Egwu Chineke “Ịdọ Aka ná Ntị nke Amamihe”
Egwu Chineke “Ịdọ Aka ná Ntị nke Amamihe”
EZI amamihe akpọwo oké oriri. “O zipụwo ụmụ agbọghọ ya, ọ na-akpọ oku n’elu ebe nile dị elu nke obodo, sị, Onye ọ bụla na-enweghị uche, ya wezụga onwe ya bata n’ebe a: onye obi amamihe kọrọ, amamihe asịwo ya, Bịanụ, rienụ nri m ụfọdụ, ṅụọkwanụ mmanya vaịn ụfọdụ nke m gwaworo agwa. Hapụnụ amaghị ihe, unu ndị na-enweghị uche, wee dị ndụ; gaakwanụ n’ihu n’ụzọ nghọta.”—Ilu 9:1-6.
Ọ dịtụghị mgbe iri oriri na tebụl amamihe na-arụpụta ihe ọ bụla dị njọ ma ọ bụ nke na-emerụ ahụ́. Ịṅa ntị n’amamihe Chineke bụ́ nke dị n’akwụkwọ Ilu e ji ike mmụọ nsọ dee na ịnakwere ndụmọdụ dị na ya na-arụpụta nanị ihe dị mma. Nke a gụnyekwara okwu amamihe dị n’Ilu 15:16-33. * Ịnakwere ndụmọdụ dị n’okwu ndị ahụ gbara ọkpụrụkpụ bụ́ ndị a na-achọta n’akwụkwọ Ilu a pụrụ inyere anyị aka inwe afọ ojuju n’agbanyeghị otú ihe anyị nwere ha. Ọ pụkwara ime ka anyị nwee ọganihu na ọṅụ ná ndụ. Ime nke a pụrụ inyere anyị aka ịdị na-eme mkpebi ndị amamihe dị na ha, ọ pụkwara ime ka anyị nọrọ n’okporo ụzọ ahụ na-eduga ná ndụ.
Mgbe Ọ Ka Mma Inwe Ntakịrị Ihe Onwunwe
Eze Solomọn nke Izrel oge ochie kwuru, sị: “Ọ dị mma inwe ihe nta n’egwu Jehova, karịa inwe ọtụtụ akụ̀ ma ọgbụgba aghara adị ya.” (Ilu 15:16) Ọ bụ ihe nzuzu mmadụ ichefu Onye Okike ma jiri ịchụso ihe onwunwe mere ihe mgbaru ọsọ ya bụ́ isi ná ndụ. Ụdị ndụ dị otú a na-akpatakarị ike ọgwụgwụ na nchekasị. Ọ ga-abụ nnọọ ihe ihere mmadụ ịghọta n’oge nká ya na ọ dịghị ezigbo ihe ya jiri ndụ ya mee nakwa na ndụ ya enweghị isi! N’ezie, ọ dịghị amamihe dị ná mmadụ ịkpakọta ọtụtụ ihe onwunwe nke ga-eme ka ndụ ya jupụta ‘n’ọgbụgba aghara.’ Ọ ka nnọọ mma ịmụta ụzọ isi nweta ezigbo afọ ojuju ma bie ndụ na-eju afọ! A na-enweta ezigbo afọ ojuju n’ịtụ egwu Jehova—ná mmekọrịta anyị na ya—ọ bụghị n’inwe ọtụtụ ihe onwunwe.—1 Timoti 6:6-8.
Iji mee ka ọ pụta ìhè na iso ndị ọzọ nwee ezi mmekọrịta bara nnọọ uru karịa inwe ọtụtụ akụ̀, Solomọn kwuru, sị: “Ọ dị mma, bụ́ òkè ihe oriri nke bụ́ nanị akwụkwọ nri, ma ịhụnanya dị n’ebe ahụ, karịa ehi a zụrụ azụ igbu egbu, ma ịkpọasị adị ya.” (Ilu 15:17) Ee, ịhụnanya ịdị n’ezinụlọ ka inwe ụbara nri ndị dị ụtọ e siri nke ọma mma. N’ezinụlọ e nwere nanị nne ma ọ bụ nna, ihe onwunwe pụrụ ịdị nnọọ nta. N’ala ụfọdụ, o nwere ike ịbụ na nanị ihe mmadụ nwere ike inweta bụ nanị ihe oriri ndị bụ́ aka ru nwa mgbei. Otú ọ dị, ahụ́ na-eru ndị nọ n’ezinụlọ ala n’ebe e nwere ịhụnanya.
