Ịkwanyere Nnọkọ Anyị Ndị Dị Nsọ Ùgwù
Ịkwanyere Nnọkọ Anyị Ndị Dị Nsọ Ùgwù
“M ga-eme ka ha bịaruo ugwu nsọ m, M ga-emekwa ka ha ṅụrịa n’ụlọ ekpere m.”—AỊSAỊA 56:7.
1. Olee ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ nke mere anyị ji kwesị ịkwanyere nzukọ anyị dị iche iche ùgwù?
JEHOVA akpọkọtawo ndị ya, Ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị enyi ha, ka ha bịa fee ya ofufe ‘n’ugwu nsọ’ ya. Ọ na-eme ka ha ṅụrịa ọṅụ “n’ụlọ ekpere” ya, bụ́ ụlọ nsọ ime mmụọ ya, nke bụ́ “ụlọ ekpere maka mba nile.” (Aịsaịa 56:7; Mak 11:17) Mkpọkọta a Jehova kpọkọtara ndị ya ka ha bịa fee ya ofufe na-egosi na ofufe Jehova dị nsọ, dịrị ọcha, ma bụrụkwa nke e buliri elu. Site n’ịkwanyere nzukọ anyị na-enwe iji mụọ Bible na iji fee Jehova ofufe ùgwù, anyị na-egosi na anyị na-ele ihe ndị dị nsọ anya dị ka Jehova si ele ha.
2. Gịnị na-egosi na Jehova na-ele ebe ọ họọrọ ka a nọrọ na-efe ya ofufe anya dị ka ebe dị nsọ, oleekwa otú Jizọs si gosipụta otu ụdị àgwà a?
2 N’Izrel oge ochie, a chọrọ ka a na-ele ebe a na-anọ efe Jehova ofufe anya dị ka ebe dị nsọ. A chọrọ ka e doo ụlọikwuu ahụ na ihe ndị e ji chọọ ya mma na arịa ndị dị na ya iche ma doo ha nsọ “ka ha wee bụrụ ihe nsọ kachasị ihe nsọ nile.” (Ọpụpụ 30:26-29) A kpọrọ ọnụ ụlọ abụọ nke dị n’ụlọ nsọ ahụ “Ebe Nsọ” na “Ebe Kasị Nsọ.” (Ndị Hibru 9:2, 3) E mesịrị jiri ụlọ nsọ dị na Jeruselem dochie anya ụlọikwuu ahụ. A kpọrọ Jeruselem ‘obodo nsọ’ n’ihi na ọ bụ ebe bụ́ isi a nọ efe Jehova ofufe. (Nehemaịa 11:1; Matiu 27:53) Mgbe Jizọs na-eje ozi ya n’elu ala, ọ kwanyeere ụlọ nsọ ahụ ùgwù ruuru ya. O wesara ndị mmadụ iwe n’ihi otú ha si jiri ogige ụlọ nsọ ahụ mere ebe a na-azụ ahịa nakwa okporo ụzọ e si aga ebe ndị ọzọ dị na Jeruselem.—Mak 11:15, 16.
3. Gịnị na-egosi na mkpọkọta ndị e nwere n’Izrel dị nsọ?
3 Ndị Izrel na-agbakọta mgbe nile iji fee Jehova ofufe na iji gee ntị mgbe a na-agụ Iwu ya. A na-akpọ ụbọchị ememe ha ụfọdụ mkpọkọta nsọ, nke na-egosi na nnọkọ ndị dị otú ahụ dị nsọ. (Levitikọs 23:2, 3, 36, 37) Ná mkpọkọta e nwere n’oge Ezra na Nehemaịa, ndị Livaị nọ ebe ahụ ‘mee ka ndị Izrel ghọta iwu ahụ.’ Ebe “ndị ahụ nile na-akwa ákwá, mgbe ha nụrụ okwu nile nke iwu ahụ,” ndị Livaị nọ “na-eme ka ndị ahụ nile gba nkịtị, sị, Nọdụnụ duu, n’ihi na ụbọchị a dị nsọ.” Ndị Izrel jiziri “oké ọṅụ” mee Ememe Ụlọ Ntu nke na-ewe ụbọchị asaa. Tụkwasị na nke ahụ, ‘a gụrụ akwụkwọ iwu Chineke kwa ụbọchị, site n’ụbọchị mbụ ruo ụbọchị nke ikpeazụ. Ha wee mee ememe ahụ ụbọchị asaa; ma n’ụbọchị nke asatọ ụbọchị mgbochi dị, dị ka ikpe ya si dị.’ (Nehemaịa 8:7-11, 17, 18) Oge ndị a bụ oge ndị dị nsọ n’ezie bụ́ nke chọrọ ka ndị bịara ya jiri nkwanye ùgwù na-ege ntị.
