Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mkpughe—Nke Mbụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mkpughe—Nke Mbụ

Okwu Jehova Dị Ndụ

Isi Ihe Ndị Sitere n’Akwụkwọ Mkpughe—Nke Mbụ

E MERE ka Jọn onyeozi, bụ́ onye merela okenye, hụ ọhụụ iri na isii mgbe ọ nọ mkpọrọ n’agwaetiti dị na Patmọs. Ọ hụrụ ihe Jehova bụ́ Chineke na Jizọs Kraịst ga-eme n’ụbọchị Onyenwe anyị, bụ́ oge malitere mgbe e guzobere Alaeze Chineke n’afọ 1914 ruo mgbe ọchịchị Kraịst, bụ́ nke ọ ga-achị otu puku afọ, ga-akwụsị. Ọhụụ ndị a na-eme obi ụtọ dị n’akwụkwọ Mkpughe, bụ́ nke Jọn dere n’ihe dị ka n’afọ 96 O.A.

Ugbu a, ka anyị tụlee isi ihe ndị dị ná Mkpughe 1:1-12:17, bụ́ ebe e dere ọhụụ asaa mbụ Jọn hụrụ. Anyị kwesịrị ichebara ọhụụ ndị a echiche n’ihi na ha gbasara ihe ndị na-eme n’ụwa ugbu a, ha na-egosikwa ihe Jehova ga-eme n’oge na-adịghị anya. Ọhụụ ndị a na-akasi ndị ji okwukwe na-agụ ha obi, ha na-agbakwa ha ume n’ezie.—Hib. 4:12.

“NWA ATỤRỤ AHỤ” EMEGHEE IHE ISII N’IME IHE ASAA E JI KECHIE AKWỤKWỌ MPỊAKỌTA AHỤ

(Mkpu. 1:1–7:17)

Jọn bu ụzọ hụ Jizọs Kraịst, onye e mere ka ọ dị ebube, bụ́ onye ziri ya ozi ọ ga-ede ‘n’akwụkwọ mpịakọta ọ ga-ezigara ọgbakọ asaa.’ (Mkpu. 1:10, 11) Ihe ọzọ ọ hụrụ bụ ocheeze nke dị n’eluigwe. Onye nọ ọdụ n’ocheeze ahụ ji akwụkwọ mpịakọta n’aka nri ya, e jikwa ihe asaa a kara akara mechie akwụkwọ ahụ. Onye e lere anya na ọ bụ ya “kwesịrị imeghe akwụkwọ mpịakọta ahụ” abụghị onye ọzọ ma ọ́ bụghị “Ọdụm nke si n’ebo Juda” ma ọ bụ “nwa atụrụ nke . . . nwere mpi asaa na anya asaa.”—Mkp. 4:2; 5:1, 2, 5, 6.

N’ọhụụ nke atọ, Jọn hụrụ ihe mere mgbe “nwa Atụrụ ahụ” meghere nke ọ bụla n’ime isii ndị bu ụzọ n’ime ihe asaa ahụ a kara akara e ji mechisie akwụkwọ ahụ ike. Ala ọma jijiji mere mgbe nwa Atụrụ ahụ meghere nke isii n’ime ihe ndị ahụ e ji mechie akwụkwọ ahụ, oké ụbọchị nke ọnụma bịakwara. (Mkpu. 6:1, 12, 17) Ma, n’ọhụụ nke ọzọ, ọ hụrụ ‘ndị mmụọ ozi anọ ka ha jidesiri ifufe anọ nke ụwa ike’ ruo mgbe a kachara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ akara. Ọ hụrụ “oké ìgwè mmadụ,” bụ́ ndị a na-akaghị akara n’egedege ihu ha, “ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ nakwa n’ihu Nwa Atụrụ ahụ.”—Mkpu. 7:1, 9.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

1:4; 3:1; 4:5; 5:6—Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “mmụọ asaa ahụ” pụtara? N’anya Chineke, asaa na-anọchi anya ihe zuru ezu. N’ihi ya, ozi ahụ e zigaara “ọgbakọ asaa ahụ” gbasara ndị Chineke niile, bụ́ ndị nọ n’ihe karịrị otu narị puku ọgbakọ n’ụwa dum. (Mkpu. 1:11, 20) Ebe ọ bụ na Jehova na-enye mmụọ nsọ ya dabere n’ihe ọ chọrọ ka ọ rụọ, okwu ahụ bụ́ “mmụọ asaa ahụ” pụtara na mmụọ nsọ na-arụ ọrụ zuru ezu iji mee ka ndị na-ege ntị n’amụma ahụ ghọta ya nke ọma, ọ na-emekwa ka ha nweta ngọzi dị ukwuu. O yiri ka akwụkwọ Mkpughe ọ̀ na-atụle ihe asaa asaa. N’ebe a, asaa na-anọchi anya ihe zuru ezu. N’ezie, akwụkwụ Mkpughe kwuru otú a ga-esi ‘mezuo ihe nzuzo ahụ dị nsọ nke Chineke.’—Mkpu. 10:7.