Nsogbu nwere ike ibilite ọbụna n’ezinụlọ ndị hụrụ onwe ha n’anya. Otu onye n’ezinụlọ Ilu 15:18 na-ekwu, sị: “Onye ọnụma na-akpali iseokwu: ma onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ na-eme ka ịlụ ọgụ dị jụụ.” Ikwu okwu n’ụzọ dị nro, ọ bụghị n’iwe, na-eme ka udo dị. A pụkwara itinye okwu ndụmọdụ dị n’akwụkwọ Ilu a n’ọrụ n’ihe omume ndị ọzọ a na-eme ná ndụ, ọbụna n’ihe ndị a na-eme n’ọgbakọ nakwa n’ozi ubi.
nwere ike ikwu okwu ma ọ bụ mee ihe kpasuru onye ọzọ iwe. Gịnị ka onye ahụ a kpasuru iwe kwesiri ime?Mgbe ‘A tụliri Ụzọ Atụli’
Ilu ọzọ Eze ahụ maara ihe tụrụ mere ka ọdịiche dị n’etiti onye na-eleghara amamihe anya na ndị na-aṅa ntị na ya pụta ìhè. O kwuru, sị: “Ụzọ onye umengwụ dị ka ogige ogwu: ma okporo ụzọ ndị ziri ezi bụ ụzọ a tụliri atụli.”—Ilu 15:19.
Ọ dịghị ụdị ihe mgbochi onye umengwụ na-adịghị echetụ n’echiche bụ́ nke ọ ga-ebido aka ghara ịmalite n’oge mewe ihe o kwesịrị ime. N’aka nke ọzọ, ndị ziri ezi adịghị echegbu onwe ha banyere ogwu ndị nwere ike igbochi ha ime ihe ha chọrọ ime. Ha na-eji ọrụ ha akpọrọ ihe ma na-adị nnọọ uchu n’ọrụ ha ji n’aka. N’ụzọ dị otú a, ha na-agbanahụ nsogbu ndị gaara adakwasị ha ma ọ bụrụ na ha ejighị ọrụ ha kpọrọ ihe. ‘A tụliri ụzọ ha atụli,’ ya bụ, ha na-enwe ọganihu. Ha na-amalite ọrụ ha ma na-enwe ọṅụ na ọ na-aga n’ihu.
Dị ka ihe atụ, ọ chọrọ nnọọ ịrụsi ọrụ ike ma a bịa n’ihe banyere inweta ezi ihe ọmụma nke Okwu Chineke na inwe ọganihu ruo n’ịghọ onye tozuru okè. Mmadụ pụrụ nnọọ ikwu na ihe mere na ya adịghị amụchi Bible anya bụ n’ihi na ya amachaghị akwụkwọ, na ya amachaghị agụ ihe ma ọ bụkwanụ n’ihi na ya na-echefukarị ihe. Mmadụ ekwesịtụghị iwere ihe ndị a dị ka ihe na-egbochi ya inweta ihe ọmụma! Ọ bụrụgodị na e nwere ihe ụfọdụ na-egbochi anyị inweta ihe ọmụma Chineke, anyị pụrụ itinye mgbalị iji na-agụkwu ihe nke ọma ma na-aghọta ihe anyị gụrụ, ikekwe anyị pụrụ ime nke a site n’iji akwụkwọ ọkọwa okwu na-eme ihe mgbe ọ dị mkpa. Inwe àgwà nke ịmụ ihe na-enyere anyị aka inweta ihe ọmụma ma mee ka anyị na Chineke dịrị ná mma.
Mgbe ‘Nna Na-aṅụrị Ọṅụ’
Eze Solomọn kwuru, sị: “Nwa nke maara ihe na-eme ka nna ya ṅụrịa: ma mmadụ nzuzu na-eleda nne ya anya.” (Ilu 15:20) Ọ̀ bụ na ndị nne na nna adịghị aṅụrị ọṅụ mgbe ụmụ ha kpara àgwà dị ka ndị maara ihe? N’ezie, ndị nne na nna ga na-azụ ụmụ ha ma na-adọ ha aka ná ntị tupu ha enwee ike ịkpa àgwà dị ka ndị maara ihe. (Ilu 22:6) Nwa maara ihe na-eme nnọọ ka ndị mụrụ ya ṅụrịa ọṅụ. Ma onye nzuzu ga-anọgide na-akpatara ndị mụrụ ya mwute.