Nzukọ Anyị Bụ Nnọkọ Ndị Dị Nsọ
4, 5. Olee ihe ndị a na-eme ná nzukọ anyị bụ́ ndị gosiri na ha dị nsọ?
4 N’ezie, Jehova enweghị obodo nkịtị dị nsọ taa n’ụwa bụ́ nke nwere ụlọ nsọ pụrụ iche e mere maka ofufe ya. Otú o sina dị, anyị ekwesịghị ichefu na nzukọ ndị a na-enwe iji fee Jehova ofufe bụ nnọkọ ndị dị nsọ. Anyị na-ezukọ ugboro atọ n’izu iji gụọ ma mụọ Akwụkwọ Nsọ. A ‘na-agụpụta Okwu Jehova nke ọma,’ dịkwa ka e mere n’oge Nehemaịa, ‘a na-emekwa ka a ghọta isi ya.’ Nehemaịa 8:8) Anyị na-eji ekpere amalite ma na-emechi nzukọ anyị nile, anyị na-abụkukwa Jehova abụ otuto n’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime nzukọ ndị a. (Abụ Ọma 26:12) Nzukọ ọgbakọ dị iche iche bụ n’ezie akụkụ nke ofufe anyị na-efe Jehova, a chọkwara ka anyị na-ele ha anya dị ka ihe ndị dị nsọ na ihe ndị kwesịrị ka anyị kwanyere ha ùgwù.
(5 Jehova na-agọzi ndị ya ka ha na-ezukọta iji fee ya ofufe, iji mụọ Okwu ya na iji soro Ndị Kraịst ibe ha nwee mkpakọrịta na-enye ọṅụ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ ná nzukọ ndị a ka “Jehova nyere ngọzi ahụ iwu” ka ọ dịkwasị. (Abụ Ọma 133:1, 3) Anyị na-eso anata ngọzi ahụ ma ọ bụrụ na anyị anọrọ ná nzukọ ahụ ma gee ntị nke ọma n’ihe omume ime mmụọ na-ewere ọnọdụ n’ebe ahụ. Tụkwasị na nke ahụ, Jizọs kwuru, sị: “N’ebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ zukọtara n’aha m, anọ m n’ebe ahụ n’etiti ha.” Ihe Jizọs na-ekwu okwu ya kpọmkwem n’ebe a bụ mgbe ndị okenye zụkọrọ ilebara nsogbu ndị siri ike anya, ma ụkpụrụ dị na ya metụtakwara nzukọ anyị dị iche iche. (Matiu 18:20) Ọ bụrụ na Kraịst nọ ya site ná mmụọ nsọ mgbe Ndị Kraịst na-ezukọta n’aha ya, ọ̀ bụ na e kwesịghị iwere nzukọ ndị dị otú ahụ dị ka ihe ndị dị nsọ?
6. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere ebe ndị anyị na-anọ enwe nzukọ, ma hà dị obere ma hà buru ibu?
6 Ọ bụ ezie na Jehova adịghị ebi n’ụlọ e ji aka wuo. Otú o sina dị, Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị bụ ebe a na-anọ efe ezi ofufe. (Ọrụ 7:48; 17:24) Anyị na-ezukọta n’ebe ahụ iji mụọ Okwu Jehova, iji kpegara ya ekpere, na iji bụkuo ya abụ otuto. Otú ahụkwa ka ọ dị n’Ụlọ Mgbakọ anyị. Ebe ndị buru ibu a gbazitere iji mee mgbakọ—dị ka ụlọ mgbakọ, ụlọ ezumezu, ma ọ bụ ámá egwuregwu—na-aghọ ebe a na-anọ efe Jehova ofufe mgbe ọ bụla anyị ji ha na-eme ihe maka nnọkọ anyị ndị dị nsọ. Anyị kwesịrị ịkwanyere nnọkọ ndị dị otú a bụ́ maka ife Jehova ofufe ùgwù ma hà dị obere ma hà buru ibu. Otú anyị si akpa àgwà ga-egosikwa na anyị na-akwanyere nnọkọ ndị a ùgwù.
