Esemokwu nke Gbasara Gị
Esemokwu nke Gbasara Gị
Ọ̀ DỊ enyi ma ọ bụ onye ezinụlọ unu gị na ya dị nnọọ ná mma? Gịnị ma ọ bụrụ na mmadụ ekwuo na ihe mere i ji kwere ka gị na ya ka dịrị ná mma bụ n’ihi ihe ị na-erite n’aka ya? Ọ́ gaghị ewute gị, ma eleghị anya, weedị gị iwe? Nke ahụ bụ kpọmkwem ebubo Setan bụ́ Ekwensu boro ndị nile ha na Jehova Chineke dị nnọọ ná mma.
Tụlee ihe merenụ mgbe Setan nwetara di na nwunye mbụ ahụ bụ́ Adam na Iv ịda iwu Chineke ma sonyere ya n’inupụrụ Chineke isi. Ihe ahụ merenụ ọ̀ pụtara na ndị mmadụ ga-anọgide na-erubere Jehova isi nanị ma ọ bụrụ na o nwere uru ha na-erite na ya? (Jenesis 3:1-6) Ihe dị ka puku afọ abụọ na narị ise ka Adam nupụsịrị isi, Setan welitere okwu a—nke ugbu a bụ n’ihe metụtara otu nwoke aha ya bụ Job. Ebe ọ bụ na ebubo ahụ Ekwensu boro gosiri nnọọ ihe na-ese okwu, ka anyị jiri nnọọ nwayọọ tụlee akụkọ ahụ dị na Bible.
“M Gaghị Esi n’Ebe M Nọ Wezụga Izu Okè M”
Job bụ “nwoke zuru okè, ziekwa ezie, nke na-atụ egwu Chineke, na-esikwa n’ihe ọjọọ wezụga onwe ya.” Otú ọ dị, Setan katọrọ izi ezi Job. Ọ jụrụ Jehova, sị: “Ọ̀ bụ n’efu ka Job na-atụ egwu Chineke?” Mgbe ahụ, Ekwensu katọrọ ma Chineke ma Job site n’ikwu na ihe mere Job ji na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova bụ na Jehova na-echebe ma na-agọzi ya. Setan mara Chineke aka, sị: “Otú ọ dị, biko, setịpụ aka Gị, metụ ihe nile o nwere, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.”—Job 1:8-11.
Iji nye azịza maka ebubo ndị a Setan boro Jehova na Job, Jehova nyere Setan ohere ka ọ nwaa Job. Ná mgbalị ndị Ekwensu mere iji mee ka Job kwụsị ife Chineke, o wetaara nwoke ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi ọdachi dị iche iche. E zuru anụ ụlọ Job ma gbuo ndị nke fọrọnụ, gbuo ndị na-ejere ya ozi, gbuokwa ụmụ ya. (Job 1:12-19) Ma Setan ò mezuru ihe o bu n’uche? Mbanụ! N’agbanyeghị na Job amaghị na ọ bụ Ekwensu kpataara ya ọnwụnwa ndị ahụ, o kwuru, sị: “Jehova nyere, Jehova anarawokwa; ka aha Jehova bụrụ ihe a gọziri agọzi.”—Job 1:21.
Ka e mesịrị, Setan bịakwutere Jehova, Jehova gwakwara ya, sị: “[Job] na-ejidekwa izu okè ya, ma ị na-akpali m imegide ya, iloda ya n’efu.” (Job 2:1-3) Ihe na-ese okwu bụ ikwesị ntụkwasị obi Job—bụ́ àgwà nke na-achọ ka mmadụ kwụrụsie ike n’akụkụ Chineke ma na-agbaso ụkpụrụ ezi omume. Ruo mgbe ahụ, Job emeriwo Ekwensu n’ihe banyere ikwesị ntụkwasị obi ya. Ma, ike agwụghị Ekwensu.