Eze ahụ maara ihe jiri okwu ahụ bụ́ “ọṅụ” mee ihe n’ụzọ ọzọ dị iche. O kwuru, sị: “Uche gbagọrọ agbagọ bụụrụ onye obi amamihe kọrọ ọṅụ: ma onye nghọta na-eme ka ije ije ya zie ezie.” (Ilu 15:21) Ihe na-enye ndị obi amamihe kọrọ ọṅụ bụ omume nzuzu, ya na mkpori ndụ ndị na-adịghị eweta ezigbo afọ ojuju ma ọ bụ obi ụtọ. Otú ọ dị, onye nwere nghọta na-achọpụta na ọ bụ ihe nzuzu mmadụ ịbụ onye ‘hụrụ ihe ụtọ n’anya kama ịbụ onye hụrụ Chineke n’anya.’ (2 Timoti 3:1, 4) Ịṅa ntị n’ụkpụrụ ndị Chineke tọrọ na-enyere ya aka ịnọgide na-eme ihe ziri ezi ma mee ka ụzọ ya guzozie.
Mgbe “A Na-arụzu Ihe”
Ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ndị Chineke tọrọ na-aba nnọọ uru n’akụkụ ndị ọzọ nke ndụ. Ilu 15:22 na-ekwu, sị: “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị: ma n’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka [“a na-arụzu ihe” NW].”
Izu nzuzo bụ mgbe mmadụ abụọ na-ekwurịta ihe dị ha n’obi. N’asụsụ Hibru mbụ e ji dee Bible, okwu bụ́ “izu nzuzo” na-egosi inwe nkwurịta okwu chiri anya. Izu nzuzo abụghị nkwurịta okwu nkịtị, ọ bụ mmadụ iso onye ọzọ na-ekwurịta nnọọ otú ihe dị ya n’obi na ihe ndị na-enye ya nsogbu n’obi. Mgbe ndị di na nwunye nakwa ndị nne na nna na ụmụ na-agwarịta nnọọ ibe ha otú ihe dị ha n’obi n’atụghị ụjọ ọ bụla, ha ga-adị n’otu ma nọrọ n’udo. Ma, e nweghị izu nzuzo na-akpatakarị nkụda mmụọ na nsogbu n’ezinụlọ.
Mgbe anyị na-achọ ime mkpebi ndị dị mkpa, ọ ga-abụ ihe amamihe dị na ya ịnakwere ndụmọdụ ahụ bụ́: “N’ọtụtụ ndị na-adụ ọdụ ka [a na-arụzu ihe].” Dị ka ihe atụ, mgbe anyị na-ahọrọ ụzọ anyị chọrọ ka e si gwọọ anyị ọrịa, ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe amamihe dị na ya ijekwuru ihe karịrị otu dọkịta, karịsịa ma ọ bụrụ na ọrịa ahụ siri ike?
Abamuru dị n’inwe ọtụtụ ndị ndụmọdụ n’okwu metụtara ọgbakọ dị ukwuu. ‘A na-arụzu ihe’ mgbe ndị okenye nọkọrọ ma jiri okwu amamihe ha gbakọrọ aka chepụta mee ihe. Tụkwasị na nke ahụ, ndị okenye a họpụtara ọhụrụ ekwesịghị ịla azụ n’ijekwuru ndị okenye ndị ọzọ bu ha ụzọ bụ́ ndị nwekwara ahụmahụ karị ha, ka ha tụọrọ ha aro, karịsịa ma ọ bụrụ na ihe ha na-elebara anya esiere ha ike.
Mgbe E Nwere ‘Ọṅụ n’Ọzịza Okwu’
Olee ihe ọma pụrụ isi n’okwu e ji nghọta kwuo pụta? Eze Izrel kwuru, sị: “Ọṅụ dịịrị onye Ilu 15:23) Ọ̀ bụ na anyị adịghị enwe ọṅụ mgbe a gbasoro azịza ma ọ bụ ndụmọdụ anyị, ya arụpụta ihe dị mma? Otú ọ dị, ka ndụmọdụ anyị na-enye wee bụrụ nke na-arụpụta ihe, ọ ga-enwerịrị ihe abụọ.
