Ị Pụghị Ichekwa Ya Jiri Ya Mee Ihe nke Ọma
Ị Pụghị Ichekwa Ya Jiri Ya Mee Ihe nke Ọma
A NA-ANỤKARỊ okwu bụ́, “Oge adịghị eche mmadụ.” Nke a na-egosi na mmadụ apụghị ịdọghachi aka elekere azụ, oge gafehaala, ọ gafechaala. Ị pụghị ichekwa oge ụfọdụ taa iji jiri ha mee ihe echi. Ọ gatụghị ekwe omume mmadụ ichekwa oge o nwere taa site n’ịghara iji ya eme ihe. Gịnị ma ọ bụrụ na i jiri awa asatọ hie ụra ma gbalịa ichekwa awa ndị fọrọ afọ site n’ịghara ime ihe ọ bụla ọzọ n’ụbọchị ahụ? N’ọgwụgwụ nke ụbọchị ahụ, awa ọ bụla ị na-ejighị mee ihe efuola ọhịa.
A pụrụ iji oge tụnyere osimiri nke na-asọsi ike. Ọ na-asọrọ n’ike n’ike na-aga nnọọ n’ihu. Ọ dịghị ihe ị ga-eme ka ị kwụsị ya, ị pụghịkwa iji mmiri nile sọferenụ mee ihe. Ọtụtụ narị afọ gara aga, ndị mmadụ malitere ịrụ wiil ndị mmiri na-akwagharị n’akụkụ osimiri. N’ụzọ dị otú a, osimiri nke na-asọsi ike na-enye aka akwagharị ígwè e ji akwọ ihe, ígwè e ji awa osisi na ígwè e ji etinye ikuku n’ime taya. N’ụzọ yiri nke a, ị pụrụ ịzụpụta oge, ọ bụghị ka i wee nwee ike ichekwa ya, kama ọ bụ iji jiri ya mee ihe bara uru. Otú ọ dị, iji mee nke a, ọ dị ihe abụọ na-ewekọrọ oge bụ́ ndị ị na-aghaghị ịkpachara anya banyere ha—iyigharị ihe na nwanne ya bụ́ idosasị ngwongwo aghara aghara. Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe banyere iyigharị ihe.
Zere Ịdị Na-eyigharị Ihe
Ndị mmadụ na-ekwukarị ihe dị ka, E mee ngwa ngwa e meghara ọdachi. Ma ụfọdụ mmadụ adịghị agbaso ndụmọdụ a. Mgbe ha nwere ọrụ tara akpụ ha ga-arụ, ha na-eyigharị ọrụ ahụ iji mee ka ihe dịrị ha mfe. Iyigharị ihe pụtara mmadụ ịmara ụma ghara ime ihe n’oge o kwesịrị ime ya ma buga ya n’oge ọzọ. Iyigharị ihe na-abịa mara onye ahụ ahụ́. Ka ọrụ onye ahụ ga-arụ na-amụba, ọ na-enweta ahụ́ efe site n’iwezụga ọrụ ahụ n’akụkụ ma jiri oge ọ gaara eji rụọ ọrụ ahụ zuru ike—otú a ka ọ ga-emegide ruo mgbe ọrụ zuru ya ahụ́.
Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịdị mkpa na anyị ga-eyigharị ihe ụfọdụ ma ọ bụ ihe nile anyị chọrọ ime gaa n’oge ọzọ n’ihi na anyị ejichaghị ahụ́ ma ọ bụ n’ihi na obi adịchaghị anyị mma. E wezụgakwa nke ahụ, onye ọ bụla kwesịrị izurụtụ ike mgbe ụfọdụ n’ọrụ ọ na-arụ kwa ụbọchị. Ọbụna ọ dị mgbe Ọkpara Chineke mere otú ahụ. Jizọs rụsiri ọrụ ike n’ozi ya, ma o wepụtakwara oge ya na ndị na-eso ụzọ ya ji zurutụ ike. (Mak 6:31, 32) Ime otú a na-aba uru. Otú ọ dị, ya na ịdị na-eyigharị ihe abụghị otu; iyigharị ihe na-emebikarị ihe. Tụlee otu ihe atụ.
