Ì Chetara?
Ì Chetara?
Ọ̀ tọrọ gị ụtọ ịgụ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ? Ọ dị mma, legodị ma ị ga-azali ajụjụ ndị a na-esonụ:
• Olee mgbe ndị ahụ na-agụ kpakpando gara leta Jizọs?
Otu akwụkwọ na-akọwa Baịbụl kwuru, sị: “Ndị ahụ na-agụ kpakpando eletaghị Jizọs mgbe e nyiwere ya n’ihe e ji etinyere anụ ụlọ nri n’abalị ahụ a mụrụ ya bụ́ mgbe ndị na-azụ atụrụ gara leta ya. Ha gara leta ya mgbe ọnwa ole na ole gachara.” Mgbe ahụ, Jizọs abụrụla “nwatakịrị” nọrọkwa n’ụlọ. (Mat. 2:7-11) A sị na ndị ahụ na-agụ kpakpando gara leta Jizọs n’abalị ahụ a mụrụ ya ma nye ya ọlaedo na onyinye ndị ọzọ ahụ dị oké ọnụ ahịa, ọ̀ ga-abụ naanị ụmụ nnụnụ abụọ ka Meri gaara enye mgbe abalị iri anọ ọ mụrụ nwa gachara, bụ́ mgbe o kutere Jizọs n’ụlọ nsọ?—1/1, peeji nke 31.
• Gịnị ka ọtụtụ ndị nwere ike ime ka ndụ ha wee na-atọkwu ha ụtọ?
Mmadụ nwere ike ịjụ, sị, ‘M̀ ga-enwe ike ịhazi oge m ma bie ndụ dị mfe?’ Amy mere otú ahụ. O nwere ego ma o nweghị obi ụtọ. Ọ chọpụtara na ọ fọrọ nke nta ka ịgbalị ịbụ ọgaranya n’ụwa a mee ka ọ dapụ n’okwukwe. N’ihi ya, o kpebiri ibute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ ná ndụ ya, o mesịkwara rụọ ọrụ ọsụ ụzọ ruo afọ ụfọdụ. Amy kwuru, sị, “Ugbu a enwere m ụdị afọ ojuju m na-enwetụghị” mgbe m na-achụ ego ụwa a.—1/15, peeji nke 19.
• Gịnị nwere ike inyere ndị nne aka inwe obi ụtọ?
Ọtụtụ ndị nne na-arụ ọrụ ego. Ụfọdụ na-eme nke a iji nweta ego ha ga-eji gboo mkpa ezinụlọ ha ebe ndị ọzọ na-arụ ọrụ ego iji nweta ego nke ha ma ọ bụ iji na-ebi ndụ okomoko. E nwekwara ndị ọzọ na-arụ ọrụ ego n’ihi na ọrụ ha na-atọ ha ụtọ. Ndị nne bụ́ Ndị Kraịst na-arụ ọrụ dị mkpa n’ezinụlọ—karịsịa mgbe ụmụ ha ka dị nnọọ obere. Ụfọdụ ndị nne ahọrọla igbubilata oge ha ji arụ ọrụ ego ma ọ bụ ịghara ịrụ ọrụ ego iji nwee ohere lebakwuoro ndị ezinụlọ ha anya, nke a ewetakwarala ha obi ụtọ dị ukwuu.—2/1, peeji nke 28-31.
• Olee “ọgbọ” Jizọs na-ekwu okwu ya na Matiu 24:34?
Ọ bụ mgbe Jizọs na-agwa ndị ajọ mmadụ okwu ma ọ bụ mgbe ọ na-ekwu okwu banyere ha ka ọ na-ejikarị okwu ahụ bụ́ “ọgbọ” eme ihe n’ụzọ na-adịghị mma. Ma n’oge a ọ na-agwa ndị na-eso ụzọ ya okwu, bụ́ ndị a ga-eji mmụọ nsọ tee mmanụ n’oge na-adịghị anya, o jighị okwu ahụ mee ihe n’ụzọ na-adịghị mma. Ọ bụ ha ga-aka ghọta ihe okwu ahụ e kwuru na Matiu 24:32, 33 pụtara. N’ihi ya, o yiri ka ọ bụ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ na narị afọ mbụ nakwa ndị nke oge a ka Jizọs na-ekwu okwu ya.—2/15, peeji nke 23-24.
• Dị ka e kwuru ná Ndị Galeshia 3:24, olee otú Iwu ahụ si bụrụ onye nduzi?
Onye nduzi n’oge ochie bụ ohu a tụkwasịrị obi, ọ na-ahụ na o nweghị ihe mere nwata ọ na-elekọta, hụkwa na e meere nwa ahụ ihe nna ya chọrọ. N’otu aka ahụ, Iwu ahụ chebere ndị Juu ka ha ghara ịmụta omume rụrụ arụ, dị ka ịlụ ndị na-ekpere arụsị ma ọ bụ iso ha gọọ ọgọ. Ma dị nnọọ ka ọrụ onye nduzi na-anaghị adịte aka, Iwu ahụ adịteghị aka kama ọ nọgidere ruo mgbe Kraịst bịara.—3/1, peeji nke 18-21.
• Dị ka Jems 3:17 si kwuo, olee àgwà ndị anyị kwesịrị ịdị na-akpa?
Iji bụrụ ndị dị ọcha, anyị kwesịrị ịjụ ihe ọ bụla dị njọ ozugbo. (Jen. 39:7-9) Anyị kwesịkwara ịbụ ndị na-eme udo, na-ezere ịdị na-eme ihe ike ike, na-ezerekwa ime ihe ndị ga-akpaghasị udo. N’ihi ya, ọ dị mkpa ka onye ọ bụla n’ime anyị jụọ onwe ya, sị: ‘À maara m dị ka onye na-eme udo ka ọ bụ onye na-akpaghasị udo? Mụ na ndị ọzọ ànyị na-enwekarị nghọtahie? M̀ na-ewekarị iwe ọsọ ọsọ, ma ọ bụ na-emejọkarị ndị ọzọ? Ka m̀ na-adị njikere ịgbaghara ndị ọzọ ma ghara ịdị na-esi ọnwụ ka ọ bụrụ ihe m chọrọ ka a na-eme?’—3/15, peeji nke 24-25.
• Gịnị mere Jizọs ji jiri nke nta nke nta meghee anya otu nwoke kpuru ìsì? (Mak 8:22-26)
Baịbụl agwaghị anyị kpọmkwem ihe mere o ji mee otú ahụ. Ma o nwere ike ịbụ na ihe mere Jizọs ji jiri nke nta nke nta meghee anya nwoke ahụ bụ iji nyere ya aka ka o jiri nwayọọ nwayọọ hụwa ihe. Ọ ga-abụrịrị ọmịiko Jizọs nwere n’ebe nwoke ahụ kpuru ìsì nọ mere o ji mee nke a.—4/1, peeji nke 21.