ọ bụla n’ọzịza okwu nke ọnụ ya: ọzọ, okwu e kwuru na mgbe ya, lee ka o si dị mma nke ukwuu!” (Nke mbụ, ndụmọdụ ahụ ga-adaberesi ike n’Okwu Chineke, bụ́ Bible. (Abụ Ọma 119:105; 2 Timoti 3:16, 17) Nke abụọ, a ghaghị inye ya n’oge kwesịrị ekwesị. Ọbụna okwu ndị bụ́ eziokwu e kwuru n’oge na-ekwesịghị ekwesị pụrụ imebi ihe. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ihe amamihe na-adịghị na ya ibu ụzọ nyewe mmadụ ndụmọdụ tupu onye ahụ akọọrọ gị nsogbu ya, ndụmọdụ dị otú ahụ agaghịkwa enyere ya aka. Ọ dị oké mkpa na anyị “aghaghị ịdị ngwa n’ịnụ ihe, ghara ịdị ngwa n’ikwu okwu”!—Jems 1:19.
“Ụzọ Ndụ Na-arịgo Elu”
Ilu 15:24 kwuru, sị: “Ụzọ ndụ na-arịgo elu n’ebe onye nwere uche nọ, ka o wee si na [Shiol NW] dị n’okpuru wezuga onwe ya.” Onye ji nghọta na-eme ihe nọ n’ụzọ ahụ na-adịghị eduba na Shiol nke bụ́ ili ihe a kpọrọ mmadụ. Onye ahụ adịghị etinye aka n’omume ndị na-emerụ ahụ́ ndị dị ka inwe mmekọahụ aghara aghara, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya ókè—ma si otú a zere nnwụchu ọnwụ. Ụzọ ya na-eduga ná ndụ.
Rịba ama otú nke a si dị iche n’ụzọ nke ndị na-enweghị nghọta: “Ụlọ ndị mpako ka Jehova ga-efopụ: ma Ọ ga-eme ka ókè ala nwanyị di ya nwuru guzosie ike. Ihe arụ n’anya Jehova ka echiche ọjọọ nile bụ: ma okwu ọnụ ụtọ nile dị ọcha. Onye na-emekpa ezinụlọ nke aka ya ahụ́ ka onye akpịrị uru na-ezighị ezi na-akpọ nkụ bụ: ma onye na-akpọ onyinye iri ngo asị ga-adị ndụ.”—Ilu 15:25-27.
Eze Izrel gosiri anyị ụzọ anyị ga-esi zere ọnyà a na-amatakarị ndị mmadụ. O kwuru, sị: “Obi onye ezi omume na-atụgharị uche n’ịza okwu: ma ọnụ ndị na-emebi iwu na-ekwuwa ihe ọjọọ dị iche iche.” (Ilu 15:28) Ndụmọdụ dị n’ilu a bara nnọọ uru! Ọ dịghị mgbe ịzaghachi okwu n’echeghị ya eche na-arụpụta ihe dị mma. Mgbe anyị tụlere ihe dị iche iche gbara okwu gburugburu, tinyere ọnọdụ ndị ọzọ nọ na ya na mmetụta ha na-enwe, ọ ga-esi ike anyị ekwuo ihe anyị ga-emecha kwaa ụta.
Oleezi uru ịtụ egwu Chineke na ịnakwere ịdọ aka ná ntị ọ na-enye anyị bara? Nwoke ahụ maara ihe zara, sị: “Jehova dị anya n’ebe ndị na-emebi iwu nọ: ma ekpere ndị ezi omume ka Ilu 15:29) Ezi Chineke ahụ dị anya n’ebe ndị na-emebi iwu nọ. Bible na-ekwu, sị: “Onye na-ewezụga ntị ya n’ịnụ iwu, ọbụna ekpere ya bụ ihe arụ.” (Ilu 28:9) Ọ pụrụ ịdịrị ndị na-atụ egwu Chineke ma na-agbalị ime ihe ziri ezi n’anya ya mfe ikpegara ya ekpere, ma nwee obi ike na ọ ga-anụ ekpere ha.