Ụzọ Ndị Anyị Ga-esi Na-akwanyere Nnọkọ Anyị Ùgwù
7. N’ụzọ dị aṅaa pụtara ìhè ka anyị pụrụ isi gosi na anyị na-akwanyere nnọkọ anyị ùgwù?
7 E nwere ụzọ ndị gbara ọkpụrụkpụ anyị pụrụ isi gosi na anyị na-akwanyere nnọkọ anyị ùgwù. Otu n’ime ha bụ ịnọ ya mgbe a na-abụ abụ Alaeze. Ụfọdụ n’ime abụ ndị a dị n’ụdị ekpere, e kwesịkwara iji nsọpụrụ bụọ ha. Mgbe Pọl onyeozi na-ede banyere Jizọs, o hotara ihe e dere n’Abụ Ọma nke 22, sị: “M ga-akpọsara ụmụnna m aha gị; n’etiti ọgbakọ ka m ga-eji abụ na-eto gị.” (Ndị Hibru 2:12) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịhụ na anyị na-anọ n’oche anyị tupu a kpọpụta abụ a ga-abụ ma soro bụọ ya ma na-echebara okwu ndị e ji dee ha echiche. Ka anyị gosipụta site n’iso na-abụ abụ na anyị nwere echiche yiri nke ọbụ abụ ahụ bụ́ onye dere, sị: “M ga-ewere obi m nile kelee Jehova, n’izu nzuzo nke ndị ziri ezi, na n’ime nzukọ Izrel.” (Abụ Ọma 111:1) Ee, otu ezigbo ihe mere anyị ga-eji na-abịa nzukọ anyị n’oge ma nọrọ ya ruo mgbe ọmụmụ ihe gbasara bụ iji soro bụkuo Jehova abụ otuto.
8. Ihe atụ dị aṅaa dị n’ime Bible na-egosi na ekpere ndị a na-ekpe ná nzukọ anyị kwesịrị ka anyị jiri nkwanye ùgwù na-ege ntị na ha?
8 Ihe ọzọ na-eme ka nzukọ anyị bakwuo uru n’ụzọ ime mmụọ bụ ekpere sitere n’obi a na-ekpe n’ihi ndị nile bịara ọmụmụ ihe. N’otu oge, Ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ na Jeruselem zukọtara ọnụ ma ‘jiri otu obi gwa Chineke okwu n’oké olu’ n’ekpere. N’ihi ya, ha nọgidere “na-ekwukwa okwu Chineke n’atụghị egwu” n’agbanyeghị na a na-akpagbu ha. (Ọrụ 4:24-31) Ì chere na o nwere onye n’ime ha kwere ka uche ya na-awagharị mgbe a nọ na-ekpe ekpere ahụ? Ee e, ha “ji otu obi” kpee ekpere. Ekpere ndị a na-ekpe ná nzukọ anyị na-egosipụta ihe dị n’uche onye ọ bụla bịara nzukọ ahụ. Ekpere ndị a kwesịrị ka anyị jiri nkwanye ùgwù na-ege ntị na ha.
9. Olee otú anyị pụrụ isi gosi na anyị na-akwanyere nnọkọ anyị ndị dị nsọ ùgwù site n’otú anyị si eji ejiji na otú anyị si akpa àgwà?