1:8, 17—Ònye ka a na-etu “Alfa na Omega” nakwa “Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ”? Ọ bụ Jehova nwe utu aha ahụ bụ́ “Alfa na Omega.” Aha a pụtara na ọ dịghị Chineke ọzọ bu ya ụzọ nke pụrụ ime ihe niile, ọ dịghịkwa nke na-eso ya n’azụ. Ọ bụ “mmalite na ọgwụgwụ.” (Mkpu. 21:6; 22:13) Ọ bụ ezie na a kpọrọ Jehova “mmalite na ọgwụgwụ” ná Mkpughe 22:13 n’ihi na ọ dịghị onye ọzọ bu ya ụzọ, ọ dịghịkwanụ onye ọzọ na-eso ya n’azụ, ihe a na-ekwu ná Mkpughe isi mbụ na-egosi na ọ bụ Jizọs Kraịst ka a kpọrọ “Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ.” Ọ bụ ya bụ mmadụ mbụ a kpọlitere n’ọnwụ, ya aghọọ mmụọ na-anaghị anwụ anwụ. Ọ bụkwa ya bụ onye ikpeazụ Jehova ji aka ya kpọlite n’ọnwụ, ya aghọọ mmụọ na-anaghị anwụ anwụ.—Kọl. 1:18.

2:7—Gịnị bụ “paradaịs Chineke”? Ebe ọ bụ Ndị Kraịst e tere mmanụ ka a gwara okwu a, paradaịs a na-ekwu okwu ya ebe a ga-abụrịrị eluigwe bụ́ ebe yiri paradaịs, ya bụ, ebe Chineke nọ. A ga-akwụ ndị e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi ụgwọ ọrụ site n’inye ha mkpụrụ si “n’osisi nke ndụ” ka ha rie. Ha agaghị anwụ anwụ.—1 Kọr. 15:53.

3:7—Olee mgbe Jizọs natara “mkpịsị ugodi nke Devid,” oleekwa otú o si jiri ya na-arụ ọrụ? Mgbe e mechara Jizọs baptizim n’afọ 29 O.A., ọ ghọrọ Onye A Họpụtara Ịbụ Eze nke si n’ezinụlọ Devid. Ma, Jizọs anataghị mkpịsị ugodi Devid ruo n’afọ 33 O.A., bụ́ mgbe e buliri ya elu ya anọrọ n’aka nri Chineke n’eluigwe. Ọ bụ ebe ahụ ka ọ nọ ghọọ onye ga-achị Alaeze Devid. Kemgbe ahụ, Jizọs anọwo na-eji mkpịsị ugodi ahụ na-eme ka ndị mmadụ na-enweta ihe ùgwù nke bụ́ ịrụ ọrụ ndị metụtara Alaeze ahụ. N’afọ 1919, Jizọs tụkwasịrị “mkpịsị ugodi nke ụlọ Devid” n’ubu “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” site n’ime ka ọ ghọọ “onye na-elekọta ihe niile o nwere.”—Aịza. 22:22; Mat. 24:45, 47.

3:12—Olee ihe bụ́ “aha ọhụrụ” Jizọs? Aha ọhụrụ a bụ ọrụ ọhụrụ e nyere Jizọs na ihe ùgwù ndị o nwere. (Fil. 2:9-11) Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye ọzọ ma aha ahụ otú Jizọs ma ya, Jizọs na-ede ya n’ahụ́ ụmụnna ya kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’eluigwe, wee mee ka ha na ya dị ná mma. (Mkpu. 19:12) Ha na-enwetakwa ụfọdụ n’ime ihe ùgwù ndị pụrụ iche Jizọs nwere.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

1:3. Ebe ọ bụ na “oge ahụ a kara aka [ya bụ, oge Chineke ga-eme ụwa Setan ihe o kpere n’ikpe] dị nso,” ọ dị nnọọ mkpa ka anyị ghọta ihe dị n’akwụkwọ Mkpughe ma mee ya.

3:17, 18. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ, anyị aghaghị ịzụ Jizọs “ọlaedo e ji ọkụ nụchaa.” Ya bụ na anyị kwesịrị ịgba mbọ ka anyị bụrụ ọgaranya n’ezi ọrụ. (1 Tim. 6:17-19) Anyị kwesịrị iyiri “uwe elu na-acha ọcha,” bụ́ nke na-egosi na anyị bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst. Anyị kwesịkwara ịna-ete “ọgwụ anya,” ya bụ, ịṅa ntị na ndụmọdụ ndị e nyere anyị, dị ka ndị nke e bipụtara na magazin Ụlọ Nche, ka anyị wee mara ihe dị iche iche Chineke chọrọ n’aka anyị.—Mkpu. 19:8.