Ọ na-anụ.” (Ihe “Na-eme Ka Obi Ṅụrịa”
Solomọn jiri ihe ntụnyere na-akpali iche echiche mee ihe site n’ikwu, sị: “Ihe nke na-enye anya ìhè na-eme ka obi ṅụrịa: ezi ihe a nụrụ anụ na-eme ka ọkpụkpụ nile maa abụba.” (Ilu 15:30) Ọkpụkpụ na-ama “abụba” mgbe ha jupụtara n’ụmị. Nke a na-eme ka ahụ́ dum nwee ume ma mee ka obi na-aṅụrị ọṅụ. A na-ejikwa ihu mmadụ amara ma ọ̀ na-aṅụrị ọṅụ. Nke a bụ ihe akụkọ dị mma na-arụzu!
Ọ̀ bụ na akụkọ ndị anyị na-anụ banyere otú ofufe Jehova siworo gbasaruo n’ụwa nile adịghị agba anyị nnọọ ume? N’ezie, ịtụle banyere ihe nile a rụzurula n’ọrụ ikwusa ozi ọma nke Alaeze ahụ na nke ime ndị na-eso ụzọ na-akpali anyị ikere òkè dị ukwuu n’ozi ahụ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) Ahụmahụ nke ndị mere ka Jehova bụrụ Chineke ha, ma malite ijere ya ozi na-eme ka obi anyị jupụta n’ọṅụ. Ebe ọ bụ na “okwu ọma a nụrụ site n’ala dị anya” na-enwe ụdị mmetụta a dị ike, ọ ga-adị nnọọ mma ka anyị na-enye ihe anyị rụtara n’ozi ubi ma na-enyechi akụkọ ozi ubi anyị anya!—Ilu 25:25.
“N’ihu Nsọpụrụ Ka Obi Umeala Na-aga”
Eze ahụ maara ihe kọwara uru ịnakwere ịdọ aka ná ntị n’ụdị ya dị iche iche bara. O kwuru, sị: “Ntị nke na-anụ ịba mba nke ndụ, n’etiti ndị maara ihe ka ọ ga-anọ ọnọdụ abalị. Onye na-ezere ịdọ aka ná ntị na-ajụ mkpụrụ obi nke aka ya: ma onye na-anụ ịba mba na-enweta obi amamihe.” (Ilu 15:31, 32) Ịdọ aka ná ntị na-eru n’obi mmadụ ma gbazie onye ahụ, na-eme ka o nwee ezi uche. Ka à sịkwa ihe mere o ji bụrụ “mkpanaka nke ịdọ aka ná ntị” na-eme ka ‘uche gbagọrọ agbagọ e kekọtara n’obi nwata’ dị anya n’ebe ọ nọ! (Ilu 22:15) Onye na-aṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị na-enwetakwa obi amamihe, ya bụ, ọ na-enwe echiche ziri ezi. N’aka nke ọzọ, ịjụ ịdọ aka ná ntị bụ ịjụ ndụ.
N’ezie, ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị amamihe na-enye ma jiri obi umeala nakwere ya na-aba uru. Ọ bụghị nanị na ime nke a na-eme ka mmadụ nwee afọ ojuju, ọganihu, ọṅụ, ma mee ka arụpụta ezigbo ihe kamakwa ọ na-eweta nsọpụrụ na ndụ. Ilu 15:33 mechiri site n’ikwu, sị: “Egwu Jehova bụ ịdọ aka ná ntị nke amamihe: ọ bụkwa n’ihu nsọpụrụ ka obi umeala na-aga.”
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
[Foto dị na peeji nke 17]
Ịhụnanya ịdị n’ezinụlọ ka inwe ụbara nri ndị dị ụtọ e siri nke ọma mma
[Foto dị na peeji nke 18]
Ọ bụrụgodị na e nwere ihe ụfọdụ na-egbochi anyị inweta ihe ọmụma Chineke, inwe àgwà nke ịmụ ihe na-enyere anyị aka inweta ihe ọmụma
[Foto dị na peeji nke 19]
Izu nzuzo bụ mmadụ iso onye ọzọ kwurịta otú ihe dị ya n’obi na ihe ndị na-enye ya nsogbu n’obi
[Foto dị na peeji nke 20]
Ị̀ maara otú ‘ezi ihe a nụrụ anụ si na-eme ka ọkpụkpụ nile maa abụba’?