Mgbe nke ahụ gasịrị, Setan boro otu ebubo nke metụtara mmadụ nile. Ọ gwara Jehova, sị: “Akpụkpọ ahụ́ laara akpụkpọ ahụ́, ọbụna ihe nile nke mmadụ nwere ka ọ ga-enye n’ọnọdụ ndụ ya. Otú ọ dị, biko, setịpụ aka Gị, metụ ọkpụkpụ ya metụkwa anụ ahụ́ ya, ọ ghaghịkwa ịgbakụta Gị azụ n’ihu Gị.” (Job 2:4, 5) Site n’iji okwu ahụ bụ́ “mmadụ” mee ihe kama iji aha Job, Ekwensu katọrọ ikwesị ntụkwasị obi nke mmadụ nile. Isi ihe ọ na-ekwu bụ: ‘O nweghị ihe mmadụ na-agaghị eme iji zọrọ ndụ ya. I nye m ohere, m ga-eme ka mmadụ nile gbakụta Chineke azụ.’ Ọ̀ bụ eziokwu na ọ dịghị mmadụ ga-anọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’ọnọdụ na n’oge ọ bụla?
Jehova hapụrụ Ekwensu ka o tie Job ọrịa ọjọọ. Job tara ahụhụ dị ukwuu nke na o kpere ekpere ka ya nwụọ. (Job 2:7; 14:13) N’agbanyeghị nke ahụ, Job kwuru, sị: “Ruo mgbe m kubiri ume m gaghị esi n’ebe m nọ wezụga izu okè m!” (Job 27:5) Job kwuru nke a n’ihi na ọ hụrụ Chineke n’anya, ọ dịghịkwa ihe pụrụ ịgbanwe nke ahụ. Job gosiri na ya kwesịrị ntụkwasị obi. Bible kwuru, sị: “Ọzọ, Jehova gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya.” (Job 42:10-17) Ò nweela ndị ọzọ mere ka Job? Olee ihe ihe ndị mere n’oge ndị gaferelanụ gosiri?
Ihe E Merela Banyere Nkatọ Ahụ
N’isi 11 nke akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Hibru, Pọl onyeozi kpọrọ aha ọtụtụ ndị nwoke na ndị nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi dịrị ndụ tupu oge Ndị Kraịst, gụnyere Noa, Ebreham, Sera, na Mozis. Onyeozi ahụ kwuziri, sị: “Oge ga-agwụnahụ m ma ọ bụrụ na m gaa n’ihu ịkọ banyere [ndị ọzọ].” (Ndị Hibru 11:32) Ndị a ji ikwesị ntụkwasị obi fee Chineke dị nnọọ ọtụtụ nke na Pọl kpọrọ ha ‘oké ìgwè ndị àmà.’ (Ndị Hibru 12:1) Ee, kemgbe ọtụtụ narị afọ, imirikiti ndị mmadụ ejirila aka ha họrọ ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova Chineke.—Joshua 24:15.
Onye kasị gosi na Setan ghara ụgha mgbe o kwuru na ya ga-emeli ka mmadụ nile gbakụta Jehova azụ bụ Ọkpara Chineke, bụ́ Jizọs Kraịst. Ọbụnadị ọnwụ ahụhụ ọ nwụrụ n’elu osisi ịta ahụhụ emeghị ka ọ kwụsị ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke. Ka Jizọs na-ekubi ume, o tiri mkpu, sị: “Nna, n’aka gị ka m na-enyefe mmụọ m.”—Luk 23:46.
Ihe ndị mere n’oge ndị gaferelanụ emeela ka o doo anya na Ekwensu enwebeghị ike ime ka mmadụ nile kwụsị ife ezi Chineke ahụ. Ọtụtụ ụmụ mmadụ amatala Jehova ma ‘jiri obi ha dum, mkpụrụ obi ha dum na uche ha dum hụ ya n’anya.’ (Matiu 22:37) Ikwesị ntụkwasị obi ha nye Jehova egosila na ihe ahụ Setan kwuru banyere ikwesị ntụkwasị obi nke ụmụ mmadụ bụ ụgha. Gị onwe gị kwa pụrụ igosi na ihe ahụ Ekwensu kwuru bụ ụgha site na gị ịbụ nwoke ma ọ bụ nwanyị na-ekwesị ntụkwasị obi.
Olee Ihe Ị Na-aghaghị Ime?
Ọ bụ uche Chineke ka “a zọpụta ụdị mmadụ nile na ka ha bịaruo ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Olee otú ị pụrụ isi mee nke ahụ? Hazie oge ị ga-eji na-amụ Bible ma ‘nweta ihe ọmụma banyere nanị ezi Chineke ahụ, nakwa banyere onye ahụ o zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.’—Jọn 17:3.