9 Tụkwasị na nke ahụ, anyị pụrụ igosi otú anyị si akwanyere nnọkọ anyị ùgwù dị ka ihe dị nsọ site n’otú anyị si eji ejiji. Ọdịdị anyị, ya bụ, ụdị uwe anyị na-eyi na ụdị isi anyị na-akpa, pụrụ iso mee ka nzukọ anyị dịkwuo ùgwù. Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Achọrọ m ka ụmụ nwoke nọgide na-ekpe ekpere, na-eweli aka na-eguzosi ike n’ihe, n’abụghị n’ọnụma na nrụrịta ụka. Achọrọ m ka ụmụ nwanyị jiri uwe a haziri nke ọma na-achọ onwe ha mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè, ọ bụghị n’ụdị dị iche iche nke ịkpa isi na ọlaedo ma ọ bụ nkume pel ma ọ bụ ejiji dị nnọọ oké ọnụ, kama n’ụzọ kwesịrị ụmụ nwanyị ndị na-ekwupụta na ha na-asọpụrụ Chineke, ya bụ, site n’ezi ọrụ.” (1 Timoti 2:8-10) Mgbe anyị gara mgbakọ ukwu n’ámá egwuregwu ndị elu ha ghere oghe, anyị ka kwesịrị iji ejiji kwesịrị ekwesị ma dị ùgwù n’agbanyeghị na e nwere okpomọkụ. Tụkwasị na nke ahụ, ùgwù anyị na-akwanyere ihe omume a ga-eme ka anyị zere iri ihe ma ọ bụ ịta chịngọm mgbe ihe omume na-aga n’ihu. Iyi uwe kwesịrị ekwesị abịa nzukọ anyị na ịkpa àgwà dị mma mgbe anyị bịara, na-asọpụrụ Jehova bụ́ Chineke, ofufe anyị na-efe ya, nakwa ndị anyị na ha so na-efe Jehova.
Àgwà E Kwesịrị Ịkpa n’Ụlọ Chineke
10. Olee otú Pọl onyeozi si gosi na a chọrọ ka a na-akpa àgwà kwesịrị ekwesị mgbe a bịara nzukọ Ndị Kraịst?
10 N’akwụkwọ Ndị Kọrint isi iri na anọ, anyị na-chọta ndụmọdụ amamihe dị na ya nke Pọl onyeozi nyere banyere otú anyị kwesịrị isi na-akpa àgwà mgbe a bịara nzukọ Ndị Kraịst. O mechiri okwu ya site n’ịsị: “Ka ihe nile were ọnọdụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa dị ka ndokwa si dị.” (1 Ndị Kọrịnt 14:40) Nzukọ anyị bụ akụkụ dị mkpa nke ihe e ji mara ọgbakọ Ndị Kraịst, ọ chọkwara ka a na-akpa àgwà kwesịịrị ụlọ Jehova na ya.
11, 12. (a) Gịnị ka e kwesịrị ime ka ụmụaka ndị na-aga nzukọ anyị ghọta? (b) N’ụzọ dị aṅaa kwesịrị ekwesị ka ụmụaka pụrụ isi kwupụta okwukwe ha ná nzukọ?
11 Karịsịa, e kwesịrị ka a kụziere ụmụaka otú e kwesịrị isi na-akpa àgwà mgbe a bịara ọmụmụ ihe. Ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịkọwara ụmụ ha na Ụlọ Nzukọ Alaeze na ebe a na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ abụghị ebe a na-egwuri egwu. Ha bụ ebe ndị anyị na-anọ efe Jehova ofufe ma na-amụ Okwu ya. Eze Solomọn maara ihe dere, sị: “Debe ụkwụ gị mgbe ị na-ejeru ụlọ Chineke; n’ihi na ịbịaru nso ịnụ anụ dị mma.” (Eklisiastis 5:1) Mozis kụziiri ụmụ Izrel ka ha na-ezukọ ọnụ, ma ndị okenye ma “ụmụntakịrị.” Ọ sịrị: ‘Kpọkọta ndị Izrel ka ha wee nụ, ka ha wee mụtakwa, wee tụọ egwu Jehova, bụ́ Chineke unu, leziekwa anya ime okwu nile nke iwu a; ụmụ ha, ndị na-amaghị, ga-anụkwa, wee mụta ịtụ egwu Jehova.’—Deuterọnọmi 31:12, 13.
