niile Jehova meere ha. Ụmụ Izrel malitere inupụrụ Jehova isi.
N’otu mgbe, ụmụ Izrel gwara Mozis okwu ọjọọ n’ihi na ha chere na o nweghị otú ha ga-esi nweta mmiri. (Ọnụ Ọgụ. 20:2-5) Ha mekwara mkpesa banyere mana ahụ nke debere ha ndụ. Ha kwuru, sị: “Mkpụrụ obi anyị akpọwokwa ihe oriri a na-enweghị isi asị.” (Ọnụ Ọgụ. 21:5) Ha kwuru na mkpọpụta Chineke kpọpụtara ha n’Ijipt abaghịrị ha uru, gosikwa na ha achọghịzi ka Mozis na-edu ha. Ha sịrị: “A sị nnọọ na anyị nwụrụ n’ala Ijipt, ma ọ bụ, a sị nnọọ na anyị nwụrụ n’ala ịkpa a! . . . Ka anyị mee otu onye onyeisi, ka anyị laghachikwa n’Ijipt!”—Ọnụ Ọgụ. 14:2-4.
Olee otú obi dị Jehova mgbe ụmụ Izrel nupụụrụ ya isi? Mgbe otu ọbụ abụ na-ekwu banyere ihe mere n’oge ahụ, o dere, sị: “Lee ugboro ole ha nupụụrụ ya isi n’ala ịkpa, kpasuokwa ya iwe n’ọzara! Ha nwara Chineke ọnwụnwa ugboro ugboro, ha mekwara ihe wutere Onye Nsọ Izrel. Ha echetaghị aka ya, ha echetaghịkwa ụbọchị ọ gbapụtara ha n’aka onye mmegide, otú o si mee ihe ịrịba ama ya n’Ijipt.” (Ọma 78:40-43) N’ezie, otú ndị Izrel si chefuo Jehova wutere ya nke ukwuu.
Mmadụ Abụọ Ndị Na-echefughị Jehova
Ma, e nwere ụfọdụ ndị Izrel na-echefughị Jehova. Mmadụ abụọ n’ime ha bụ Jọshụa na Keleb. Ọnụ Ọgụ. 14:6-10.
Ha so ná ndị nledo iri na abụọ e si na Kedesh-bania ziga n’Ala Nkwa ahụ ka ha gaa mara otú ọ dị. Mmadụ iri n’ime ha kọrọ akụkọ ọjọọ banyere ala ahụ, ma Jọshụa na Keleb gwara ndị Izrel, sị: “Ala ahụ anyị gara ledo bụ nnọọ ezi ala. Ọ bụrụ na ihe anyị dị Jehova mma, ọ ga-akpọba anyị n’ala a wee nye anyị ya, bụ́ ala nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya. Ma, unu enupụrụla Jehova isi.” Mgbe ndị Izrel nụrụ nke a, ha chọrọ ịtụ Jọshụa na Keleb nkume. Ma ha abụọ kwụsiri ike, ha tụkwasịkwara Jehova obi.—Mgbe ọtụtụ afọ gachara, Keleb gwara Jọshụa, sị: “Mozis ohu Jehova zipụrụ m na Kedesh-bania ịga ledo ala a, m wee kọọrọ ya otú m si jee dị nnọọ ka ọ dị n’obi m. Ụmụnne m ndị mụ na ha so gaa mere ka obi lọọ ndị anyị mmiri; ma mụ onwe m soro Jehova bụ́ Chineke m n’ụzọ zuru ezu.” (Jọsh. 14:6-8) Keleb na Jọshụa diri ọtụtụ nsogbu ndị bịaara ha, n’ihi na ha tụkwasịrị Chineke obi. Ha kpebisiri ike na ha ga na-echeta Jehova ná ndụ ha niile.
Keleb na Jọshụa nwere ekele n’ihi na Jehova mezuru nkwa o kwere ndị ya inye ha ala na-eme nri. Ndị Izrel kwesịrị ikele Jehova n’ihi na ọ bụ ya mere ha ji dị ndụ. Jọshụa dere, sị: “Jehova wee nye Izrel ala dum ọ ṅụrụ iyi inye ndị nna nna ha . . . Ọ dịghị nkwa ọ bụla n’ime nkwa ọma niile Jehova kwere ụlọ Izrel nke na-emezughị; ha niile mezuchara.” (Jọsh. 21:43, 45) Olee otú anyị ga-esi gosi taa na anyị nwere ekele dị ka Keleb na Jọshụa nwere?
Nwee Ekele
Ọ dị mgbe otu nwoke na-atụ egwu Chineke jụrụ, sị: “Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ uru niile ọ na-eme ka m rite?” (Ọma 116:12) Ụgwọ anyị ji Chineke maka ihe ndị ọ na-enye anyị, maka otú o si na-eduzi anyị, nakwa maka ndokwa o mere ka e wee zọpụta anyị buru ibu nke ukwuu nke na anyị agaghị akwụchali ya ruo mgbe ebighị ebi. N’eziokwu, anyị agaghị akwụli Jehova ụgwọ anyị ji ya. Ma, anyị niile ga-egosili na anyị nwere ekele.