Setan katọrọ ikwesị ntụkwasị obi nke ụmụ mmadụ site n’ikwu na ha na-efe Chineke n’ihi ihe ha ga-erite n’aka Ya. Ka i nwee ike ime ihe ndị ị mụtara eme, ọ ghaghị iru gị n’obi. Ka i wee nwee ike ime nke a, ihe ị ga-eme abụghị nanị ịmata ihe dị na Bible. Mụta ịdị na-atụgharị uche n’ihe ndị ị mụtara mgbe nile. (Abụ Ọma 143:5) Mgbe ị na-agụ Bible ma ọ bụ akwụkwọ ndị dabeere na Bible, hụ na i wepụtara oge iji chebara ajụjụ ndị dị ka ndị a echiche: ‘Gịnị ka ihe a na-akụziri m banyere Jehova? Olee àgwà Chineke ndị m hụrụ n’ebe a? Olee akụkụ ndụ m ebe ndị ọ dị m mkpa ịdị otú a? Olee ihe Chineke na-anabata ma ọ bụ nke ọ na-adịghị anabata? Olee otú nke ahụ si emetụta ihe m na-eche banyere Chineke?’ Ichebara ihe ndị dị otú a echiche ga-eme ka i nwee nnọọ ịhụnanya na ekele n’ebe Onye Okike nọ.
Ọ bụghị nanị n’ihe metụtara nkwenkwe okpukpe ka mmadụ ga-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke. (1 Ndị Eze 9:4) Gị ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova Chineke pụtara na omume gị ga-adị mma n’akụkụ nile. Otu ọ dị, ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi agaghị anapụ gị ihe ọ bụla. Jehova bụ “Chineke onye obi ụtọ,” ọ chọkwara ka anyị nwee obi ụtọ ná ndụ. (1 Timoti 1:11) Ugbu a tụlee àgwà ụfọdụ ndị ọ dị gị mkpa izere iji mee ka ị nọgide na-adị ọcha n’omume ma si otú ahụ mee ka i nwekwuo obi ụtọ ná ndụ ma nweta ngọzi Chineke.
Zere Àgwà Na-ezighị Ezi n’Ihe Banyere Mmekọahụ
Jehova n’onwe ya kwuru ụkpụrụ a ga-agbaso maka alụmdi na nwunye n’Okwu ya, bụ́ Bible, bụ́ nke sịrị: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya, rapara n’ahụ nwunye ya: ha ewee ghọọ otu anụ ahụ́.” (Jenesis 2:21-24) Ebe di na nwunye ghọrọla “otu anụ ahụ́,” ọ bụrụ na ha aghara iso onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ha nwee mmekọahụ, ha na-asọpụrụ ndokwa alụmdi na nwunye Chineke mere. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ka alụmdi na nwunye bụrụ ihe kwesịrị nsọpụrụ n’etiti mmadụ nile, ka ihe ndina alụmdi na nwunye bụrụkwa ihe na-enweghị mmerụ, n’ihi na Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko na ndị di ma ọ bụ nwunye na-akwa iko ikpe.” (Ndị Hibru 13:4) Okwu ahụ bụ́ “ihe ndina alụmdi na nwunye” pụtara mmekọahụ nke nwoke na nwanyị, bụ́ ndị lụrụ onwe ha n’ụzọ iwu kwadoro, na-enwe. Onye nke ọ bụla n’ime ha sooro onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nwee mmekọahụ, akwaala iko, Chineke ga-amakwa onye dị otú ahụ ikpe.—Malakaị 3:5.
Gịnị banyere mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye? Nke ahụkwa megidere ụkpụrụ omume ọma ndị Jehova tụrụ. Bible kwuru, sị: “Nke a bụ uche Chineke . . . ka unu na-asọ ịkwa iko asọ.” (1 Ndị Tesalonaịka 4:3) Mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe ya, mmadụ idina onye ikwu ya, na mmadụ iso anụmanụ dinaa bụcha mmehie megide Chineke. (Levitikọs 18:6, 23; Ndị Rom 1:26, 27) Onye ọ bụla chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ ma bie ndụ n’obi ụtọ ga-ewepụrịrị aka n’omume ọjọọ.