12 N’ụzọ yiri nke ahụ, taa isi ihe mere ụmụaka ji eso ndị mụrụ ha aga nzukọ bụ iji nụ ihe a na-ekwu na iji mụta ihe. Ozugbo ụmụaka mụtara ige ntị na ịghọta ma ọ dịghị ihe ọzọ, eziokwu Bible ndị bụ́ isi, ha nwekwara ike ‘ikwupụta okwukwe ha n’ihu ọha’ site n’ịza ajụjụ ná mkpirikpi. (Ndị Rom 10:10) Nwatakịrị pụrụ ịmalite site n’iji okwu ole na ole zaa ajụjụ ọ ghọtara. Ná mmalite, ọ pụrụ ịgụpụta azịza ya agụpụta dị ka e si dee ya, ma ka oge na-aga, ọ ga-amalite ịgbalị ịza ajụjụ n’okwu nke aka ya. Nke a ga-abara nwata ahụ uru ma tọọ ya ụtọ, azịza dị otú ahụ o ji kwupụta okwukwe ya ga-amasịkwa ndị toworo eto bịara ọmụmụ ihe ahụ. Dị ka o kwesịrị ịdị, ndị nne na nna kwesịrị isetịpụ ihe nlereanya site n’ịza ajụjụ n’onwe ha. N’ebe o kwere omume, ọ dịkwa mma ma ụmụaka nwee Bible nke ha, akwụkwọ abụ, na akwụkwọ a na-amụ. Ha kwesịrị ịmụta otú e kwesịrị isi na-akwanyere akwụkwọ ndị ahụ ùgwù. Ihe ndị a nile ga-eme ka ụmụaka ghọta na nzukọ anyị bụ nnọkọ dị nsọ.
13. Gịnị ka anyị chọrọ ka ndị bịara ọmụmụ ihe anyị nke mbụ ha kwuo?
13 N’ezie, anyị achọghị ka ọmụmụ ihe anyị yie ihe ndị a na-eme na chọọchị Krisendọm. Mgbe ụfọdụ ndị chọọchị na-anọrọ onwe ha ma na-eme oké nsọ nsọ ma ọ bụkwanụ ebe nile a na-ekwo ka ebe a na-akụ egwu. Anyị chọrọ ka ọmụmụ ihe anyị na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na-ekpo ọkụ ma bụrụ ebe mmadụ nile ga-atụsara ahụ́, ma anyị achọghị ka ọ gabiga ókè ruo n’ókè nke iyi ebe a na-enwe nzukọ ezumezu. Ihe anyị ji na-ezukọta bụ iji fee Jehova ofufe, n’ihi ya, nzukọ anyị kwesịrị ịdị ùgwù mgbe nile. Ọchịchọ anyị bụ ka ndị bịara ọmụmụ ihe anyị nke mbụ ha kwuo na ‘Chineke nọ n’etiti anyị n’ezie,’ mgbe ha geresịrị ihe e kwuru ná nzukọ anyị ma hụ ezigbo àgwà anyị na ụmụ anyị na-akpa.—1 Ndị Kọrịnt 14:25.
Ihe Na-adịghị Akọ Ụkọ n’Ofufe Anyị Na-efe Jehova
14, 15. (a) Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị ‘na-ahapụ ụlọ Chineke anyị’? (b) Olee otú e si na-emezu Aịsaịa 66:23 ugbu a?
14 Dị ka e kwuru ná mmalite, Jehova na-akpọkọta Aịsaịa 56:7) Nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Nehemaịa chetaara ndị Juu ibe ya na ha kwesịrị ịkwanyere ụlọ nsọ Chineke ùgwù site n’iji ihe onwunwe ha na-akwado ya. Ọ sịrị: “Anyị agaghị ahapụkwa ụlọ Chineke anyị.” (Nehemaịa 10:39) Tụkwasị na nke ahụ, anyị ekwesịghị ịghara ịza oku Jehova kpọrọ anyị ka anyị bịa fee ya ofufe ‘n’ụlọ ekpere ya.’