Otu nwata akwụkwọ nwere izu atọ zuru ezu iji kwadebe maka ule mgbakọ ná mwepụ ya. E nwere ọtụtụ akwụkwọ ndị o kwesịrị ịgụgharị tinyere ihe ndị o deturu na klas. Ime nke a bịara na-agwụ
ya ike. Ọ malitere iyigharị oge ọ ga-eji mee ihe ndị a. Kama ịgụwa akwụkwọ ya, ya ana-ele telivishọn. Kwa ụbọchị, ọ na-eyigharị ihe ndị o kwesịrị ime bụ́ ndị ga-enyere ya aka ịgafe n’ule ahụ. N’abalị ga-abọta ụbọchị a ga-ele ule ahụ, ihe nile bịara gbakọta ọnụ. Ọ malitere ịgụgharị akwụkwọ ya na ihe ndị o deturu na klas.Ọ gụrụ akwụkwọ ruo ọtụtụ awa. Ka ndị ezinụlọ ya nọ na-ehi ụra, o siri ọnwụ mụrụ anya na-agbalị ibukọrọ usoro e si arụ mgbakọ na mwepụ ahụ n’isi. Mgbe o ruru n’ụlọ akwụkwọ n’echi ya, ya na ajụjụ ndị ọ na-enweghị ike ịza n’ihi ụbụrụ ya na-akpakọghị ọnụ, malitere ịlụ. Ọ dịghị ihe o nwetara n’ule ahụ, ọ kụrụ afọ n’ala. N’ihi nke a, ọ mụgharịrị ihe ọmụmụ ahụ, ọ gafeghịkwa na klas ọzọ.
Iyigharị ihe kpataara nwata akwụkwọ a nnukwu ọdachi. Ma e nwere ụkpụrụ Bible nke pụrụ inyere ndị mmadụ aka ịgbanahụ ọdachi a dakwasịrị nwata akwụkwọ a. Pọl onyeozi dere, sị: “Nọrọsienụ ike na nche ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, na-azụpụtara onwe unu oge kwesịrị ekwesị.” (Ndị Efesọs 5:15, 16) Pọl nọ na-agba Ndị Kraịst ume ka ha jiri oge ha mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya site n’iji ya na-etinye uche n’ihe ndị metụtara ozi Jehova, ma ụkpụrụ dị n’okwu ya pụrụ inyere anyị aka n’ọtụtụ ihe ndị dị mkpa a na-eme ná ndụ. Ebe ọ bụ na ọ dị anyị n’aka ikpebi mgbe anyị ga-eme ihe ọ bụla anyị chọrọ ime, anyị ga-arụpụta ihe ka mma ma rụchaa ọrụ anyị chọrọ ịrụ ọsọ ọsọ ma ọ bụrụ na anyị ahọrọ ime ya n’oge “kwesịrị ekwesị,” ma ọ bụ n’oge kasị mma. Mmadụ ime otú a na-egosi na onye ahụ ‘maara ihe,’ dị ka Akwụkwọ Nsọ si kwuo.
Olee mgbe gaara abụ oge “kwesịrị ekwesị” maka nwata akwụkwọ ahụ ịgụ akwụkwọ maka ule mgbakọ na mwepụ ya? Ikekwe, ọ bụrụ na o jiri minit iri na ise ma ọ bụ karịa na-eme otú ahụ kwa abalị, ọ ga-eji nwayọọ nwayọọ mụchaa ihe ndị o kwesịrị ịmụ. N’ụzọ dị otú ahụ, ọ gaghị adị mkpa ka ọ gaa buwe ihe nile n’isi n’abalị ga-abọta ụbọchị ọ ga-ele ule, bụ́ oge kasị mma iji hie ụra. N’ụbọchị a ga-ele ule ahụ, isi gaara ajụ ya oyi, ọ gaara adịwokwa njikere ile ule ahụ. Nke ahụ pụrụ ime ka ọ gbata ihe dị mma n’ule ahụ.