Gịnị banyere ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye imeso ibe ha omume na-akpali agụụ mmekọahụ? Omume dị otú a adịghị atọ Jehova ụtọ. (Ndị Galeshia 5:19) Mmadụ ga-ezerekwa ịdị na-eche banyere ihe rụrụ arụ. Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke nọgidere na-ele nwanyị anya nke na agụụ iso ya nwee mmekọahụ gụrụ ya esoroworị ya kwaa iko n’obi ya.” (Matiu 5:28) Okwu ndị ahụ metụtakwara ikiri foto ndị gba ọtọ n’akwụkwọ, ikiri ha na televishọn, ma ọ bụ n’Intanet; ịgụ banyere mmekọahụ n’akwụkwọ; na ige egwú ndị na-agba mmadụ ume ime ihe ọjọọ. Izere ihe ndị dị otú ahụ na-atọ Chineke ụtọ ma na-eme ka ndụ mmadụ ka mma.
Olee banyere ịchụ nwanyị ma ọ bụ ịchụ nwoke? Onye lụrụ di ma ọ bụ nwunye inwe mmasị na-ezighị ezi n’ebe onye na-abụghị di ma ọ bụ nwunye ya nọ megidere ụkpụrụ Bible, ọ na-egosikwa na ọ naghị asọpụrụ Jehova. (Ndị Efesọs 5:28-33) Ọ ga-abụ nnọọ ihe na-ezighị ezi ndị na-alụbeghị di na nwunye igosi mmasị mmekọahụ n’ebe ibe ha nọ n’ebughị ọlụlụ n’obi! Gịnị ma ọ bụrụ na nwanyị ahụ ma ọ bụ nwoke ahụ a na-achụ echee na onye ahụ na-achụ ya chọrọ ịlụ ya? Cheedị banyere ihe mgbu nke ahụ ga-akpata. Ihe ọzọ kwesịrị ime ka anyị chesie echiche ike banyere ya bụ na ịchụ nwoke ma ọ bụ nwanyị pụrụ iduga n’ịkwa iko. N’aka nke ọzọ, ịkpaso ndị na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwanyị ibe anyị àgwà dị ọcha na-enyekwu anyị ùgwù.—1 Timoti 5:1, 2.
Ime Ihe Dị Chineke Mma n’Akụkụ Ndị Ọzọ nke Ndụ
N’ọtụtụ mba, mmanya na-aba n’anya na-adị mfe nnweta. Ọ̀ dị njọ ịṅụ ha? Akwụkwọ Nsọ emegideghị ịṅụ mmanya, biya, ma ọ bụ ihe ọṅụṅụ ndị ọzọ na-aba n’anya ruo n’ókè kwesịrị ekwesị. (Abụ Ọma 104:15; 1 Timoti 5:23) Otú ọ dị, ịṅụbiga mmanya ókè na aṅụrụma dị njọ n’anya Chineke. (1 Ndị Kọrint 5:11-13) N’ezie, ị gaghị achọ ka ịṅụbiga mmanya ókè mebie ahụ́ ike gị ma kpasasịa ezinụlọ gị.—Ilu 23:20, 21, 29-35.
Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.” (Abụ Ọma 31:5) Bible kwuru, sị: ‘Ọ gaghị ekwe Chineke omume ịgha ụgha.’ (Ndị Hibru 6:18) Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta ngọzi Chineke, ị ga-ezere ịgha ụgha. (Ilu 6:16-19; Ndị Kọlọsi 3:) Bible dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.”— 9, 10Ndị Efesọs 4:25.
E nwekwara ịgba chaa chaa. N’agbanyeghị na ọ bụ ihe ọtụtụ ndị na-eme, ịgba chaa chaa bụ anyaukwu, ebe ọ bụ ịgbalị irite ego site n’ego funahụrụ ndị ọzọ. Jehova anaghị enwe mmasị n’ebe ndị “nwere anyaukwu maka uru aghụghọ” nọ. (1 Timoti 3:8) Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ ime ihe ga-atọ Jehova ụtọ, ị ga-ezere ụdị ịgba chaa chaa ọ bụla, bụ́ ndị gụnyere lọtrị na ọkụ na-eri ego. I zere ihe ndị ahụ, ị ga-ahụ nnọọ na ego ga na-anọ gị n’akpa karịa iji na-egbo mkpa ezinụlọ gị.