Ò nweela mgbe ndụmọdụ Jehova nyere gị nyeere gị aka izere nsogbu? Ọ̀ dịtụla mgbe Jehova gbaghaara gị nke mere ka i nwee Ilu 3:5, 6, nke sịrị: ‘Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị. N’ụzọ gị niile, mara ya, ya onwe ya ga-emekwa ka ụzọ gị kwụrụ ọtọ.’ Obi siri m ike na ebe ọ bụ na Jehova enyerela m aka ruo ugbu a, ọ ga-anọgide na-enyere m aka.”
akọnuche dị ọcha? Anyị ga-anọgide na-erite uru n’ihe ndị a Chineke na-emere anyị, anyị kwesịkwara ịnọgide na-enwe ekele maka ha. Sandra, bụ́ nwa agbọghọ dị afọ iri na anọ, nwere ezigbo nsogbu, ma, Jehova nyeere ya aka idi ha. O kwuru, sị: “Ekpekuru m Jehova ekpere ka o nyere m aka, otú o sikwa nyere m aka masịrị m. Ugbu a ka m ghọtara ihe mere papa m ji agwakarị m banyereGosi na I Chetara Jehova Site n’Ịtachi Obi
Baịbụl kwuru àgwà ọzọ ga-egosi na anyị chetara Jehova. Ọ sịrị: “Ma ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee zuo ezu, gbasiekwa ike n’ụzọ niile, n’enweghị ihe ọ bụla kọrọ unu.” (Jems 1:4) Gịnị ka mmadụ ‘izu ezu, gbasiekwa ike n’ụzọ niile’ pụtara? Ọ pụtara inwe àgwà ndị ga-enyere anyị aka ịtachi obi mgbe ihe na-esiri anyị ike ma tụkwasị Jehova obi. Ọ pụtakwara na anyị ga-ekpebisi ike imeri ule ndị bịaara anyị n’adaghị mba. Ọ bụrụ na anyị atachie obi otú a, anyị ga-enwe obi ụtọ mgbe ule ahụ bịaara anyị kwụsịrị. Ule ndị a na-emechakwa kwụsị.—1 Kọr. 10:13.
Otu ohu Jehova onye na-arịasi ọrịa ike kwuru ihe nyeere ya aka ịtachi obi. Ọ sịrị: “Agbalịrị m iche ihe ndị Jehova na-eme, ọ bụghị ihe m chọrọ ime. Iguzosi ike n’ezi ihe pụtara iburu nzube Chineke n’uche, ọ bụghị ọchịchọ m. Mgbe m nwere nsogbu, anaghị m asị, ‘Jehova, gịnị mere ihe ndị a ji na-eme m?’ Ihe m na-eme bụ ịnọgide na-ejere ya ozi ma nọsie ike n’akụkụ ya mgbe nsogbu ndị m na-atụghị anya ha bịara.”
Taa, ọgbakọ Ndị Kraịst na-efe Jehova “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:23, 24) Ọgbakọ Ndị Kraịst agaghị echefu Chineke otú mba Izrel si chefuo ya. Ma, na anyị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst apụtaghị na onye ọ bụla n’ime anyị ga-anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe. Dị ka Keleb na Jọshụa mere, onye ọ bụla n’ime anyị aghaghị inwe ekele ma jiri ntachi obi na-ejere Jehova ozi. E nwere ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-eme nke a, n’ihi na Jehova na-eduzi ma na-elekọta anyị n’otu n’otu n’oge a ihe tara akpụ.
Dị ka nkume ndị ahụ Jọshụa bukọtara si kwesị inyere ndị Izrel aka icheta Jehova, akụkọ banyere otú Chineke si zọpụta ndị ya kwesịrị ime ka obi sie anyị ike na ọ gaghị ahapụ anyị. Ya mere, kpebisie ike ime dị ka ọbụ abụ ahụ, bụ́ onye dere, sị: “M ga-echeta ihe niile Jaa mere; n’ihi na m ga-echeta ihe dị ịtụnanya i mere n’oge dị anya gara aga. M ga-atụgharị uche n’ọrụ gị dum, m ga na-echebara ihe niile i mere echiche.”—Ọma 77:11, 12.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ụmụ Izrel niile gagharịrị ‘n’ala kpọrọ nkụ’
[Ebe e si nweta foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Foto dị na peeji nke 8]
Mgbe ndị Izrel mara ụlọikwuu na Kedesh-bania, e zipụrụ ndị nledo ka ha gaa mara otú Ala Nkwa ahụ dị
[Ebe e si nweta foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Foto dị na peeji nke 9]
Mgbe ụmụ Izrel gagharịchara ọtụtụ afọ n’ala ịkpa, ha kwesịrị inwe ekele na ha nwetara Ala Nkwa na-eme nri
[Ebe e si nweta foto]
Pictorial Archive (Near Eastern History) Est.
[Foto dị na peeji nke 10]
Iburu nzube Jehova n’uche ga-enyere anyị aka ịtachi obi mgbe ọ bụla ihe na-esiri anyị ike