Ya mere, mgbe e nyere gị ọrụ ị ga-arụ, chọpụta oge “kwesịrị ekwesị” iji rụọ ya ma jisie ike rụọ ya. Mgbe ahụ, ị pụrụ izere iyigharị ihe, zerekwa ọdachi ndị iyigharị ihe na-akpata. Ị ga-enwekwa obi ụtọ na ị rụrụ ọrụ gị nke ọma. Nke a dị oké mkpa karịsịa ma ọ bụrụ na ọrụ ahụ ga-emetụta ndị ọzọ, dị ka ọ dị n’ihe banyere ihe omume a na-eme n’ọgbakọ.
Tụfusịa Ngwongwo Ndị Na-adịghị Mkpa
Dị ka a kpọtụrụ uche ná mmalite, ihe nke abụọ ga-eme ka anyị nwee ike iji oge anyị dị oké ọnụ ahịa eme ihe nke ọma bụ izere idosasị ngwongwo aghara aghara. Anyị maara na ọ na-ewe oge iji dozie ngwongwo anyị, iji ha eme ihe, ime ka ha dị ọcha, ichekwa ha, na ịchọta ha. Ka ihe ndị anyị nwere na-adị ọtụtụ ka a na-achọkwu oge iji lekọta ha. Ịrụ ọrụ n’ime ụlọ ngwongwo juru na ya na-ewe oge dị ukwuu ma na-ara ahụ́ karịa ịrụ ọrụ n’ime ụlọ e nwere ohere na ya na nke kpakọrọ ọnụ. Tụkwasị na nke ahụ, ka ngwongwo na-ejupụta n’ụlọ, otú ahụ ka ọ na-esiri mmadụ ike ịchọta ihe dị ya mkpa ọ na-achọ.
Otu ọkachamara n’ihe banyere idozi ụlọ kwuru na “ibuzigharị ihe ndị e buchiri ụzọ na idozisị ihe ndị a tụsasịrị ebe nile” na-ewe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke oge ndị na-edozi ụlọ ji arụ ọrụ ha. O yikwara ka ọ̀ bụ otú ahụ ka ọ dịkwa
ma a bịa n’ihe ndị ọzọ a na-eme ná ndụ. Ya mere, ọ bụrụ na ị chọrọ iji oge gị mee ihe nke ọma, leruo ebe obibi gị anya. Ngwongwo ò jupụtara ebe nile, na-eme ka o siere gị ike ịgagharị n’ime ụlọ gị, ma ọ bụ nke kadị njọ, na-ewekọrọ oge gị? Ọ bụrụ otú ahụ, tụfusịa ụfọdụ ngwongwo ndị ahụ.Ọ dịghị mfe mmadụ ịtụfusị ngwongwo ya. Ọ na-esi ike mmadụ ịtụfu ihe o nwere mmasị na ya ọ bụrụgodị na ihe ahụ adịghịzi ya mkpa. Ọ na-adịcha onye ahụ ka ezigbo enyi ya ọ̀ hapụla ya. Ya mere, olee otú ị pụrụ isi mara ma ị̀ ka ga-edebe otu ihe i nwere ma ọ bụ na ị̀ ga-atụfu ya? Ihe ụfọdụ ndị na-eme bụ idebe ihe ahụ ruo otu afọ. Ọ bụrụ na i jighị ihe ahụ mee ihe ruo otu afọ, tụfuo ya. Gịnị ma ọ bụrụ na ọ ka na-esiri gị ike ịtụfu ya mgbe otu afọ gasịrị? Chọọ otu ebe tụba ya ruo ọnwa isii ọzọ. Mgbe ọzọ ị hụrụ ya ma cheta na otu afọ na ọkara agafeela ma ọ dịbeghị ihe i jiri ya mee, ịtụfu ya agaghịzi ara gị ahụ́. Otú o sina dị, ihe anyị na-eme ka ọ pụta ìhè n’ebe a bụ mkpa ọ dị ime ka ebe obibi gị kpakọọ ọnụ na iji oge gị eme ihe nke ọma.