Izu ohi, ya bụ, iwere ihe na-abụghị nke gị, bụkwa anyaukwu. Bible kwuru, sị: “Gị ezula ohi.” (Ọpụpụ 20:15) Ọ bụ ihe ọjọọ mmadụ ịmara ụma zụrụ ihe e zutere n’ohi na iwere ihe n’ebughị ụzọ nata ikike. Bible kwuru, sị: “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike, na-eji aka ya arụ ọrụ ọma, ka o wee nwee ihe ọ ga-ekenye onye nọ ná mkpa.” (Ndị Efesọs 4:28) Kama izunara onye ha na-arụrụ ọrụ oge, ndị hụrụ Jehova n’anya na-arụzu ọrụ ụbọchị ha. Ha “na-achọ ịdị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe nile.” (Ndị Hibru 13:18) Akọnuche dị ọcha na-emekwa nnọọ ka obi rukwuo mmadụ ala.
Olee otú Chineke si ele onye nwere obi ọkụ anya? Bible dọrọ aka ná ntị, sị: “Gị na onye iwe abụla enyi; ị gaghị esokwa onye ọnụma baa n’ụlọ.” (Ilu 22:24) Iwe a na-achịkwaghị achịkwa na-edugakarị n’ime ihe ike. (Jenesis 4:5-8) N’ihe banyere mmadụ ịbọrọ onwe ya ọ́bọ̀, Bible kwuru, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi onye ọ bụla n’ọnọdụ ihe ọjọọ. Na-emenụ ndokwa maka ihe ndị dị mma n’anya mmadụ nile. Ọ bụrụ na o kwere omume, ọ bụrụhaala na ọ dị unu n’aka, bụrụnụ ndị ha na mmadụ nile na-adị n’udo. Ndị m hụrụ n’anya, unu abọrọla onwe unu ọbọ, kama nyenụ ọnụma ahụ ohere; n’ihi na e dere, sị: ‘Ịbọ ọbọ bụ nke m; m ga-akwụghachi, ka Jehova na-asị.’” (Ndị Rom 12:17-19) Ọ bụrụ na anyị aṅaa ntị na ndụmọdụ dị otú ahụ, anyị ga-enwekwu udo ná ndụ anyị—nke ahụ ga-amụbakwa obi ụtọ anyị.
Ị Ga-emeli Ihe Ziri Ezi
Ị̀ pụrụ ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Chineke n’agbanyeghị nrụgide ndị na-eme ka o siere gị ike ịnọgide na-eme otú ahụ? Ee, ị pụrụ. Ghọta na Chineke chọrọ ka i nwee ihe ịga nke ọma n’igosi na ihe Setan kwuru bụ ụgha n’ihe banyere ikwesị ntụkwasị obi, n’ihi na Okwu Ya kwuru, sị: “Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa, ka m wee zaghachi onye na-ata m ụta okwu.”—Ilu 27:11.
Ị pụrụ ikpegara Jehova ekpere ka o wusie gị ike ime ihe ziri ezi n’anya ya. (Ndị Filipaị 4:6, 7, 13) N’ihi ya, mee mgbalị siri ike iji nwetakwuo ihe ọmụma nke Okwu Chineke, bụ́ Bible. Iji mmasị na-echebara ihe ndị ị mụtara na Bible echiche ga-enyere gị aka ịhụkwu Chineke n’anya ma kpalie gị ime uche ya. Jọn nke Mbụ 5:3 kwuru, sị: “Nke a bụ ihe ịhụ Chineke n’anya pụtara, ka anyị debe ihe ndị o nyere n’iwu; ma ihe ndị o nyere n’iwu adịghịkwa arọ.” Ndịàmà Jehova nọ n’ógbè gị ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịmụ Bible. Anyị na-agba gị ume ka ị kpọtụrụ ha n’ógbè gị, ma ọ bụ, ị pụrụ idetara ndị bipụtara magazin a akwụkwọ.
[Foto dị na peeji nke 4]
Job nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi n’oge a na-anwa ya ọnwụnwa
[Foto dị na peeji nke 7]
Gị inwetakwu ihe ọmụma nke Okwu Chineke ga-ewusikwu gị ike ná mkpebi i mere ime ihe ziri ezi