ndị ya ma na-eme ka ha ṅụrịa ọṅụ ‘n’ụlọ ekpere’ ya, ya bụ, n’ụlọ nsọ ime mmụọ. (15 Iji gosi mkpa ọ dị ka a na-ezukọta mgbe nile iji fee Jehova ofufe, Aịzaịa buru amụma, sị: “Ọ ga-erukwa, na site n’otu ọnwa ọhụrụ ruo ọnwa ọhụrụ ọzọ, na site n’otu ụbọchị izu ike ruo ụbọchị izu ike ọzọ, anụ ahụ́ nile, bụ́ mmadụ, ga-abịa ịkpọ isiala n’ihu m, ka Jehova sịrị.” (Aịsaịa 66:23) Nke a na-ewerekwa ọnọdụ taa. Mgbe nile, n’izu nile nke ọnwa ọ bụla, Ndị Kraịst raara onwe ha nye na-ezukọta ọnụ iji fee Jehova ofufe. Ha na-eme nke a, gụnyere ihe ndị ọzọ, site n’ịga ọmụmụ ihe Ndị Kraịst na site n’ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ì so ná ndị ‘na-abịa akpọ isiala n’ihu Jehova’ mgbe nile?
16. N’ihi gịnị ka ịgachi nzukọ anya ji kwesị ịmara anyị ahụ́ ugbu a?
16 Aịsaịa 66:23 ga-emezu n’ụzọ zuru ezu n’ụwa ọhụrụ nke Jehova kwere ná nkwa. N’oge ahụ, n’ụzọ nkịtị, kwa izu na kwa ọnwa, “anụ ahụ́ nile bụ́ mmadụ, ga-abịa ịkpọ isiala n’ihu” Jehova, ma ọ bụ fee ya ofufe, ruo mgbe nile ebighị ebi. Ebe ọ bụ na anyị ga-anọgide na-ezukọta iji fee Jehova ofufe dị ka Ndị Kraịst n’usoro ihe ọhụrụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ime ka ịgachi nzukọ anyị ndị dị nsọ anya mara anyị ahụ́ ugbu a?
17. N’ihi gịnị ka nzukọ anyị ji dị anyị mkpa “karị ka [anyị] na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso”?
17 Ka ọgwụgwụ na-eru nso, anyị kwesịrị ikpebisikwu ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịdị na-aga nzukọ Ndị Kraịst anyị iji fee Jehova ofufe. N’ihi ùgwù anyị na-akwanyere nzukọ anyị, anyị adịghị ekwe ka ọrụ ego, ihe e nyere anyị n’ụlọ akwụkwọ ka anyị rụọ n’ụlọ, ma ọ bụ ihe ọmụmụ uhuruchi mee ka anyị hapụ iso ndị kwere ekwe ibe anyị na-ezukọ mgbe nile. Ume a na-enweta site n’iso ụmụnna anyị na-ezukọ dị anyị mkpa. Nzukọ anyị na-eme ka anyị nwee ohere ịmata ibe anyị, ịgbarịta ibe anyị ume, na ịkpalirịta ibe anyị “inwe ịhụnanya na ịrụ ezi ọrụ.” Anyị kwesịrị ịdị na-eme otú a “karị ka [anyị] na-ahụ ụbọchị ahụ ka ọ na-eru nso.” (Ndị Hibru 10:24, 25) N’ihi ya, ka anyị na-akwanyere nnọkọ anyị ndị dị nsọ ùgwù mgbe nile site n’ịgachi ya anya, iyi uwe ndị kwesịrị ekwesị, na ịkpa àgwà ndị dị mma. Site n’ime otú a, anyị na-egosi na anyị na-ele ihe ndị dị nsọ anya dị ka Jehova si ele ha.
Ntụleghachi
• Gịnị na-egosi na e kwesịrị ile nnọkọ ndị Jehova anya dị ka ihe dị nsọ?
• Olee ihe ndị na-ewere ọnọdụ ná nzukọ anyị bụ́ ndị na-egosi na ha bụ nnọkọ ndị dị nsọ?
• Olee otú ụmụaka ga-esi gosi na ha na-akwanyere nzukọ anyị ùgwù dị ka ihe dị nsọ?
• N’ihi gịnị ka anyị ji kwesị ime ka ịgachi nzukọ anya mara anyị ahụ́?
[Ajụjụ Nke Paragraf Ndị a Na-amụ Amụ]
[Foto ndị dị na peeji nke 28]
Nzukọ ndị anyị na-enwe iji fee Jehova ofufe bụ nnọkọ ndị dị nsọ n’agbanyeghị ebe a nọ na-enwe ha
[Foto dị na peeji nke 31]
Ụmụ anyị na-aga ọmụmụ ihe iji nụ ihe a na-ekwu na iji mụta ihe