N’ezie, ọ bụghị nanị n’ebe obibi ma ọ bụ n’ụlọ ọrụ mmadụ ka ngwongwo na-ejupụta. Jizọs kwuru okwu banyere “nchegbu nke usoro ihe a na ike dị aghụghọ nke akụ̀ na ụba” bụ́ ihe ndị pụrụ ‘ịkpagbu okwu’ Chineke ma mee ka mmadụ ‘ghara ịmị mkpụrụ’ ma a bịa n’ihe banyere ikwusa ozi ọma. (Matiu 13:22) Mmadụ pụrụ nnọọ iji ọtụtụ ọrụ n’aka ma na-adọga iru ọtụtụ ihe mgbaru ọsọ ya nke na ọ gaghị enwe ohere maka ihe ime mmụọ bụ́ ihe dị oké mkpa. Ihe pụrụ isi na nke a pụta bụ na mmekọrịta onye ahụ na Jehova nwere ike gharazie isi ike, o nwekwara ike ụwa ọhụrụ ahụ Chineke kwere ná nkwa akwaa onye ahụ, bụ́ mgbe mmadụ ga-enwe ohere na-adịghị agwụ agwụ ime ihe ndị ga-ewetara ya ezi afọ ojuju na obi ụtọ.—Aịsaịa 65:17-24; 2 Pita 3:13.
Ị̀ na-adọga ịhụ na ihe nile i chere na ị ghaghị ime—ihe ndị metụtara ọrụ gị, ụlọ gị, ụgbọala gị, ihe ntụrụndụ, ime njem, mmega ahụ́, nnọkọ oriri, ma ọ bụ ọtụtụ ihe ndị ọzọ—banyechara n’usoro ihe omume gị? Ọ bụrụ otú ahụ, eleghị anya, ugbu a bụ oge i kwesịrị iche otú ị ga-esi webilata ihe ụfọdụ ka i wee nwee ike ilebara mmekọrịta gị na Jehova anya.
Dị ka ilu ahụ anyị ji mee ihe ná mmalite na-ekwu, oge adịghị eche mmadụ. Ikwu nke bụ́ eziokwu, oge na-agara nnọọ onwe ya dị ka mmiri nke na-asọsi ike na-akwụsịghị akwụsị. A pụghị ịdọghachi ya azụ ma ọ bụ chekwaa ya, ọ gahaala, ọ gachaala. Otú ọ dị, site n’ịgbaso ụkpụrụ Bible ụfọdụ ndị dị mfe, nakwa site n’ịhapụ ihe omume ụfọdụ ndị na-adịchaghị mkpa, anyị pụrụ ịzụpụta oge dị mkpa iji lebara “ihe ndị ka mkpa” anya, bụ́ ihe ndị ga-abara anyị uru ruo mgbe ebighị ebi ma wetara “Chineke otuto na ịja mma.”—Ndị Filipaị 1:10, 11.
[Foto dị na peeji nke 8, 9]
A pụrụ ịzụpụta oge ma jiri ya rụpụta ezigbo ihe dị nnọọ ka a pụrụ iji mmiri na-asọsi ike rụọ ọrụ bara uru
[Foto dị na peeji nke 9]
Olee “oge kwesịrị ekwesị” ọ gaara eji gụọ akwụkwọ maka ule ya?
[Foto dị na peeji nke 10]
Ịrụ ọrụ n’ebe ngwongwo juru na-ewe oge ma na-agwụ ike