7:13, 14. Ndị okenye iri abụọ na anọ e kwuru okwu ha ná Mkpughe na-anọchi anya otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ, ndị e merela ka ha dị ebube n’eluigwe, bụ́ ebe ha bụ ndị eze na ndị nchụàjà. Ọ bụ ha ka ndị nchụàjà nọ n’Izrel oge ochie nọchiri anya ha, bụ́ ndị Eze Devid mere ka ha dịrị ìgwè iri abụọ na anọ. Otu n’ime ndị okenye ahụ mere ka Jọn mara ndị bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ. Ya mere, ọ ghaghị ịbụ na mbilite n’ọnwụ nke ndị e tere mmanụ malitere tupu afọ 1935. N’ihi gịnị ka anyị ji kwuo otú a. Ọ bụ n’ihi na ọ bụ n’afọ ahụ ka e mere ka ndị ohu Chineke e tere mmanụ nọ n’ụwa mara kpọmkwem ndị bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ.—Luk 22:28-30; Mkpu. 4:4; 7:9.

A FỤRỤ OPI ASAA MGBE E MEGHERE NKE ASAA N’IME IHE NDỊ AHỤ A KARA AKARA

(Mkpu. 8:1–12:17)

E nyere ndị mmụọ ozi asaa opi asaa mgbe Nwa Atụrụ ahụ meghere nke asaa n’ime ihe ndị ahụ a kara akara. Isii n’ime ha fụrụ opi ha wee mee ka a mara ikpe Chineke mara “otu ụzọ n’ụzọ atọ” nke ndị nọ n’ụwa, ya bụ, Krisendọm. (Mkpu. 8:1, 2, 7-12; 9:15, 18) Ọ bụ nke a ka Jọn hụrụ n’ọhụụ nke ise. Jọn so mee ihe ọ hụrụ n’ọhụụ nke sochiri. Ọ tara obere akwụkwọ mpịakọta e nyere ya, tụọkwa ebe nsọ nke ụlọ nsọ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀. Mgbe a fụrụ opi nke asaa, oké olu kwuru, sị: “Alaeze nke ụwa aghọwo alaeze nke Onyenwe anyị na nke Kraịst ya.”—Mkpu. 10:10; 11:1, 15.

Ọhụụ nke asaa mere ka a ghọtakwuo ihe e kwuru ná Mkpughe 11:15, 17. A hụrụ oké ihe ịrịba ama n’eluigwe. Nwaanyị nke nọ n’eluigwe mụrụ ọkpara, bụ́ nwa nwoke. A chụpụrụ Ekwensu n’eluigwe. Ebe ọ na-eweso nwaanyị ahụ nọ n’eluigwe iwe, ọ gara “ibuso ndị fọdụrụ n’ime mkpụrụ ya agha.”—Mkpu. 12:1, 5, 9, 17.

Azịza nke Ajụjụ Ndị Dabeere n’Akwụkwọ Nsọ:

8:1-5—Gịnị mere eluigwe ji daa jụụ, gịnịkwa ka a wụdara n’ụwa mgbe nke a mere? Jụụ eluigwe dara bụ ihe atụ. Nke a bụ ka e wee nụ “ekpere ndị nsọ” nọ n’ụwa. Nke a mere mgbe agha ụwa nke mbụ biri. Ndị Kraịst e tere mmanụ agaghị n’eluigwe mgbe Oge Ndị Jentaịl gwụrụ, dị ka ọtụtụ n’ime ha tụrụ anya na ha ga-aga. Ihe siiri ha ike n’oge agha ahụ. N’ihi ya, ha kpesiri ekpere ike ka Chineke duzie ha. A zara ekpere ha. Otu mmụọ ozi wụdara ọkụ ihe atụ n’ụwa, bụ́ nke mere ka Ndị Kraịst e tere mmanụ maliteghachi ịnụ ọkụ n’obi. Ọ bụ ezie na ha adịghị ọtụtụ, ha malitere ikwusa ozi ọma n’ụwa dum, bụ́ nke mere ka ọtụtụ mmadụ nụ banyere Alaeze Chineke nke na e nwere ike ikwu na e sunyere ọkụ na Krisendọm. Ha ji nkwuwa okwu jiri Baịbụl na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị, na-eme ka ha mara eziokwu dị n’Akwụkwọ Nsọ. Nke a mere ka okpukpe ụgha ma jijiji otú ahụ ụlọ si ama jijiji ma e nwee ala ọma jijiji.

8:6-12; 9:1, 13; 11:15—Olee mgbe ndị mmụọ ozi asaa ahụ jikeere ịfụ opi ha, olee mgbe ha fụrụ opi ndị ahụ, oleekwa otú ha si fụọ ha? Njikere ndị mmụọ ozi ahụ jikeere ịfụ opi asaa ahụ gụnyere ịgwa ndị òtù Jọn nọ n’ụwa, bụ́ ndị maliteghachiri ịnụ ọkụ n’obi, ihe ha ga-eme malite n’afọ 1919 ruo n’afọ 1922. Ndị ahụ e tere mmanụ nọ na-ahazigharị otú a ga-esi na-eje ozi ọma, ha nọkwa na-ewu ebe ndị a ga-anọ na-ebi akwụkwọ. (Mkpu. 12:13, 14) Ịfụ opi ahụ pụtara nkwupụta ndị ohu Chineke ji obi ike na-ekwupụta ikpe Jehova mara ụwa Setan nakwa otú ndị mmụọ ozi si na-enyere ndị Chineke aka ime nke a. O doro anya na nke a malitere ná mgbakọ e nwere na Cedar Point, Ohio, n’afọ 1922. Ha ga na-ekwupụtakwa ya ruo mgbe oké mkpagbu ahụ ga-amalite.

8:13; 9:12; 11:14—Olee otú ụda opi atọ ikpeazụ ahụ si bụrụ “ahụhụ”? Opi anọ e bu ụzọ fụọ bụ okwu e kwuru iji mee ka a mara na Krisendọm bụ okpukpe ụgha, ma opi atọ a fụrụ n’ikpeazụ bụ ahụhụ n’ihi na e kwuru kpọmkwem ihe ndị ga-emenụ. Mgbe a fụrụ opi nke ise, e mere ka ndị Chineke si ‘n’abis’ pụta n’afọ 1919, bụ́ ebe ha nọ n’arụghị ọrụ. Mgbe ha pụtara, ha ji ịnụ ọkụ n’obi malite ikwusa ozi ọma, bụ́ nke dị ka oké ihe otiti n’ahụ́ Krisendọm. (Mkpu. 9:1) Ọfụfụ opi nke isii kpọpụtara oké ụsụụ ndị agha a na-ahụtụbeghị ụdị ya, e bidokwara ikwusa ozi ọma n’ụwa dum, bụ́ nke malitere n’afọ 1922. Ọfụfụ opi nke ikpeazụ kpọsara ọmụmụ nke Alaeze Mesaya ahụ.

Ihe Ndị Anyị Mụtara:

9:10, 19. Okwu ndị bụ́ eziokwu, bụ́ ndị dị n’akwụkwọ dị iche iche dabeere na Baịbụl “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” na-ebipụta, nwere ozi na-agba agba. (Mat. 24:45) Ozi a ha na-ezisa bụ ọdụ igurube ndị ahụ, bụ́ ndị “na-agba agba dị ka akpị” nakwa ịnyịnya ndị ahụ e ji aga agha, bụ́ ndị “ọdụ ha dị ka agwọ.” Gịnị mere anyị ji kwuo nke a? Ọ bụ n’ihi na akwụkwọ ndị ahụ na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị banyere “ụbọchị [Jehova] ga-abọ ọbọ.” (Aịza. 61:2) Ka anyị jiri obi ike na ịnụ ọkụ n’obi na-enye ha ndị mmadụ.

9:20, 21. Ọtụtụ ndị, bụ́ ndị dị umeala n’obi, ndị bi na mba ndị a na-ewere na ha amaghị Kraịst, anabatala ozi ọma anyị. Otú ọ dị, anyị anaghị atụ anya na ọtụtụ ndị, bụ́ ndị na-anọghị n’okpukpe Krisendọm, ndị amaokwu a kpọrọ “ndị fọdụrụ n’ime ndị ahụ,” ga-echegharị. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị agaghị akwụsị ozi ọma anyị na-ekwusa.

12:15, 16. “Ala,” ya bụ, ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ụwa Setan, ma ọ bụ ndị ọchịchị nke mba dị iche iche, kwadoro ka ndị mmadụ nwere onwe ha ife ofufe otú ha si chọọ. Malite n’afọ 1940 gawa, ọchịchị ndị ahụ loro “osimiri ahụ [ya bụ, mkpagbu] nke dragọn ahụ gbụpụtara n’ọnụ ya.” N’ezie, mgbe ọ bụla Jehova chọrọ, ọ na-eme ka ndị ọchịchị mee ihe bụ́ uche ya. Ọ bụ ya mere, Ilu 21:1 ji kwuo, sị: “Obi onye eze dị ka iyi n’aka Jehova. Ebe ọ bụla ọ chọrọ, ya echee ya ihu.” Nke a kwesịrị ime ka okwukwe anyị nwere n’ebe Chineke nọ sikwuo ike.